Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ihe Dị Njọ na Nwoke na Nwanyị Na-akpa na Nzuzo?

Olee Ihe Dị Njọ na Nwoke na Nwanyị Na-akpa na Nzuzo?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Olee Ihe Dị Njọ na Nwoke na Nwanyị Na-akpa na Nzuzo?

Jessica * amaghị ihe ọ ga-eme eme mgbe otu nwa klas ya aha ya bụ Jeremy malitere inwe mmasị n’ebe ọ nọ. Jessica kwuru, sị, “Ọ mara nnọọ mma nwoke, ndị enyi m gwakwara m na ọ bụ ya ga-abụ onye kasị akpa ezi àgwà n’ime ndị nile ga-enwe mmasị n’ebe m nọ. Ọtụtụ ụmụ agbọghọ anwaala imeta ya enyi, ma o nweghị mmasị n’ebe ha nọ. O nwere mmasị nanị n’ebe m nọ.”

Tupu Jessica amara ihe na-emenụ, Jeremy arịọla ya ka ha kpawa. Jessica kwuru, sị: “Akọwaara m ya na dị ka Onyeàmà Jehova, a gaghị ekwe ka m soro onye na-abụghị Onyeàmà ibe m na-akpa. Ma, Jeremy nwere otú o chere e nwere ike isi mee ya. Ọ jụrụ m, sị, ‘Gịnịkwanụ ma anyị mewe ya otú ndị mụrụ gị na-agaghị ama banyere ya?’”

Ọ BỤRỤ na onye i nwere mmasị n’ebe ọ nọ atụọ aro dị otú ahụ, gịnị ka ị ga-eme? O nwere ike iju gị anya na, ná mmalite, Jessica nabatara aro ahụ Jeremy tụrụ. Jessica kwuru, sị, “Obi siri m ike na ọ bụrụ na mụ na ya akpawa, na enwere m ike ịkụziri ya ịhụ Jehova n’anya.” Oleezi otú ihe si gaa? Anyị ga-achọpụta nke ahụ ka oge na-aga. Ma, ka anyị burugodị ụzọ hụ ihe mere ọbụna ezigbo Onye Kraịst dị ka Jessica pụrụ iji daba n’ọnyà nke iso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya na-akpa na nzuzo.

Ihe Mere Ha Ji Eme Ya

Ụfọdụ ndị na-eto eto na-amalite ime enyi mgbe ha ka dị obere. Susan, bụ́ nwa agbọghọ nọ na Britain, kwuru, sị: “Ahụla m ebe ụmụaka dị afọ 10 ma ọ bụ 11 na-eme enyi nwoke na enyi nwanyị!” Gịnị mere o ji adị ha ọkụ n’ahụ́? Ọ na-abụkarị n’ihi ọchịchọ ha bu pụta ụwa nke iso ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha na-akpa nakwa n’ihi otú ndị ọgbọ ha si arụgide ha ime ya. Lois, bụ́ nwa agbọghọ nọ n’Australia, kwuru, sị: “E nwere mgbanwe ndị na-aga n’ime ahụ́ gị, onye ọ bụla nọ n’ụlọ akwụkwọ nwekwara onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya ya na ya na-akpa.”

Ma, gịnị mere ụfọdụ ji akpa na nzuzo? Jeffrey, bụ́ nwa okorobịa nọ na Britain kwuru, sị, “O nwere ike ịbụ na ha na-atụ ụjọ ihe ndị mụrụ ha ga-ekwu.” David, bụ́ nwa okorobịa nọ na South Africa, chekwara otú ahụ. O kwuru, sị, “Ha ma na ndị mụrụ ha agaghị ekwe, n’ihi ya, ha adịghị agwa ha.” Otu nwa agbọghọ nọ n’Australia aha ya bụ Jane kwuru ihe ọzọ o nwere ike ịbụ ya na-akpata ya. O kwuru, sị, “Iso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị na-akpa na nzuzo bụ omume nnupụisi. Ọ bụrụ na obi gị na-agwa gị na i toruola ogo mmadụ, nakwa na a naghị emeso gị ihe dị ka onye torurula ogo mmadụ, gị ekpebizie na ị ga na-eme ihe ọ bụla sọrọ gị, nakwa na ị gaghị agwa ndị mụrụ gị banyere ya. Ọ na-adị mfe ime ya na nzuzo.”

N’ezie, Bible nyere gị iwu ka ị na-erubere ndị mụrụ gị isi. (Ndị Efesọs 6:1) Ọ bụrụkwa na ndị mụrụ gị ekweghị ka gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị na-akpa, a ga-enwerịrị ezigbo ihe kpatara ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ndị mụrụ gị bụ Ndịàmà Jehova, ha ga-achọ ka onye gị na ya ga na-akpa bụrụ onye kwere ekwe ibe gị—ọ bụkwa nanị mgbe gị na ya toruru ikwu okwu ọlụlụ ka ha ga-ekwe. * Ma, ya ejula gị anya ma ọ bụrụ na ị na-eche ihe dị ka ndị a:

Ọ na-adị m ka ò nwere ihe na-efunahụ m n’ihi na onye ọ bụla, ma e wezụga mụnwa, nwere onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya ya na ya na-akpa.

Ana m anwụrụ otu onye mụ na ya na-anọghị n’otu okpukpe.

Achọrọ m ka mụ na Onye Kraịst ibe m nke na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe m malite ịkpa, n’agbanyeghị na etorubeghị m ịlụ di ma ọ bụ nwunye.

Ikekwe, ị maara ihe ndị mụrụ gị ga-ekwu ma ị gwa ha ihe ndị ahụ. N’ime obi gị, ị makwaara na ihe ahụ ha ga-ekwu bụ eziokwu. Ma, echiche gị nwere ike iyi nke otu nwa agbọghọ nọ na Japan, nke aha ya bụ Manami, bụ́ onye kwuru, sị: “Ọtụtụ mmadụ na-agbasi m ume ike inwe nwoke mụ na ya ga na-akpa nke na, mgbe ụfọdụ, ana m enwe obi abụọ ma mkpebi m mere ịghara inwe enyi nwoke ọ̀ bụkwa ezi mkpebi. Ụmụ okoro na agbọghọ nke oge a na-ewere ya na o nwetụghị otú mmadụ ga-esi nọrọ n’enweghị enyi nwoke ma ọ bụ enyi nwanyị.” Ụfọdụ n’ime ndị ọ dị otú ahụ amalitela iso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha na-akpa ma zochiere ya ndị mụrụ ha. Olee otú ha si eme ya?

“A Gwara Anyị Ka Anyị Zochie Ya”

Okwu bụ́ ‘ịkpa na nzuzo’ na-egosi na aghụghọ dịtụ na ya. Ụfọdụ anaghị ekwe ka a mara na e nwere onye ha na ha na-akpa, n’ihi ya, ụzọ bụ́ isi ha si ekwurịta okwu bụ site na fon ma ọ bụ n’Intanet. A bịa n’ihu ọha, ha aghọọ ndị enyi nkịtị, ma a bịa n’ozi e-mail ha, ozi ha na-eji ekwe ntị ede, na ihe ha na-ekwu na fon, egwú adagharịa.

Caleb, bụ́ nwa okorobịa nọ na Nigeria, kọrọ ụzọ aghụghọ ọzọ e si eme ya. O kwuru, sị: “Ụfọdụ ndị ntorobịa ha na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha na-akpa na nzuzo nwere ụzọ pụrụ iche ha si ekwu okwu, nweekwa aha pụrụ iche ha na-akpọ onwe ha ma ha na ndị ọgbọ ha kwuwe okwu, ka ndị ọzọ wee ghara ịma ihe ha na-ekwu banyere ya.” Ụzọ ọzọ ha si eme ya bụ ịhazi ihe omume a na-eme n’ìgwè, ka mmadụ abụọ ahụ na-akpa na nzuzo wee nwee ike ịnọkọta ọnụ. James, bụ́ onye nọ na Britain, kwuru, sị: “N’otu oge, a kpọrọ ụfọdụ n’ime anyị oku izukọ n’otu ebe. Mgbe anyị bịara, ihe anyị chọpụtaziri bụ na a haziri nnọkọ ahụ ka mmadụ abụọ so ná ndị bịaranụ wee nwee ike ịnọkọ ọnụ. A gwara anyị ka anyị zochie ya.”

Dị ka James kwuru, ọtụtụ mgbe, ndị enyi nke nwoke na nwanyị na-akpa na nzuzo na-enyekarịrị ha aka izochi ya. Carol, bụ́ nwa agbọghọ nọ na Scotland, kwuru, sị, “A ga-enwerịrị, ọ dịkarịa ala, otu enyi ha nke maara na ha abụọ na-eme enyi, ma ya ekpebie na ọ gaghị ekwu ya n’ihi na a sị ya agwala onye ọ bụla.”

Ọtụtụ mgbe, a na-aghadị ụgha n’ihi ya. Beth, bụ́ nwa agbọghọ nọ na Canada, kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị ntorobịa na-eme ka ndị mụrụ ha ghara ịma na o nwere onye ha na ha na-akpa site n’ịdị na-aghara ha ụgha banyere ebe ha gara.” Misaki, bụ́ nwa agbọghọ nọ na Japan, kwetara na ya mere otú ahụ. O kwuru sị: “Ana m achọta otu ihe kọọrọ ha. Ana m akpachara anya ka m ghara ịgha ụgha maka ihe ọ bụla ọzọ na-abụghị ihe metụtara enyi m na-eme, ka ndị mụrụ m wee ghara ịkwụsị ịtụkwasị m obi.”

Nsogbu Ndị Dị n’Iso Onye Na-abụghị Nwoke Ma Ọ Bụ Nwanyị Ibe Gị Na-akpa na Nzuzo

Ọ bụrụ na obi gị na-agwa gị ka ị malite iso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị na-akpa na nzuzo—ma ọ bụkwanụ na i mewela ya eme—ọ ga-adị mkpa ka i chebara ihe ndị a na-esonụ echiche.

Olee ebe ihe a m na-eme ga-eduga m? Ì bu n’obi ịlụ onye ahụ na nso nso a? Evan, bụ́ nwa okorobịa nọ na United States, kwuru, sị: “Iso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị na-akpa n’ebughị n’obi ịlụ onye ahụ dị nnọọ ka ịkpọsa ngwá ahịa ị na-adịghị ere ere.” Ilu 13:12 na-ekwu, sị: “Nchere a na-echere ogologo mgbe dị anya na-eme ka obi na-arịa ọrịa.” Ị̀ ga-achọ ịkpatara onye ị hụrụ n’anya obi mgbawa n’ezie?

Olee otú Jehova Chineke si ele ihe m na-eme anya? Bible kwuru na “ihe nile gba ọtọ ma bụrụ ndị e kpughepụrụ ekpughepụ n’anya onye ahụ anyị ga-aza ajụjụ.” (Ndị Hibru 4:13) Ya mere, ọ bụrụ na ị chọghị ka mmadụ mara na e nwere onye gị na ya na-akpa—ma ọ bụkwanụ na ị na-ezochi nke enyi gị—Jehova maara maka ya. Ọ bụrụkwa na ọ dị otú aghụghọ si bata na ya, i kwesịrị ichebara onwe gị echiche. Jehova Chineke kpọrọ ịgha ụgha asị. Nke bụ́ eziokwu bụ na “okwu ụgha” so n’ihe ndị bụ́ isi Bible sịrị na ha bụ ihe arụ n’anya Jehova.—Ilu 6:16-19.

N’eziokwu, ọ bụrụ na i so onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị na-akpa na nzuzo, ọ ga-eme ka ị ghara inweta ụdị nchebe ụfọdụ i kwesịrị inweta ma a sị na ndị mmadụ maara banyere ya. Ọ bụghị ihe ijuanya na ụfọdụ n’ime ndị na-akpa na nzuzo na-emecha nwee mmekọahụ rụrụ arụ. Jane, bụ́ nwa agbọghọ nọ n’Australia, kwuru na e nwere enyi ya nwanyị nke sooro otu nwa okoro nọ n’ụlọ akwụkwọ ha na-akpa na nzuzo, nke a emeekwa ka o biwe ụdị ndụ abụọ. Jane kwukwara, sị: “Tupu papa ya achọpụta na o nwere enyi nwoke, o butela ime.”

N’eziokwu, ọ bụrụ na e nwere onye gị na ya na-akpa na nzuzo, ọ ga-adị mma ka ị kọọrọ ya ndị mụrụ gị ma ọ bụkwanụ Onye Kraịst torurula ogo mmadụ. Ọ bụrụkwa na e nwere enyi gị ya na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya na-akpa na nzuzo, esonyela ya n’omume ahụ site n’inyere ya aka na-ezochi ya. (1 Timoti 5:22) A sị ka e kwuwe ya, olee otú obi ga-adị gị ma ya na onye ahụ mesịa baa ná nsogbu? Í cheghị na aka gị dịtụ na ya? Ka e were ya na enyi gị nke na-arịa ọrịa shuga na-aracha swiiti na nzuzo. Gịnị ma ọ bụrụ na ị chọpụta ihe ọ na-eme, ma ya arịọ gị ka ị ghara ịgwa onye ọ bụla? Olee ihe ga-akasị adị gị mkpa ime—ọ̀ bụ izochi ihe ahụ enyi gị ahụ na-eme, ka ọ̀ bụ ime ihe nwere ike ichebe ndụ ya?

Otú ahụ ka ọ dị ma ọ bụrụ na e nwere onye ị ma na-eso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya akpa na nzuzo. Ụjọ atụla gị na ọ ga-eme ka gị na ya gharazie ịbụ enyi! Ka oge na-aga, ọ bụrụ na onye ahụ bụ ezigbo enyi gị, ọ ga-achọpụta na ihe i mere bụ maka ọdịmma ya.—Ilu 27:6.

“Amatara M Ihe M Kwesịrị Ime”

Jessica, bụ́ onye e kwuru banyere ya ná mmalite, mechara gbanwee obi ya banyere iso onye na-abụghị nwanyị ibe ya na-akpa na nzuzo mgbe ọ nụrụ ahụmahụ nke Onye Kraịst ọzọ ụdị ihe ahụ mere. Jessica kwuru, sị: “Mgbe ọ kọsịịrị m otú o siri hapụ onye ahụ ya na ya mere enyi, amatara m ihe m kwesịrị ime.” Ọ̀ na-adị mfe ịhapụ onye ahụ? Mbanụ! “Jessica kwuru, sị: “Onye ahụ bụ nanị nwa okorobịa m nwere ezigbo mmasị n’ebe ọ nọ. Ebere m ákwá kwa ụbọchị ruo ọtụtụ izu.”

Ma, o nwere ihe ọzọ Jessica maara—ọ maara na ya hụrụ Jehova n’anya, nakwa na ọ bụ eziokwu na o mere ihe na-adịghị mma, o ji obi ya nile chọọ ime ihe dị mma. Ka oge na-aga, obi mgbawa ahụ ọ na-enwe maka ịhapụ onye ahụ kwụsịrị. Jessica kwuru, sị: “Ugbu a, mmekọrịta mụ na Jehova bịara kakwuo mma. Obi dị m nnọọ ụtọ na ọ na-enye anyị nduzi dị anyị mkpa kpọmkwem n’oge ahụ ọ dị anyị mkpa!”

Ị pụrụ ịhụ isiokwu ndị ọzọ dị n’usoro isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . ” n’ebe a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet nke adres ya bụ www.watchtower.org/ype

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanweela aha ụfọdụ e ji mee ihe n’isiokwu a.

^ par. 9 Lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . Olee Mgbe Mụ na Onye Na-abụghị Nwoke Ma Ọ Bụ Nwanyị Ibe M Nwere Ike Ịmalite Kpawa?” nke gbara na Teta! January–March 2007.

IHE NDỊ A GA-ECHEBARA ECHICHE

▪ Leruo anya n’ọnọdụ atọ ahụ e depụtara n’aka akwụkwọ okpotokpo na peeji nke 15. N’ime ha atọ, olee nke kọwara otú ọ na-adị gị mgbe ụfọdụ, ma ọ bụrụkwa na ọ dị nke kọwara ya?

▪ Olee otu ihe ị ga-eme maka ya nke na-abụghị iso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị na-akpa na nzuzo?

[Igbe dị na peeji nke 16]

À Na-eme Ya na Nzuzo Ka Ọ̀ Bụ na A Chọbeghị Ka Ndị Ọzọ Mara Maka Ya?

Ọ bụghị mgbe nile nwoke na nwanyị na-ezo mkpakọrịta ha ezo ka aghụghọ na-adị na ya. Ka e were ya na nwoke na nwanyị torurula ogo ịlụ di na nwunye chọrọ ịmatakwu onwe ha nke ọma, ma ha achọbeghị ka ndị mmadụ mara banyere ya. Ikekwe, dị ka nwa okorobịa aha ya bụ Thomas si kwuo ya, “ha achọghị ka ndị mmadụ na-ajụ ha ajụjụ ndị dị ka, ‘Oleekwanụ mgbe unu ga-alụ?’”

N’eziokwu, nrụgide sitere n’aka ndị ọgbọ nwere ike ịdị oké njọ. (Abụ nke Abụ 2:7) N’ihi ya, n’oge ahụ ha ka bidoro adịm ná mma ha ebido, ụfọdụ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị nwere ike ikpebi ịdị na-eme ya otú ndị mmadụ na-agaghị achọpụta—ma n’otu mgbe ahụ, ha ana-akpachapụ anya ka ha ghara ịdị na-anọ nanị ha n’ebe ndị mmadụ na-anọghị. (Ilu 10:19) Anna, bụ́ nwa agbọghọ dị afọ 20, kwuru, sị, “Nke a na-enye mmadụ abụọ ahụ ohere ikpebi ma hà nwere mmasị n’ebe ibe ha nọ. Ọ bụrụ na ha nwere, ha nweziri ike ime ka ndị mmadụ mara.”

N’otu mgbe ahụ, ọ ga-adị njọ ma ọ bụrụ na ị chọghị ime ka ndị kwesịrị ịma banyere mkpakọrịta ahụ, dị ka ndị mụrụ gị ma ọ bụ ndị mụrụ onye ahụ gị na ya na-akpa, mara banyere ya. Ọ bụrụ na ị chọghị ime ka ndị ọzọ mara banyere ya, i kwesịrị ịjụ onwe gị ihe kpatara ya. Ọnọdụ gị ọ̀ dị ka nke Jessica, bụ́ onye e kwuru banyere ya ná mmalite isiokwu a? Obi gị ọ̀ na-agwa gị na ndị mụrụ gị ga-enwe ezigbo ihe mere ha na-agaghị eji kwere ka gị na onye ahụ kpawa?

[Igbe dị na peeji nke 17]

IHE NDỊ MỤRỤ ỤMỤ KWESỊRỊ IBURU N’UCHE

Mgbe ị gụsịrị isiokwu bu ụzọ, i nwere ike iche, sị, ‘Ọ̀ ga-abụ na nwa m nwoke ma ọ bụ nwa m nwanyị na-eme enyi nwoke ma ọ bụ enyi nwanyị na nzuzo?’ Gụọ ihe ụfọdụ ndị na-eto eto gwara ndị na-ebipụta Teta! na ọ bụ ya nwere ike ime ka ụfọdụ soro ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha na-akpa na nzuzo. Ị gụsịa ya, gị echebara ajụjụ ya na ya so echiche.

▪ “Ahụ́ anaghị eru ụfọdụ ndị ntorobịa ala n’ụlọ ha, n’ihi ya, ha na-aga nweta enyi nwoke ma ọ bụ enyi nwanyị ga na-eme ka ahụ́ ruo ha ala.”—Wendy.

Dị ka nne ma ọ bụ nna, olee otú ị pụrụ isi jide n’aka na ahụ́ ga na-eru ụmụ gị ala nke ọma? È nwere ihe ndị i nwere ike ime iji meziwanye ihe n’akụkụ a? Ọ bụrụ na e nwere, olee ihe ndị ọ bụ?

“Mgbe m dị afọ 14, otu nwa akwụkwọ ibe m rịọrọ m ka m bụrụ enyi ya nwanyị. Ekwetara m. Ihe mekwaranụ m ji kwere bụ na obi m gwara m na ọ ga-adị mma ka m nwee nwa okorobịa ga na-ekonye m aka n’olu.”—Diane.

Ọ bụrụ na Diane bụ nwa gị nwanyị, olee ihe ị ga-eme banyere ọnọdụ ya?

“Ekwe ntị na-eme ka ọ dị nnọọ mfe ime enyi nwoke ma ọ bụ enyi nwanyị na nzuzo. I jiri ya na-eme enyi, ndị nne na nna anaghị ama ihe na-aganụ!”—Annette.

Olee ihe ndị ị pụrụ ime iji gbochie ụmụ gị ịdaba n’ụdị nsogbu a n’ihi iji ekwe ntị eme ihe?

“Ọ na-adịkarịrị ndị na-eto eto mfe ime enyi nwoke ma ọ bụ enyi nwanyị na nzuzo ma ọ bụrụ na ndị mụrụ ha adịghị eleru anya ala iji mara ihe ụmụ ha na-eme, na ndị ha na ha na-akpa.”—Thomas.

È nwere ụzọ ndị i nwere ike isi na-etinye anya n’ihe nwa gị ka na-eto eto na-eme, ma n’otu mgbe ahụkwa, kwe ka o nwere onwe ya ruo n’ókè o kwesịrị?

“Ọtụtụ mgbe, ndị nne na nna anaghị anọ n’ụlọ mgbe ụmụ ha nọ n’ụlọ. Ma ọ bụkwanụ, ha na-ekwekarị ka ụmụ ha soro ndị ọzọ kpapụ.”—Nicholas.

Chọpụta onye bụ́ ezigbo enyi nwa gị. Ị̀ maara ihe ndị ha na-emekarị ma ha nọkọọ ọnụ?

“Ọ bụrụ na ndị mụrụ ụmụ anaghị ekwe ụmụ ha megharịa ahụ́, nke a pụrụ ime ka ha mewe enyi nwoke na enyi nwanyị na nzuzo.”—Paul.

Olee otú unu pụrụ isi mee ka “ezi uche unu bụrụ nke mmadụ nile maara” n’emebighị iwu na ụkpụrụ Bible?—Ndị Filipaị 4:5.

“Mgbe m ka nọ n’agbata afọ 12 na 15, ihere na-emekarị m, ọ na-agụkwa m agụụ inwe onye ga na-enye m ihu. N’ihi ya, amalitere m izigara otu nwa okorobịa nọ n’ọgbakọ dị nke anyị nso ozi E-mail, malitekwa ịnwụrụ ya. Nwa okorobịa ahụ mere ka ọ dị m ka m bụ ọpụrụiche.”—Linda.

Ọ̀ dị ụzọ ndị i chere ka mma a gaara esi gboo mkpa Linda n’ụlọ?

Í cheghị na ọ ga-adị mma ka gị na nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwanyị tụlekọọ isiokwu a nakwa peeji a ọnụ? Ụzọ kasị mma isi mee ka nwa gị ghara imewe ihe na nzuzo bụ site n’iso ya na-eji obi ọcha ekwurịta okwu n’ezoghị ọnụ. Ọ chọrọ oge na ndidi iji chọpụta ihe bụ́ mkpa onye na-eto eto, ma uru na-esi na ya apụta na-eme ka mgbalị e mere iji chọpụta ya ghara ifu ọhịa.—Ilu 20:5.