Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ihe Ịbụ Onyeisi n’Alụmdi na Nwunye Pụtara?

Olee Ihe Ịbụ Onyeisi n’Alụmdi na Nwunye Pụtara?

Echiche Baịbụl

Olee Ihe Ịbụ Onyeisi n’Alụmdi na Nwunye Pụtara?

N’ỌTỤTỤ ala, ndị na-alụ di na nwunye ọhụrụ na-ekwerịta onwe ha nkwa n’oge ememme alụmdi na nwunye ha, bụ́ mgbe nke nwaanyị na-ekwe nkwa irubere di ya isi. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ụmụ nwaanyị anaghị achọ iji ntị anụ na ha ga-anọ n’okpuru di ha. Tụlee ihe Baịbụl na-akụzi banyere okwu a. Ị ga-ahụ na amamihe dị n’ihe Baịbụl kwuru banyere ya, nakwa na ọ dị irè.

Otú Chineke Si Kọwaa Ịbụisi

Ụzọ bụ́ isi Baịbụl si kọwaa ịbụisi dị ná Ndị Efesọs 5:22-24, bụ́ ebe kwuru, sị: “Ka ndị bụ́ nwunye na-edo onwe ha n’okpuru ndị di ha dị ka n’okpuru Onyenwe anyị, n’ihi na di bụ isi nke nwunye ya dị ka Kraịst bụkwa isi nke ọgbakọ ahụ . . . N’eziokwu, dị ka ọgbakọ ahụ si na-edo onwe ya n’okpuru Kraịst, ka ndị bụ́ nwunye sikwa otú ahụ na-edo onwe ha n’okpuru di ha n’ihe niile.” Ebe ọ bụ na di bụ “isi nke nwunye ya,” ọ bụ ya ga na-edu ndú n’ezinụlọ, nwunye ya ana-agbaso ya ma na-erubere ya isi dị ka onyeisi.—Ndị Efesọs 5:33.

Ọ bụghị di ka ikike niile dị n’aka n’ihi na di n’onwe ya nọ n’okpuru Chineke na Kraịst. O nweghị ikike ịgwa nwunye ya ka o mee ihe megidere iwu Chineke ma ọ bụ ihe megidere akọnuche nwunye ya bụ́ nke e ji Baịbụl zụọ. Ma, Chineke nyere ya ọrụ ime mkpebi ndị gbara ọkpụrụkpụ n’ezinụlọ, n’emebighị iwu Baịbụl.—Ndị Rom 7:2; 1 Ndị Kọrịnt 11:3.

Baịbụl nyere di iwu ka ọ ghara idu ndú n’ụzọ ga-abara naanị ya onwe ya uru, kama nke ahụ, ka o buru ụzọ na-eche banyere ọdịmma nwunye ya karịa nke ya. Ndị Efesọs 5:25 kwuru, sị: “Ndị bụ́ di, na-ahụnụ nwunye unu n’anya, dị nnọọ ka Kraịst hụkwara ọgbakọ ahụ n’anya ma nyefee onwe ya maka ya.” Di nke na-agbaso ihe nlereanya magburu onwe ya Kraịst setịpụrụ n’igosi ịhụnanya anaghị edu ndú n’ụzọ ga-abara naanị ya onwe ya uru.

Ọzọkwa, Baịbụl gwara nwoke ka ya na nwunye ya na-ebi “dị ka ihe ọmụma si dị.” (1 Pita 3:7) Nke a abụghị naanị ịmata ọdịiche dị n’ọdịdị ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị na otú echiche nwoke si dị iche na nke nwaanyị. O kwesịrị ịmata mkpa nwunye ya.

“Ọ Bụ Onye Inyeaka Gị”

Na a sịrị ka nwaanyị na-edo onwe ya n’okpuru di ya ọ̀ pụtara na ọ gaghị enwe ọnụ okwu n’ezinụlọ? Tụlee ihe banyere Sera, bụ́ onye Baịbụl kpọrọ aha dị ka ihe atụ n’irubere di ya, bụ́ Ebreham, isi. (1 Pita 3:5, 6) O doro onwe ya n’okpuru di ya n’ihe niile, ma site n’ịhapụ ebe obibi ha ruru ha ahụ́ ala ma n’ịkwadebe nri na mberede. (Jenesis 12:5-9; 18:6) Ma, mgbe otu ihe dị mkpa dapụtara, ugboro ugboro, o kwuru ihe dị iche n’ihe Ebreham chere. Nke a mere mgbe ọ chọrọ ka Ebreham chụpụ ohu ya nwaanyị, bụ́ Hega, na nwa mbụ ya, bụ́ Ishmel, n’ezinụlọ ha. Chineke abaraghị Sera mba, kama nke ahụ, ọ gwara Ebreham ka o “gee ntị n’olu ya.” Ma, Sera nọgidere na-edo onwe ya n’okpuru Ebreham site n’ichere ka o mee ihe kama ịchọ iji aka ya chụpụ Hega na Ishmel.—Jenesis 21:8-14.

Ihe nlereanya Sera gosiri na ọ bụghị mgbe niile ka nwaanyị ga na-ekwenyere echiche di ya, kama nke ahụ, o kwesịrị ịbụ “nwaanyị [ma ọ bụ “onye inyeaka”]” di ya, onye a na-akwanyere ùgwù. (Malakaị 2:14) Ebe ọ bụ na nwaanyị bụ onye inyeaka di ya, ọ na-enye di ya ndụmọdụ ndị bara uru, e nyekwara ya ikike ụfọdụ n’ezinụlọ, mgbe mgbe, ọ na-eme mkpebi banyere ọtụtụ ihe ndị a na-eme n’ụlọ na ihe ụfọdụ metụtara ego. N’ezie, ebe di bụ onyeisi ezinụlọ, ọ bụ ya ka ọ dị n’aka ime mkpebi ikpeazụ.—Ilu 31:10-31; 1 Timoti 5:14.

Ịkwanyere Onye Hiwere Ya Ùgwù

Ọ bụ Jehova Chineke kere nwoke na nwaanyị, o hiwekwara alụmdi na nwunye ka ọ bụrụ ihe dị nsọ ga-adị n’etiti ha abụọ. (Jenesis 2:18-24) O kwukwara ihe ga-abụ ọrụ di na nke nwunye bụ́ nke ga-akasị wetara ha ọṅụ.—Diuterọnọmi 24:5; Ilu 5:18.

Ebe ọ bụ Jehova hiwere alụmdi na nwunye, o nwere ikike iwepụta ụkpụrụ ndị a ga-agbaso na ya. Di na nwunye ndị na-arụ ọrụ Chineke nyere ha ma na-akwanyere ndokwa Chineke mere maka ịbụisi n’alụmdi na nwunye ùgwù, ọ bụghị naanị n’ihi na ọ bara uru, kamakwa n’ihi na ha na-akwanyere ịbụisi Chineke ùgwù, na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ ma na-enweta enyemaka Ya.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

▪ Olee onye setịpụrụ ihe nlereanya zuru okè ma a bịa n’ịbụisi?—Ndị Efesọs 5:25.

▪ Chineke ọ̀ kpaara ikike onye bụ́ di nwere ókè?—1 Ndị Kọrịnt 11:3.

▪ Olee ihe mere e ji hiwe alụmdi na nwunye na ndokwa ịbụisi?—Ilu 5:18.

[Foto dị na peeji nke 16]

Ọ bụrụ na di agbasoo ihe nlereanya Kraịst n’idu ndú, ọ na-eme ka ma ya ma nwunye ya nwee ọṅụ na afọ ojuju