Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

O Nwere Mmasị na Ya Karịa n’Ihe Egwuregwu Ọ Bụla

O Nwere Mmasị na Ya Karịa n’Ihe Egwuregwu Ọ Bụla

O Nwere Mmasị na Ya Karịa n’Ihe Egwuregwu Ọ Bụla

Ụmụaka hà nwere ike inwe mmasị n’akwụkwọ karịa n’ihe egwuregwu? N’ezie, ha nwere ike inwe ma ọ bụrụ na ndị mụrụ ha amalite ịgụrụ ha akwụkwọ malite mgbe a mụrụ ha ọhụrụ. Mebrahtu na Angela, bụ́ di na nwunye bi na California, U.S.A., malitere ịgụrụ nwa ha nwaanyị akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ mgbe e ku ya si n’ụlọ ọgwụ lọta.

Ndị mụrụ ya dere, sị: “N’ihi ya, ọ bịara nwee nnọọ mmasị n’akwụkwọ Onye Ozizi ahụ. Mgbe ọ dị naanị ọnwa iri na abụọ, ọ malitere iji ọnụ ya agwa anyị ka anyị gụọrọ ya ihe ọ na-akpọ akwụkwọ Jizọs. Julianna dị afọ atọ ugbu a, ọ na-agụsikwa ya agụụ ike ka oge ahụ Mama ya ma ọ bụ Papa ya na-eji agụrụ ya akwụkwọ ahụ na-atọgbu ya atọgbu kwa ụbọchị ruo. Anyị aghaghị ụgha ma anyị gwa gị na nwa anyị nwaanyị nwere mmasị n’akwụkwọ a karịa n’ihe egwuregwu ọ bụla. Ihe osise na ihe atụ ndị dị n’akwụkwọ ahụ na-enyere onye ji ha na-akụzi ihe aka. Anyị bụ́ nne na nna ya na-amụtakwa ọtụtụ ihe.”

Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta akwụkwọ a nwere ihe osise ndị mara mma nke dị peeji 256, nke peeji ya hacha ka peeji magazin a, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 nke magazin a.

❑ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Baịbụl ebe obibi n’efu.