Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Amamihe E Bu Pụta Ụwa Dị Nnọọ Ịtụnanya

Amamihe E Bu Pụta Ụwa Dị Nnọọ Ịtụnanya

Amamihe E Bu Pụta Ụwa Dị Nnọọ Ịtụnanya

“Isi n’otu mpaghara ụwa gaa ná mpaghara ụwa ọzọ biri bụ, ma eleghị anya, ihe kasị ịtụnanya ihe ndị e kere eke na-eme.”—AKWỤKWỌ BỤ́ COLLINS ATLAS OF BIRD MIGRATION.

NA December 9, 1967, otu onye ọkwọ ụgbọelu hụrụ ọbọgwụ 30 ka ha na-efega obodo Ireland. Nke a bụ ụdị ọbọgwụ ndị Bekee na-akpọ whooper swan. Ha na-efe nnọọ oké elu. Site n’ala ruo ebe ha na-efe n’elu dị puku mita asatọ na narị abụọ. Gịnị mere ha ji na-efe oké elu otú ahụ ruo ebe jụrụ nnọọ oyi ka friza? Otu ihe kpatara ya bụ iji zere oké ifufe na-ebu snow abịa, bụ́ nke na-efe n’okpuru ebe ọbọgwụ ndị a na-efe. Nke ọzọ bụ na ikuku na-eku n’elu ebe ahụ ha na-efe na-enye aka ebu ha, nke na ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba ọsọ ha na-eru ihe dị ka narị kilomita abụọ n’ime otu awa. A na-ekwu na ọbọgwụ ndị ahụ ji nanị ihe dị ka awa asaa si obodo Iceland feruo obodo Ireland, bụ́ nke dị otu puku kilomita na narị atọ.

Nnụnụ a kasị mara amara n’ụwa dị ka nnụnụ na-esi n’otu mpaghara ụwa aga ná mpaghara ụwa ọzọ biri—ya bụ, nnụnụ ndị Bekee na-akpọ arctic tern—na-anọkarị n’ebe mgbago mgbago ụwa amụ ụmụ. Ma, n’oge e nwere oké oyi n’ebe mgbago mgbago ụwa, ha na-efega n’ebe ndịda ndịda ụwa gaa biri. N’ime otu afọ, obere nnụnụ a na-efe ihe dị ka iri puku kilomita anọ ma ọ bụ iri puku kilomita ise—bụ́ nke há ka ịgba ụwa gburugburu!

Nnụnụ a na-akpọ ụgbala ọcha na-anọkarị n’Ebe Ugwu Europe amụ ụmụ, ma n’oge oyi, ha na-efega obodo South Africa gaa biri. Site n’Ebe Ugwu Europe ahụ ruo obodo South Africa a dị iri puku kilomita abụọ na puku anọ. Ọtụtụ puku nnụnụ ndị a na-esi n’obodo Izrel efefe n’oge mgbụsị akwụkwọ na n’oge opupu ihe ubi. Ha na-agbaso usoro ọgụgụ oge a maara n’oge Bible.—Jeremaịa 8:7.

Ònye nyere ha amamihe a? Ihe dị ka puku afọ atọ na narị ise gara aga, Chineke jụrụ onye ezi omume bụ́ Job ajụjụ ndị a: “Ọ̀ bụ site ná nghọta gị ka égbé na-efego n’elu, gbasaakwa nku ya n’ebe ndịda dị? Ọ̀ bụ n’okwu ọnụ gị ka ugo na-efeli elu, ma ọ bụ mee akwụ́ ya ka ọ dị elu?” Ka Job na-aza ajụjụ ndị ahụ, o toro Jehova n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’ihi ikike dị ịtụnanya nnụnụ na anụmanụ ndị ọzọ nwere.—Job 39:26, 27; 42:2.

Ihe Ka Amamihe E Bu Pụta Ụwa Mma

Ọ bụghị amamihe e bu pụta ụwa bụ isi ihe na-eduzi ụmụ mmadụ, nke bụ́ ihe kasị mma Chineke kere n’ụwa. Kama nke ahụ, ụmụ mmadụ nwere ikike ime nhọrọ, nwee akọnuche, nweekwa ikike nke inwe ịhụnanya. (Jenesis 1:27; 1 Jọn 4:8) N’ihi onyinye ndị a nile, anyị pụrụ ime mkpebi ndị dị mma, bụ́ ndị na-egosi mgbe ụfọdụ na anyị nwere ụdị ịhụnanya pụrụ iche ma dịrị njikere ijere ndị ọzọ ozi.

N’ezie, ihe na-ekpebikarị ụdị àgwà mmadụ ga na-akpa bụ ụkpụrụ omume na nkwenkwe okpukpe ndị a kụziiri ya, ma ọ bụ ndị a na-akụzighịrị ya, mgbe ọ ka bụ nwata. N’ihi ya, ihe otu onye weere na ọ dị mma nwere ike ịdị njọ n’anya onye ọzọ, ihe otu onye nabatara, onye ọzọ nwere ike ịjụ ịnabata ya. Ọdịiche a e nwere n’ụzọ ndị mmadụ si ele ihe anya nwere ike ibute nghọtahie, ekweghị ibe nọrọ, na ọbụna ịkpọasị, karịsịa ma ọ bụrụ na ihe ndị dị ka omenala, ịhụ mba n’anya, na okpukpe so na-akpata ha.

Leenụ otú ụwa gaara esi ka nnọọ mma ma a sị na mmadụ nile nọ n’ụwa na-agbaso otu ụkpụrụ n’ihe banyere omume, bụ́kwa nke dabeere na Bible, dị nnọọ ka anyị nile na-agbaso otu iwu sitere n’okike nke na-achịkwa mbara ụwa! Ma, ajụjụ bụ, ọ̀ dị onye nwere ikike na amamihe zuru ezu iji setịpụ ụkpụrụ mmadụ nile nọ n’ụwa ga na-agbaso? Ọ bụrụ na e nwere, onye ahụ ọ̀ ga-esetịpụ ya, ka ò setịpụla ya esetịpụ? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.