Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mee Ka Ezinụlọ Unu Bụrụ Ebe Nchebe

Mee Ka Ezinụlọ Unu Bụrụ Ebe Nchebe

Mee Ka Ezinụlọ Unu Bụrụ Ebe Nchebe

“NDỊ na-enweghị obi mmadụ.” Ọ bụ otú ahụ ka Bible si kọwaa ọtụtụ ndị bi n’oge anyị a nke a na-akpọ ‘ụbọchị ikpeazụ.’ (2 Timoti 3:1, 3, 4) Otú imetọ ụmụaka si ju ebe nile n’ezinụlọ bụ ihe àmà doro anya na amụma ahụ bụ eziokwu. N’eziokwu, okwu Grik bụ́ aʹstor·gos, nke a sụgharịrị ‘enweghị obi mmadụ’ n’Igbo, na-egosi na ụdị ịhụnanya nke kwesịrị ịdị n’ezinụlọ ga-akọ ụkọ, karịsịa, n’etiti ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha. * Ọ na-abụkarịkwa mgbe a na-enweghị ụdị ịhụnanya a ka a na-emetọ nwatakịrị.

Ụfọdụ ndị na-eme nnyocha sịrị na ndị kasị arụ ụdị arụrụala a bụ ndị nna. Ndị ọzọ so arụ ya bụ ndị ikwu bụ́ ndị nwoke. Ọ bụ eziokwu na ọ bụ ụmụntakịrị nwanyị ka a na-emetọkarị, a na-emetọkwa ụmụntakịrị nwoke. Ụmụ nwanyị sokwa arụ arụrụala a karịa ka i nwere ike iche. Ikekwe, ụdị arụrụala a na-adịghị ekwulitekarị bụ nwanne idina nwanne ya. Otú ha si eme ya bụ na onye nke tọrọ ibe ya ma ọ bụ nke ka ibe ya ike ga-amanye onye nke ọ tọrọ ma ọ bụ onye ọ ka ike ka ya na ya nwee mmekọahụ. Ma ọ bụkwanụ rata nwanne ya nwoke ma ọ bụ nwanne ya nwanyị nke ọ tọrọ ma ọ bụ nke ọ ka ike ka ya na ya nwee mmekọahụ. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ụdị omume ndị a ga na-agba gị agba ná ntị ịnụ.

Gịnị ka ị ga-eme ka a ghara inwe nsogbu ndị a n’ezinụlọ unu? O doro anya na ọ dị onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ọ bụla mkpa ịmụta ụkpụrụ ụfọdụ ndị katọrọ ime omume rụrụ arụ na iji ụkpụrụ ndị ahụ kpọrọ ihe. Ebe kasị mma isi nweta ụdị nduzi ahụ bụ n’Okwu Chineke, bụ́ Bible.

Ihe Okwu Chineke Kwuru Banyere Mmekọahụ

Ka ezinụlọ wee bụrụ ebe nchebe, onye ọ bụla nọ na ya kwesịrị ịdị na-eme omume otú Bible kwuru ka a na-eme ya. Bible adịghị ezo ọnụ n’okwu metụtara mmekọahụ. Ọ na-ekwu ya hoo haa, nakwa n’ụzọ dị ùgwù. O kwuru na Chineke mere ka mmekọahụ bụrụ ihe na-enye di na nwunye obi ụtọ. (Ilu 5:15-20) Ma, ọ kagburu mmadụ na onye ọ bụla na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ya inwe mmekọahụ. Dị ka ihe atụ, Bible kwuru hoo haa na mmadụ na onye ikwu ya inwe mmekọahụ jọgburu onwe ya. Na Levitikọs isi nke iri na asatọ, a kagburu ụdị dị iche iche nke mmadụ na onye ikwu ya inwe mmekọahụ. Lee ihe e kwuru ebe a: ‘Nwoke ọ bụla abịarula nso onye ahụ́ ya ọ bụla, ikpughe ọtọ ya [ka ya na ya nwee mmekọahụ]: Mụ onwe m bụ Jehova.’—Levitikọs 18:6.

Jehova gụnyere mmadụ idina onye ikwu ya n’ime “ihe arụ” ndị ọ ga-abụ onye mee ya, e gbuo ya. (Levitikọs 18:26, 29) N’ezie, Onye Okike adịghị ewere okwu a dị ka obere okwu. Taa, ọtụtụ ndị ọchịchị adịghịkwa ele ya anya dị ka obere okwu. Ha etiela iwu ndị kagburu mmadụ idina onye ikwu ya. Iwu ndị ahụ na-ekwukarị na ọ bụrụ na onye toro eto edinaa nwatakịrị, ihe onye ahụ toro eto mere bụ idina mmadụ n’ike. Olee ihe mere o ji bụrụ otú ahụ ebe ọ bụ na onye ahụ amanyeghị nwa ahụ amanye?

Ọtụtụ ndị ọchịchị aghọtala ihe Bible nọ na-ekwu kemgbe banyere ụmụaka, ya bụ, na ha anaghị eche echiche otú ndị toro eto si eche. Dị ka ihe atụ, Ilu 22:15 kwuru, sị: “Uche gbagọrọ agbagọ bụ ihe e kekọtaworo n’obi nwata.” Pọl onyeozi dekwara n’ike mmụọ nsọ, sị: “Mgbe m bụ nwa ọhụrụ, m . . . na-eche echiche dị ka nwa ọhụrụ, na-ele ihe anya dị ka nwa ọhụrụ; ma ugbu a m ghọworo dimkpa, ewepụwo m omume nwa ọhụrụ.”—1 Ndị Kọrint 13:11.

Nwatakịrị enweghị ike ịghọtacha ihe inwe mmekọahụ pụtara, o nweghịkwa ike iji echiche ya mata ihe ga-emecha si n’inwe mmekọahụ pụta n’ọtụtụ afọ na-abịa abịa. N’ihi ya, n’ọtụtụ ebe, e weere ya na ụmụaka amaghị ihe ha na-eme mgbe ha kwetara ka ha na mmadụ nwee mmekọahụ. Otú ọzọ e nwere ike isi kwuo ya bụ na ọ bụrụ na onye toro eto (ma ọ bụ onye ntorobịa tolitetụrụlanụ) edinaa nwatakịrị, ọ gaghị azọrọli isi ya ma o kwuo na nwa ahụ ajụghị mgbe ọ na-edina ya, ma ọ bụ na ọ bụ nwa ahụ sịrị ya dinaa ya. Ikpe idina mmadụ n’ike mara onye ahụ. Ihe o mere bụ mpụ, ntaramahụhụ ya na-abụkarịkwa ịtụ onye ahụ mkpọrọ. Ọ bụ onye ahụ nke dinara mmadụ n’ike ka ikpe mara, ọ bụghị onye ahụ e dinara n’ike.

Ma, ọ dị mwute na ndị ọchịchị adịghị ata ọtụtụ ndị mere ụdị mpụ ahụ ahụhụ n’oge anyị a. Dị ka ihe atụ, n’Australia, a chọpụtala na ọ bụ nanị otu onye n’ime mmadụ iri ọ bụla nke mere ụdị mpụ ahụ ka a na-akpụpụ n’ụlọ ikpe, ọ bụkwa ole na ole n’ime ha ka a na-ama ikpe. Otú ahụ ka ọ dịkwa ná mba ndị ọzọ. Ọ bụ ezie na ndị ọchịchị nwere ike ime ihe ụfọdụ iji chebe ezinụlọ Ndị Kraịst, itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ nwere ike ichebe ha karịsịa.

Ezi Ndị Kraịst ghọtara na Chineke ahụ nke mere ka e dee ụkpụrụ ndị ahụ n’Okwu ya agbanwebeghị. Ọ na-ahụ ihe ọ bụla anyị na-eme, ọbụna ndị nke ọtụtụ mmadụ na-agaghị ahụli. Bible kwuru, sị: ‘Ọ dịghị ihe e kere eke nke na-apụtaghị ìhè n’anya ya, ma ihe nile gba ọtọ ma bụrụ ndị e kpughepụrụ ekpughepụ n’anya onye ahụ anyị ga-aza ajụjụ.’—Ndị Hibru 4:13.

Anyị ga-aza Chineke ajụjụ ma ọ bụrụ na anyị emebie iwu ya ma mee ihe ga-ewute ndị ọzọ. N’aka nke ọzọ, ọ na-agọzi anyị maka idebe iwu ndị bara uru o nyere banyere ezinụlọ. Olee ụfọdụ n’ime iwu ya ndị a?

Ezinụlọ nke Ịhụnanya Mere Ka Ha Dịrị n’Otu

Bible na-agwa anyị na “ịhụnanya” bụ “ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.” (Ndị Kọlọsi 3:14) Dị ka Bible kọwara, mmadụ anaghị enwe ịhụnanya nanị n’ime obi ya. Kama nke ahụ, ịhụnanya na-apụta ìhè n’ihe ndị ọ na-akpali onye ahụ ime, ya bụ, n’àgwà ndị ọ na-akpali onye ahụ ịkpa na omume ndị ọ na-akpali onye ahụ izere. (1 Ndị Kọrint 13:4-8) N’ime ezinụlọ, igosi ịhụnanya pụtara iji nkwanye ùgwù, nsọpụrụ, na obiọma na-emeso onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ihe. Ọ pụtara mmadụ ibi ụdị ndụ na-egosi na ya na-ele onye ọ bụla n’ezinụlọ ya anya otú Chineke si ele ya. Chineke nyere onye nke ọ bụla ọrụ dị ùgwù na nke dị mkpa ọ ga na-arụ.

Onyeisi ezinụlọ, bụ́ nna, kwesịrị ibute ụzọ n’igosi ndị ọzọ ịhụnanya. Ọ ghọtara na e nyeghị Onye Kraịst bụ́ nna ikike ịchị ezinụlọ ya ọchịchị aka ike, ya bụ, imesi nwunye ya na ụmụ ya ike. Kama nke ahụ, ọ na-amụta otú e si achị isi n’aka Kraịst. (Ndị Efesọs 5:23, 25) N’ihi ya, ọ na-eji obiọma na ịhụnanya na-emeso nwunye ya ihe, jirikwa ndidi na obi ebere na-emeso ụmụ ya ihe. Ọ na-echebe ha nke ọma. Ọ na-emekwa ihe nile o nwere ike ime iji hụ na ihe ọ bụla anapụghị ha udo ha na ùgwù ha. Ọ na-emekwa nke a ka ihe ọ bụla ghara ime ka obi koro ha n’elu.

N’otu aka ahụ, onye bụ́ nwunye, bụrụkwa nne, nwere ọrụ dị oké mkpa, nke dịkwa ùgwù. Bible ji ihe atụ nke otú nnekwu ọkụkụ si echebe ụmụ ya tụnyere otú Jehova na Jizọs si echebe ndị ha. (Matiu 23:37) N’otu aka ahụ, nne kwesịrị iji ichebe ụmụ ya kpọrọ ihe. Ịhụnanya na-akpali ya ime ihe nile o nwere ike ime iji hụ na e nweghị ihe ga-eme ha, hụkwa na obi dị ha ụtọ tupu ya ahụwa maka mkpa nke onwe ya. Nne ma ọ bụ nna ekwesịghị imesi di ma ọ bụ nwunye ya ike, na-eti ya ihe, na-amaja ya, ma ọ bụkwanụ na-emegbu ya. Ha ekwesịghịkwa ịdị na-emeso ụmụ ha otú ahụ; ha agaghịkwa ekwe ka ụmụ ha si otú ahụ na-emeso ụmụnne ha.

Ọ bụrụ na onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ana-asọpụrụ ibe ya ma na-akwanyere ibe ya ùgwù, ha ga na-enwe ezigbo nkwurịta okwu. Lee ihe onye na-ede akwụkwọ bụ́ William Prendergast kwuru: “Ndị nne na nna nile na ụmụ ha ndị obere na ndị nke nọ n’oge uto kwesịrị ịdị na-ekwurịta okwu nke ọma kwa ụbọchị nakwa n’oge nile.” O kwukwara, sị: “Ọ dị ka nke a ọ̀ bụ ụzọ kasị mma a ga-esi gwọta nsogbu imetọ mmadụ.” N’eziokwu, ọ bụ nnọọ ụdị nkwurịta okwu a e ji ịhụnanya enwe mgbe nile ka Bible gbara ume ka a na-enwe. (Deuterọnọmi 6:6, 7) Ọ bụrụ na e tinye ntụziaka ahụ n’ọrụ, onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ unu ga-enwere onwe ya ikwu ihe dị ya n’obi n’atụghị ụjọ.

N’eziokwu, anyị bi n’ụwa ajọ omume, ọ bụghịkwa ụdị mmetọ nile ka e nwere ike izetecha. N’agbanyeghị nke a, ezinụlọ nke bụ́ ebe nchebe nwere ike ime ka ihe ka nnọọ mma. Ọ bụrụ na e mejọọ mmadụ n’èzí, ọ maara na ọ ga-aga n’ezinụlọ ya iji nweta nkasi obi na agbamume. Ezinụlọ dị otú ahụ bụ ebe nchebe n’ezie n’ụwa a nke nsogbu jupụtara. Ka Chineke gọzie mgbalị ị na-eme iji mee ka ezinụlọ unu bụrụ ụdị ebe ahụ!

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 2 A na-akọwa okwu Grik ochie a dị ka: “Mmadụ inwere ndị ikwu ya obi ọjọọ.” Otu nsụgharị Bible si otú a kwuo ya: ‘Ndị na-adịghị ahụ ndị ezinụlọ ha n’anya.’

[Igbe/Foto dị na peeji nke 10]

ARO NDỊ GA-ENYE AKA MEE KA ỤLỌ UNU BỤRỤ EBE NCHEBE

Intanet: Ọ bụrụ na ụmụ gị na-aga n’Intanet, e kwesịrị ịkụziri ha ebe ndị ha ga-aga na ebe ndị ha na-agaghị aga ka ha ghara ịdaba ná nsogbu. E nwere ọtụtụ ebe a na-edebe foto ndị gba ọtọ na ebe a na-akparịta ụka n’Intanet, nakwa ebe ndị yiri nke ahụ. Ndị na-emetọ ụmụaka na-eje ebe ndị ahụ achọgharị ụmụaka ma na-arata ha. Ọ bụ ihe amamihe dị na ya ma ndị mụrụ ụmụ debe kọmputa ha n’ebe na-ezoghị ezo, bụ́ ebe ọ ga-adịrị ha mfe ịchọpụta ihe ụmụ ha ji ya eme. Ndị nne na nna kwesịrị ịhụ na ụmụ ha agaghị agwa onye ọ bụla banyere onwe ha, ma ọ bụ mee ndokwa ka ha gaa hụ onye ha na ya kparịtara n’Intanet, ọ gwụkwala ma nne na nna ha hà kwadoro ka ha mee otú ahụ.—Abụ Ọma 26:4.

Mmanya Na-aba n’Anya: Ihe mere ọtụtụ ndị ji metọọ ụmụaka bụ n’ihi na ha ṅụrụ mmanya. Ahụmahụ na-egosi na ndị toro eto, bụ́ ndị na-aṅụ oké mmanya anachaghị ejideli onwe ha; ụfọdụ n’ime ha na-eme ihe ndị ha na-agaraghị achọ ime ma a sị na mmanya anaghị egbu ha. Otú o sina dị, nke a na-eme ka e nwekwuo ihe mere e kwesịrị iji na-erube isi na ndụmọdụ Bible nyere ka mmadụ ghara ịbụ onye aṅụrụma na onye na-aṅụbiga mmanya oké.—Ilu 20:1; 23:20, 31-33; 1 Pita 4:3.

Inyetụ Mmadụ Ohere: Otu nwanyị kwuru, sị: “Mgbe mama anyị nwụrụ, ọ bụ nanị papa anyị bụ onye nọ n’ụlọ anyị nke ji ákwà gechie windo ime ụlọ ya na ọnụ ụzọ ime ụlọ ya. Ọ naghị enyetụ anyị ohere—ọbụna mgbe anyị na-asa ahụ́.” Nwoke ahụ metọrọ ụmụ ya ndị nwanyị nile. Onye ọ bụla n’ezinụlọ kwesịrị ịghọta na ọ dị mkpa inyetụ ibe ya ohere mgbe ụfọdụ. Dị ka ọ dị nne na nna mkpa ịnọ nanị ha mgbe ụfọdụ n’enweghị nwa ha ha na ya nọ, ha kwesịkwara ịhapụ ụmụ ha mgbe ụfọdụ ka ha nọrọ nanị ha ka ha na-eto. Ndị nne na nna ndị maara ihe na-emeso ndị ọzọ ihe otú ha chọrọ ka a na-emeso ha.—Matiu 7:12.