Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Na-eme ná Ndụ Gị Hà Si n’Akara Aka?

Ihe Ndị Na-eme ná Ndụ Gị Hà Si n’Akara Aka?

Echiche nke Bible

Ihe Ndị Na-eme ná Ndụ Gị Hà Si n’Akara Aka?

N’otu ụtụtụ, ụmụ nwoke abụọ ji gwongworo na-aga ọrụ ma kpebie isi n’ụzọ gara ebe otu n’ime ha bibu, n’ihi na ọ ka nso. Ka ha na-aga, ha hụrụ ọkụ si na windo nke otu ụlọ na-apụta. Ha kwụsịrị gwongworo ha ma jiri ubube ha ji rịgoro n’ụlọ ahụ ma kupụta otu nne na ụmụ ya ise. Ka otu akwụkwọ akụkọ na-akọ banyere ihe ahụ merenụ, o kwuru, sị: “Ikekwe, o si n’akara aka ha.”

ỌTỤTỤ mmadụ kweere na e nwere onye ike ya karịrị nke ha, nke na-ekpebi ihe ọ bụla na-eme ha, ma ihe ọma ma ihe ọjọọ. Dị ka ihe atụ, John Calvin nke biri ndụ n’ihe dị ka narị afọ ise gara aga, bụ́ onye a ma ama maka ihe ndị ọ gbanwere n’ụwa, dere, sị: “Anyị na-akọwa akara aka dị ka ndokwa na-adịru mgbe ebighị ebi nke Chineke mere, bụ́ nke ọ nọ na ya kpebie ihe ọ chọrọ iji mmadụ ọ bụla mee. O keghị ha nile ịnọ n’otu ọnọdụ, kama tupu a mụọ mmadụ ọ bụla, o kpebielarị ndị ga-adị ndụ ebighị ebi na ndị ga-anwụ ọnwụ ebighị ebi.”

Ọ̀ bụ eziokwu na Chineke ekpebielarị otú anyị ga-esi eme omume na ihe ga-esi n’omume anyị apụta? Gịnị ka Bible na-akụzi?

Ihe Mere Ndị Mmadụ Ji Chee na Amamihe Dị n’Ozizi Akara Aka

Echiche nke ụfọdụ ndị kweere n’akara aka na-enwe bụ: Chineke maara ihe nile. Ọ maara ọbụna ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Ọ maara ihe onye ọ bụla ga-eji ndụ ya mee, ọ makwaara kpọmkwem oge na otú mmadụ ọ bụla ga-esi anwụ. Ya mere, dị ka ha si eche ya, mgbe mmadụ chọrọ ikpebi ihe ọ ga-eme, mkpebi ya enweghị ike ịdị iche n’ihe Chineke kpebirila na ọ ga-eme mgbe ahụ; ma ọ́ dịghị otú ahụ, ọ pụtara na Chineke amaghị ihe nile. Ọ̀ dị gị ka amamihe ọ dị n’echiche a? Ka anyị tụlee ihe ọ pụtara ma a sị na echiche a bụ eziokwu.

Ọ bụrụ na ọ dị onye nwere ike karịrị nke gị, nke kpebirila ihe ọdịnihu gị ga-abụ, ọ pụtara na ọ baghịziri gị uru ịdị na-akpachapụ anya mgbe ị na-eme ihe. Ọ sọ gị sewe siga, ọ sọ gị esela ya, ọ dịghị mmetụta ọ bụla ọ ga-enwe n’ahụ́ gị ma ọ bụ n’ahụ́ ụmụ gị. Ọ sọ gị yiri belt na-adị n’oche ụgbọala nke ndị Bekee na-akpọ seat belt n’oge ị nọ n’ụgbọala, ọ sọ gị eyila ya, ọ dịghị mmetụta ọ bụla ọ ga-enwe n’ahụ́ gị ma e nwee ihe ọghọm. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na amamihe adịghị n’echiche a. Nnyocha ndị e mere gosiri na ndị na-akpachapụ anya adịkebeghị anwụ ma ọdachi ndị nwere ike igbu mmadụ mee. Ọdachi pụrụ ịdakwasị mmadụ n’ihi na ọ kpachapụghị anya mgbe ọ na-eme ihe.

Tụlee ihe ọzọ mere na amamihe adịghị n’ozizi akara aka. Ọ bụrụ na Chineke họọrọ ịma ihe nile ga-eme tupu ha emee, ọ pụtara na tupu o kewedị Adam na Iv, o kwesịrịnụ ịma na ha ga-enupụrụ ya isi. Ma, mgbe Chineke gwara Adam ka ọ ghara iri mkpụrụ sitere “n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ” nakwa na ha rie ya, ha ga-anwụ, Chineke ọ̀ dịla mbụ mara na Adam ga-eri ya? (Jenesis 2:16, 17) Mgbe Chineke gwara di na nwunye mbụ ahụ, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe unu; nweekwanụ ike n’ahụ́ azụ̀ nke oké osimiri, na n’ahụ́ anụ ufe nke eluigwe, na n’ahụ́ anụ nile ọ bụla dị ndụ nke na-akpụ akpụ n’elu ụwa,” ọ̀ dịla mbụ mara na olileanya magburu onwe ya ha nwere ibi na paradaịs ruo mgbe ebighị ebi, agaghị enwe isi? Mbanụ.—Jenesis 1:28.

A sị ka e kwuo ya hoo haa, echiche bụ́ na Chineke dị mbụ mara mkpebi nile ụmụ mmadụ na-eme tupu ha emewe ya na-egosi na ọ bụ ya kpatara ihe nile na-emenụ—nke gụnyere agha, ikpe na-ezighị ezi, na nhụsianya. Nke ahụ ò kwere omume? Ihe Chineke kwuru banyere onwe ya zara ajụjụ a otú doro anya.

“Gị Họrọkwa”

Akwụkwọ Nsọ kwuru na “Chineke bụ ịhụnanya” nakwa na ọ “na-ahụ ezi ikpe n’anya.” Ọ dịla anya ọ gbawara ndị ya ume, sị: “Kpọọnụ ihe ọjọọ asị, hụnụ ezi ihe n’anya.” (1 Jọn 4:8; Abụ Ọma 37:28; Emọs 5:15) Ọ gbara ndị ya na-ekwesị ntụkwasị obi ume ọtụtụ mgbe ka ha họrọ ibi ndụ dị mma. Dị ka ihe atụ, mgbe Jehova na ụmụ Izrel oge ochie gbachara ndụ, o si n’ọnụ Mozis gwa ha, sị: “Emewo m ka eluigwe na ala gbaa àmà megide unu taa, na ọ bụ ndụ na ọnwụ, ngọzi ahụ na nkọcha ahụ, ka m tinyeworo n’ihu gị: gị họrọkwa ndụ, ka i wee dị ndụ, gị na mkpụrụ gị.” (Deuterọnọmi 30:19) Chineke ọ̀ dịla mbụ kpebie ihe onye ọ bụla n’ime ụmụ Izrel oge ochie ahụ ga-ahọrọ tupu ya agwawa ha okwu ahụ? O doro anya na o meghị otú ahụ.

Jọshụa, bụ́ onye ndú nke ndị Chineke n’oge ochie, gbara ndị obodo ya ume, sị: “Họpụtaranụ onwe unu taa onye unu ga-efe ofufe . . . Ma mụ onwe m na ụlọ m, anyị ga-efe Jehova ofufe.” (Joshua 24:15) N’otu aka ahụkwa, onye amụma Chineke bụ́ Jeremaịa kwuru, sị: “Biko, gee ntị olu Jehova, n’ihe nke mụ onwe m na-agwa gị, o wee dịrị gị mma, mkpụrụ obi gị ga-adịkwa ndụ.” (Jeremaịa 38:20) Chineke nke na-ahụ n’anya ma na-ekpe ikpe ziri ezi ọ̀ ga-agba ndị mmadụ ume ka ha na-eme ihe ziri ezi iji nweta ụgwọ ọrụ maka ya mgbe ọ maara na ya ekpebiela na ha ga-akụrịrị afọ n’ala? Mbanụ. Agbamume dị otú ahụ ga-abụzi nke ihu abụọ.

Ya mere, mgbe ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ mere gị, o meghị gị n’ihi na e kpebiela na ọ bụ otú ahụ ka ọ ga-adịrịrị. Ọtụtụ mgbe, ‘ihe ndapụta’ na-adabara mmadụ n’agbanyeghị ụdị mkpebi onye ahụ mere—ma ọ̀ bụ nke amamihe dị na ya ma ọ̀ bụ na ọ bụghị. (Eklisiastis 9:11) Mbanụ, e kpebighị ihe ọdịnihu gị ga-abụ tupu a mụọ gị, ọ bụkwa ihe i kpebiri iji ndụ gị mee ga-ekpebi ihe ọdịnihu gị ga-abụ ruo mgbe ebighị ebi.

GỊNỊ KA I CHERE?

▪ Tupu Chineke ekee Adam na Iv, ọ̀ dịla mbụ kpebie na ha ga-emehie?—Jenesis 1:28; 2:16, 17.

▪ Olee àgwà Chineke ndị gbaghara ozizi akara aka?—Abụ Ọma 37:28; 1 Jọn 4:8.

▪ Olee ọrụ dịịrị gị?—Joshua 24:15.

[Ihe Odide Gbatụrụ Okpotokpo nke dị na peeji nke 11]

Nnyocha ndị e mere gosiri na ndị na-akpachapụ anya adịkebeghị anwụ ma ọdachi ndị nwere ike igbu mmadụ mee