Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Igbochi Afọ Ime Ò Megidere Iwu Chineke?

Igbochi Afọ Ime Ò Megidere Iwu Chineke?

Echiche Baịbụl

Igbochi Afọ Ime Ò Megidere Iwu Chineke?

GỊNỊ ka i chere? Ọ̀ dị njọ di na nwunye igbochi afọ ime? Azịza gị nwere ike ịdabere n’ihe okpukpe gị kụziiri gị. Chọọchị Katọlik na-akụzi na ihe ọ bụla mmadụ mere iji gbochie afọ ime “bụ njọ mmadụ mere megide onwe ya.” Ndị Katọlik na-akụzi na di na nwunye ekwesịghị ikwe ka ihe ọ bụla gbochie afọ ime mgbe ọ bụla ha nwere mmekọahụ. N’ihi ya, ndị Katọlik na-ele igbochi afọ ime anya dị ka “njọ.”

Ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ikwenye n’ihe ahụ ndị Katọlik na-akụzi. Otu akụkọ gbara n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Pittsburgh Post-Gazette, nke na-ekwu banyere igbochi afọ ime, kwuru na “ihe karịrị ụzọ atọ n’ụzọ anọ nke ndị Katọlik bi na United States na-ekwu na chọọchị ha kwesịrị iwepụ iwu ahụ megidere iji ihe aka mere egbochi afọ ime. . . . Ọtụtụ nde mmadụ na-elegharakwa iwu ahụ anya kwa ụbọchị.” Otu n’ime ha, bụ́ Linda, onye ji ụmụ atọ, kwetara na ya na-eji ihe e ji egbochi afọ ime eme ihe ma kwuo, sị: “Akọnuche m anaghị agwa m na ihe m na-eme bụ njọ.”

Gịnị ka Okwu Chineke nwere ikwu n’okwu a?

Ndụ Dị Oké Ọnụ Ahịa

Chineke na-ele ndụ nke nwa ọhụrụ anya dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa, ọbụna mgbe nwa ahụ ka malitere ito n’ime afọ. Site n’ike mmụọ nsọ, Eze Devid nke Izrel dere, sị: “I kpuchiri m ekpuchi n’ime afọ nne m. . . . Anya gị hụrụ m ọbụna mgbe m bụ nwa e bu n’afọ, e dekwara akụkụ ahụ́ m niile n’akwụkwọ gị.” (Abụ Ọma 139:13, 16) Ndụ na-amalite mgbe a tụụrụ ime mmadụ, Iwu Mozis kwukwara na mmadụ ga-aza ajụjụ ma o merụọ nwa e bu n’afọ ahụ́. Ọpụpụ 21:22, 23 kwudịrị na ọ bụrụ na mmadụ abụọ na-alụ ọgụ egbuo nwaanyị dị ime ma ọ bụ nwa o bu n’afọ na mberede, a ga-ewegara ndị ikpe okwu ahụ. Ndị ikpe ga-eleba okwu ahụ anya ma kpebie ma ha ma ama mee ya, ma ndị ikpe ahụ nwere ike ikpebi ka “mkpụrụ obi laara mkpụrụ obi,” nke bụ́ ka ndụ laara ndụ.

Ụkpụrụ ndị a nwere ihe jikọrọ ha na igbochi afọ ime n’ihi na ụzọ ụfọdụ e si eme ya yiri ka hà na-egbu nwa a tụụrụla ime ya. Ụzọ ndị a e si egbochi afọ ime na-emegide iwu Chineke nyere ka a na-akwanyere ndụ ùgwù. Ma, ọtụtụ ụzọ e si egbochi afọ ime anaghị egbu nwa e bu n’afọ. Oleekwanụ maka isi otú ahụ egbochi afọ ime?

Ọ dịghị ebe Baịbụl nyere Ndị Kraịst iwu ka ha mụọ ụmụ. Chineke gwara di na nwunye mbụ na ezinụlọ Noa, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba ma jupụta ụwa.” Ma, e nyeghachighị Ndị Kraịst iwu ahụ. (Jenesis 1:28; 9:1) N’ihi ya, di na nwunye nwere ike ikpebiri onwe ha ma hà ga-amụ ụmụ, ụmụ ole ha ga-amụ, na mgbe ha ga-amụ ha. N’otu aka ahụkwa, Akwụkwọ Nsọ emegideghị igbochi afọ ime. Ya mere, ọ bụrụ na e lee ya anya otú Baịbụl si ele ihe anya, ọ bụ di na nwunye ga-ekpebi ma hà ga na-eji ihe e ji egbochi afọ ime nke na-adịghị egbu nwa a tụụrụla ime ya eme ihe ma ọ bụ na ha agaghị eji. Ma, olee ihe mere Chọọchị Katọlik ji akatọ igbochi afọ ime?

Amamihe Mmadụ na Amamihe Chineke

Akwụkwọ ndị Katọlik na-akọwa na ọ bụ na narị afọ nke abụọ O.A. ka ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst tiri iwu ọkụ ga na-achịkwa àgwà mmadụ, bụ́ nke ha nọ na ya kwuo na naanị ihe iwu kwadoro mere di na nwunye ji enwe mmekọahụ bụ iji mụta nwa. Nke a na-egosi na iwu ha ahụ dabeere na nkà ihe ọmụma mmadụ kama ịdabere na Baịbụl. Ọ dabereghị n’amamihe Chineke, kama ọ dabeere n’amamihe mmadụ. Ozizi a nọgidere ruo ọtụtụ narị afọ, ndị ọkà mmụta okpukpe Katọlik dịgasị iche iche kọwakwukwara ya. * Ma, ozizi a mere ka ndị mmadụ chee na inwe mmekọahụ naanị iji nweta obi ụtọ dị njọ, n’ihi ya kwa, na inwe mmekọahụ, n’achọghị ịmụta nwa, bụ mmehie. Ma, nke ahụ abụghị ihe Akwụkwọ Nsọ na-akụzi.

Akwụkwọ Baịbụl bụ́ Ilu ji uri kọwaa ọṅụ di na nwunye nwere ike inweta mgbe ha nwere mmekọahụ ziri ezi: “Ṅụọ mmiri si n’olulu mmiri nke gị, ṅụọkwa mmiri ji nwayọọ nwayọọ na-asọpụta n’isi mmiri nke gị. . . . Ka isi mmiri gị bụrụ ihe a gọziri agọzi, ṅụrịakwa ọṅụ n’ihi nwunye ị lụrụ n’okorobịa, bụ́ nne ele na-adọrọ mmasị nakwa ewu ọhịa mara mma. Ka ara ya na-egbu gị dị ka mmanya n’oge niile. Ka ịhụnanya ya na-enye gị oké obi ụtọ mgbe niile.”—Ilu 5:15, 18, 19.

Di na nwunye inwe mmekọahụ bụ onyinye Chineke. Ma ha anaghị enwe ya naanị iji mụta nwa. Mmekọahụ na-enyekwa di na nwunye ohere igosi na ha hụrụ onwe ha n’anya. Ya mere, ọ bụrụ na di na nwunye ekpebie na ha achọghị afọ ime site n’iji otu ụdị ihe e ji egbochi afọ ime ma ọ bụ ọzọ eme ihe, nke ahụ bụ okwu aka ha, mmadụ ekwesịghịkwa ịta ha ụta maka ya.—Ndị Rom 14:4, 10-13.

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 11 Ọ ka bụ na narị afọ nke 13 ka Poopu Gregory nke Itoolu tiri iwu akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia kpọrọ “iwu mbụ zuru ebe niile poopu tiri megide igbochi afọ ime.”

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

▪ Di na nwunye inwe mmekọahụ ọ̀ dị njọ?—Ilu 5:15, 18, 19.

▪ Gịnị ka Ndị Kraịst kwesịrị iburu n’uche ma ọ bụrụ na ha na-eji ihe e ji egbochi afọ ime eme ihe?—Ọpụpụ 21:22, 23.

▪ Olee otú ndị ọzọ kwesịrị isi na-ele di na nwunye na-eji ihe a na-eji egbochi afọ ime eme ihe anya?—Ndị Rom 14:4, 10-13.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 11]

Chineke gwara di na nwunye mbụ na ezinụlọ Noa, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba ma jupụta ụwa.” Ma, e nyeghachighị Ndị Kraịst iwu ahụ