Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Pụrụ Isi Zere Iso Nwoke Ibe M Ma Ọ Bụ Nwanyị Ibe M Na-enwe Mmekọahụ?

Olee Otú M Pụrụ Isi Zere Iso Nwoke Ibe M Ma Ọ Bụ Nwanyị Ibe M Na-enwe Mmekọahụ?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Olee Otú M Pụrụ Isi Zere Iso Nwoke Ibe M Ma Ọ Bụ Nwanyị Ibe M Na-enwe Mmekọahụ?

“Mgbe m dị afọ 12, agụụ iso otu nwatakịrị nwanyị nọ n’ụlọ akwụkwọ anyị nwee mmekọahụ gụwara m. Amaghị m ihe m ga-eme, echekwara m na m na-aga ịghọ onye na-eso nwanyị ibe ya enwe mmekọahụ.”—Anna. *

“Mgbe m dị afọ iri na ụma, agụụ iso nwoke ibe m enwe mmekọahụ na-agụ m. N’obi m, ama m na ụdị agụụ ahụ dị njọ.”—Olef.

“Mụ na enyi m nwanyị susuru ọnụ otu ugboro ma ọ bụ abụọ. Ebe ọ bụ na ihe ụmụ nwoke na-amasị m, echere m na m na-aga ịghọ onye na-eso ma nwanyị ma nwoke enwe mmekọahụ.”—Sarah.

ÀGWÀ onye mere otú masịrị ya dị n’ụwa taa emeela ka ndị ntorobịa na-anwale ihe ọ dị ka ya iso nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha enwe mmekọahụ. Nwa agbọghọ dị afọ 15 bụ́ Becky kwuru, sị: “Ọtụtụ ụmụ agbọghọ nọ n’ụlọ akwụkwọ anyị sịrị na ha na nwanyị ibe ha na-enwe mmekọahụ, ma ọ bụ na ha na nwanyị na nwoke na-enwe mmekọahụ, ma ọ bụkwanụ na ha na-enwe mmasị iso ma nwoke ma nwanyị enwe mmekọahụ.” Christa dị afọ 18 siri na otu ihe ahụ na-eme n’ụlọ akwụkwọ ha. O kwuru, sị: “Ụmụ agbọghọ abụọ nọ na klas anyị agwala m ka mụ na ha nwee mmekọahụ. Otu detaara m akwụkwọ ma jụọ ma m̀ ga-achọ ịma ihe nwanyị na nwanyị inwe mmekọahụ dị ka ya.”

Ebe ọ bụ na ndị na-eso nwoke ibe ha ma ọ bụ nwanyị ibe ha enwe mmekọahụ adịghị ezo onwe ha ezo, i nwere ike ịjụ, sị: ‘Ime otú ahụ ọ̀ dị njọ n’eziokwu? Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ọ na-agụ m iso nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe m nwee mmekọahụ? Ọ̀ pụtara na m ga na-esozi nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe m enwe mmekọahụ?’

Olee Otú Chineke Si Ele Omume A Anya?

Taa, ọtụtụ mmadụ—ma ndị ụkọchukwu—adịghị ekwusi okwu ike banyere mmadụ iso nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya enwe mmekọahụ. Ma, Bible kwuru ya otú ọ na-agaghị agbagwoju anyị anya. Ọ na-agwa anyị na Jehova Chineke kere nwoke na nwanyị, nakwa na nzube ya bụ ka ọ bụrụ nanị di na nwunye ga na-enwe mmekọahụ. (Jenesis 1:27, 28; 2:24) N’ihi ya, ọ bụghị ihe ijuanya na Bible katọrọ mmadụ iso nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya nwee mmekọahụ.—Ndị Rom 1:26, 27.

N’ezie, ọtụtụ ndị pụrụ ikwu na Bible bụ akwụkwọ mgbe ochie. Dị ka ihe atụ, Megan bụ́ nwa agbọghọ dị afọ 14 kwuru, sị, “Ụfọdụ n’ime ihe ndị e kwuru na Bible abaghị uru n’oge anyị a.” Ma gịnị mere ụfọdụ ndị ji adị ngwa ikwu na Bible abaghịzi uru? Ihe na-akpatakarị ya bụ na otú Bible si ele ihe anya dị iche n’otú ha si ele ya. Ha na-ajụ Okwu Chineke n’ihi na ihe ọ na-akụzi dị iche n’ihe ha chọrọ ikwere. Ma, echiche dị otú ahụ adịghị mma, Bible na-agbakwa anyị ume izere echiche ahụ hiere ụzọ! N’eziokwu, n’ime Bible, Jehova Chineke na-agba anyị ume ịtụle eziokwu ahụ bụ́ na iwu ya bụ maka ọdịmma anyị. (Aịsaịa 48:17, 18) Nke ahụ bụ nnọọ ihe amamihe dị na ya ime. A sị ka e kwuwe, ọ̀ dị onye ka Onye Okike anyị mara otú e si kee anyị?

Ebe ọ bụ na ị ka na-eto eto, ị pụrụ ịdị na-enwe ụdị mmetụta dị iche iche. Were ya na ọ na-agụ gị agụụ iso nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị nwee mmekọahụ. Ọ̀ pụtara ozugbo na ị ga-aghọ onye na-eso nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya enwe mmekọahụ? Mba. Cheta na ị ka nọ n’oge “ntoju ntorobịa,” bụ́ oge ahụ́ gị ga na-eji aka ya akpali gị inwe agụụ mmekọahụ. (1 Ndị Kọrint 7:36) Ruo oge ụfọdụ, ọ pụrụ ịdị na-agụ gị iso nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị nwee mmekọahụ. Ma ọ naghị egosi na ị ga-aghọ onye na-eso nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya enwe mmekọahụ. N’ezie, nchọpụta e mere na-egosi na ọtụtụ mgbe, agụụ ahụ na-emecha kwụsị. Ma, ị pụrụ ịjụ, sị, ‘Oleedị otú agụụ a si amalite?’

Ụfọdụ na-ekwu na mmadụ iso nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya enwe mmekọahụ na-esi n’ọbara. Ndị ọzọ na-ekwu na a na-amụta ya amụta. Ihe bụ́ mkpa anyị n’ebe a abụghị ịtụlewe ma ọ̀ na-esi n’ọbara ma à na-amụta ya amụta. N’ezie, ọ bụrụ na e kwuo na ọ bụ nanị otu ihe na-eme ka mmadụ na-eso nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya enwe mmekọahụ, o yiri ka ọ̀ ga-abụ ime ka omume ahụ yie ihe na-adịtụghị ihe ọ bụ. Dị nnọọ ka e si enwe ọtụtụ ihe na-eme ka mmadụ na-akpa àgwà ndị ọzọ, otú ahụ ka e sikwa enwe ọtụtụ ihe na-eme ka mmadụ na-eso nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya enwe mmekọahụ.

Ihe ọ sọrọ ya bụrụ ya na-akpata ya, ihe dị mkpa bụ ịghọta na Bible katọrọ ya. N’ihi ya, onye ọ bụla ọ na-agụ agụụ iso nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya nwee mmekọahụ nwere ike ikpebi na ya agaghị emejụ agụụ ahụ. Iji maa atụ: Mmadụ nwere ike ịdị “na-enwe ọnụma hie nne.” (Ilu 29:22) O nwere ike ịbụ na n’oge mbụ, obere ihe mehaala, ya amalite iji iwe mebiwe ihe. Ma, mgbe ọ mụchara Bible, ya amatazie na ọ dị mkpa ka ọ na-ejide onwe ya. Ọ̀ pụtara na o nwetụghịzi oge iwe ga-ewe ya? Mba. Ma, ebe ọ bụ na ọ matala ihe Bible kwuru banyere iwebiga iwe ókè, mgbe ọ bụla iwe were ya, ọ na-agbalị ịchịkwa ya. Otú ahụkwa ka ọ dị onye ọ na-agụbu agụụ iso nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya nwee mmekọahụ, ma ya abịazie mata ihe Bible kwuru banyere ya. Mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ inwe ụdị agụụ mmekọahụ ahụ. Ma, site n’itinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ, ọ pụrụ izere imejụ agụụ mmekọahụ ahụ.

N’eziokwu, ọchịchọ iso nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị nwee mmekọahụ pụrụ ịgbanyesi mgbọrọgwụ ike n’ime gị. Ma, mara na ọchịchọ ọjọọ pụkwara ịkwụsị. (1 Ndị Kọrint 9:27; Ndị Efesọs 4:22-24) Mee elu mee ala, ọ bụ gị ka ọ dị n’aka ikpebi otú ị ga-esi bie ndụ gị. (Matiu 7:13, 14; Ndị Rom 12:1, 2) N’agbanyeghị na a na-ekwu na ọ gaghị ekwe omume, ị pụrụ ịkwụsị ichewe banyere ihe ndị obi gị na-agwa gị ka i mee—ma ọ bụ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, izere ime ihe ndị ahụ eme.

Zere Omume Ọjọọ

Olee otú ị pụrụ isi zere iso nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị nwee mmekọahụ?

Nke Mbụ Kọọrọ Jehova ihe nile na-echegbu gị, nweekwa obi ike na ‘ọ na-eche banyere gị.’ (1 Pita 5:7; Abụ Ọma 55:22) Jehova pụrụ iji udo nke “karịrị echiche nile” wusie gị ike. Nke a pụrụ ‘iche obi gị na ike iche echiche gị nche’ ma nye gị “ike karịrị ike nkịtị” nke ga-enyere gị aka izere imejụ ọchịchọ ọjọọ. (Ndị Filipaị 4:7; 2 Ndị Kọrint 4:7) Sarah, bụ́ onye ụjọ ji ma ọ̀ ga-aghọ onye na-eso ma nwoke ma nwanyị enwe mmekọahụ, kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla echiche ahụ batara m n’obi, ana m ekpegara Jehova ekpere, ọ na-enyekwara m aka. E wepụ enyemaka ya, agaraghị m emerili nsogbu a. Ekpere bụ ike m!”—Abụ Ọma 94:18, 19; Ndị Efesọs 3:20.

Nke Abụọ Na-eche banyere ihe ndị metụtara ofufe Chineke mgbe nile. (Ndị Filipaị 4:8) Na-agụ Bible kwa ụbọchị. Echela na ọ gaghị akpụzili uche gị na obi gị. (Ndị Hibru 4:12) Jason kwuru, sị: “Bible—nke gụnyere akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị ka 1 Ndị Kọrint 6:9, 10 na Ndị Efesọs 5:3—emetụtala m nke ukwuu. Ana m agụ ha mgbe ọ bụla ọchịchọ ọjọọ batara m n’obi.”

Nke Atọ Ekirila ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na ihe ọ bụla pụrụ ime ka i nwewe ụdị agụụ a, n’ihi na nanị ihe nke ahụ ga-eme bụ ka echiche ọjọọ bata gị n’obi ma dịgide na ya. * (Abụ Ọma 119:37; Ndị Kọlọsi 3:5, 6) Ụfọdụ ihe ndị a na-egosi na fim nakwa na televishọn na-emekwa ka ndị mmadụ kwere na mmadụ iso nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya enwe mmekọahụ adịghị njọ, kama na ọ bụ ụzọ ọzọ mmadụ nwere ike isi bie ndụ ya. Anna kwuru, sị, “Echiche ọjọọ nke ụwa bịara baa m n’obi ma mee ka ihe ndị metụtara mmekọahụ gbagwojukwuo m anya. Ugbu a, ana m agbara ihe ọ bụla ma ọ bụ onye ọ bụla na-akwado mmadụ iso nwoke ma o bụ nwanyị ibe ya enwe mmekọahụ ọsọ.”—Ilu 13:20.

Nke Anọ Chọta onye i nwere ike ịkọrọ ihe dị gị n’obi, ma kọọrọ ya ihe ahụ na-enye gị nsogbu n’obi. (Ilu 23:26; 31:26; 2 Timoti 1:1, 2; 3:10) Olef, bụ́ onye gara ka otu okenye n’ọgbakọ Ndị Kraịst nyere ya aka, kwuru, sị: “Ndụmọdụ o nyere m baara m nnọọ uru. Asị na m ma, agaara m akọrọ ya nsogbu m n’oge.”

Ike Agwụla Gị!

N’eziokwu, ụfọdụ ga-asị na ọ baghị uru imewecha ihe a nile, na ị kwesịrị ịdị na-enwe ụdị mmekọahụ ọ bụla ahụ́ gị nabatara. Ma Bible na-ekwu na i nwere ike ime ihe ka nke ahụ mma! Dị ka ihe atụ, ọ gwara anyị na ụfọdụ Ndị Kraịst oge mbụ bụbu ndị ikom na-edina ndị ikom, ma mechaa kwụsị ya. (1 Ndị Kọrint 6:9-11) Gị onwe gị nwekwara ike imeri n’ọgụ a—ọbụna ma a sị na ọ ka na-abata gị abata n’obi.

Ọ bụrụ na ị ka nọgide na-enwe ụdị agụụ ahụ, ike agwụla gị, echekwala na ị gaghịzi ekwe mmekwata. (Ndị Hibru 12:12, 13) Ọchịchọ ọjọọ na-abata anyị nile n’obi mgbe ụfọdụ. (Ndị Rom 3:23; 7:21-23) Ọ bụrụ na ị jụ imejụ ọchịchọ ọjọọ ndị ị na-enwe, ka oge na-aga, ha ga-apụrụ onwe ha. (Ndị Kọlọsi 3:5-8) Ihe kasị mkpa bụ, dabere n’ebe Jehova nọ maka enyemaka. Ọ hụrụ gị n’anya, ọ makwa ihe ga-eme gị obi ụtọ. (Aịsaịa 41:10) Ee, “tụkwasị Jehova obi, meekwa ezi ihe . . . , Ọ ga-enyekwa gị ihe nile obi gị na-arịọ.”—Abụ Ọma 37:3, 4.

Ị pụrụ ịhụ isiokwu ndị ọzọ dị n’usoro isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . ” n’ebe a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet nke adres ya bụ www.watchtower.org/ype

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanweela aha ndị e ji mee ihe n’isiokwu a.

^ par. 19 “Otu omume na-ewu ewu bụ ụmụ nwoke ilebara onwe ha na ọdịdị ahụ́ ha anya gabiga ókè. Nke a emeela ka a ghara ịma ọdịiche dị n’etiti ụmụ nwoke na-eso ụmụ nwoke ibe ha enwe mmekọahụ na ụmụ nwoke na-eso ụmụ nwanyị enwe mmekọahụ. Dị ka otu nwoke si kwuo, nwoke na-ebi ụdị ndụ a nwere ike ịdị na-edina nwoke ibe ya, na-edina nwanyị, ma ọ bụkwanụ na-edina ma nwoke ma nwanyị. Ma ọ̀ na-edina nwoke ma ọ̀ na-edina nwanyị, nke ahụ adịghịzi ihe ọ bụụrụ ya, n’ihi na ọ na-ejizi ahụ́ ya emejụ agụụ mmekọahụ ya, na-ejikwa ihe ndị na-enye ya obi ụtọ edochi anya mmekọahụ.” Otu akwụkwọ kwuru na omume a malitere iwu ewu “mgbe ọnụ ọgụgụ ụmụ nwoke na-edina ụmụ nwoke ibe ha mụbara n’obodo, nakwa mgbe a kwụsịziri ile nwoke idina nwoke ibe ya anya dị ka ihe arụ ma nwewe echiche dị iche banyere ihe bụ́ àgwà e ji mara nwoke n’ezie.”

IHE NDỊ A GA-ECHEBARA ECHICHE

▪ Gịnị mere Chineke ji katọọ mmadụ iso nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya enwe mmekọahụ?

▪ Gịnị ka ị pụrụ ime ma ọ bụrụ na ọ na-agụ gị agụụ iso nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị nwee mmekọahụ?

▪ Ònye ka ị pụrụ ịkọsara nsogbu gị ma ọ bụrụ na agụụ iso nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị nwee mmekọahụ na-agụ gị?

[Foto dị na peeji nke 20]

Gakwuru Onye Kraịst tozuru okè maka enyemaka