Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chọọnụ Ezi Ndụmọdụ

Chọọnụ Ezi Ndụmọdụ

Nke 1

Chọọnụ Ezi Ndụmọdụ

Gịnị mere nke a ji dị mkpa? Na nke mbụ di na nwunye kuuru nwa mbụ ha, nke ha mụrụ ọhụrụ, echiche dị iche iche na-eju ha isi. Brett, bụ́ otu nna nke bi na Britain, sịrị: “Obi tọgburu m atọgbu, ọ dị m ka ọ̀ bụ ná nrọ. Ma, ọ dịkwa m ka m̀ nwetara ọrụ karịrị m akarị. O yiri m ka ọ̀ bụ na mụ adịbeghị njikere ịrụ ọrụ a.” Monica, bụ́ otu nne nke bi n’Argentina, sịrị: “Ihe nọ na-echegbu m bụ ma m̀ ga-enwekwa ike igboro obere nwa m nwanyị mkpa ya. M chere n’obi m, sị, ‘M̀ ga-enwe ike ịzụ ya ka ọ ghọọ ezigbo nwa agbọghọ?’”

Ị̀ ghọtara otú obi dị ndị ahụ mụrụ ụmụ, ma ọṅụ ma nchegbu ha na-enwe? N’ezie, ịzụ ụmụ bụ otu n’ime ọrụ kasị taa akpụ mmadụ ọ bụla nwere ike ịrụ. Ma, ọ na-enye obi ụtọ. Ọ bụ ọrụ na-echu ụra. Ma, uru dị na ya. Dị ka otu nna kwuru, “onye na-azụghị nwa ya nke ọma mgbe ọ dị obere enwekwaghị ohere ọzọ iji zụọ ya.” Ebe ọ bụ na ọ dị n’aka ndị mụrụ ụmụ ịhụ na ụmụ ha nwere ezi ahụ́ ike na obi ụtọ, ikekwe, ị hụla na ọ dị gị nnọọ mkpa inweta ezigbo ndụmọdụ banyere otú ị ga-esi bụrụ ezigbo nne ma ọ bụ ezigbo nna karịa ka ị bụ ugbu a.

Ihe mere o ji esi ike: O yiri ka mmadụ nile nwechara ndụmọdụ ha ga-enye banyere ịzụ ụmụ. N’oge ochie, mgbe di na nwunye mụrụ nwa mbụ ha, ọ bụ ihe nlereanya ndị mụrụ ha ma ọ bụ ihe okpukpe ha kụziiri ha ka ha na-elekwasị anya azụ ụmụ ha. Ma n’ọtụtụ mba, ezinụlọ na-adakpọsị adakpọsị, ndị mmadụ ejikwaghị okpukpe kpọrọ ihe. N’ihi ya, ọtụtụ ndị mụrụ ụmụ na-agakwuru ndị ọkà n’inye ndụmọdụ banyere otú e si azụ ụmụ ka ha nye ha ndụmọdụ. Ụfọdụ n’ime ndụmọdụ ndị ọkà a na-enye dabeere n’ụkpụrụ ziri ezi. Ma ọtụtụ mgbe, ndụmọdụ nke otu onye ọkà nwere ike ịdị iche na nke ibe ya. Obere oge, ndụmọdụ ha nwere ike ghọọ ihe oge ya gafere.

Ihe ga-enyere unu aka: Chọọnụ ndụmọdụ nke Onye ahụ kacha mara otú e si azụ ụmụ, ya bụ, Onye nyere mmadụ ndụ, bụ́ Jehova Chineke. (Ọrụ 17:26-28) N’Okwu ya, bụ́ Bible, e nwere ndụmọdụ doro anya na ihe nlereanya bara uru ndị nwere ike inyere gị aka ịbụ ezigbo nne ma ọ bụ ezigbo nna karịa ka ị bụ ugbu a. O kwere nkwa, sị, “M ga-adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa gị n’ahụ́.”—Abụ Ọma 32:8.

Olee ndụmọdụ Chineke nyere ndị mụrụ ụmụ nke nwere ike inyere ha aka ịzụlite ụmụ ha ka ha nwee obi ụtọ?

[Ihe Odide Gbatụrụ Okpotokpo nke dị na peeji nke 21]

“Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala nghọta gị.”—Ilu 3:5