Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Nwere Ike Isi Zere Ihe Na-akpali Agụụ Mmekọahụ?

Olee Otú M Nwere Ike Isi Zere Ihe Na-akpali Agụụ Mmekọahụ?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị . . .

Olee Otú M Nwere Ike Isi Zere Ihe Na-akpali Agụụ Mmekọahụ?

“N’ụlọ akwụkwọ anyị, otu nwata nwoke mapawara foto nwa agbọghọ gba ọtọ na lọka ya. Lọka ya dị nso na nke m.”—Robert. *

“Anọ m na-achọ ihe n’Intanet maka ihe omume ụlọ akwụkwọ a sị anyị mee n’ụlọ. N’otu ntabi anya, ahụrụ m ebe e nwejuru ihe na-akpali agụụ mmekọahụ n’Intanet.”—Annette.

MGBE ndị mụrụ gị nọ afọ ole ị nọ ugbu a, ọ bụrụ na mmadụ achọọ ikiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ, ọ ga-esitụrụ ya ike ịchọta ya. Taa, o yiri ka ihe na-akpali agụụ mmekọahụ ò juru ebe niile. Dị ka Robert e kwuru okwu ya n’elu, anya gị nwere ike ịhụpere foto onye gba ọtọ nke nwa akwụkwọ ibe gị ji. Ma ọ bụkwanụ dị ka Annette, i nwere ike ịhụpere ya n’Intanet. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu sịrị, “Mgbe ụfọdụ m na-achọ ihe n’Intanet ma ọ bụ mgbe m ji Intanet na-azụ ihe ma ọ bụ na-ele ego ole m nwere n’ụlọ akụ̀, n’otu ntabi anya, ihe na-akpali agụụ mmekọahụ na-apụta!” *

Nke a na-eme mgbe niile. N’otu nnyocha e mere, mmadụ itoolu n’ime ndị ntorobịa iri ọ bụla, bụ́ ndị nọ n’agbata afọ asatọ ruo afọ iri na isii, sịrị na ha emepetụla ebe e nwere ihe na-akpali agụụ mmekọahụ n’Intanet n’amaghị ụma. Ọ na-abụkarịkwa mgbe ha na-eme ihe omume e nyere ha ka ha mee n’ụlọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na n’ọtụtụ nde ebe dị iche iche n’Intanet, e nwere ọtụtụ narị nde ebe ndị e debegasịrị ihe ndị metụtara mmekọahụ. N’ihi ya, ọ dị mfe ugbu a inweta ihe na-akpali agụụ mmekọahụ karịa mgbe ọ bụla ọzọ. E nwedịrị ike iji ekwe ntị nweta ya. Denise, bụ́ onye dị afọ iri na isii, sịrị: “Ọ na-ewu ewu n’ụlọ akwụkwọ anyị. O yiri ka ihe onye ọ bụla na-ajụ ibe ya n’ụbọchị Monday ọ bụla bụ, ‘Olee foto ndị i tinyere n’ekwe ntị gị ná ngwụsị izu gara aga?’”

Ebe ọ bụ na ị maara na ọtụtụ ndị na-ekiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ, i nwere ike ichewe, sị, ‘Ọ̀ bụdị eziokwu na ọ dị njọ?’ Azịza ya bụ ee. E nwere ọtụtụ ihe mere o ji dị njọ. Tụlee naanị atọ n’ime ha:

Ihe na-akpali agụụ mmekọahụ na-eweda ma ndị na-emepụta ya ma ndị na-ekiri ya ala.—1 Ndị Tesalonaịka 4:3-5.

▪ Mmadụ inwe mmasị n’ihe na-akpali agụụ mmekọahụ pụtara na ọ na-eṅomi ndị mmụọ ọjọọ biri n’ụwa n’oge Noa, bụ́ ndị ara inwe mmekọahụ na-ezighị ezi na-agba.—Jenesis 6:2; Jud 6, 7.

Ikiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ na-edubakarị mmadụ n’ịkwa iko.—Jems 1:14, 15.

Ikiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ na-akpa ndị na-ekiri ya aka ọjọọ. Tụlee naanị ihe atụ abụọ:

“Amalitere m ikiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ mgbe m dị nnọọ obere. O sikwaara m ike ịkwụsị ya. Ọtụtụ afọ agafeela kemgbe ahụ, ma ihe ndị m kiriri bara m nnọọ n’ụbụrụ nke na ha enweghịzi ike ịpụ apụ. Ọ na-adị ka ò nwere ebe ihe ndị ahụ na-aga anọrọ n’uche mmadụ, akọ na uche onye ahụ a na-apịa ya ụtarị mgbe niile. Ihe na-akpali agụụ mmekọahụ na-ere ùgwù mmadụ. Ọ na-emekwa ka mmadụ were onwe ya na ya adịghị ọcha nakwa na ya abaghị uru ọ bụla. Obi onye ahụ ga na-ama ya ikpe mgbe niile.”—Erica.

“Ikiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ riri m ahụ́ ruo afọ iri. O ruokwala afọ iri na anọ m kwụsịrị ya. Ma, ọbụna ugbu a, mụ na ya ka na-alụ kwa ụbọchị. Ọ ka na-agụ m agụụ ikiri ya, ọ bụ eziokwu na ọ naghịzi agụ m otú o sibu agụ m. Ọ ka na-enu m enu ịga kirie ya. Ihe ndị m kiriri apụbeghị m n’isi. A sị na m ma, agaraghị m amalite omume ọjọọ a amalite. Mgbe m malitere ya, o yiri ka ọ̀ bụ na ọ gaghị eme m ihe ọ bụla. Ma ugbu a anya efoola m. Ihe na-akpali agụụ mmekọahụ na-emebi ihe, ọ rụrụ arụ, na-ewedakwa ma ndị na-emepụta ya ma ndị na-ekiri ya ala. N’agbanyeghị ihe ndị na-akwado ya nwere ike ikwu, o nwetụghị otú ihe na-akpali agụụ mmekọahụ si dị mma.”—Jeff.

Tụlee Ya nke Ọma

Olee otú i nwere ike isi zere ịhụperetụdị ihe na-akpali agụụ mmekọahụ n’amaghị ama? Buru ụzọ tụlee ihe ndị nwere ike ime ka ị hụperetụ ya.

Ugboro ole ka ị na-ahụpere ihe na-akpali agụụ mmekọahụ n’amaghị ụma?

Ahụtụbeghị M Ya Mgbe Ụfọdụ

Kwa Izu Kwa Ụbọchị

Olee ebe ị na-ahụperekarị ya?

N’Intanet N’ụlọ akwụkwọ

Na TV N’ebe Ọzọ

Ò nwere ihe ọ na-abụ i mewe gị ahụpere ya?

Tụlee ihe atụ ndị a:

Ụfọdụ ụmụ akwụkwọ ibe gị hà nwere ike izitere gị ihe na-akpali agụụ mmekọahụ n’ozi e-mail ma ọ bụ n’ekwe ntị gị? Ọ bụrụ na ị maara nke a, o nwere ike ime ka ị kagbuo ozi ahụ n’emegheghị ya emeghe.

Ọ̀ na-abụ i denye okwu ụfọdụ ma ị chọwa ihe n’Intanet, gị enweta ozi na kọmputa gị nke na-agwa gị ka ị gaa ebe ọzọ n’Intanet? Ọ bụrụ na ị maara na nke a nwere ike ime, ọ ga-enyere gị aka ịma kpọmkwem okwu ndị ị ga-edenye ma ị chọwa ihe.

Dee ihe ndị merela ka ị hụpere ihe na-akpali agụụ mmekọahụ n’ebe a.

․․․․․

Ebe ọ bụ ihe ndị a i dere mere ka ị hụpere ihe na-akpali agụụ mmekọahụ, olee ihe i nwere ike ime iji belata ugboro ole ị na-ahụpere ya? (Dee ihe ndị i chere n’ebe a.)

․․․․․

Olee ihe ị na-eme ma ị hụpere ihe na-akpali agụụ mmekọahụ?

Ana m akwụsị ile ya ozugbo.

Ọ na-enu m enu, mụ eletụkwuo ya anya.

M na-anọrọ lewe ya, chọkwuokwa ọzọ m ga-ele.

Ọ bụrụ na ị kanyere ihe na nke abụọ ma ọ bụ na nke atọ, olee ihe i nwere ike ime iji dozie nsogbu ahụ?

․․․․․

Otú Ị Ga-esi Kwụsị Ikiri Ya

Ọ na-enu ụfọdụ ndị hụpeere ihe na-akpali agụụ mmekọahụ enu ikirikwu ya. E mechazie, ya amara ha ahụ́. Ọ naghị adị mfe ịkwụsị ya. Jeff, bụ́ onye e kwuru okwu ya ná mmalite, sịrị: “Tupu mụ amalite ịmụ Baịbụl, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na mụ aṅụtụla ụdị ọgwụ ọjọọ niile. Ma n’ime ihe niile ririla m ahụ́, nke kacha siere m ike ịkwụsị bụ ikiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ.”

Ọ bụrụ na ikiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ amarala gị ahụ́, echela na i nwezighị ike ịkwụsị ya. E nwere ike inyere gị aka. Olee otú e nwere ike isi nyere gị aka?

Ghọta ihe ihe na-akpali agụụ mmekọahụ bụ. Ọ bụ ihe Setan ji eme ka ihe dị ùgwù nke Jehova kere gharazie ịdị ùgwù. Ọ bụrụ na i lee ihe na-akpali agụụ mmekọahụ anya otú a, ọ ga-enyere gị aka ‘ịkpọ ihe ọjọọ asị.’—Abụ Ọma 97:10.

Chebara ihe na-esi na ya apụta echiche. Ihe na-akpali agụụ mmekọahụ na-emebi alụmdi na nwunye. Ọ na-eme ka e ledawa ụmụ nwaanyị na ụmụ nwoke anya. Ọ na-ewedakwa onye na-ekiri ya ala. Baịbụl nwere ezigbo ihe mere o ji sị: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo.” (Ilu 22:3) Olee otu ọdachi nke nwere ike ịdakwasị gị ma ọ bụrụ na ị na-ekiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ mgbe niile? Dee ya n’ebe a.

․․․․․

Kwee onwe gị nkwa. Job, bụ́ nwoke kwesịrị ntụkwasị obi, sịrị: “Eji m obi m niile kwee nkwa na agaghị m ele nwa agbọghọbịa anya ka ọ gụọ m agụụ.” (Job 31:1, nsụgharị Today’s English Version) Ụfọdụ n’ime ‘nkwa ndị i nwere ike iji obi gị kwe onwe gị bụ ndị a:

Agaghị m aga n’Intanet ma naanị m nọrọ n’ụlọ.

Ọ bụrụ na m nweta ozi ma ọ bụ gaa n’ebe na-ekwu ma ọ bụ ebe na-egosi ihe metụtara mmekọahụ, m ga-apụ ebe ahụ ozugbo.

Ọ bụrụ na mụ ekirie ya ọzọ, m ga-aga kọọrọ enyi m torola eto.

Ì nwere ike icheta otu ihe ma ọ bụ abụọ ọzọ ị ga-ekpebi ime, bụ́ nke ga-enyere gị aka izere ihe na-akpali agụụ mmekọahụ? I cheta ha, dee ha ebe a.

․․․․․

Tinye ya n’ekpere. Otu ọbụ abụ kpekuru Jehova ekpere, sị: “Mee ka anya m ghara ịhụ ihe na-abaghị uru.” (Abụ Ọma 119:37) N’eziokwu, o nwere ike isi ike izere ihe na-amasị anụ ahụ́ mmadụ nke na-eme mmehie. Ma Jehova Chineke chọrọ ka i nwee ike izere ya. O nwekwara ike inye gị “ike karịrị ike nkịtị” ka i wee nwee ike ime ezi ihe!—2 Ndị Kọrịnt 4:7.

Kọọrọ ya onye ọzọ. O nwere ike ịbụ na ọ na-eme gị ihere. Ma, chegodị echiche otú ahụ́ ga-esi ruo gị ala ma i butuo ibu na-anyịgbu gị. Onye ị kọọrọ ihe dị gị n’obi nwere ike ịbụrụ gị “nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.” (Ilu 17:17) Mmadụ inwe onye ọ na-akọrọ ihe dị ya n’obi na-abụkarị ụzọ bụ́ isi e si akwụsị omume ahụ.

Ọ bụrụ na ikiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ amarala gị ahụ́, dee aha onye torola eto nke obi ga-eru gị ala ịkọrọ banyere ya.

․․․․․

Mara na i nwere ike ịkwụsị ikiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ. N’eziokwu, n’oge ọ bụla ị jụrụ ikiri ya, ọ bụ mgbalị dị ukwuu ka i mere. Gwa Jehova banyere mgbalị ahụ i mere. Keleekwa ya maka ike o nyere gị ịjụ ikiri ya. Na-echeta mgbe niile na ọ bụrụ na i zere ikiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ, ị ga-eme ka obi Jehova ṅụrịa!—Ilu 27:11.

Ị gaa n’Intanet, ị ga-enweta ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị . . . ” n’adres bụ́ www.watchtower.org/ype

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 3 Agbanwere aha ndị dị n’isiokwu a agbanwe.

^ par. 5 Ihe na-akpali agụụ mmekọahụ bụ ihe na-anaghị ezo ihe ọ bụla n’ihe banyere mmekọahụ bụ́ nke a haziri iji kpalie onye na-ele ya, onye na-agụ ya, ma ọ bụ onye na-ege ya inwe agụụ inwe mmekọahụ. O nwere ike ịbụ ihe osise nakwa ihe odide na ihe a na-ege ege.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

▪ Olee otú ihe na-akpali agụụ mmekọahụ si eme ka ihe dị ùgwù gharazie ịdị ùgwù?

▪ Olee ihe ndị ị ga-eme iji zere ihe na-akpali agụụ mmekọahụ?

▪ Olee otú ị ga-esi nyere nwanne gị nke na-ekiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ aka?

[Foto dị na peeji nke 18 na 19]

Ụfọdụ ụmụ akwụkwọ ibe gị hà nwere ike iji ekwe ntị zitere gị ihe na-akpali agụụ mmekọahụ?