Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Bụrụ na I Kpebisiri Ike Ịba Ọgaranya—Olee Otú Ọ Pụrụ Isi Metụta Gị?

Ọ Bụrụ na I Kpebisiri Ike Ịba Ọgaranya—Olee Otú Ọ Pụrụ Isi Metụta Gị?

Ọ Bụrụ na I Kpebisiri Ike Ịba Ọgaranya—Olee Otú Ọ Pụrụ Isi Metụta Gị?

N’ỤWA nke agụụ na-akpa ihe karịrị narị nde mmadụ asatọ na nde iri ise ezé, ọ pụrụ isi ike ichetụ n’echiche na ọgaranya mmadụ bara pụrụ ịbụrụ ya nsogbu. Ma, ị̀ chọpụtara na akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ e hotara n’isiokwu bu nke a ụzọ adịghị adọ aka ná ntị megide inwe ego ma ọ bụ ịba ọgaranya, kama ọ bụ megide ịhụ ego n’anya na ikpebisi ike ịba ọgaranya? Gịnị na-eme mgbe ndị mmadụ tinyere ndụ ha nile n’ịchụ ego na ihe e ji ego azụta? Burugodị ụzọ tụlee mmetụta ọ na-enwe n’ebe ụmụ ha nọ.

Mmetụta Ọ Na-enwe n’Ebe Ụmụaka Nọ

A na-ekwu na nanị n’ime otu afọ, otu nwatakịrị nọ na United States na-ahụ ihe dị ka puku ngwa ahịa iri anọ a kpọsara na televishọn. Ọ bụrụ na a tụkwasịkwuo ya egwuregwu vidio, redio ndị bụ́ ọkpọka e ji akpọ egwu, kọmputa, na uwe ndị dara oké ọnụ e biri aha ụlọ ọrụ kwara ya, bụ́ ndị ụmụaka na-ahụ n’ụlọ ahịa nakwa n’ụlọ ndị enyi ha, ị ga-achọpụta na ihe ụmụaka ga na-arịọ ka ndị mụrụ ha meere ha karịrị akarị. Ụfọdụ ndị nne na nna na-emere ụmụ ha ihe ọ bụla ha rịọrọ. N’ihi gịnị?

Ebe ọ bụ na e meghịrị ụfọdụ ndị nne na nna ihe ụfọdụ ha rịọrọ mgbe ha ka dị obere, ha na-agbasi mbọ ike ịhụ na ụmụ ha agaghị etolite ma chewe na e meghịrị ha ihe ndị e kwesịrị imere ha mgbe ha dị obere. Ụfọdụ ndị nne na nna na-atụkwa ụjọ na ọ bụrụ na ha ekweghị emere ụmụ ha ihe ọ bụla ha rịọrọ, na ụmụ ha ga-akwụsị ịhụ ha n’anya. Otu onye so ná ndị isi nke otu òtù e guzobere n’obodo Boulder, nke dị na Colorado, U.S.A, nke ndị mejupụtara ya bụ ndị nne na nna na-akwadorịta ibe ha, kwuru, sị: “[Ndị nne na nna] na-achọ ịbụ ezigbo ndị enyi ụmụ ha ma hụ na ụmụ ha na-ekpori ndụ.” Ndị ọzọkwa bụ́ ndị nne na nna na-atụ anya na ọ bụrụ na ha ana-enye ụmụ ha onyinye n’esepụghị aka, na nke a ga-eme ka ụmụ ha ghara iweso ha iwe maka oge nile ha ji na-achụ ego, bụ́ nke ha kwesịrị iji soro ụmụ ha nọkọọ. Ọzọkwa, ọ pụrụ ịbụ na mgbe nne ma ọ bụ nna rụsicharala ọrụ ike ruo ogologo izu, ike agaghị adị ya iso nwa ya gbaghawa ihe nwa ya ga-ekwu ma ọ gwa ya na ya agaghị emere ya ihe ọ rịọrọ ya.

Ma, ajụjụ bụ, ndị nne na nna na-enye ụmụ ha ihe ọ bụla ha rịọrọ, hà na-enyere ha aka ka hà na-emebi ha emebi? Ọ bụ ihe na-eju anya na ahụmahụ ndị e nwetara na-egosi na kama ịhụkwu nne na nna ha n’anya, ụmụaka ndị a na-emere ihe ọ bụla ha rịọrọ na-aghọ ndị na-enweghị ekele. Ha adịghịdị eji ihe ahụ ha rịọsịrị arịrịọ ike ka e nye ha akpọrọ ihe ma e nye ha ya. Otu onyeisi ụlọ akwụkwọ sekọndrị kwuru, sị: “Achọpụtara m na mgbe e nyere ụmụaka ihe ha rịọrọ ozugbo, ha na-atụfukarị ya n’ime izu abụọ e nyesịrị ha ya.”

Mgbe ụmụaka ndị a na-emere ihe ọ bụla ha rịọrọ toruru ogo mmadụ, gịnị na-abụ ọnọdụ ha? Dị ka magazin bụ́ Newsweek si kwuo, nchọpụta ndị e mere na-egosi na ha na-aghọ ndị okenye “na-amaghị otú e si anagide ihe isi ike a na-enwe ná ndụ.” Ebe ọ bụ na a kụzighịrị ha ịrụsi ọrụ ike iji nweta ihe ha chọrọ, ọtụtụ n’ime ha adịghị eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ, n’ụlọ ọrụ, nakwa n’alụmdi na nwunye ha. E mesịakwa, ha anọgide na-adabere n’ebe ndị mụrụ ha nọ iji na-egbo mkpa ego ha. Ha pụkwara ịdị na-enwe nchekasị, ma daa mbà n’obi.

Ya mere, a sị ka e kwuwe ya, a dịghị egboro ụmụaka ndị a a na-emere ihe ọ bụla ha rịọrọ, ihe ndị bụ́ mkpa ha n’ezie. A na-anapụ ha ohere nke ịmata uru ọrụ bara, nke inwe ùgwù, nakwa nke ịbụ ndị afọ juru ná ndụ. Otu dọkịta aha ya bụ Jessie O’Neill dọrọ aka ná ntị, sị: “Ọ bụrụ na ị na-akụziri ụmụaka na ha pụrụ inweta ihe ọ bụla ha rịọrọ mgbe ọ bụla ha rịọrọ ya, ị na-akụziri ha ihe ga-eme ka ha tagbuo onwe ha n’ahụhụ ná ndụ.”

Olee Mmetụta Ọ Na-enwe n’Ebe Ndị Toro Eto Nọ?

Ọ bụrụ na ị lụọla di ma ọ bụ nwunye, magazin bụ́ Psychology Today kwuru na “n’agbanyeghị afọ ole unu lụrụla ma ọ bụ ego ole unu nwere, o yiri nnọọ ka esemokwu ọzọ unu ga-enwe ọ̀ ga-abụ n’ihi ego.” O kwukwara na “ihe di na nwunye na-eme mgbe ha nwere nghọtahie n’ihi ego nakwa mgbe ihe gbasara ego na-agaghị ka ha si chee ya, pụrụ ikpebi ma hà ga-alụte aka ka hà ga-emecha gbaa alụkwaghịm.” O doro anya na di na nwunye nke na-eji ego na ihe onwunwe akpọrọ ihe gabiga ókè na-etinye alụmdi na nwunye ha n’ihe ize ndụ. N’ezie, e kwuola na n’ime ndị di na nwunye iri ọ bụla gbara alụkwaghịm, ihe bụ́ isi seere itoolu n’ime ha okwu bụ ego.

Ọbụnadị mgbe di na nwunye na-agbaghị alụkwaghịm, ha pụrụ inwe nsogbu n’alụmdi na nwunye ha ma ọ bụrụ na ebe uche ha na-adị bụ nanị n’ego nakwa n’ihe ndị ha ji ego zụta. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịdịrị di na nwunye ji ụgwọ mfe inwe ahụ́ mgbakasị na iwe iwe ọkụ, onye nke ọ bụla ana-ata ibe ya ụta maka nsogbu ego ha na-enwe. N’ọnọdụ ọzọ, ọ pụrụ ịbụ na ma di ma nwunye na-etinye oge ya nile n’ịchụ ego nke ya nke na oge ha na-eji anọkọ dị ka di na nwunye anatụghị ehi nne. Gịnị na-eme mgbe di ma ọ bụ nwunye zụtara ihe dara ezigbo ọnụ ma zochiere ya onye nke ọzọ? Nke ahụ na-eme ka ha zowere ibe ha ihe ezo, nwewe obi amamikpe, gharakwa ịtụkwasị ibe ha obi—ihe a nile bụkwa ihe ndị na-etisa di na nwunye.

Mmadụ ole na ole torurula ogo mmadụ, ma ndị nke lụrụla di ma ọ bụ nwunye ma ndị nke na-alụbeghị, ewerela ndụ ha nile tinye n’ịchụ ego. Ụfọdụ ndị bi na South Africa anwaala igbu onwe ha n’ihi na ike ụwa agwụla ha ka ha na-adọga ibi ndụ oké ozu e ji mara mba ndị mepere emepe na Europe nakwa n’America. Na United States, otu nwoke gburu nwunye ya, gbuo nwa ya nwoke dị afọ iri na abụọ, gbuokwa onwe ya, ikekwe n’ihi nsogbu ego.

N’eziokwu, ọtụtụ mmadụ adịghị anwụ n’ihi ịchụ ego. Ma, ha pụrụ ibicha ndụ ha n’enwetaghị ezigbo obi ụtọ n’ihi ego ahụ ha tinyere ndụ ha n’ịchụ. Ọzọkwa, ndụ ha pụrụ ịnọ n’ihe ize ndụ ma ọ bụrụ na nchekasị ha na-enwe n’ihi ọrụ ha, ma ọ bụ n’ihi ego, akpatara ha nsogbu ndị dị ka obi mmapụ, ehighị ụra nke ọma, oké isi ọwụwa, ma ọ bụ ọnyá afọ—nke bụ́ nsogbu ahụ́ ike ndị pụrụ ime ka mmadụ nwụchuo ọnwụ. Ọ bụrụkwa na onye ahụ emesịa ghọta na ọ dị ya mkpa ime mgbanwe ma a bịa n’ihe ndị ọ na-achụso ná ndụ, ọ pụrụ ịbụ mgbe ihe mebicharala. Ikekwe, di ya ma ọ bụ nwunye ya akwụsịla ịtụkwasị ya obi, ụmụ ya ana-enwezi obi mgbawa, ma ọ bụkwanụ na ọ daala ọrịa n’ihi otú o si achụ ego. Ma eleghị anya, ọ pụrụ idozi ụfọdụ n’ime nsogbu ndị ahụ, ma ọ ga-achọ mgbalị dị ukwuu n’aka ya. N’ezie, ndị dị otú ahụ ejirila “ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha aghara aghara.”—1 Timoti 6:10.

Gịnị Ka Ị Chọrọ?

Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ chọrọ ka ezinụlọ ha na-enwe obi ụtọ, chọọkwa ezi ahụ́ ike, ezigbo ọrụ, na ego ga-ezuru ha ibi ndụ ntụsara ahụ́. Ka mmadụ wee nwee ike inweta ha anọ, ọ dị mkpa na ọ ga-edebe nke ọ bụla n’ọnọdụ kwesịrị ya. Ma, ọ bụrụ na ọ bụ n’ego ka obi mmadụ kasị dịrị, ọ gaghị enwe ike idebe nke ọ bụla n’ọnọdụ kwesịrị ya. Nye ọtụtụ ndị, inweta ihe anọ ahụ nwere ike ịpụta na ha ga-ekwe ịrụ ọrụ a ga na-akwụ ha ego dị ala, nweta ụlọ na-aharughị ka nke ha bi na ya ugbu a, gbawa ụgbọala na-adịrughị ọnụ ka nke ha na-agba ugbu a, ma gbadatakwuo n’ọkwá. Ma, ajụjụ bụ, mmadụ ole n’ime ha dị njikere ịhapụ ụdị ndụ oké ozu ahụ iji nwee ike inweta ihe ndị a ka ya mma? Otu nwanyị kwetara, sị, ‘Amaara m na ihe ndị a m na-achụ adịghị m mkpa, ma o sigburu onwe ya n’ike ịhapụ ha!’ Ndị ọzọ chọrọ ịhapụ ndụ oké ozu, ma ha achọghị ịbụ ndị mbụ ga-ahapụ ya.

Gịnị banyere gị? Ọ bụrụ na i nweela ike idebe ego na ihe onwunwe n’ọnọdụ kwesịrị ha, i kwesịrị ka a jaa gị mma. N’aka nke ọzọ, ị̀ na-agụ isiokwu a ọkụ ọkụ ugbu a n’ihi na ihe ị na-achụso ná ndụ adịtụghị ekwe gị nwee ohere? Ì so ná ndị ọ na-agụ agụụ ibelata akụnụba ha iji nwee ike inwe obi iru ala na ezi ahụ́ ike? Ọ bụrụ na i so, mee ihe ozugbo banyere ya tupu ego ị na-achụ akpaa mkpamkpa n’ezinụlọ gị. Igbe dị na peeji a tụrụ aro ụfọdụ banyere otú ị ga-esi ebido ya.

Mgbe e debere ihe onwunwe n’ọnọdụ kwesịrị ya, ahụ́ ga-adị onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ mma, obi eruokwa ha ala. Otú ọ dị, Ndị Kraịst nwere ihe ọzọ mere ha ga-eji debe ihe onwunwe n’ọnọdụ kwesịrị ya. Nke ahụ bụ na ha achọghị ka ihe onwunwe mebie adịm ná mma ha na Chineke. Olee otú ịhụ ihe onwunwe n’anya pụrụ isi mebiere mmadụ adịm ná mma ya na Chineke, oleekwa otú onye ahụ pụrụ isi mee ka nke a ghara ime? Isiokwu na-esonụ ga-akọwa ya.

[Ihe Odide Gbatụrụ Okpotokpo nke dị na peeji nke 27]

Ụmụaka ndị a na-emere ihe ọ bụla ha rịọrọ adịkebeghị enwe ekele, ọ naghịkwa ete aka ha atụfuo ihe ndị ahụ ha rịọtara

[Igbe/Foto dị na peeji nke 29]

Idebe Ego n’Ọnọdụ Kwesịrị Ya ná Ndụ

Ka mmadụ wee nwee ike ịkwụsịlata ịkpa ego, ọ dị mkpa na ọ ga-eme mkpebi siri ike na nhazi a kpachapụrụ anya mee. Ihe ndị na-esonụ bụ aro ndị nyeerela ụfọdụ ndị aka ime ya.

▪ TỤLEE ỌNỌDỤ GỊ. Olee ihe ndị ị pụrụ ịkwụsị ịzụ? Olee ihe ndị ị pụrụ ire ma ọ bụ tụfuo? Ọ̀ bụ akwụkwọ akụkọ? Ka ọ̀ bụ kaseti na disc egwu? Ka ọ̀ bụ ihe ndị na-adịchaghị mkpa ị na-azụ maka ụgbọala gị?

▪ JIRI NWAYỌỌ NWAYỌỌ MALITE IBI NDỤ DỊ MFE. Ya na-eme gị obi abụọ ka ọ̀ bụ gị biwe ndụ dị mfe ka ọ̀ bụ gị ebila, í cheghị na ọ ga-adị mma ma i jiri ọnwa isii ma ọ bụ otu afọ nwalee ya? Jirizie aka gị chọpụta ma oge nile ahụ i ji achụ ego na akụnụba ọ̀ na-eme ka i nwekwuo obi ụtọ—ka ọ̀ na-eme ka ị ghara inwecha obi ụtọ.

▪ HỤNỤ NA ỤMỤ UNU SO MGBE UNU NA-EKWURỊTA BANYERE EZINỤLỌ UNU IBIWEZI NDỤ DỊ MFE. Ha soro, o yiri ka hà ga-akwado ya, ọ gaghịkwa esiri unu oké ike ịjụ imere ha ihe ha rịọrọ mgbe ọ dị mkpa ka unu jụ.

▪ MARANỤ MA ÙNU GA NA-ENYE ỤMỤ UNU EGO MMACHI AKPA. Ma hà kpebiri ichekwa ego ahụ maka ihe ha chọrọ ịzụ ma hà kpebiri na ha agaghịzi azụ ya, ha ga-amụta inwe ndidi na iji ihe ha nwere kpọrọ ihe. Ha ga-amụtakwa otú e si eme mkpebi.

▪ MỤTA ỤZỌ NDỊ Ị GA-ESI NA-ECHEKWA EGO. Na-azụ ihe mgbe a na-ere ya ná mgbuka. Na-ahazi otú ị ga-esi na-emefu ego ahazi. Na-ewetulata aka n’ókè ị na-ejiru ígwè ọrụ ndị i nwere eme ihe. Na-agbazite akwụkwọ n’ọ́bá akwụkwọ, ma ọ bụ n’aka ndị mmadụ, kama ịzụ ha azụ.

▪ HỤ NA Ị NA-EME IHE I JI MAKA YA MALITE IBI NDỤ DỊ MFE. Cheta na ihe mere i ji kwụsịlata ịchụ ego abụghị nanị ka akụnụba gị wee belata, kama ọ bụ ka i wee nwee ike ilebara ihe ndị ka mkpa anya, dị ka ndị ezinụlọ na ndị enyi gị. Ị̀ na-eme ya?

[Foto dị na peeji nke 28]

Mmadụ ikpebisi ike ịba ọgaranya pụrụ ibutere ya na di ya ma ọ bụ nwunye ya nsogbu