Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ụzọ Amamihe Dị na Ya Isi Na-ele Ego Anya?

Olee Ụzọ Amamihe Dị na Ya Isi Na-ele Ego Anya?

Echiche nke Bible

Olee Ụzọ Amamihe Dị na Ya Isi Na-ele Ego Anya?

BIBLE kwuru, sị: ‘Ego bụ ndò.’ (Eklisiastis 7:12) Ebe ọ bụ na e ji ego azụta nri, uwe, na ụlọ, ọ na-eche mmadụ ndò pụọ ná nsogbu ndị ịda ogbenye na-akpata. N’eziokwu, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na a pụrụ iji ego zụta ihe nile dị mmadụ mkpa n’ụzọ anụ ahụ́. Dị ka Eklisiastis 10:19 si kwuo ya, “ego na-azakwa ihe nile,” ma ọ bụ na-egbo mkpa nile.

Okwu Chineke na-agba anyị ume ịrụsi ọrụ ike ka anyị wee nwee ike igbo mkpa nke anyị na ndị ezinụlọ anyị. (1 Timoti 5:8) Ọ bụrụ na mmadụ ejiri obi eziokwu na-arụsi ọrụ ike, obi ga-adị ya ụtọ, ọ ga-enwe ùgwù, ihe agaghịkwa na-esichara ya ike.—Eklisiastis 3:12, 13.

Ọzọkwa, ọ bụrụ na anyị na-arụsi ọrụ ike, ọ ga-eme ka anyị nwee ike ịdị na-emesapụ aka. Jizọs kwuru, sị: “A na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Anyị na-enweta obi ụtọ dị otú ahụ mgbe anyị ji mgbasapụ ihu jiri ego anyị nyere ndị nọ ná mkpa aka, karịsịa Ndị Kraịst ibe anyị, ma ọ bụkwanụ jiri ya zụta ihe anyị ga-enye onye anyị hụrụ n’anya.—2 Ndị Kọrint 9:7; 1 Timoti 6:17-19.

Jizọs gbara ụmụazụ ya ume ka ha na-emesapụ aka mgbe nile, ka ọ bụrụ àgwà ha na ihe e ji mara ha. Ọ gwara ha, sị: “Na-enyenụ ihe.” (Luk 6:38) Ọ bụkwa otu ụkpụrụ ahụ ka e kwesịrị ịgbaso mgbe a na-enye onyinye iji kwadoo ihe ndị metụtara Alaeze Chineke. (Ilu 3:9) N’ezie, ọ bụrụ na anyị na-emesapụ aka n’ihe ndị metụtara ofufe Chineke, ọ ga-enyere anyị aka ‘imeta Jehova na Ọkpara ya enyi.’—Luk 16:9.

Kpachara Anya Banyere “Ịhụ Ego n’Anya”

E jighị inye ihe mara ndị na-achọ ọdịmma onwe ha nanị, ha nyekwanụ enye, o nwere ike ịbụ na o nwere ihe ha bu n’obi nye ya. Ihe mere na ha adịghị enye ihe na-abụkarị n’ihi na ha hụrụ ego n’anya. Ma, kama nke ahụ ga-eme ka ha nweta ihe ha tụrụ anya ya, ọ na-emekarị ka obi ghara ịdị ha ụtọ. Na 1 Timoti 6:10, Bible kwuru, sị: “Ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ nile, sitekwa n’ịchụso ịhụnanya nke a e duhiewo ụfọdụ pụọ n’okwukwe, ha ejiriwokwa ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha aghara aghara.” Gịnị mere na ego anaghị eju onye hụrụ ego n’anya afọ, gịnịkwa mere ego ahụ ọ hụrụ n’anya ji ebutere ya nsogbu?

Otu ihe kpatara ya bụ na ego anaghị eju onye anyaukwu afọ. Eklisiastis 5:10 na-ekwu, sị: “Onye na-ahụ ego n’anya, ego agaghị eju ya afọ.” N’ihi ya, ndị hụrụ ego n’anya na-eji iwe na obi mgbawa ha na-enwe mgbe nile ‘adụpu onwe ha.’ Ọzọkwa, anyaukwu ha na-eme ka ha na ndị ọzọ ghara ịdị ná mma, na-eme ka ezinụlọ ha ghara ịdị na-enwe obi ụtọ, na-emekwa ka ha ghara ịdị na-ezu ike otú ha kwesịrị. “Ihe ụtọ ka ụra nke onye na-ala ọrụ ubi bụ, ma ọ̀ bụ ihe nta ma ọ̀ bụ ihe hiri nne ka ọ na-eri: ma afọ ojuju nke ọgaranya adịghị ekwe ya arahụ ụra. (Eklisiastis 5:12) Nke ka nke ahụ bụ na ịhụ ego n’anya na-eme ka mmadụ na Chineke ghara ịdị ná mma.—Job 31:24, 28.

Ma na Bible ma n’akụkọ ihe mere eme, e nwere ọtụtụ ihe atụ nke ndị zuru ohi, kpee ikpe na-ezighị ezi, gbaa akwụna, gbuo mmadụ, ghọọ ndị sabo, ma ghaa ụgha—n’ihi ego. (Joshua 7:1, 20-26; Maịka 3:11; Mak 14:10, 11; Jọn 12:6) N’oge Jizọs na-eje ozi ya n’elu ala, ọ kpọrọ otu nwa okorobịa bụ́ onye ọchịchị “bara ọgaranya nke ukwuu” ka ọ ghọọ onye na-eso ụzọ ya. Ọ dị mwute ikwu na nwoke ahụ jụrụ ọmarịcha oku ahụ a kpọrọ ya n’ihi na nke ahụ ga-eme ka ọ gharazie inwe ego otú o nweburu. Nke a mere ka Jizọs jiri olu dara ụda kwuo, sị: “Lee ka ọ ga-esi siere ndị ji ego ike ịba n’alaeze Chineke!”—Luk 18:23, 24.

“N’ụbọchị ikpeazụ” a anyị bi n’ime ya, Ndị Kraịst aghaghị ịkpachara anya karịsịa n’ihi na ndị mmadụ n’ozuzu ha “hụrụ ego n’anya” dị ka Bible buru n’amụma. (2 Timoti 3:1, 2) Anyaukwu a juru ebe nile anaghị emetụta ezi Ndị Kraịst maara mkpa ime mmụọ ha n’ihi na ha nwere ihe ka ego mma.

Ihe Ka Ego Mma

Mgbe Eze Solomọn kwuru na ego bụ ndò, o kwukwara na “amamihe bụ ndò” n’ihi na ọ “na-eme ka onye nwe ya dị ndụ.” (Eklisiastis 7:12) Gịnị ka o bu n’uche kwuo ihe ahụ? Ụdị amamihe Solomọn na-ekwu okwu ya bụ amamihe e nwetara site n’ezi ihe ọmụma nke Akwụkwọ Nsọ, na nke e nwetara site n’ịtụ egwu Chineke. Ebe ọ bụ na ụdị amamihe ahụ sitere n’aka Chineke ka ego mma, ọ pụrụ ime ka mmadụ ghara ịdaba n’ọtụtụ nsogbu nke ụwa a, nakwa ọbụna ka ọ ghara ịnwụchu ọnwụ. Ọzọkwa, dị ka okpueze, ezi amamihe na-ebuli ndị nwe ya elu ma na-eme ka ha nwee ùgwù. (Ilu 2:10-22; 4:5-9) Ebe ọ bụkwa na ọ na-eso eme ka mmadụ nweta ihu ọma Chineke, a kpọrọ ya “osisi na-enye ndụ.”—Ilu 3:18.

Ndị ji ezi obi chọọ inweta ụdị amamihe a ma dị njikere ịchọ ya achọpụtala na o sighị oké ike inweta ya. “Nwa m, ọ bụrụ na . . . ọ bụ mmata ka ị na-akpọku, ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị; ọ bụrụ na ị chọọ ya dị ka ọlaọcha, ọ bụrụkwa na ọ bụ dị ka akụ̀ zoro ezo ka ị na-egwupụta ya: mgbe ahụ ka ị ga-aghọta egwu Jehova, ọ bụkwa ihe ọmụma Chineke ka ị ga-achọta. N’ihi na Jehova na-enye amamihe; n’ọnụ Ya ka ihe ọmụma na nghọta si apụta.”—Ilu 2:1-6.

Ebe ọ bụ na ezi Ndị Kraịst ji amamihe kpọrọ ihe karịa ego, ha na-enweta ụdị udo, obi ụtọ, na ahụ́ iru ala nke ndị hụrụ ego n’anya na-anaghị enweta. Ndị Hibru 13:5 na-ekwu, sị: “Ka ụzọ ndụ unu bụrụ nke ịhụnanya ego na-adịghị na ya, ka unu nọ na-enwe afọ ojuju n’ihe ndị dị ugbu a. N’ihi na [Chineke ekwuwo], sị: ‘M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.’” Ego anaghị eme ka mmadụ nweta ụdị obi iru ala ahụ.

Ì CHETỤWO ECHICHE BANYERE NKE A?

▪ Olee otú ego si bụrụ ndò?—Eklisiastis 7:12.

▪ Gịnị mere amamihe sitere n’aka Chineke ji ka ego mma?—Ilu 2:10-22; 3:13-18.

▪ Gịnị mere anyị ji kwesị izere ịhụ ego n’anya?—Mak 10:23, 25; Luk 18: 23, 24; 1 Timoti 6:9, 10.