Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Omume Ọma Na-ala Ala n’Ụwa Nile

Omume Ọma Na-ala Ala n’Ụwa Nile

Omume Ọma Na-ala Ala n’Ụwa Nile

“AGHỤGHỌ juru ebe nile.” Ihe a ka David Callahan dere n’akwụkwọ ọhụrụ ya bụ́ The Cheating Culture. O dere banyere “aghụghọ ụmụ akwụkwọ sekọndrị na ndị nke mahadum na-aghọ,” “otú e si eji ụzọ iwu na-akwadoghị emepụtaghachi egwú ndị ọzọ kụrụ nakwa fim ndị ọzọ mepụtara,” “ohi a na-ezu n’ụlọ ọrụ,” “wayo ọjọọ a na-egwu n’ihe ndị metụtara ahụ́ ike,” otú ndị na-eme egwuregwu si eji ọgwụ ike eme ihe, nakwa ụdị ihe ọjọọ ndị ọzọ a na-eme na United States. O dekwara, sị: “A gụnyekwuo iwu nile ọzọ ndị mmadụ na-ada, ị ga-achọpụta na omume ọma na-ala n’ụzọ dị egwu.”

Akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times kwuru na oké ifufe ahụ kpara mkpamkpa na United States n’ọnwa August 2005, nke ndị Bekee kpọrọ Hurricane Katrina, “mere ka a hụ aghụghọ gọọmenti na-aghọ n’ụzọ ha si eleba ihe anya, mee ka e gwuo ụdị wayo na-enweghị atụ, meekwa ka a kpaa otu n’ime nkata aghụghọ ndị kasị ịtụnanya, n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-emetụbeghị ha n’oge anyị a.” Otu onye omeiwu nke mba United States kwuru, sị: “Otú e si saa anya mmiri gwuo wayo ahụ, otú e si kaa anya kpaa nkata aghụghọ ahụ, na otú ihe ndị a lara n’iyi na ya haruru, abụghị ihe e ji ọnụ ekwu.”

N’eziokwu, a ka nwere ndị na-eme ihe ọma n’achọghị ọdịmma nke ha. (Ọrụ 27:3; 28:2) Ma, anyị na-anụkarị ka ndị mmadụ na-ekwu, sị: “Olee uru ọ ga-abara m? Olee ihe m ga-erite na ya?” O yiri ka àgwà e jizi mara ụmụ mmadụ taa ọ̀ bụ àgwà nke ibu ụzọ na-achọ ọdịmma onwe onye.

E gosiwo na otu n’ime ihe ndị mere obodo ndị mepere anya n’oge ochie, dị ka Alaeze Ukwu Rom, ji daa bụ n’ihi omume rụrụ arụ ndị ha ji ịchọ ọdịmma onwe ha nanị na ịka anya wee mee. Ọ̀ ga-abụ na ihe na-eme ugbu a bụ ihe na-egosi na ihe kadị njọ ga-emesị mee? Ọ̀ ga-abụ na “ịba ụba nke mmebi iwu,” bụ́ nke Bible buru amụma na a ga-eji ama ọgwụgwụ usoro ihe a, ezuola ụwa ọnụ?—Matiu 24:3-8, 12-14; 2 Timoti 3:1-5.

Otú O Si Na-ala n’Ụwa Nile

Ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Africa News nke June 22, 2006, na-akọ banyere “nnọkọ ọmụmụ ihe a nọ na ya tụlee banyere ndina a na-edina ndị mmadụ n’ụzọ na-adịghị mma na nkiri a na-ekiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ” n’ógbè ndị ogbenye nke dị n’otu ebe na Uganda, o kwuru na “ihe mere ndị na-agba akwụna na ndị na-aṅụ ọgwụ ike ji na-amụba n’ógbè ahụ bụ n’ihi na ndị nne na nna adịghị elebara ụmụ ha anya.” Akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru, sị: “Maazị Dhabangi Salongo, bụ́ onye uwe ojii nọ n’isi ngalaba na-ahụ maka ichebe ụmụaka na ezinụlọ n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii dị na Kawempe, kwuru na mmegbu a na-emegbu ụmụaka na ihe ike a na-eme n’ezinụlọ amụbaala nke ukwuu.”

Dị ka otu dọkịta nọ n’India si kwuo, “obodo dị iche iche adịghịzi agbasocha omenala ha.” Otu onye na-eduzi fim n’obodo ahụ kwuru na “otú ọtụtụ mmadụ si na-aṅụ ọgwụ ike na otú ha si na-enwe mmekọahụ aghara aghara bụkwa ihe ọzọ na-egosi na obodo India na-anabatawanye ‘àgwà ọjọọ ndị e ji mara obodo ukwu ndị dị na Europe nakwa n’America.’”

Hu Peicheng, bụ́ odeakwụkwọ ukwu nke Òtù Na-ahụ Maka Ihe Ndị Metụtara Mmekọahụ n’obodo China kwuru, sị: “N’oge mbụ, anyị ma ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ n’obodo anyị. Ugbu a, anyị nwere ike ime ihe ọ bụla masịrị anyị.” Otu isiokwu e bipụtara na magazin bụ́ China Today si otú a kwuo ya: “Obodo dị iche iche anọgidela nnọọ na-anabata ịkwa iko nke ndị lụrụ di na nwunye.”

Akwụkwọ akụkọ bụ́ Yorkshire Post nke a na-ebipụta n’England kọrọ na nso nso a, sị: “O yiri ka onye ọ bụla ọ̀ na-agbazi ọtọ ma na-eji mmekọahụ ere ngwá ahịa ya. N’oge ndị nna anyị hà, a gaara ewere omume dị otú ahụ dị ka arụ. Ebe ọ bụla anyị chere ihu taa, anyị na-ahụ foto ma ọ bụ ihe nkiri ndị metụtara mmekọahụ, ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ . . . [abụrụkwala] ihe ọhaneze nabatara.” Akwụkwọ akụkọ ahụ kwukwara, sị: “Akwụkwọ na fim ndị e weere n’oge mbụ na ọ bụ nanị maka ndị dị site afọ 18 gbagowe, ka a na-emekarịzi maka onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ. Dịkwa ka ndị na-akatọ ngosi a na-egosi ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ si kwuo, ọ bụ ụmụaka ka a na-ejikarị maka ha emepụta ihe ndị ahụ.”

Akwụkwọ bụ́ The New York Times Magazine kwuru, sị: “[Ụfọdụ ndị dị afọ iri na ụma] adịghị ezo ọnụ ekwu banyere [ndị ha na ha nwere mmekọahụ] dị nnọọ ka ha na-agaghị esi ezo ọnụ mgbe ha na-ekwurịta banyere nri e siri n’ebe ha na-aga eri nri ehihie.” Otu magazin nke na-ekwu banyere otú ndị nne na nna ga-esi zụọ ụmụ ha ndị dị afọ 8 ruo 12, nke aha ya bụ Tweens News, kwuru, sị: “Otu nwatakịrị nwanyị ji aka akwụkwọ ụmụaka dee ihe a na-agbawa obi, sị: ‘Mama m na-amanye m ime enyi nwoke na iso ha na-enwe mmekọahụ. Adị m nanị afọ 12 . . . nyerenụ m aka!’”

Ụwa agbanweela nnọọ! Akwụkwọ akụkọ bụ́ Toronto Star nke a na-ebipụta na Canada kwuru na, n’oge na-adịbeghị anya, “mmadụ ichetụwadị n’echiche ịlụ nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya bụ ihe arụ.” Ma, Barbara Freemen, nke na-akụzi na Mahadum Carleton, nke dị n’Ottawa, Canada, kwuru, sị: “Ndị mmadụ na-ekwuzi, sị, ‘Ihe anyị ji ndụ anyị eme enweghị onye ọ gbasara. Anyị adịghị achọ ka ndị ọzọ na-etinye ọnụ na ya.’”

O doro anya na n’ime iri afọ ole na ole gara aga, omume ọma ejirila ọsọ laa n’ọtụtụ ebe n’ụwa nile. Gịnị kpatara ya? Olee otú ọ na-adị gị onwe gị? Gịnị ka mgbanwe ndị a na-egosi banyere ọdịnihu?