Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Hà Dịruru Afọ Ole ahụ n’Eziokwu?

Hà Dịruru Afọ Ole ahụ n’Eziokwu?

Hà Dịruru Afọ Ole ahụ n’Eziokwu?

Dị ka Bible si kwuo, Adam biri ndụ ruo narị afọ itoolu na afọ iri atọ, Set ebie ndụ ruo narị afọ itoolu na afọ iri na abụọ, Metusela ebiekwa ndụ ruo narị afọ itoolu na iri afọ isii na itoolu—nke bụ́ na ọ fọrọ nanị afọ 31 ka Metusela dịruo otu puku afọ! (Jenesis 5:5, 8, 27) Ọ̀ bụ otú afọ nke anyị hà n’ogologo ka afọ nke ha hà, ka ụbọchị ndị mejupụtara afọ nke ha ọ̀ dị ala karịa nke anyị, ikekwe hara ka otu ọnwa anyị, dị ka ụfọdụ ndị kwurula?

Ihe àmà ndị e nwere na Bible na-egosi na afọ ndị ahụ bụ afọ nkịtị ndị há ka nke anyị n’ogologo. Chegodị echiche: A sị na afọ nke ha hà ka nanị otu ọnwa anyị n’ogologo, mmadụ ndị dị ka Kenan, Mahalalel, na Ịnọk gaara amụta ụmụ mgbe ha ka dị nnọọ obere: Kenan gaara amụta nwa tupu ya eruo afọ isii, Mahalalel na Ịnọk gaara amụta nke ha mgbe ha ji obere ihe gafee afọ ise.—Jenesis 5:12, 15, 21.

Ọzọkwa, a bịa n’otú ndị oge gboo si agụ oge, ha nwere ụbọchị, nwee ọnwa, nweekwa afọ. (Jenesis 1:14-16; 8:13) N’eziokwu, otú e si kọọ akụkọ usoro ọmụmụ Noa n’ụzọ zuru nnọọ ezu na-enyere anyị aka ịmata ụbọchị ole dị n’otu ọnwa. Ọ bụrụ na i jiri Jenesis 7:11, 24 tụlee Jenesis 8:3, 4, ị ga-ahụ na ọnwa ise—malite n’ụbọchị nke 17 nke ọnwa nke abụọ ruo n’ụbọchị nke 17 nke ọnwa nke asaa—nwere otu narị ụbọchị na iri ise. Ya bụrụ otú ahụ, o doro anya na Noa weere ụbọchị 30 dị ka otu ọnwa, a gụkọta ọnwa 12 ya abụrụ otu afọ.—Jenesis 8:5-13. *

Ma olee otú mmadụ ga-esi bie ndụ ruo narị afọ itoolu ma ọ bụ karịa? Bible na-agwa anyị na Chineke kere mmadụ ibi ndụ ruo mgbe ebighị ebi, nakwa na ọ bụ mmehie Adam kpatara ezughị okè, ọ bụkwa ya mere mmadụ ji anwụ anwụ. (Jenesis 2:17; 3:17-19; Ndị Rom 5:12) Ezughị okè akpawabeghị ike n’ahụ́ ndị biri ndụ tupu Iju Mmiri ahụ otú o si na-akpa ike n’ahụ́ anyị taa, obi abụọ adịghịkwa ya na nke a bụ otu n’ime ihe ndị bụ́ isi mere ha ji bie ogologo ndụ. Dị ka ihe atụ, Metusela biri ndụ n’ọgbọ nke asaa site n’Adam.—Luk 3:37, 38.

Otú ọ dị, n’isi nso, Jehova Chineke ga-ewepụcha ihe nile mmehie Adam kpatara n’ahụ́ ndị nile nwere okwukwe n’ọbara Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst. “Ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ, ma onyinye nke Chineke na-enye bụ ndụ ebighị ebi site na Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.” (Ndị Rom 6:23) N’eziokwu, oge na-abịa mgbe narị afọ itoolu na iri afọ isii na itoolu Metusela biri ndụ ga-adị nnọọ obere n’anya!

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 4 Lee Insight on the Scriptures (Bekee), Mpịakọta nke 2, peeji nke 1214, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Ihe e sere na peeji nke 24]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

1000

Metusela

Adam

Set

900

 

 

 

800

 

 

 

700

 

 

 

600

 

 

 

500

 

 

 

400

 

 

 

300

 

 

 

200

 

 

 

100

Afọ ndụ mmadụ taa