Ikpebisi Ike Ịba Ọgaranya n’Ebe Chineke Nọ
Ikpebisi Ike Ịba Ọgaranya n’Ebe Chineke Nọ
KA MMADỤ wee bụrụ ọgaranya n’ụzọ nkịtị, ọ dị mkpa na ọ ga-eme ezigbo mgbalị ma chụọ ihe ụfọdụ n’àjà. Otú ahụ ka ọ dịkwa ma ọ chọọ ịba ọgaranya n’ebe Chineke nọ. Ihe a ka Jizọs na-ekwu banyere ya mgbe ọ sịrị: “Na-akpakọbaranụ onwe unu akụ̀ n’eluigwe.” (Matiu 6:20) Akụ̀ ime mmụọ adịghị eji aka ha akpakọba onwe ha. Nanị na mmadụ nwere okpukpe ọ nọ na ya adịghị eme ka ọ bụrụ ọgaranya n’ụzọ ime mmụọ, dị nnọọ ka mmadụ inwe ego o tinyere n’ụlọ akụ̀ na-adịghị eme ka ọ bụrụ ọgaranya n’ụzọ nkịtị. Ka mmadụ wee bụrụ onye ya na Chineke na-akpachi anya, onye ji ofufe Chineke akpọrọ ihe, na onye nwere àgwà ndị na-amasị Chineke, ọ dị mkpa na ọ ga-emere ya mkpebi siri ike, wepụtara ya oge, meere ya mgbalị siri ike, ma chụọ ihe ụfọdụ n’àjà.—Ilu 2:1-6.
Ị̀ Pụrụ Inwe Ha Abụọ?
Mmadụ ọ́ pụghị inwe ma akụ̀ ime mmụọ ma akụnụba? Ikekwe ọ pụrụ inwe ha abụọ, ma, ọ bụ nanị otu ka ọ pụrụ ịchụso nke ọma. Jizọs kwuru, sị: “Unu apụghị ịbụ ohu Chineke na nke Akụ̀ na Ụba.” (Matiu 6:24b) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ịchụso akụ̀ ime mmụọ na akụnụba ekwechaghị omume. Ha abụọ adịghị agakọ. Ọ bụ ya mere na tupu Jizọs agwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-akpakọbara onwe ha akụ̀ n’eluigwe, o bu ụzọ gwa ha, sị: “Kwụsịnụ ịkpakọbara onwe unu akụ̀ n’elu ala.”—Matiu 6:19.
Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na mmadụ eleghara ndụmọdụ Jizọs anya ma na-anwa ịchụso ma akụ̀ ime mmụọ ma akụnụba? Jizọs kwuru, sị: “Ọ dịghị onye pụrụ ịbụ ohu nke nna ukwu abụọ; n’ihi na ma ọ́ bụghị na ọ ga-akpọ otu asị ma hụ nke ọzọ n’anya, ya abụrụ na ọ ga-arapara n’otu ma leghara nke ọzọ anya.” (Matiu 6:24a) Mgbe mmadụ na-achụso ha abụọ, ihe ndị metụtara ofufe Chineke pụrụ ịdị na-agbakasị ya ahụ́, ọbụna ma a sị na ọ na-eme ha iji mezuo iwu. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ ga na-adị ya ka ọ̀ na-egbochi ya inweta akụnụba ọ chọrọ inweta. Kama ilegara Chineke anya ka o nyere ya aka ịnagide nchegbu ọ na-enwe ná ndụ, onye ahụ pụrụ ọbụna ilegara ego na ihe e ji ego azụta, anya. Ọ dị nnọọ ka Jizọs si kwuo ya, sị: “N’ebe akụ̀ gị dị, n’ebe ahụ ka obi gị ga-adịkwa.”—Matiu 6:21.
Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị iji nlezianya tụlee ndụmọdụ ndị dị otú ahụ dị na Bible tupu ya ekpebiwe ihe ọ ga-etinyewe obi ya, oge ya, na ike ya na ya. Na Chineke ekwughị kpọmkwem ókè Onye Kraịst ga-enwedebe ego apụtaghị na mmadụ agaghị ata ahụhụ ya ma o leghara ịdọ aka ná ntị O nyere banyere anyaukwu anya. (1 Ndị Kọrint 6:9, 10) Ndị leghaara ndụmọdụ Bible anya ma kpebisie ike ịba ọgaranya na-emebi adịm ná mma ha na Chineke, na-enwe obi mgbawa, na-enwekwa nsogbu ụbụrụ, dị ka anyị hụrụla. (Ndị Galeshia 6:7) N’ụzọ dị iche na nke ahụ, Jizọs kwuru na ndị maara mkpa ime mmụọ ha ga-enwe obi ụtọ. (Matiu 5:3) N’ezie, Onye Okike anyị na Ọkpara ya maara ihe ga-akasị enye anyị obi ụtọ ma dị anyị mma n’ahụ́!—Aịsaịa 48:17, 18.
Nhọrọ Ị Na-agaghị Akwara Ụta
Olee nke ị ga-achụso? Ọ̀ bụ Chineke ka ọ̀ bụ akụnụba? O doro anya na anyị kwesịrị igbo mkpa ego ndị anyị nwere. N’akwụkwọ ozi mbụ Pọl degaara Timoti, o dere, sị: “N’ezie, ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị egboro ndị nke ya mkpa ha, karịsịakwa ndị bụ́ ndị ezinụlọ ya, ọ jụwo okwukwe, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.” Ma, Pọl gbakwara Ndị Kraịst ume ka ha ghara ịtụkwasị olileanya ha n’ego, kama ka ha tụkwasị ya n’ebe Chineke nọ, nakwa “ka ha baa ọgaranya n’ezi ọrụ.” (1 Timoti 5:8; 6:17, 18) Gịnị ka ị ga-etinye obi gị na ya? Gịnị ka ị ga-achụso? Nke bụ́ isi n’ezi ọrụ Pọl kwuru okwu ya bụ ọrụ ikwusa ozi ọma na ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ nke Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha rụọ. (Matiu 28:19, 20) Mgbe Ndị Kraịst ji aka ha họrọ ime ka ndụ ha dị mfe, ọ bụghị nanị ka ha wee kwụsịlata ịkpa ego ma riwezie nke ha kpara akpa, kama ka ha wee nwekwuo oge maka ọrụ a bara uru, ha “na-atọrọ onwe ha ezi ntọala maka ọdịnihu” n’ime ụwa ọhụrụ Chineke kwere ná nkwa. Ọbụnadị ugbu a, ha na-achọpụta na akụ̀ ime mmụọ “dị mma nke ukwuu karịa ọlaedo ọma.”—1 Timoti 6:19; Ilu 16:16; Ndị Filipaị 1:10.
Tụlee ahụmahụ Eddie, bụ́ onye ezinụlọ ya ghọrọ Ndịàmà Jehova mgbe ọ ka dị obere. N’otu oge, akụnụba nile ezinụlọ ya nwere funahụrụ ha, a chụpụkwara ha n’ụlọ ha bi. Eddie kọrọ, sị: “N’oge ahụ, anọ m na-echegbu onwe m banyere ihe ga-abụ ọnọdụ anyị ma ihe sigidere anyị ike ruo n’ókè nke na ọ dịghịzi ihe ọ bụla anyị nwere. Ọ dịghị ihe anyị nwere mgbe ahụ. Ma, ị̀ ma ihe mere? Ọ dịghị ihe mere! Anyị ka nọkwa na-eri nri, na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, na-eyikwa ákwà. Jehova gbooro anyị mkpa anyị, ka oge na-agakwa, anyị nwetaghachiri ihe ndị ahụ funahụrụ anyị. Ahụmahụ a kụziiri m iji nkwa ahụ Jizọs kwere na Matiu 6:33 kpọrọ ihe—nke bụ́ na ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ chọọ Alaeze Chineke, ọ dịtụghị anyị mkpa ichegbuwe onwe anyị banyere mkpa ndị e ji ego egbo.” Taa, Eddie na-eje ozi dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, ya na nwunye ya. Ha na-egbo mkpa ha. Nke kasị mkpa bụ na ha bara ọgaranya n’ụzọ ime mmụọ.
Uru Dị na Ya Karịrị Akarị
Akụ̀ ime mmụọ adịghị ka akụ̀ ndị dị n’ụwa bụ́ nke ndị ohi pụrụ izuru, kama ọ bụ akụ̀ na-adịgide adịgide. (Ilu 23:4, 5; Matiu 6:20) Nke bụ́ eziokwu bụ na o siri ike ịmata ókè mmadụ nweruru ọganihu n’ofufe Chineke karịa ka o si sie ike ịmata ókè o nweruru ọganihu n’ịchụta ego. Ọ dịghị mfe ịmata otú mmadụ nweruru ọganihu n’ịmụta inwe ịhụnanya, ọṅụ, ma ọ bụ okwukwe otú o si dị mfe ịma otú mmadụ nweruru ego. Ma, uru dị n’inweta akụ̀ ime mmụọ karịrị akarị. Ka Jizọs na-ekwu banyere ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ ndị ga-ahapụ ọbụna ụlọ ha na ubi ha—ee, ihe ha ji ebi ndụ—iji nwee ike ife Chineke, ọ sịrị: “N’ezie asị m unu, Ọ dịghị onye hapụworo ụlọ ma ọ bụ ụmụnne ndị ikom ma ọ bụ ụmụnne ndị inyom ma ọ bụ nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ ụmụ ma ọ bụ ubi n’ihi m nakwa n’ihi ozi ọma ahụ, nke na-agaghị enweta okpukpu otu narị ugbu a n’ime oge a, ụlọ na ụmụnne ndị ikom na ụmụnne ndị inyom na nne na ụmụ na ubi, ha na mkpagbu, nakwa ndụ ebighị ebi n’usoro ihe na-abịanụ.”—Mak 10:29, 30.
Gịnị ka ị ga-edebe n’ọnọdụ mbụ ná ndụ? Ọ̀ Bụ Chineke ka ọ̀ bụ akụnụba?
[Foto ndị dị na peeji nke 30 na 31]
Ị̀ na-achụso akụnụba. . .
. . . ka ọ̀ bụ akụ̀ ime mmụọ?