Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Ọ̀ Na-agbaghara Mmehie Ndị Dị Oké Njọ?

Chineke Ọ̀ Na-agbaghara Mmehie Ndị Dị Oké Njọ?

Echiche Baịbụl

Chineke Ọ̀ Na-agbaghara Mmehie Ndị Dị Oké Njọ?

EBERE so n’àgwà ndị bụ́ isi Chineke nwere. (Abụ Ọma 86:15) Olee otú ọ na-emeru ebere? Otu ọbụ abụ dere, sị: “A sị na ọ bụ njehie ka ị na-ele, Jaa, Jehova, ònye pụrụ iguzo? N’ihi na ezi mgbaghara dị n’aka gị, ka e wee na-atụ egwu gị.” (Abụ Ọma 130:3, 4) Ebe ọzọ na Baịbụl kwuru, sị: “Dị ka ọwụwa anyanwụ si dị anya site n’ọdịda anyanwụ, otú ahụ ka o mere ka njehie anyị dị anya n’ebe anyị nọ. Jehova emeworo ndị na-atụ egwu ya ebere dị ka nna si emere ụmụ ya ebere. N’ihi na ya onwe ya maara nnọọ otú e si kpụọ anyị, ọ na-echeta na anyị bụ ájá.”—Abụ Ọma 103:12-14.

N’ezie, ebere Jehova zuru okè, ọ na-emekwara ya ndị mmadụ n’ụba, ebere ya na-emekwa ka ọ na-echebara adịghị ike anyị echiche—na-echeta na anyị bụ “ájá.” Ka anyị tụlee ihe atụ ụfọdụ sitere na Baịbụl ndị na-egosi otú Chineke na-emeru ebere.

Pita onyeozi gọnahụrụ Kraịst ugboro atọ. (Mak 14:66-72) Mgbe Pọl onyeozi ka bụ onye na-ekweghị ekwe, ọ kpagburu ụmụazụ Kraịst. Mgbe a chọrọ igbu ụfọdụ n’ime ha, Pọl kwadoro ya. Ogbugbu e gburu otu n’ime ha dịdị ya mma. (Ọrụ 8:1, 3; 9:1, 2, 11; 26:10, 11; Ndị Galeshia 1:13) Ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ dị na Kọrịnt bụbu ndị aṅụrụma, ndị na-apụnara mmadụ ihe, na ndị ohi tupu ha aghọọ Ndị Kraịst. (1 Ndị Kọrịnt 6:9-11) N’agbanyeghị nke ahụ, ndị a niile mechara ghọọ ndị ihe ha dị Chineke mma. Olee ihe mere Chineke ji gbaghara ha?

Ihe Atọ Na-eme Ka Chineke Meere Mmadụ Ebere

Pọl dere, sị: “E meere m ebere, n’ihi na amaghị m ihe mgbe ahụ, emekwara m ya n’ihi enweghị okwukwe.” (1 Timoti 1:13) Eziokwu ahụ o kwuru mere ka anyị ghọta ihe mbụ ọ dị mkpa ka mmadụ mee tupu Chineke agbaghara ya—inweta ezi ihe ọmụma banyere Jehova na ụkpụrụ ya ndị dị na Baịbụl. (2 Timoti 3:16, 17) Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị agaghị emeli ihe ga-atọ Onye Okike anyị ụtọ ma ọ bụrụ na anyị amaghị Ya nke ọma. Jizọs kwuru mgbe ọ na-ekpegara Nna ya ekpere, sị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”—Jọn 17:3.

Mgbe ndị nwere obi eziokwu matara Chineke na Jizọs, mmehie ndị ha merela na-ewute ha nke ukwuu, nke ahụ na-emekwa ka ha chegharịa. Nke ahụ bụ ihe nke abụọ mmadụ ga-eme ka Chineke wee gbaghara ya mmehie ya. Ọrụ 3:19 kwuru, sị: “Ya mere, chegharịanụ, chigharịakwanụ ka e wee hichapụ mmehie unu, ka oge inweta ume wee si n’ihu Jehova bịa.”

Amaokwu ahụ kwukwara ihe nke atọ ọ dị mkpa ka mmadụ mee—ya bụ, ichigharị. Mmadụ ichigharị pụtara onye ahụ ịhapụ àgwà na echiche ochie ya ma nabata ụkpụrụ na echiche Chineke. (Ọrụ 26:20) Ikwu ya n’ụzọ dị mfe, onye ahụ na-egosi site n’otú o sizi ebi ndụ na ihe o kwuru si ya n’obi mgbe ọ sịrị Chineke, “Gbaghara m.”

Chineke Anaghị Agbaghara Mmehie Niile

Ọ dị ụfọdụ ndị Chineke na-anaghị agbaghara mmehie ha. Pọl dere, sị: “Ọ bụrụ na anyị elezie anya na-eme mmehie mgbe anyị nwetasịrị ezi ihe ọmụma nke eziokwu ahụ, ọ dịkwaghị àjà ọ bụla fọrọ a ga-achụ maka mmehie, kama e nwere nnọọ ikpe [ọmụma] dị egwu nke a na-atụ anya ya.” (Ndị Hibru 10:26, 27) Okwu bụ́ “elezie anya na-eme mmehie” na-egosi na onye ahụ ma nnọọ ụma na-eme mmehie, nakwa na o nwere nnọọ obi ọjọọ.

Judas Iskarịọt malitere inwe ụdị obi ahụ. Jizọs kwuru, sị: “Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya.” (Matiu 26:24, 25) Jizọs kwukwara banyere ndị ndú okpukpe ụfọdụ e nwere n’oge ya, sị: “Unu sitere ná nna unu bụ́ Ekwensu . . . Mgbe ọ na-ekwu okwu ụgha, ọ na-ekwu dị ka ọchịchọ ya si dị, n’ihi na ọ bụ onye ụgha, bụrụkwa nna ụgha.” (Jọn 8:44) Dị ka Setan, àgwà ndị ikom ahụ jọgburu onwe ya. Ihe ndị ha mere ewuteghị ha, kama nke ahụ, ha kpọkwuru ekwo nkụ na-eme omume ọjọọ ha na-eme. * N’ezie, n’ihi ezughị okè na adịghị ike, ọbụna ụfọdụ ezi Ndị Kraịst na-eme mmehie, mgbe ụfọdụ ọ na-abụkwa mmehie ndị dị oké njọ. Ma mmehie ahụ ha mere apụtaghị na ha ma ụma na-eme ihe ọjọọ.—Ndị Galeshia 6:1.

O Mere Ebere Ruo n’Ọnwụ

Ọ bụghị naanị mmehie mmadụ mere ka Jehova na-ahụ, ọ na-ahụkwa otú onye ahụ si lee ihe ahụ o mere anya. (Aịzaya 1:16-19) Chetụgodị echiche banyere mmadụ abụọ ahụ a kpọgbukọtara ha na Jizọs. O doro anya na ha abụọ mere mpụ, n’ihi na otu n’ime ha kwuru, sị: “Anyị na-anatazu ihe kwesịrị anyị maka ihe ndị anyị mere; ma ọ dịghị ihe na-ekwesịghị ekwesị nwoke a [Jizọs] mere.” Ihe onye ahụ na-emebi iwu kwuru gosiri na ọ maara ihe banyere Jizọs. O nwekwara ike ịbụ na ihe ahụ ọ maara banyere ya nyeere ya aka ichegharị. Ihe ọzọ o kwuru gosiri nke a, ọ rịọziri Jizọs arịrịọ, sị: “Cheta m mgbe ị banyere n’alaeze gị.” Olee ihe Kraịst gwara nwoke a mgbe o ji obi ya niile rịọ ya arịrịọ a? Ọ gwara ya, sị: “N’ezie, ana m asị gị taa, Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.”—Luk 23:41-43.

Chee echiche banyere nke ahụ: Okwu ikpeazụ ndị Jizọs kwuru mgbe ọ bụ mmadụ gụnyere okwu na-egosi ebere o meere nwoke kwetara na ikpe ọnwụ mara ya. Nke ahụ bụ nnọọ ihe na-agba ume! N’ihi ya, anyị ji n’aka na ma Jizọs Kraịst ma Nna ya, bụ́ Jehova, ga-enwe ọmịiko n’ahụ́ ndị niile ji obi ha chegharịa, n’agbanyeghị ihe ha mere n’oge gara aga.—Ndị Rom 4:7.

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 12 Lee isiokwu bụ́ “Ì Mehiela Megide Mmụọ Nsọ?” na peeji nke 16-20 nke Ụlọ Nche July 15, 2007.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

▪ Olee otú ị ga-esi kọwaa ebere Chineke?—Abụ Ọma 103:12-14; 130:3, 4.

▪ Olee ihe mmadụ ga-emerịrị ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ka Chineke gbaghara ya?—Jọn 17:3; Ọrụ 3:19.

▪ Olee nkwa Jizọs kwere onye ajọ omume a kpọgidere n’elu osisi?—Luk 23:43.

[Foto dị na peeji nke 10]

Jizọs gosiri na e nwere ike ịgbaghara mmadụ mmehie dị oké njọ