Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Imeso Ụmụ Nwaanyị Ihe Ike Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ

Imeso Ụmụ Nwaanyị Ihe Ike Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ

Imeso Ụmụ Nwaanyị Ihe Ike Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ

NOVEMBER 25 bụ Ụbọchị Mba Niile Wepụtara Iji Kwụsị Imeso Ụmụ Nwaanyị Ihe Ike. Nzukọ Ezumezu nke Òtù Mba Ụwa wepụtara ụbọchị a n’afọ 1999 iji mee ka ọhaneze mata otú e si na-anapụ ụmụ nwaanyị ihe ndị ruuru ha. Olee ihe mere o ji dị mkpa iwepụta ụbọchị dị otú ahụ?

N’ọtụtụ ebe, a na-ele ụmụ nwaanyị anya dị ka ndị na-abachaghị uru, sikwa otú ahụ na-emeso ha ihe. A kpọrọ ha ezigbo asị. Ka ọ dị ugbu a, ọ dịghị ụdị ihe ike a na-anaghị emeso ụmụ nwaanyị, ọbụna ná mba ndị a sịrị na ha bụ mba ndị mepere emepe. Onye bụ́bu Odeakwụkwọ Ukwu òtù UN bụ́ Kofi Annan kwuru na “ọ dịghị ebe a na-anaghị emeso ụmụ nwaanyị ihe ike n’ụwa, a na-emekwa ya n’obodo niile. A na-emeso ya ụmụ nwaanyị n’agbanyeghị agbụrụ ha, obodo ha, ebe a mụrụ ha, ma ọ bụ ọnọdụ ọ bụla ha nọ na ya.”

Radhika Coomaraswamy, onye bụ́bu onye ọrụ pụrụ iche nke òtù UN bụ́ onye na-akọrọ ọhaneze banyere ihe ike a na-emeso ụmụ nwaanyị, kwuru na ihe ka nnọọ ọtụtụ n’ụmụ nwaanyị “enweghị ike iji ọnụ ha kọọ [ihe ike e mesoro ha], ha na-elekwa ya anya dị ka ihe ihere a na-eme ụmụ nwaanyị nke ọtụtụ ndị na-amaghị banyere ya.” Ihe ndekọ e nwetara site n’otu ụlọ ọrụ dị na Holland, nke na-ahụ maka ndị mpụ metụtara, na-egosi na a na-emeso pasent iri abụọ na atọ nke ụmụ nwaanyị ndị bi n’otu mba dị n’Ebe Ndịda America, ya bụ, ihe dị ka otu onye n’ime ụmụ nwaanyị anọ ọ bụla, ihe ike n’ezinụlọ ha. N’otu aka ahụ, Kansụl Europe kwuru na a na-emeso ihe dị ka otu nwaanyị n’ime ụmụ nwaanyị anọ ọ bụla bi na Europe ihe ike n’ezinụlọ ya. Ngalaba Na-ahụ Maka Ihe Ndị Na-eme n’Obodo Britain, bụ́ nke nwere ụlọ ọrụ n’England na n’obodo Wales, kwuru na n’otu afọ na-adịbeghị anya, ihe dị ka ụmụ nwaanyị abụọ nwụrụ kwa izu n’aka ụmụ nwoke ha na ha bibu ma ọ bụ ndị ha na ha ka bi. Magazin bụ́ India Today International kwuru na “ụmụ nwaanyị na-anọ n’ụjọ n’ebe niile n’India, e nwekwara ike idina ha n’ike n’oge ọ bụla, na n’ebe ọ bụla, ma n’ebe zoro ezo ma n’ebe ndị mmadụ juru.” Òtù Mba Niile Na-ahụ Maka Mgbaghara kpọrọ ihe ike a na-emeso ma ụmụ nwaanyị ndị toro eto ma ndị nke ka na-eto eto “nsogbu kasị ukwuu ndị na-ahụ maka ihe ndị ruuru mmadụ na-alụso ọgụ” taa.

Otú ahụ e kwuru n’elu e si ele ụmụ nwaanyị anya ọ̀ bụ otú Chineke si ele ha anya? A ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ.