Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Kwe Ka Chineke Duru Gị Baa ná “Ndụ ahụ Nke Bụ́ Ndụ n’Ezie”

Kwe Ka Chineke Duru Gị Baa ná “Ndụ ahụ Nke Bụ́ Ndụ n’Ezie”

Kwe Ka Chineke Duru Gị Baa ná “Ndụ ahụ Nke Bụ́ Ndụ n’Ezie”

OTU àgwà dị oké mkpa e ji ama ezigbo onye ndú bụ ikwesị ntụkwasị obi. Ndị maara Jehova, bụ́ Onye chepụtara Bible, kwenyesiri ike na ọ bụ ya bụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi karịa onye ọ bụla ọzọ. Ọ ‘pụghị ịgha ụgha.’ (Taịtọs 1:2; 2 Timoti 3:16) Jọshụa, bụ́ onye na-atụ egwu Chineke, nke duuru ụmụ Izrel banye n’Ala Nkwa ahụ, gbara akaebe na Jehova bụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi. Mgbe ọ na-agwa ụmụ Izrel okwu, ọ sịrị: ‘Unu amawo n’obi unu nile na n’ime mkpụrụ obi unu nile, na ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ezi ihe nile nke Jehova, bụ́ Chineke unu, kwuru banyere unu; ha nile emeworo unu, ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ime ya.’—Joshua 23:14.

Kemgbe oge Jọshụa, ọtụtụ n’ime amụma ndị Bible buru emezuola. Nke a mere ka anyị nwee ezigbo ihe mere anyị kwesịrị iji nwee okwukwe siri ike n’amụma ndị ka ga-emezu n’ọdịnihu. Ọtụtụ n’ime ha nwere ihe jikọrọ ha na nzube Chineke maka ụwa na ụmụ mmadụ na-erube isi.

Ị̀ Ga-erite Uru Site ná Nduzi Chineke?

Jehova, onye bụ́ ịhụnanya n’onwe ya, chọrọ ka anyị nwee obi ụtọ ugbu a nakwa ruo mgbe ebighị ebi. (Jọn 17:3; 1 Jọn 4:8) N’ezie, Chineke chọrọ ka anyị nweta “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie”—ya bụ, ndụ ebighị ebi. (1 Timoti 6:12, 19) N’ihi nke a, ihe karịrị nde Ndịàmà Jehova isii ji obi ụtọ ekwusara ndị agbata obi ha ‘ozi ọma alaeze,’ nke bụ́ ihe Chineke nyere iwu ka ha mee. (Matiu 24:14) Ka ọ dị ugbu a, ha na-eme nke a na narị ala abụọ na iri atọ na ise—nke bụ́ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ná mba nile nke ụwa!

Alaeze Chineke bụ ọchịchị eluigwe nke dị n’aka Jizọs Kraịst. (Daniel 7:13, 14; Mkpughe 11:15) N’oge ọchịchị ya, a ga-ebibi ndị ọjọọ nile—ya bụ, ndị nile na-ekweghị edo onwe ha n’okpuru ụkpụrụ ziri ezi nke Jehova. (Abụ Ọma 37:10; 92:7) Mgbe nke ahụ gasịrị, “ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa [nile], dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.”—Aịsaịa 11:9.

Chegodị echiche banyere ụdị udo na ịdị n’otu a ga-enwe mgbe mmadụ nile nọ n’ụwa ga na-efe Chineke “n’ime mmụọ na n’eziokwu,” ma dị njikere ịgbaso nduzi o ji ịhụnanya enye nakwa ụkpụrụ ya zuru okè! (Jọn 4:24) Ụmụ mmadụ ga-emesị nweta “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie,” bụ́ nke Chineke kwere ná nkwa!

Ma, dị ka e buru n’amụma, ọ bụ nanị mmadụ ole na ole ga-anabata nduzi Chineke ma nweta ndụ. (Matiu 7:13, 14) Ị̀ chọrọ iso n’ime ha? Ọ bụrụ na ị chọrọ, Ndịàmà Jehova ji ezi obi na-agba gị ume ka ị tụlee ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu ma kwe ka ndụmọdụ Chineke na-enye na-eduzi gị. Site n’ime otú ahụ, ị ‘ga-edetụ Jehova ire,’ ma hụ na ọ dị mma n’ezie. (Abụ Ọma 34:8) Dị nnọọ ka amamihe e bu pụta ụwa si eduzi ụmụ nnụnụ mgbe ha si n’otu mpaghara ụwa aga ná mpaghara ụwa ọzọ gaa biri, Jehova ga-eduru ndị na-eguzosi ike n’ihe nye ya gaa ná ndụ n’ime Paradaịs.—Luk 23:43.

[Foto dị na peeji nke 8 na 9]

“Obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi, ebe ọ bụ na ha ga-eketa ụwa.”—MATIU 5:5

“Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.”—ABỤ ỌMA 37:11

“Ụlọikwuu nke Chineke na-adịnyere ihe a kpọrọ mmadụ . . . Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ.”—MKPUGHE 21:3, 4

“Ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, ndị zuru okè ga-afọdụkwa n’ime ya. Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-efopụ na ya.”—ILU 2:21, 22