Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Meenụ Ka Iwu Na-achị Ezinụlọ Unu Doo Ụmụaka Anya, Hụkwanụ Ozugbo na Ha Na-edebe Ya

Meenụ Ka Iwu Na-achị Ezinụlọ Unu Doo Ụmụaka Anya, Hụkwanụ Ozugbo na Ha Na-edebe Ya

Nke 4

Meenụ Ka Iwu Na-achị Ezinụlọ Unu Doo Ụmụaka Anya, Hụkwanụ Ozugbo na Ha Na-edebe Ya

Gịnị mere nke a ji dị mkpa? Ronald Simons, bụ́ ọkà ná mmụta mmekọrịta ọhaneze na Mahadum Georgia, sịrị, “Nke bụ́ eziokwu bụ na ụmụaka na-aka eme nke ọma ma ọ bụrụ na e nyere ha iwu dị iche iche a kapịrị ọnụ, na-adọkwa ha aka ná ntị mgbe ọ bụla ha dara iwu ndị ahụ. Ọ bụrụ na e meghị nke a, ụmụaka na-eche nanị banyere onwe ha, na-achọkwa nanị ọdịmma onwe ha. Obi na-ajọkwa ha njọ. Ha na-emekwa ka ahụ́ ghara iru onye ọ bụla nọ ha nso ala.” Okwu Chineke kwuru hoo haa, sị: ‘Onye na-ahụ nwa ya n’anya na-adọsi ya aka ná ntị ike.’—Ilu 13:24.

Ihe mere o ji esi ike: Ime ka àgwà ụmụ gị kwesịrị ịkpa na àgwà ha na-ekwesịghị ịkpa doo ha anya na ịhụ na ha na-erube isi n’ihe unu kwuru na-ewe oge. Ọ chọkwara mgbalị na inwe ndidi. O yikwara ka ụmụaka hà na-achọkarị ịma ma o nwere ihe a ga-eme ha ma ha daa iwu ndị ahụ. Mike na Sonia, bụ́ ndị na-azụ ụmụntakịrị nwanyị abụọ, kwuru isi ihe mere o ji esi ike ime ka iwu na-achị ezinụlọ doo ụmụaka anya nakwa ịhụ ozugbo na ha na-edebe ya. Ha sịrị, “ụmụaka nwere uche, nweekwa ọchịchọ nke ha. Ha na-achọkarịkwa ime mmehie.” Di na nwunye a hụrụ ụmụ ha n’anya nke ukwuu. Ma ha kwetara na “mgbe ụfọdụ, ụmụaka na-eme isi ike, na-achọkwa nanị ọdịmma onwe ha.”

Ihe ga-enyere unu aka: Ṅomie otú Jehova si meso mba Izrel ihe. Otu n’ime ụzọ o si gosi na ọ hụrụ ndị ya n’anya bụ ime ka iwu ọ chọrọ ka ha na-agbaso doo ha anya. (Ọpụpụ 20:2-17) Ọ kọwara ihe dị iche iche ga-eme ha ma ọ bụrụ na ha erubeghị isi n’iwu ndị ahụ.—Ọpụpụ 22:1-9.

Ya mere, ọ ga-adị mma ka unu depụta iwu ndị ga na-achị ezinụlọ unu, bụ́ ndị unu chere na ụmụ unu aghaghị irubere isi. Ụfọdụ ndị mụrụ ụmụ tụrụ aro ka e depụta nanị iwu ole na ole, ikekwe, ihe dị ka iwu ise. Ọ gaghị esicha ike ịhụ na ụmụaka na-edebe iwu na-achị ezinụlọ ha bụ́ ndị e leziri anya họrọ, ma ọ bụrụ na iwu ndị ahụ dị ole na ole. O yikwara ka ọ ga-aka mfe icheta ha. Mgbe unu depụtachara iwu ndị ahụ, deenụ ihe unu ga-eme onye dara ha. Hụkwanụ na ahụhụ unu ga-enye ha ma ha daa iwu ndị ahụ bụ ahụhụ kwesịrị ekwesị, nakwa na unu dị njikere inye ha ahụhụ ahụ. Na-atụleghachinụ iwu ndị ahụ mgbe nile, ka onye ọ bụla—ma nne ma nna—mara kpọmkwem ihe a chọrọ n’aka ya.

Ọ bụrụ na ha adaa iwu ndị ahụ, nyenụ ha ahụhụ ozugbo. Wedanụ obi ala mgbe ọ bụla unu na-enye ha ahụhụ. Unu ejikwala ya mere ihe egwuregwu. Burunụ nke a n’uche: Ọ bụrụ na iwe ji unu, cherenụ ruo mgbe obi dajụrụ unu tupu unu adọọ nwa unu aka ná ntị. (Ilu 29:22) Otú ọ dị, unu egbula oge. Unu ahapụla nwatakịrị ka ọ họrọ ihe ọ ga-achọ ka unu mee ya. Ọ bụrụ na unu mee otú ahụ, nwa unu ga-eche na ọ dịghị mkpa ka o jiri iwu ndị ahụ kpọrọ ihe. Nke a yiri ihe Bible kwuru, sị: “N’ihi na e meghị ihe e kpere n’ikpe megide ọrụ ọjọọ ọsọ ọsọ, n’ihi nke a obi ụmụ mmadụ juru eju n’ime ha ime ihe ọjọọ.”—Eklisiastis 8:11.

Olee ụzọ ọzọ unu ga-esi gosi ụmụ unu na ọ bụ unu ka ikike dị n’aka bụ́ nke ga-abara ha uru?

[Ihe Odide Gbatụrụ Okpotokpo nke dị na peeji nke 24]

“Nanị ka Ee unu kwuru bụrụ Ee, Ee e unu abụrụ Ee e.”—Matiu 5:37