Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Nke A Bụ Kpọmkwem Ihe Anyị Na-achọ!”

“Nke A Bụ Kpọmkwem Ihe Anyị Na-achọ!”

“Nke A Bụ Kpọmkwem Ihe Anyị Na-achọ!”

Ihe a ka otu nne nọ n’Ịtali ji oké olu kwuo mgbe o nwetara akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. O kwuru, sị, “O metụrụ m n’obi nke ukwuu nke na ebere m ákwá.” O kwukwara banyere nwa ya nwanyị ka dị obere, sị: “Ọ mụtabeghị ịgụ ihe, ma n’ihi ihe osise ndị dị n’akwụkwọ ahụ, ọ na-echeta isi ihe ndị dị na ya. Ọ na-ege ntị nke ọma ma a na-agụ ya n’ihi na e dere akwụkwọ ahụ ka à ga-asị na onye na-agụ ya na onye a na-agụrụ ya na-akparịta ụka, ọtụtụ mgbe kwa, ọ na-etinye ọnụ. Anyị echeghị na ọ dị onyinye anyị gaara enweta nke ga-aka nke a mma.”

Otu nna nọ n’Ịtali kọrọ na ya na nwunye ya anọwo na-ajụ onwe ha otú ha ga-esi kọwaara nwa ha nwoke dị obere ihe ndị metụtara mmekọahụ. Ha kwuru, sị, “Mgbe e wepụtara akwụkwọ ọhụrụ a, ọ bịara dị anyị ka Chineke ọ̀ chọpụtara nchegbu anyị na-enwe. Mgbe anyị gụsịrị ya, anyị kwuru banyere otú akwụkwọ ọhụrụ a ga-esi agba nwa anyị nwoke ume ịtụgharị uche na ichebara ihe echiche.”

Otu onye na-eto eto nọ na Japan, bụ́ onye e dinara mgbe ọ ka bụ nwata, detara ozi ekele maka akwụkwọ a, sị: “Ebere m ákwá nke ukwuu, apụghịkwa m ịkwụsị ikele Jehova. Akwụkwọ a kwuru kpọmkwem ihe ụmụaka pụrụ iche ihu n’ụwa ọjọọ a, n’ezoghị ọnụ. Ajụjụ ndị a jụrụ na ya na-eme nnọọ ka nwatakịrị nwee ike ikwu ihe dị ya n’obi. Isi nke 32 bụ nnọọ ihe enyemaka magburu onwe ya n’ichebe ụmụaka pụọ n’aka ndị dimkpa na-arụ arụrụala! Ihe mere m ná ndụ agaraghị eme m ma a sị na m nwetara akwụkwọ dị ka nke a na-akụzi ihe n’ezoghị ọnụ, ihe dị ka afọ 20 gara aga.”

Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta akwụkwọ a nwere ihe osise ndị mara mma nke dị peeji 256, nke peeji ya hacha ka peeji magazin a, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 nke magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.