Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Anyị Ga-eji Na-elekọta Ụwa Anyị A?

Gịnị Mere Anyị Ga-eji Na-elekọta Ụwa Anyị A?

Echiche Baịbụl

Gịnị Mere Anyị Ga-eji Na-elekọta Ụwa Anyị A?

IKEKWE ihe dị iche iche ụmụ mmadụ na-eme na-emebi mbara ala anyị ugbu a karịa ka o metụrụla. Ka nsogbu ndị na-eyi ụwa egwu na-akakwu njọ, dị ka ụwa ikpo ọkụ karịa otú o kwesịrị, ndị ọkà mmụta sayensị, ndị gọọmentị, na ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ihe, na-agbakwu mbọ ilebara nsogbu ndị ahụ anya.

Ò nwere ihe onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ime iji nye aka na-elekọta ụwa anyị a? Ya bụrụ na e nwere, olee ókè anyị ga-enyeru aka? Baịbụl kwuru ezigbo ihe mere anyị ga-eji na-elekọta ụwa anyị a. Ọ na-enyekwara anyị aka ime nke a otú kwesịrị ekwesị.

Ịkwado Nzube Onye Okike Anyị

Jehova bụ́ Chineke kere ụwa ka ọ bụrụ ebe mara mma ụmụ mmadụ ga-ebi. O kwuru na ihe niile o kere “dị nnọọ mma,” nyekwa ụmụ mmadụ ọrụ ka ha “na-akọ ihe [n’ụwa] ma na-elekọta ya.” (Jenesis 1:28, 31; 2:15) Olee otú obi dị Chineke maka otú ụwa dị ugbu a? O doro anya na otú ụmụ mmadụ si emebi ihe e nyere ha ilekọta na-ewute ya nke ukwuu n’ihi na Mkpughe 11:18 kwuru na ọ ‘ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa.’ Ya mere, anyị ekwesịghị iche na ihe na-eme ụwa a agbasaghị anyị.

Baịbụl na-emesi anyị obi ike na mgbe Chineke ‘ga-eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ,’ ọ ga-edozi ihe niile ụmụ mmadụ mebiri n’ụwa a. (Mkpughe 21:5) Ma, anyị ekwesịghị ikwubi na ebe ọ bụ na Chineke ga-emecha dozie ụwa, ihe anyị na-eme ugbu a enweghị ihe o mere. O nwere ihe o mere! Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị na-ele ụwa anyị a anya otú Chineke si ele ya, na-emekwa ihe kwekọrọ n’uche ya nke bụ́ ime ka ụwa ghọọ paradaịs?

Iso Na-eme Ka Ụwa Dị Ọcha

Unyí na-esi n’ihe dị iche iche ụmụ mmadụ na-eme kwa ụbọchị apụta. Jehova ji amamihe kee ụwa ka ọ na-ewepụsị unyí ndị ahụ n’onwe ya, na-eme ka ikuku dị mma, na-emekwa ka mmiri na ala dị ọcha. (Ilu 3:19) Ihe anyị na-eme kwesịrị ịkwekọ n’otú ahụ o si kee ụwa. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara iso na-emebi ụwa anyị a. Ime otú ahụ na-egosi na anyị hụrụ ndị agbata obi anyị n’anya dị ka onwe anyị. (Mak 12:31) Tụlee ihe atụ magburu onwe ya e nwere na Baịbụl.

Chineke gwara mba Izrel ka ha lie nsị mmadụ “ná mpụga . . . ụlọikwuu.” (Diuterọnọmi 23:12, 13) Nke a mere ka ebe ndị ha mara ụlọikwuu dị ọcha. O mekwara ka nsị ha ree ngwa ngwa. Taakwa, ezi Ndị Kraịst na-agbalị ikpofu unyí n’ebe kwesịrị ekwesị n’egbughị oge ọ bụla. E kwesịrị ilezikwu anya mgbe a na-ekpofu ụdị unyí ndị nwere nsí n’ime ha.

E nwere ọtụtụ unyí ndị e nwere ike iji mee ihe ndị ọzọ. Ọ bụrụ na iwu na-achị obodo unu kwuru ka e jiri ụdị unyí ụfọdụ na-arụpụta ihe ndị ọzọ, irube isi na ya bụ otu ụzọ e si akwụ “Siza ihe Siza.” (Matiu 22:21) Iji unyí rụpụta ihe ndị ọzọ nwere ike ifukwu gị ihe. Ma, ọ na-egosi na ụwa nke dị ọcha na-agụ gị agụụ.

Emefusila Akụ̀ Ndị Si n’Ala

Akụ̀ ndị si n’ala dị anyị mkpa nke ukwuu iji rijuo afọ, biri n’ụlọ, nweta mmanụ ọkụ wee si otú a na-adị ndụ. Ihe anyị ji akụ̀ ndị ahụ eme ga-egosi ma ànyị ghọtara na ha bụ onyinye si n’aka Chineke. Mgbe anụ gụrụ ụmụ Izrel agụụ n’ala ịkpa, Jehova nyere ha ọtụtụ nnụnụ kwel. Anyaukwu na ịchọ naanị ọdịmma onwe ha mere ka ha jiri onyinye ahụ gwurie egwu. Nke a were Jehova bụ́ Chineke iwe nke ukwuu. (Ọnụ Ọgụgụ 11:31-33) Kemgbe ahụ, Chineke agbanwebeghị. N’ihi ya, ezi Ndị Kraịst anaghị emefusị ihe ebe ọ bụ na nke ahụ nwere ike igosi na mmadụ bụ onye anyaukwu.

Ụfọdụ nwere ike iche na o nweghị ihe o mere ma ha na-emefusị ọkụ eletrik ma ọ bụ akụ̀ ndị ọzọ. Ma anyị ekwesịghị imefusị akụ̀ ndị si n’ala naanị maka na anyị ga-azụtali ha ma ọ bụ maka na ha juru ebe niile. Mgbe Jizọs nyere ìgwè mmadụ nri site n’ọrụ ebube ọ rụrụ, o kwuru ka a tụtụkọta azụ̀ na achịcha niile ha rifọrọ. (Jọn 6:12) O leziri anya hụ na e mefusịghị ihe ahụ Nna ya nyere.

Ime Ya Otú Kwesịrị Ekwesị

Kwa ụbọchị, anyị na-eme mkpebi ndị na-emetụta ụwa anyị. Nke a ọ̀ pụtara na anyị ga-emebiga ihe ókè, ya bụ, kwapụ ebe ndị mmadụ bi ka ọ ghara inwetụ otú anyị si mebie ụwa anyị a? O nweghị ebe Baịbụl kwuru ka anyị mee otú ahụ. Tụlee ihe nlereanya Jizọs. Mgbe ọ nọ n’ụwa, o biri ndụ otú e si ebi ndụ. Nke a mere ka o kwusaa ozi ọma, nke bụ́ ọrụ Chineke nyere ya. (Luk 4:43) Jizọs jụkwara itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ́ nke ndị mmadụ chere na ọ ga-edozi nsogbu ha nwere n’oge ahụ. O kwuru hoo haa, sị: “Alaeze m abụghị nke ụwa a.”—Jọn 18:36.

Ma, anyị kwesịrị ichesi echiche ike banyere otú ihe anyị na-azụbata n’ụlọ, otú anyị si eme njem, nakwa otú ntụrụndụ anyị na-enwe, si emetụta ụwa anyị. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị na-ekpebi ịzụ arịa ndị a rụrụ otú ha na-agaghị emebicha ihe n’ụwa ma ọ bụ ndị ọ na-abụ ha rụwa ọrụ ha agaghị emebicha ihe n’ụwa. Ndị ọzọ na-agbalị ka ha ghara itinyecha aka n’ihe omume ndị na-emebi ikuku ma ọ bụ ndị na-emefusị akụ̀ ndị si n’ala.

Ọ dịghị mkpa ka mmadụ na-amanye ndị ọzọ ime ihe ndị o kpebiri ime n’okwu metụtara ilekọta ụwa anyị a. Ọnọdụ ndị mmadụ na ebe ha bi abụghị otu. Ma, onye ọ bụla n’ime anyị ga-aza ajụjụ maka mkpebi ndị o mere. Dị ka Baịbụl kwuru, “onye ọ bụla ga-ebu ibu nke ya.”—Ndị Galeshia 6:5.

Onye Okike nyere ụmụ mmadụ ọrụ ilekọta ụwa. Ọ bụrụ na anyị nwere obi ekele maka ọrụ a, jirikwa umeala n’obi na-akwanyere Chineke na ihe ndị o kere eke ùgwù, ọ ga-akpali anyị iji nlezianya na-eme mkpebi ndị na-egosi na anyị na-echebara ụwa anyị a echiche.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

▪ Chineke ọ̀ ga-eme ka mmebi a na-emebi ụwa kwụsị?—Mkpughe 11:18.

▪ Olee ihe Chineke gwara ụmụ mmadụ banyere ilekọta ụwa?—Jenesis 1:28; 2:15.

▪ Olee otú Jizọs Kraịst si kụziere anyị ka anyị ghara imefusị ihe?—Jọn 6:12.