Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gosinụ na Ọ Bụ Unu Ka Ikike Dị n’Aka

Gosinụ na Ọ Bụ Unu Ka Ikike Dị n’Aka

Nke 3

Gosinụ na Ọ Bụ Unu Ka Ikike Dị n’Aka

Gịnị mere nke a ji dị mkpa? Dị ka magazin bụ́ Parents kwuru, nnyocha ndị e mere na-egosi na “ndị nne na nna, bụ́ ndị hụrụ ụmụ ha n’anya ma na-atụrụ ha ihe ha ga na-eme, ya bụ, nne na nna ndị na-akwado ụmụ ha ma na-agwa ha ihe ndị ha ga na-eme na ihe ndị ha na-agaghị eme, na-azụpụta ụmụaka ndị na-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ, ndị na-amụtakwu àgwà ndị ga-enyere ha aka ná mmekọrịta ha na ndị ọzọ, nakwa ndị na-enwe afọ ojuju n’ime onwe ha. Obi na-atọkwa ụmụ ha ụtọ karịa ụmụaka ndị nne na nna ha na-agbachi nkịtị ka ha mewe otú masịrị ha ma ọ bụ ndị nne na nna ha ji aka ike na-azụlite.”

Ihe mere o ji esi ike: Malite mgbe e ku ụmụaka n’aka ruo mgbe ha nọ afọ iri na ụma, ha agaghị achọ ka ị na-atụrụ ha ihe ha ga-eme. John Rosemond, onye dere akwụkwọ bụ́ Parent Power!, dere, sị: “Ọ na-adịrị ụmụaka mfe ịchọpụta mgbe obi na-akaghị ndị mụrụ ha ịtụrụ ha ihe ha ga-eme nakwa mgbe ọ na-enweghị ihe ndị mụrụ ha ga-eme ha ma ha daa iwu.” O kwukwara, sị, “A bịa ‘n’Onye bụ́ onyeisi,’ ọ bụrụ na ndị mụrụ ụmụ egosighị na ọ bụ ha bụ ndị isi, ụmụ ha ga-aghọzi ndị isi.”

Ihe ga-enyere unu aka: Unu echela na ụmụ unu ga-agbara unu ọsọ ma ọ bụ na obi ga-ada ha mbà ma ọ bụrụ na unu egosi na ọ bụ unu ka ikike dị n’aka. Jehova bụ́ Chineke, Onye malitere ndụ ezinụlọ, achọghị ka ụmụaka soro ndị mụrụ ha na-atụ ihe ndị na-eme n’ezinụlọ. Kama nke ahụ, ọ họpụtara ndị nne na nna ka ha bụrụ ndị isi. O nyekwara ụmụaka iwu, sị: “Na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi.”—Ndị Efesọs 3:14, 15; 6:1-4.

Unu nwere ike igosi ụmụ unu na ọ bụ unu ka ikike dị n’aka n’achịghị ha n’aka ike. Olee otú unu ga-esi mee nke a? Ọ bụ site n’iso ihe nlereanya Jehova. N’agbanyeghị na o nwere ikike ịmanye ụmụ ya bụ́ mmadụ ka ha na-eme uche ya, ọ na-agwa anyị okwu otú ga-eme ka anyị na-eme ihe dị mma. Okwu ya sịrị: “Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na ị ṅararịị ntị n’ihe nile M nyere n’iwu! udo gị ewee dịworịị ka osimiri.” (Aịsaịa 48:18) Jehova chọrọ ka anyị na-erubere ya isi, ọ bụghị maka na anyị na-atụ ya ụjọ, kama, n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya. (1 Jọn 5:3) Ezi uche dị n’ihe ndị ọ chọrọ anyị n’aka. Ọ makwaara na anyị ga-erite uru ma ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ omume ọma o nyere anyị.—Abụ Ọma 19:7-11.

Olee ihe ga-eme ka obi kaa unu igosi ụmụ unu na ọ bụ unu ka ikike dị n’aka n’achịghị ha n’aka ike? Nke mbụ, obi kwesịrị isi unu ike na nke a bụ ihe Chineke chọrọ n’aka unu. Nke abụọ, obi ga-esirịrị unu ike na ọ kachaara unu na ụmụ unu mma ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ omume ọma Chineke nyere anyị.—Ndị Rom 12:2.

Olee kpọmkwem ihe ndị unu ga na-eme iji gosi na ọ bụ unu ka ikike dị n’aka?

[Ihe Odide Gbatụrụ Okpotokpo nke dị na peeji nke 23]

“Dọọ nwa gị aka ná ntị, . . . ọ ga-enye mkpụrụ obi gị ihe ụtọ.”—Ilu 29:17.