Mmadụ Ịdị Umeala n’Obi Ọ̀ Na-egosi na Ọ Dịghị Ike Ka Ọ̀ Na-egosi na Ọ Dị Ike?
Echiche nke Bible
Mmadụ Ịdị Umeala n’Obi Ọ̀ Na-egosi na Ọ Dịghị Ike Ka Ọ̀ Na-egosi na Ọ Dị Ike?
N ’ỤWA taa, a na-egosikarị ndị nganga na ndị na-aka anya dị ka ndị e kwesịrị iṅomi eṅomi. A na-ewerekarị ndị dị umeala n’obi na ndị dị nwayọọ dị ka ndị na-adịghị ike, ndị ụjọ, ma ọ bụ ndị na-enweghị ọnụ. Ma, mmadụ ịdị ezi umeala n’obi ọ̀ na-egosi n’ezie na ọ dịghị ike? Mmadụ ịdị nganga ọ̀ na-egosi n’ezie na ọ dị ike? Gịnị ka Bible na-ekwu?
Ka anyị burugodị ụzọ mee ka o doo anya na e nwere ụdị nganga Bible kwuru okwu ọma banyere ya. Dị ka ihe atụ, Ndị Kraịst kwesịrị iji eziokwu ahụ bụ́ na Jehova bụ Chineke ha nakwa na ọ maara ha akpa nganga. (Abụ Ọma 47:4; Jeremaịa 9:24; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:3, 4) Ndị nne na nna pụrụ iji ụmụ ha akpa nganga mgbe ha na-esetịpụ ezi ihe nlereanya n’àgwà ha dị ka Ndị Kraịst ma jiri obi ike na-akwụsi ike n’ezi ofufe. (Ilu 27:11) Otú ọ dị, e nwekwara ụdị nganga na-adịghị mma.
Ilebakwu Anya n’Àgwà Ndị A Bụ́ Nganga na Obi Umeala
Otu ụzọ e si akọwa nganga bụ mmadụ ibuli onwe ya elu. Ụdị nganga a na-eme ka mmadụ na-eji onwe ya akpọrọ ihe gabiga ókè, na-ewerekwa onwe ya dị ka onye ka ndị ọzọ elu, ma eleghị anya n’ihi mma ya, agbụrụ o si na ya, ọkwá ya, ihe ndị ọ ga-emeli, ma ọ bụ akụnụba ya. (Jems 4:13-16) Bible kwuru banyere ndị “nganga fụliri elu.” (2 Timoti 3:4) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ha na-edebe onwe ha ebe ha na-erughị.
N’aka nke ọzọ, ndị dị umeala n’obi na-agbalị iji obi ọcha ele onwe ha anya otú kwesịrị ekwesị, ma na-aghọta na ha bụ ndị na-ezughị okè nakwa ndị dị ala n’ihu Chineke. (1 Pita 5:6) Ọzọkwa, ha na-ahụta—ọbụna na-aṅụrị ọṅụ—n’ihi àgwà ndị magburu onwe ya ndị ọzọ nwere. (Ndị Filipaị 2:3) N’ihi ya, ha adịghị ekwoso ndị ọzọ ekworo n’ihi ọganihu ha ma ọ bụ na-enwere ha anyaụfụ. (Ndị Galeshia 5:26) Ya mere, o doro anya na mmadụ ịdị umeala n’obi n’ezie na-eme ka ya na ndị ọzọ na-adị ná mma, na-emekwa ka obi ruo ya ala.
Tụlee ihe atụ banyere Jizọs. Tupu ya abịa n’ụwa, ọ bụ mmụọ e kere eke dị ike n’eluigwe. Mgbe ọ nọkwa n’ụwa, ọ bụ nwoke zuru okè nke na-enwetụghị mmehie ọ bụla. (Jọn 17:5; 1 Pita 2:21, 22) Ikike ya, amamihe ya, na ihe ọmụma ya enweghị atụ. N’agbanyeghị ihe ndị a nile, o nwetụghị mgbe o buliri onwe ya elu, kama ọ nọgidere na-adị umeala n’obi mgbe nile. (Ndị Filipaị 2:6) Ọ sadịrị ụkwụ ndị na-eso ụzọ ya n’otu oge; o nwekwara mmasị n’ebe ụmụntakịrị nọ. (Luk 18:15, 16; Jọn 13:4, 5) N’otu oge, Jizọs kpọọrọ otu nwatakịrị dobe n’akụkụ ya, ma kwuo, sị: “Onye ọ bụla nke ga-eweda onwe ya n’ala dị ka nwatakịrị a bụ onye kasị ukwuu n’alaeze nke eluigwe.” (Matiu 18:2-4) Ee, n’anya Jizọs nakwa n’anya Nna ya, ihe na-eme ka mmadụ bụrụ onye ukwu n’ezie, bụ obi umeala, ọ bụghị nganga.—Jems 4:10.
Mmadụ Ịdị Umeala n’Obi Na-egosi na Ọ Dị Ike
N’agbanyeghị na Jizọs setịpụrụ ezi ihe nlereanya ma a bịa n’ịdị umeala n’obi, ọ bụtụghị onye ụjọ ma ọ bụ onye na-enweghị ọnụ. Ọ gwara ndị mmadụ eziokwu ahụ n’atụghị egwu, ọ natụghịkwa atụ egwu mmadụ. (Matiu 23:1-33; Jọn 8:13, 44-47; 19:10, 11) Nke a medịrị ka ọbụna ụfọdụ ndị na-emegide ya kwanyere ya ùgwù. (Mak 12:13, 17; 15:5) Ma Jizọs adịtụghị aka ike. Kama nke ahụ, o ji obi umeala ya, obiọma ya, na ịhụnanya ya dọta mmasị ndị mmadụ, si otú ahụ nweta obi ha otú onye nganga na-agatụghị enwe ike ime. (Matiu 11:28-30; Jọn 13:1; 2 Ndị Kọrịnt 5:14, 15) Ọbụnadị taa, ọtụtụ nde mmadụ na-erubere nnọọ Kraịst isi n’ihi ezi ịhụnanya na nkwanye ùgwù miri emi ha nwere n’ebe ọ nọ.—Mkpughe 7:9, 10.
Okwu Chineke na-agba anyị ume ịdị umeala n’obi n’ihi na ndị dị umeala n’obi na-adị njikere ịnara ndụmọdụ, obi na-adịkwa ndị na-akụziri ha ihe ụtọ. (Luk 10:21; Ndị Kọlọsi 3:10, 12) Dị nnọọ ka Apọlọs, bụ́ Onye Kraịst oge mbụ a ma dị ka onye na-ezi ihe nke ọma mere, obi na-adị ha ụtọ ịgbanwe echiche ha mgbe a kụziiri ha ihe ọhụrụ nke bụ́ ezigbo ya. (Ọrụ 18:24-26) Ụjọ anaghịkwa atụ ha ịjụ ajụjụ. Ma, ndị dị nganga na-ezerekarị ịjụ ajụjụ, n’ihi na ha na-atụ ụjọ na ndị ọzọ ga-amata na ha amaghị ihe ndị ahụ ha na-ajụ ajụjụ banyere ha.
Tụlee banyere ọnaozi Etiopia nke narị afọ mbụ, bụ́ onye na-aghọtaghị akụkụ Akwụkwọ Nsọ ọ na-agụ. Onye na-eso ụzọ Kraịst bụ́ Filip jụrụ ya, sị: “Ị̀ maara n’ezie ihe ị na-agụ?” Ọnaozi ahụ zara ya, sị: “N’ezie, olee nnọọ otú m ga-esi mara, ma ọ́ bụghị ma mmadụ ò duziri m?” Nke ahụ bụ nnọọ ụdị obi umeala pụrụ iche—nke ka nke ma ọ bụrụ na e cheta na ọnaozi a nwere ike ịbụ onye a ma ama n’obodo ya! N’ihi obi umeala a o gosiri, e mere ka ọ ghọtakwuo nnọọ ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ.—Ọrụ 8:26-38.
Àgwà onye Etiopia a dịwagara nnọọ iche na nke ndị odeakwụkwọ ndị Juu na ndị Farisii, bụ́ ndị weere na ha nọ n’ọkwá dị elu n’okpukpe ha. (Matiu 23:5-7) Kama iji obi umeala gee Jizọs na ụmụazụ ya ntị, ha kwara ha emo ma na-achọ ma hà ga-ahụ ebe ha mejọrọ ihe. N’ihi nganga ha a, ha amataghị ihe bụ́ uche Chineke na nzube ya.—Jọn 7:32, 47-49; Ọrụ 5:29-33.
Ị̀ Dị Ka Ụrọ Na-esighị Ike Ka Ị̀ Dị Ka Ụrọ Kpọrọ Nkụ?
Bible kọwara Jehova dị ka ọkpụite, kọwaakwa ụmụ mmadụ dị ka ụrọ. (Aịsaịa 64:8) Mmadụ ịdị umeala n’obi na-eme ka onye ahụ dị ka ụrọ na-esighị ike n’aka Chineke, bụrụkwa onye ọ pụrụ ịkpụzi ka ọ bụrụ arịa a na-achọsi ike; n’aka nke ọzọ, onye nganga na-adị ka ụrọ kpọrọ nkụ nke nanị ihe a pụrụ ime ya bụ igweri ya egweri. Ihe atụ ọjọọ e nwere maka ụrọ kpọrọ nkụ bụ Fero dị mpako nke Ijipt oge ochie, bụ́ onye aka ọ mara Jehova tara isi ya. (Ọpụpụ 5:2; 9:17; Abụ Ọma 136:15) Ọnwụ Fero mere ka a ghọta ilu a nke ọma, nke bụ́: “N’ihu ntipịa ka mpako [ma ọ bụ, nganga] na-aga, ọ bụkwa n’ihu ịsụ ngọngọ ka ịdị elu nke mmụọ mmadụ na-aga.”—Ilu 16:18.
Ihe ndị a e kwuru n’elu anaghị egosi na ọ dịtụbeghị mgbe nganga batara ndị Chineke n’isi. Dị ka ihe atụ, o nwere ọtụtụ oge ndị na-eso ụzọ Jizọs rụrụ ụka banyere onye ka ibe ya ukwuu. (Luk 22:24-27) N’agbanyeghị nke ahụ, ha ekweghị ka a mara ha dị ka ndị nganga, kama ha gere Jizọs ntị ma mesịa gbanwee àgwà ha.
Solomọn dere, sị: “Ọkpụkpụ ọrụ nke obi umeala na egwu Jehova bụ akụ̀, na nsọpụrụ, na ndụ.” (Ilu 22:4) Anyị nwere nnọọ ezi ihe mere anyị ga-eji na-adị umeala n’obi! Ọ bụghị nanị na ọ bụ àgwà a na-achọsi ike na nke na-adọrọ mmasị kama ọ na-enyekwa aka eme ka mmadụ na Chineke dị ná mma, na-emekwa ka onye ahụ nweta ndụ ebighị ebi.—2 Samuel 22:28; Jems 4:10.
Ì CHETỤWO ECHICHE BANYERE NKE A?
▪ Ọ̀ bụ ụdị nganga nile dị njọ?—2 Ndị Tesalọnaịka 1:3, 4.
▪ Olee otú mmadụ ịdị umeala n’obi si eme ka ọ mụtakwuo ihe?—Ọrụ 8:26-38.
▪ Ọ̀ dị ndị ohu Chineke mkpa ịdị umeala n’obi?—Luk 22:24-27.
▪ Olee olileanya ndị dị umeala n’obi nwere?—Ilu 22:4.
[Foto dị na peeji nke 26 na 27]
Ụmụntakịrị bịakwutere Jizọs n’ihi na ọ bụ nwoke dị umeala n’obi