Olee Ihe Mere A Na-ejikarị Akpapụ M Iche?
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Olee Ihe Mere A Na-ejikarị Akpapụ M Iche?
“Ná ngwụsị izu, ọ na-adị ka mmadụ nile nọ n’ụwa a hà na-ekpori ndụ, ma e wezụga nanị m.”—Renee.
“Ndị ntorobịa ibe m na-ezukọ ma na-ekpori ndụ, ha adịghịkwa akpọ m ka m soro ha!”—Jeremy.
WERE ya na ụbọchị taa bụ ụbọchị ọma, ọ dịghịkwanụ ihe i nwere ime. Ma, mmadụ nile nwere ihe ha na-eme. Ndị enyi gị nile apụọla ịga kporie ndụ. Na nke taa kwa, ha kpapụrụ gịnwa iche!
Ọ bụrụ na a kpọghị gị n’ihe omume a kpọrọ ibe gị, obi agaghị adị gị mma. Ma, ihe nke ahụ na-egosi ga-akadị ebutere gị obi mgbawa. Ọ pụrụ ime ka i chewe, sị, ‘Ikekwe, ọ dị ebe m gbara ọrụ. Gịnị mere na ọ dịghị onye chọrọ ka mụ na ya na-akpa?’
Ihe Mere O Ji Ewe Mmadụ Iwe
Ọchịchọ nke inwe ndị enyi na ịbụ onye ndị enyi ahụ nabatara bụ ihe dị otú o kwesịrị. N’eziokwu, ahụ́ na-adị anyị mma mgbe anyị na ndị ọzọ na-akpakọrịta. Tupu Jehova ekewe Iv, o kwuru banyere Adam, sị: “Ọ dịghị mma ka mmadụ ahụ nọrọ nanị ya.” (Jenesis 2:18) O doro anya na ndị mmadụ dị ibe ha mkpa; ọ bụ otú e si kee anyị. Nke ahụ bụkwa kpọmkwem ihe mere o ji ewe mmadụ iwe ma a kpapụ ya iche.
Ọ pụrụ ịdị na-agbawa gị obi karịsịa ma ọ bụrụ na a kpapụrụ gị iche ugboro ugboro, ma ọ bụkwanụ ma ọ bụrụ na ọ dị gị ka aka gị apụghị iru ebe ndị ị na-achọ imete enyi chọrọ ka i kowe akpa gị. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Marie kwuru, sị, “E nwere ìgwè ndị enyi na-eto eto bụ́ ndị na-emepụta ihe a hụrụ anya, ma ị ga-ama na ha na-ewere gị dị ka onye na-erubeghị iso ha na-akpa.” Mgbe ndị ọzọ na-ekweghị ka i sonye n’ìgwè ha, ọ ga-abịa dị gị ka hà kpapụrụ gị iche, gị adịkwa ka onye owu na-ama.
Mgbe ụfọdụ, ọ pụdịrị ịdị gị ka ị̀ nọ nanị gị mgbe ị nọ n’etiti ìgwè mmadụ. Nicole kwuru, sị, “Echetara m otu mgbe m nọ n’otu oriri na nkwari ọtụtụ mmadụ bịara na ya, ma ya adị m ka m nọ nnọọ nanị m. Ọ bụ ezie na nke a pụrụ ịda ka okwu ụmụaka, ọ bụ ihe mere m n’eziokwu. Ana m eche na ihe
kpatara ya bụ na anọ m n’etiti ọtụtụ mmadụ, ma ọ dịghị onye n’ime ha mụ na ya bụ enyi.” Ọ na-adị ụfọdụ ndị ka hà nọ nanị ha ọbụna mgbe ha nọ ná mgbakọ ukwu na nke nta nke Ndịàmà Jehova. Meagan kwuru, sị, “Ọ na-adị ka onye ọ bụla ọ̀ ma ibe ya, ma e wezụga nanị m!” Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Maria chekwara otú ahụ. O kwuru, sị, “Ọ na-adị ka à ga-asị na ndị enyi gbara m gburugburu ma ọ dịghị nke bụ́ enyi m n’ime ha.”Ọ dịghị onye owu na-adịghị ama—ọbụnadị ndị yiri ka à ma ha ama ma ọ bụ ka hà na-enwe obi ụtọ. Otu ilu Bible kwuru, sị: “Ọbụna n’ọchị ka ihe na-egbu obi mgbu.” (Ilu 14:13) Mgbe owu ọmụma bịara ka njọ ma dịgide ruo ogologo oge, ọ pụrụ imebi ihe. Bible kwuru, sị: “E ji ihe mwute nke obi tigbuo mmụọ mmadụ.” Otú e si dee amaokwu a ná nsụgharị Bible ọzọ bụ: “Iru újú pụrụ igbu mmụọ gị.” (Ilu 15:13; Contemporary English Version) Ọ bụrụ na ọ dịla gị ka è gburu mmụọ gị n’ihi na a kpapụrụ gị iche, gịnị ka ị pụrụ ime?
Ihe Ndị Ị Ga-eme Ka Owu Kwụsị Ịma Gị
Ka owu wee kwụsị ịma gị, gbalịa mee ihe ndị na-esonụ:
▪ Lekwasị anya n’ihe ndị ị na-emeta nke ọma. (2 Ndị Kọrint 11:6) Jụọ onwe gị, sị, ‘Olee ihe ndị m na-emeta nke ọma?’ Chee echiche banyere ihe ụfọdụ ị na-emeta nke ọma ma ọ bụ àgwà ọma ndị i nwere, ma detuo ha n’okpuru ebe a
․․․․․
Mgbe ọ dị gị ka à kpapụrụ gị iche, chetara onwe gị ihe ndị ahụ ị na-emeta nke ọma—dị ka ndị nke ahụ i depụtara n’elu. Anyị kwetara na e nwere ebe ndị ị na-adịghị eme nke ọma, nakwa na i kwesịrị ịgba mbọ mewe nke ọma n’ebe ndị ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, gbalịa hụ na ị dịghị echegbukarị onwe gị banyere ebe ndị ahụ ị na-adịghị eme nke ọma. Kama nke ahụ, lewe onwe gị anya dị ka onye ji nwayọọ nwayọọ na-arụ ọrụ n’ebe ndị ahụ ị na-adịghị eme nke ọma. Ị gaghị na-emetacha ihe nile, ma, e nwere ihe ndị ị na-emeta. Lekwasị anya ná ndị nke ahụ ị na-emeta!
▪ Na-agbasapụ. (2 Ndị Kọrint 6:11-13) Na-agakwuru ndị mmadụ n’echeghị ka a gwa gị agwa. N’eziokwu, nke a anaghị adịcha mfe. Otu nwa agbọghọ dị afọ 19 aha ya bụ Liz kwuru, sị, “Mmadụ ịgakwuru ìgwè ndị bụ́ enyi ma gwa ha okwu pụrụ iyi ihe sigburu onwe ya n’ike, ma, ọ bụrụ na ị gakwuru otu n’ime ha ma sị ya ‘keekwanụ,’ ị ga-ahụ na ị pụrụ imesị sonye n’ìgwè ahụ.” (Lee igbe bụ́ “Ihe Ndị Na-enye Aka Ịmalite Mkparịta Ụka.”) Ọ bụ eziokwu na ihe anyị na-ekwu banyere ya bụ ndị mmadụ ịkpapụ gị iche, hụ na gịnwa adịghị akpapụ ndị ọzọ iche—dị ka ndị katarala ahụ́. Otu nwatakịrị dị afọ iri na ụma aha ya bụ Cori kwuru, sị, “Mgbe m dị afọ 10 ma ọ bụ 11, enwere m enyi nke tọrọ m ezigbo ọtụtọ. Mụ na ya bụ ezigbo enyi n’agbanyeghị na o ji ọtụtụ afọ tọọ m.”
Chegodị echiche banyere mmadụ abụọ katarala ahụ́ n’ọgbakọ unu, bụ́ ndị ị ga-achọ ịmatakwu nke ọma ma detuo aha ha n’okpuru ebe a.
․․․․․
N’oge ọzọ unu ga-enwe nzukọ ọgbakọ, í cheghị na ọ ga-adị mma ma ị gakwuru otu n’ime ndị ahụ i dere aha ha n’elu. Kpanyere ya ụka. Jụọ ya otú o si malite inwe mmasị na Bible. Ka ị na-amatakwu “òtù ụmụnna dum,” o yiri ka ọ gaghịzi na-adị gị ka à na-akpapụ gị iche, owu ahụ na-ama gị ga-akwụsịkwa.—1 Pita 2:17.
▪ Kọsara onye torurula ogo mmadụ ihe na-enye gị nsogbu n’obi. (Ilu 17:17) Ịkọsara ndị mụrụ gị, ma ọ bụ onye ọzọ toruru ogo mmadụ, ihe ndị na-enye gị nsogbu n’obi pụrụ inye aka mee ka owu kwụsịlata ịma gị. Nke ahụ bụ ihe otu nwa agbọghọ dị afọ 16 chọpụtara. Na mbụ, ọ nọ na-echegbu onwe ya nke ukwuu na a na-akpapụ ya iche. O kwuru, sị, “Ana m adị eche ihe merenụ nke mere o ji adị m ka à na-akpapụ m iche, ana m anọkwa na-atụgharị ya n’uche m. Ma, e mesịa, ana m akọsara ya mama m, ọ na-agwakwa m ihe m ga-eme banyere ya. Ịkọsara onye ọzọ banyere ya na-enyere m nnọọ aka!”
Ị chọọ ịkọsara mmadụ banyere owu na-ama gị mgbe nile, ònye ka ị ga-akọsara ya?
․․․․․
▪ Na-echebara ndị ọzọ echiche. (1 Ndị Kọrint 10:24) Bible kwuru na anyị kwesịrị ịdị “na-elekwasị anya, ọ bụghị n’igosi mmasị onwe onye nanị n’ihe ndị metụtara [anyị], kamakwa n’igosi mmasị onwe onye n’ihe ndị metụtara ndị ọzọ.” (Ndị Filipaị 2:4) N’eziokwu, mgbe ọ dị gị ka à kpapụrụ gị iche, ọ ga-adịrị gị mfe inwe nkụda mmụọ ma ọ bụ obi ilu. Ma, kama ịnọgide na-enwe nkụda mmụọ, í cheghị na ọ ga-adị mma ma i meere onye nọ ná mkpa ihe? Gị na onye ahụ pụdịrị isi otú ahụ bụrụ enyi!
Chegodị echiche banyere otu onye, ikekwe n’ezinụlọ unu ma ọ bụ n’ọgbakọ unu, nke gị na ya pụrụ ịbụ enyi ma ọ bụ nke ị pụrụ inyere aka n’ụzọ ụfọdụ. Dee aha onye ahụ n’okpuru ebe a, deekwa otú ị pụrụ isi nyere ya aka.
․․․․․
Mgbe ị na-eche banyere ndị ọzọ, ọ bụghị banyere nanị gị onwe gị, ma na-emere ha ihe, owu agakebeghị na-ama gị. Nke a pụrụ ime ka ị bụrụ onye na-ele ihe anya otú o kwesịrị na onye na-enwe ihu ọchị, bụ́ nke ga-eme ka ndị mmadụ nwee mmasị imeta gị enyi. Ilu 11:25 kwuru, sị: “Onye na-eme ka ndị ọzọ ṅụjuo afọ, a ga-emekwa ka ya onwe ya ṅụjuo afọ.”
▪ Na-ahọ ndị enyi ahọ. (Ilu 13:20) Ọ ka mma inwe ezigbo ndị enyi ole na ole na-eche maka ọdịmma gị karịa inwe ọtụtụ ndị sị na ha bụ ndị enyi gị, bụ́ ndị pụrụ itinye gị ná nsogbu. (1 Ndị Kọrint 15:33) Tụlee banyere nwa okoro bụ́ Samuel, bụ́ onye e kwuru maka ya n’ime Bible. Ikekwe, owu mara ya mgbe ọ nọ na-arụ ọrụ n’ụlọ nsọ Jehova. Ndị ya na ha rụkọrọ ọrụ bụ Họfnaị na Finihas, bụ́ ndị omume ọjọọ ha mere ka ha ghara ịbụ ezigbo ndị enyi—n’agbanyeghị na ha bụ ụmụ onyeisi nchụàjà. A sị na Samuel gara biwe ndụ ka ha, nke a gaara eme ka ya na Chineke gharazie ịdị ná mma! Ma, nke ahụ abụtụghị ihe Samuel chọrọ! Bible kwuru, sị: “Nwa okoro ahụ, bụ́ Samuel, wee na-eto na-aga n’ihu, o wee dị mma, ma n’ebe Jehova nọ, ma n’ebe mmadụ nọ.” (1 Samuel 2:26) Olee mmadụ ndị ọ bụ? O doro anya na ọ bụghị Họfnaị na Finihas, ndị ọ pụrụ ịbụ na ha gbaara Samuel ọsọ n’ihi àgwà ọma ya. Kama nke ahụ, ndị àgwà ọma Samuel dị mma bụ ndị na-agbaso ụkpụrụ Chineke. Ndị hụrụ Jehova n’anya bụ ụdị ndị ọ dị mkpa ka i mete enyi!
▪ Na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị. (Ilu 15:15) Ọ na-adị onye ọ bụla mgbe ụfọdụ ka à na-akpapụ ya iche—ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ruo ókè ụfọdụ. Gịnị pụrụ inyere gị aka ma ọ́ dị gị otú ahụ? Kama ịnọ na-echegbu onwe gị, gbalịsie ike ile ndụ anya otú kwesịrị ekwesị. Cheta na ọ bụ eziokwu na ị pụghị ịchịkwa ihe nile na-eme gị ná ndụ, ị pụrụ ịchịkwa ihe ị na-eme banyere ihe ndị ahụ na-eme gị ná ndụ.
Mgbe ọ bụla ọ dị gị ka à na-akpapụ gị iche, mee ihe iji gbanwee ọnọdụ ahụ ma ọ bụkwanụ, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, iji gbanwee otú i si ele ya anya. Na-echeta mgbe nile na Jehova maara otú e si kee gị, n’ihi ya, ọ maara ihe ndị na-akpa gị, na ụzọ kasị mma isi gboo mkpa ndị ahụ. Kpegara Jehova ekpere banyere owu ọmụma ọ bụla ọ pụrụ ịbụ na ị nọgidere na-enwe. Obi siekwa gị ike na ‘ya onwe ya ga-anagide gị.’—Abụ Ọma 55:22.
Ị pụrụ ịhụ isiokwu ndị ọzọ dị n’usoro isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . ” n’ebe a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet nke adres ya bụ www.watchtower.org/ype
IHE NDỊ A GA-ECHEBARA ECHICHE
▪ Olee ihe ndị dị mma m pụrụ ime ma ọ bụrụ na ọ na-adị m ka à na-akpapụ m iche?
▪ Olee akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị pụrụ inyere m aka ile onwe m anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị kama ịnọ na-echegbu onwe m?
[Igbe/Foto dị na peeji nke 23]
Ihe Ndị Na-enye Aka Ịmalite Mkparịta Ụka
▪ Nwee ihu ọchị. Ihu ọchị gị ga-eme ka ndị ọzọ nwee mmasị iso gị kparịta ụka.
▪ Kọwaa onwe gị. Kwuo aha gị na ebe i si.
▪ Jụọ ajụjụ. Ọ bụ eziokwu na i kwesịghị ịchọ ịmatacha ihe nile, jụọ ajụjụ ndị kwesịrị ekwesị banyere ebe onye ahụ si na otú e si zụlite ya.
▪ Na-ege ntị. Anọla na-eche banyere ihe ị ga-ekwu ma onye ahụ kwusịa. Hụ na ị na-ege ya ntị nke ọma. Ihe ị ga-ekwu ma o kwusịa ga-abịara onwe ya.
▪ Achụla ya n’ike! Mkparịta ụka gị na mmadụ na-enwe pụrụ ime ka gị na ya bụrụ enyi. Ya mere, hụ na unu kparuru ya ala!