Ihe Ọ̀ Ga-adabara Mụ na Onye A Ma Anyị Lụọ?
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Ihe Ọ̀ Ga-adabara Mụ na Onye A Ma Anyị Lụọ?
Wepụta oge zaa ajụjụ ndị a na-esonụ:
Olee àgwà ndị i lere anya ugbu a dị ka ndị kasị mkpa ị ga-achọ ka onye ị ga-alụ nwee? N’ime ihe ndị e depụtara n’okpuru ebe a, kanye ✔ n’ihu àgwà anọ i chere na ọ bụ ha kasị mkpa.
․․․․․ onye mara mma
․․․․․ onye ji ofufe Chineke kpọrọ ihe
․․․․․ onye ya na ndị ọzọ
․․․․․ onye a pụrụ ịtụkwasị obi na-adịkarị ná mma
․․․․․ onye a ma ama
․․․․․ onye omume ya dị ọcha
․․․․․ onye na-akpa ndị
․․․․․ onye nwere ihe mgbaru ọsọ ná ndụ mmadụ ọchị
Mgbe ị na-etorubeghị otú ị ha ugbu a, ò nwetụla onye ị na-adị anwụrụ? N’ihe ndị e depụtara n’elu, kanye X n’ihu otu àgwà kasị masị gị banyere onye ahụ n’oge ahụ.
O nweghị ihe ọjọọ dị na ya ma mmadụ nwee nke ọ bụla n’ime àgwà ndị ahụ e depụtara n’elu. Nke ọ bụla n’ime ha nwere uru ọ bara. Ma, ọ̀ bụ na i kweghị na ọ bụrụ na i nwere onye ị na-anwụrụ mgbe ị ka na-eto eto, ebe anya gị ga na-aga bụ n’àgwà ndị a na-achọpụtakarị ngwa ngwa, dị ka ndị ahụ e depụtara n’akụkụ aka ekpe nke igbe ahụ?
Ma, ka ị na-eto, ị malitere iji ikike nghọta gị nyochawa ihe ndị ọzọ ka mkpa, dị ka ihe ndị ahụ e dere n’akụkụ aka nri nke igbe ahụ. Dị ka ihe atụ, ị bịara ghọta na nwa agbọghọ ahụ kasị maa mma n’obodo unu nwere ike ghara ịbụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi, ma ọ bụkwanụ na nwa okoro ahụ a kasị mara amara na klas unu abụghị ya kasị akpa àgwà ọma. Ọ bụrụ na ị gafee oge “ntoju ntorobịa”—ya bụ, mgbe agụụ inwe mmekọahụ kasị agụ mmadụ—o yiri nnọọ ka ị̀ ga-amalite ịhụ àgwà ndị ọzọ na-abụghị nanị ndị ahụ a na-achọpụtakarị ngwa ngwa, iji nwee ike ịza ajụjụ ahụ bụ́, Ihe ọ̀ ga-adabara mụ na onye a ma anyị lụọ?—1 Ndị Kọrint 7:36.
Ọ̀ Bụ Onye Ọ Bụla Ka Ihe Ga-adabara Mụ na Ya?
Ruo oge ụfọdụ, ọtụtụ n’ime ụmụ nwoke ma ọ bụ ụmụ nwanyị ị hụrụ ga na-adọrọcha mmasị gị. Ma, ọ bụghị onye ọ bụla ka ihe ga-adabara gị na ya. A sị ka e kwuwe ya, onye ị chọrọ bụ onye gị na ya ga-ebi ruo ogologo ndụ unu, onye ga-enyere gị aka ime ka àgwà ọma gị pụtakwuo ìhè, nakwa onye ị ga-enyere aka ime otu ihe ahụ. (Matiu 19:4-6) Ònyekwanụ ka ọ ga-abụ? Tupu gị enwee ike ịza ajụjụ ahụ, ọ dị mkpa ka i ‘lee onwe gị n’enyo,’ dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ma jiri obi ọcha leruo onwe gị anya.—Jems 1:23-25.
Iji matakwuo ụdị onye ị bụ, zaa ajụjụ ndị na-esonụ:
Olee ihe ndị m ga-emeli?
․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․
․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․
Olee ihe ndị m na-agaghị emeli?
․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․
․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․
Olee ihe ndị na-akpa m ma a bịa n’ihe ndị metụtara ofufe Chineke, oleekwa ihe ndị na-eme ka obi dị m mma ma ọ bụ jọọ m njọ?
․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․
․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․
Gị onwe gị ịmata ụdị onye ị bụ abụghị obere ihe, ma ajụjụ ndị dị ka ndị ahụ nwere ike inyere gị aka ịmata ụdị onye ị bụ. * Ka ị na-amatakwu ụdị onye ị bụ, ị ga-abịa dịkwuo njikere ịchọta onye ga-eme ka ebe ndị ị na-eme nke ọma ka mma, ọ bụghị onye ga-eme ka ebe ndị ị na-adịchaghị eme nke ọma ka njọ. Ma, gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ọ dị gị ka ị̀ chọtala onye ihe ga-adabara gị na ya?
Ihe Ọ̀ Ga-adabakwara Anyị?
Iji zaa ajụjụ ahụ, jiri obi ọcha leruo onye ahụ ihe ya na-amasị gị anya. Ma, kpacharakwa anya! I nwere ike ịhụ nanị ihe ị chọrọ ịhụ. Ya mere, jiri nwayọọ leruo ya anya. Gbalịa ịchọpụta kpọmkwem ụdị onye enyi gị ahụ bụ.
Ọtụtụ ndị na-achọ ndị ha ga-alụ anaghị eleru anya ala. Kama nke ahụ, ihe ndị ha na-achọ ịhụ bụ ihe ndị na-amasịkarị ha abụọ. Echiche ha ga na-abụ: ‘Ụdị egwu na-amasị m bụ ya na-amasị ya.’ ‘Ihe ndị m na-enwe mmasị ime ka ọ na-enwe mmasị ime.’ ‘Anyị na-ekwekọrịta n’ihe nile!’ Ma, dị ka anyị kwuru n’elu, ọ bụrụ na ị gafeela ntoju ntorobịa n’eziokwu, anya gị agaghịzi adị na-aga nanị n’àgwà ndị a na-achọpụtakarị ngwa ngwa. Ọ dị gị mkpa ịghọta “mmadụ zoro ezo nke obi” onye ahụ.—1 Pita 3:4; Ndị Efesọs 3:16.
Dị ka ihe atụ, kama ilekwasị anya n’ihe ndị unu na-ekwekọrịta na ha, ị pụrụ ịghọtakwu ụdị onye ọ bụ ma e nwee ihe ndị unu na-ekwekọrịtaghị na ha. Ikwu ya Ndị Galeshia 5:19, 20; Ndị Kọlọsi 3:8) Ka ọ̀ na-eji ezi uche eme ihe—dịrị njikere ikweta n’ihe i kwuru ka udo wee dị ma ọ bụrụhaala na o nweghị ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ a ga-emebi?—Jems 3:17.
n’ụzọ ọzọ, olee otú onye ahụ si eme ma e nwee ihe ndị unu na-ekwekọrịtaghị na ha? Ọ̀ na-esi ọnwụ na a ga-agbasorịrị echiche ya, ikekwe na-ewe “iwe ọkụ” ma ọ bụ na-ekwu “okwu mkparị”? (Ihe ọzọ i kwesịrị ịtụle bụ: Ọ̀ bụ onye na-achọkarị ka okwu bie n’ọnụ ya, onye na-esi ọnwụ na a ga-emerịrị ihe o kwuru, ma ọ bụ onye ekworo? Ọ̀ na-achọ ịmata ihe nile ị na-eme? Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Nicole kwuru, sị, “Ọ bụrụ na ọ na-achọkarị ka ọ bụrụ nanị ya ka ị ga na-agwa okwu, na-ekwokwa ekworo ma ị gwa onye ọzọ okwu, mara na nsogbu dị. Ana m anụ akụkọ banyere ndị na-ekwu okwu ọlụlụ ma ihe na-esekarịrị ha abụrụ na otu onye n’ime ha adịghị akpọ onye nke ọzọ na fon mgbe nile iji kọọrọ ya ebe ọ nọ na ihe ọ na-eme—echere m na nke ahụ bụ ihe na-egosi na agwọ nọ n’akịrịka.”
Olee otú ndị ọzọ si ele onye ahụ ị na-anwụrụ anya? I nwere ike ịjụ ndị maara ya nke ọma ajụjụ, dị ka ndị torurula ogo mmadụ nọ n’ọgbakọ ya. Ha ga-eme ka ị mara ma à na-akọ “akụkọ ọma banyere ya.”—Ọrụ 16:1, 2. *
Ì Kwesịrị Ịhapụ Onye Ahụ?
Gịnị ka ị ga-eme ma ị chọpụta na ihe agaghị adabara gị na onye ahụ ma unu lụọ? Ya dị otú ahụ, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ma ị hapụ ya. Bible na-ekwu, sị: “Onye nwere ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya: ma ndị na-enweghị uche agabigawo, e wee rie ha nha.”—Ilu 22:3. *
Ka oge na-aga, i nwere ike inweta onye ọzọ. Obi abụọ adịghị ya na ọ bụrụ na i nweta onye ọzọ, ị ga-ejikwu nnọọ nlezianya mee ihe dị ka onye nwerela ahụmahụ na ya. Ikekwe, n’oge ahụ, ị ga-azazi ee! n’ajụjụ ahụ bụ́, “Ihe ọ̀ ga-adabara mụ na onye a ma anyị lụọ?”
Ị pụrụ ịhụ isiokwu ndị ọzọ dị n’usoro isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . ” n’ebe a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet nke adres ya bụ www.watchtower.org/ype
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji nke]
^ par. 28 Iji hụkwuo ajụjụ ndị ị ga-ajụ onwe gị, lee peeji nke 18 nke Teta! January–March 2007.
^ par. 34 Leekwa ajụjụ ndị dị n’igbe dị na peeji nke 19-20.
^ par. 36 Ị chọọ ịgụkwu banyere otú mmadụ nwere ike isi hapụ onye ya na ya na-akpabu, lee peeji nke 12-14 nke Teta! April 8, 2001.
IHE NDỊ A GA-ECHEBARA ECHICHE
▪ Olee àgwà ọma ndị i nwere, bụ́ ndị ga-eme ka ị bụrụ ezigbo di ma ọ bụ nwunye?
▪ Olee ụfọdụ n’ime àgwà ndị ị ga-achọ ka onye ga-abụ di gị ma ọ bụ nwunye gị nwee?
▪ Olee ụzọ ndị ị pụrụ isi matakwuo àgwà, omume, na otú ndị mmadụ si ele onye ị chọrọ ịlụ anya?
[Igbe dị na peeji nke 19]
Ọ̀ ga-abụ ezigbo di?
IHE NDỊ BỤ́ ISI
❑ Olee otú o si eji ikike ọ bụla o nwere eme ihe?—Matiu 20:25, 26.
❑ Gịnị bụ ihe mgbaru ọsọ ya?—1 Timoti 4:15.
❑ Ọ̀ na-agba mbọ ugbu a iru ihe mgbaru ọsọ ndị ahụ?—1 Ndị Kọrint 9:26, 27.
❑ Olee ndị bụ́ ndị enyi ya?—Ilu 13:20.
❑ Olee otú ya na ego si aga?—Ndị Hibru 13:5, 6.
❑ Olee ụdị ntụrụndụ na-amasịkarị ya?—Abụ Ọma 97:10.
❑ Gịnị ka ejiji ya na-ekwu banyere ya?—2 Ndị Kọrint 6:3.
❑ Olee otú o si egosi na ya hụrụ Jehova n’anya?—1 Jọn 5:3.
ÀGWÀ YA
❑ Ọ̀ dị ike ọrụ?—Ilu 6:9-11.
❑ Ọ̀ ma ka e si eji ego?—Luk 14:28.
❑ À na-ekwu okwu ọma banyere ya?—Ọrụ 16:1, 2.
❑ Ọ̀ na-asọpụrụ ndị mụrụ ya?—Ọpụpụ 20:12.
❑ Ọ̀ na-echebara ndị ọzọ echiche?—Ndị Filipaị 2:4.
IHE NDỊ NA-EGOSI NA AGWỌ NỌ N’AKỊRỊKA
❑ Ọ̀ na-ewekarị iwe ọkụ?—Ilu 22:24.
❑ Ọ̀ na-adị anwa ime ka gị na ya nwee mmekọahụ rụrụ arụ?—Ndị Galeshia 5:19.
❑ Ọ̀ na-alụkarị ọgụ ma ọ bụ na-ekwukarị okwu mkparị?—Ndị Efesọs 4:31.
❑ Ọ̀ bụ iwu na ọ ga-aṅụ mmanya na-aba n’anya tupu ya ewere na ya na-ekpori ndụ?—Ilu 20:1.
❑ Ọ̀ bụ onye ekworo na onye na-achọ ọdịmma onwe ya nanị?—1 Ndị Kọrint 13:4, 5.
[Igbe dị na peeji nke 20]
Ọ̀ ga-abụ ezigbo nwunye?
IHE NDỊ BỤ́ ISI
❑ Olee otú o si egosi na ya na-edo onwe ya n’okpuru n’ime ezinụlọ nakwa n’ọgbakọ?—Ndị Efesọs 5:21, 22.
❑ Gịnị ka ejiji ya na-ekwu banyere ya?—1 Pita 3:3, 4.
❑ Olee ndị bụ́ ndị enyi ya?—Ilu 13:20.
❑ Olee otú ya na ego si aga?—1 Jọn 2:15-17.
❑ Gịnị bụ ihe mgbaru ọsọ ya?—1 Timoti 4:15.
❑ Ọ̀ na-agba mbọ ugbu a iru ihe mgbaru ọsọ ndị ahụ?—1 Ndị Kọrint 9:26, 27.
❑ Olee ụdị ntụrụndụ na-amasịkarị ya?—Abụ Ọma 97:10.
❑ Olee otú o si egosi na ọ hụrụ Jehova n’anya?—1 Jọn 5:3.
ÀGWÀ YA
❑ Ọ̀ dị ike ọrụ?—Ilu 31:17, 19, 21, 22, 27.
❑ Ọ̀ ma ka e si eji ego?—Ilu 31:16, 18.
❑ À na-ekwu okwu ọma banyere ya?—Rut 4:11.
❑ Ọ̀ na-asọpụrụ ndị mụrụ ya?—Ọpụpụ 20:12.
❑ Ọ̀ na-echebara ndị ọzọ echiche?—Ilu 31:20.
IHE NDỊ NA-EGOSI NA AGWỌ NỌ N’AKỊRỊKA
❑ Ọ̀ na-esekarị okwu?—Ilu 21:19.
❑ Ọ̀ na-adị anwa ime ka gị na ya nwee mmekọahụ rụrụ arụ?—Ndị Galeshia 5:19.
❑ Ọ̀ na-alụkarị ọgụ ma ọ bụ na-ekwukarị okwu mkparị?—Ndị Efesọs 4:31.
❑ Ọ̀ bụ iwu na ọ ga-aṅụ mmanya na-aba n’anya tupu ya ewere na ya na-ekpori ndụ?—Ilu 20:1.
❑ Ọ̀ bụ onye ekworo na onye na-achọ ọdịmma onwe ya nanị?—1 Ndị Kọrint 13:4, 5.