Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbakọ Distrikti “Na-eso Kraịst!” nke Ndịàmà Jehova

Mgbakọ Distrikti “Na-eso Kraịst!” nke Ndịàmà Jehova

Mgbakọ Distrikti “Na-eso Kraịst!” nke Ndịàmà Jehova

Mgbakọ abalị atọ a malitere na United States n’ọnwa May. A ga-enwegide ya ruo afọ 2008 n’ọtụtụ narị obodo n’ụwa dum. N’ọtụtụ ebe, ihe omume ya ga-eji abụ olu ụtọ malite na Friday ma o jiri nkeji iri abụọ gafee elekere itoolu nke ụtụtụ. Kwa ụbọchị, ihe omume mgbakọ a ga na-ekwu banyere Jizọs.

Isiokwu usoro ihe omume ụbọchị Friday bụ “Na-elegide Anya n’Ebe Onye Nnọchiteanya Ukwu na Onye Mmezu nke Okwukwe Anyị Nọ, Bụ́ Jizọs.” (Ndị Hibru 12:2) Okwu a ga-eji nabata ndị bịara mgbakọ a bụ “Gịnị Mere Anyị Ga-eji Na-eso ‘Kraịst’?” A ga-enwekwa okwu mmadụ atọ ga-ekwu nke bụ́ “Ịmata na Jizọs Bụ Mozis ahụ Ka Ukwuu, Devid ahụ Ka Ukwuu, Sọlọmọn ahụ Ka Ukwuu.” Okwu ọzọ a ga-ekwu n’usoro ihe omume nke ụtụtụ bụ okwu bụ́ isi nke isiokwu ya bụ “Ọrụ Pụrụ Iche Jizọs Na-arụ n’Imezu Nzube Jehova.”

N’ehihie Friday, okwu mbụ a ga-ekwu bụ “‘Anyị Ahụwo Mesaya Ahụ’!” Nke ga-esochi ya bụ “Ịchọta Akụ̀ Niile Dị Oké Ọnụ Ahịa ‘E Ji Nlezianya Zochie n’Ime Kraịst.’” N’okwu ga-ewe otu awa, nke mmadụ ise ga-ekwu, nke bụ́ “Nwee Ụdị Echiche Kraịst Nwere,” mmadụ atọ n’ime ha ga-atụle isiokwu bụ́ “O ‘Ji Obiọma Nabata Ha,’” “O ‘Rubere Isi Ruo Ọnwụ,’” na “Ọ Hụrụ Ha n’Anya Ruo Ọgwụgwụ.” Okwu a ga-eji pịachie usoro ihe omume ehihie bụ “Ha ‘Na-eso Nwa Atụrụ ahụ n’Agbanyeghị Ebe Ọ Na-eje.’”

Isiokwu usoro ihe omume Saturday bụ “Atụrụ M Na-ege Ntị n’Olu M, . . . Ha Na-esokwa M.” (Jọn 10:27) N’okwu ga-ewe otu awa nke mmadụ atọ ga-ekwu, nke bụ́, “Soro Ihe Nlereanya Jizọs Setịpụrụ n’Ozi Ya,” a ga-atụ aro bara uru ndị ga-eme ka anyị na-emekwu nke ọma n’ozi anyị. Mgbe e kwusịrị okwu bụ́ “Ọ ‘Hụrụ Ezi Omume n’Anya, Ọ Kpọkwara Mmebi Iwu Asị’—Ị̀ Na-eme Otú Ahụ?” na “‘Na-eguzogide Ekwensu’ Dị Ka Jizọs Guzogidere Ya,” a ga-eji okwu baptizim pịachie usoro ihe omume ụtụtụ. E mesịa, a ga-eme ndị ruru eru baptizim.

Ihe omume ehihie Saturday ga-eji okwu mmadụ isii ga-ekwu nke bụ́ “Esola Ìgwè Mmadụ,” “Esola Obi Unu na Anya Unu,” “Esola Ihe Efu,” “Esola Ndị Ozizi Ụgha,” “Esola Akụkọ Ụgha,” na “Esola Setan,” malite. Okwu ndị ga-esochi ya bụ “Ọ Dịghị Ihe Ka Ịbụ Ndị ‘Jehova Kụziiri Ihe’” na “Nyere Ha Aka Ịlọghachi n’Ìgwè Atụrụ Ahụ.” Okwu ikpeazụ a ga-ekwu n’ụbọchị ahụ nke bụ́ “Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M” dị mkpa nke ukwuu ná mgbakọ a.”

Isiokwu usoro ihe omume Sunday bụ “Na-eso M.” (Jọn 21:19) Mgbe e kwusịrị okwu bụ́ “Arịọla Ka ‘A Hapụ Gị’ n’Iso Kraịst,” okwu mmadụ isii ga-ekwu nke bụ́ “Ihe Ndị Bara Oké Uru A Na-amụta n’Ozizi Elu Ugwu Ahụ” ga-eleba anya n’okwu Jizọs kwuru, ndị dị ka: “Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Maara Mkpa Ime Mmụọ Ha,” “Buru Ụzọ Mee Ka Gị na Nwanne Gị Dị n’Udo,” na “Na-enyenụ Ihe, Ndị Mmadụ Ga-enyekwa Unu Ihe.” A ga-eji okwu ihu ọha bụ́ “Ole Ndị Bụ Ezi Ndị Na-eso Ụzọ Kraịst?” pịachie ihe omume ụtụtụ. Ihe ga-akasị pụta ìhè n’ihe omume ehihie bụ ihe nkiri nke ga-adabere n’akụkọ Bible kọrọ banyere Gihezi, bụ́ nwoke anyaukwu nke jeere Ịlaịsha onye amụma Chineke ozi. Ndị nile ga-eme ihe nkiri a ga-eyi ụdị uwe a na-eyi n’oge ahụ. Okwu ga-apịachi mgbakọ a bụ “Nọgide Na-eso Kraịst, Bụ́ Onye Ndú Anyị A Na-apụghị Imeri Emeri!”

Mee ndokwa ugbu a ka ị gaa mgbakọ a. Iji mata ebe kacha dịrị gị nso a ga-enwe mgbakọ a, kpọtụrụ Ndịàmà Jehova n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha nke dị n’ógbè unu ma ọ bụ detara ndị bipụtara magazin a akwụkwọ. N’Ụlọ Nche nke June 1, 2007, bụ́ magazin a na-ebipụtakọ ya na nke a, e depụtara ebe ndị a ga-enwe mgbakọ a na Nigeria.