Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú E Sirila Mee Ka A Mara Aha Chineke

Otú E Sirila Mee Ka A Mara Aha Chineke

Otú E Sirila Mee Ka A Mara Aha Chineke

ONYE so dee abụ ọma Baịbụl, bụ́ Devid, bụrụ, sị: “M ga-eji abụ too aha Chineke.” Devid maara aha Chineke, o kwukwara n’abụ ya, sị: “Ka Jehova . . . bụrụ onye a gọziri agọzi . . . Ka aha ya nke dị ebube bụrụkwa ihe a gọziri agọzi.” (Abụ Ọma 69:30; 72:18, 19) Otú a na-esikarị akpọ aha Chineke n’Igbo bụ Jehova, bụ́ nke a sụgharịrị site n’okwu Hibru a יהוה, nke pụtara ihe dị ka ugboro puku asaa na Baịbụl.

Na narị afọ ndị na-adịbeghị anya, e deela aha Chineke n’ọtụtụ ebe na-abụghị na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, e dere okwu Latin bụ́ Benedictus Sit Iehova Deus,  nke pụtara “Ka E Too Aha Jehova Chineke,” ná mkpụrụ ego ọlaedo a kpụrụ na Switzerland ruo ọtụtụ afọ [1]. N’eziokwu, n’ime ọtụtụ narị afọ gara aga, e deela aha Chineke n’asụsụ Hibru nakwa na Latin n’ihe karịrị otu puku mkpụrụ ego, ihe ndị e ji mere ego, ihe nrite, na ihe ndị e ji edochi anya mkpụrụ ego.

Olee ihe mere ọtụtụ ndị ji jiri aha Chineke mee ihe otú ahụ, dị ka ihe atụ ndị anyị na-ahụ na peeji a na nke na-eso ya na-egosi?

Olee Ihe Mere Ha Ji Jiri Aha Chineke Mee Ihe?

Malite na narị afọ nke iri na isii, Chọọchị Roman Katọlik na Ndị Protestant Na-eme Mgbanwe lụrụ agha kpụ ọkụ n’ọnụ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe niile. Ógbè dị iche iche ndị Spen na-achị kewapụrụ onwe ha na Chọọchị Roman Katọlik, bụ́ nke ihe ka ọtụtụ na-aga, ma gawazie Chọọchị Protestant. Nke a dugara n’agha okpukpe n’obodo ahụ. E ji mkpụrụ ego na ihe osise ndị dị na ha agwa ndị mmadụ na Chineke na-akwado ndị Protestant ma ọ bụ ndị Roman Katọlik.

Otú E Si Jiri Aha Chineke Mee Ihe

Ndị na-akpụ ego n’oge ochie dere mkpụrụ okwu Hibru anọ na-anọchi anya aha Chineke, bụ́ Jehova, bụ́ nke a na-akpọ Tetragrammaton, ná mkpụrụ ego. Otú e si asụpe mkpụrụ okwu ndị ahụ n’asụsụ Bekee bụ JHVH ma ọ bụ YHWH. Ihe ka ọtụtụ ná ndị na-akpụ ego na ndị mmadụ n’ozuzu amaghị agụ Hibru. N’ihi ya, mgbe e depụtaghachiri Tetragrammaton ahụ ugboro ugboro, a bịara dewe mkpụrụ okwu Hibru anọ ahụ na-anọchi anya aha Chineke n’ụdị dị iche iche.

Ndị Sweden kpụrụ mkpụrụ ego bú aha Chineke ihe dị ka n’afọ 1568 [2], ndị Scotland kpụkwara nke ha n’ihe dị ka n’afọ 1591. N’ihe dị ka n’afọ 1600, Eze Charles nke Itoolu nke Sweden dere aha Chineke n’ego—bụ́ nke a sụpegasịrị dị ka Ihehova, Iehova, na Iehovah [3]. O nyere iwu ka e jiri ọlaedo kpụọ otu ụdị mkpụrụ ego, bụ́ ọmarịcha mkpụrụ ego e kwuru na ego o furu iji kpụọ ya karịrị ụgwọ ọnwa ọnwa anọ nke onye ọrụ ụbọchị!

E nwere ihe karịrị ụdị mkpụrụ ego iri isii dị iche iche a kpọrọ mkpụrụ ego Jehova n’oge Christian nke Anọ, bụ́ eze Denmark na Norway, bụ́ onye chịrị malite n’afọ 1588 ruo afọ 1648. Ka ọ na-erule n’agbata afọ 1650 na 1659, e nwekwara “mkpụrụ ego Jehova” na Poland nakwa na Switzerland, e nwekwara ha na Germany.

N’oge Agha Afọ Iri Atọ, bụ́ nke a lụrụ na Europe malite n’afọ 1618 ruo afọ 1648, bụ́kwa nke malitere dị ka agha okpukpe, ụdị mkpụrụ ego ndị ahụ juru ebe niile. Mgbe Eze Gustav nke Abụọ Adolph nke Sweden merisịrị n’Agha Breitenfeld n’afọ 1631, o mere ka a kpụọ mkpụrụ ego ndị bú Tetragrammaton [4]. A kpụrụ mkpụrụ ego ndị a n’obodo Erfurt, Fürth, Mainz, na Würzburg. Ihe dị ka n’otu oge ahụ, ndị ọchịchị ha na Sweden jikọrọ aka malitekwara ịkpụ mkpụrụ ego ndị bú aha Chineke.

Ruo ihe dị ka otu narị afọ na iri ise sochiri Agha Iri Afọ Atọ ahụ na-emenye ụjọ, a nọgidere na-ebi aha Chineke ná mkpụrụ ego, n’ihe nrite, na n’ihe ndị e ji mere ego. A kpụrụ ụdị ego ndị ahụ n’Austria, France, Mexico, na Russia, nakwa ná mba ndị ọzọ. Ma, ka ọ na-erule ná mmalite narị afọ nke iri na asatọ, a kwụsịwara ide aha Chineke ná mkpụrụ ego. Ka e mesịrị, a naghịzi ahụkarị ya n’ihe ndị e ji ebi ihe n’ego nakwa na stamp.

Ime Ka A Mara Aha Chineke

Ọ bụ ezie na a naghị ahụ aha Chineke n’ego ndị e ji azụ ihe taa, a na-akpọsa ya otú a na-akpọsatụbeghị ya mbụ. Ogologo oge gara aga, Chineke họọrọ otu ndị ịbụ ndị na-ejere ya ozi ma gwa ha, sị: “Unu bụ ndị àmà m, . . . abụkwa m Chineke.” (Aịzaya 43:12) O nweghị mkpụrụ ego ga-arụli ọrụ ahụ dị oké mkpa. N’eziokwu, ndị dere aha Chineke ná mkpụrụ ego ha gbara àmà ụgha megide Chineke, n’ihi na ha kwuru na ọ na-akwado ha n’agha ha ji obi ịta mmiri na-alụ. Ma, taa, ụfọdụ ndị mmadụ na-eme ka a mara aha Chineke n’ụzọ ọ kwadoro.

Ndịàmà Jehova na-agba gị ume ịmatakwu ihe banyere ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, na ihe aha ya pụtara. Otu ọbụ abụ so dee Baịbụl dere banyere Chineke, sị: “Ka ndị mmadụ wee mara na gị onwe gị, onye aha gị bụ Jehova, Ọ bụ naanị gị bụ Onye Kasị Elu n’ụwa niile.” (Abụ Ọma 83:18) Ọ dị ezigbo mkpa ịmata Jehova nke ọma, dị ka Ọkpara ya Ọ hụrụ n’anya mere ka a mata mgbe o kpere ekpere, sị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”—Jọn 17:3.

[Foto dị na peeji nke 28 na 29]

Ihe ndị na-akpụ ego n’oge ochie ji akpụ ego

[Ebe E Sigasị Nweta Foto dị na peeji nke 28]

Mkpụrụ ego nke 1 na ngwá ọrụ: Hans-Peter-Marquardt.net; mkpụrụ ego nke 2: Mit freundlicher Genehmigung Sammlung Julius Hagander

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 29]

Mkpụrụ ego nke 3 na nke 4: Mit freundlicher Genehmigung Sammlung Julius Hagander