Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Gị?

Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Gị?

Echiche Bible

Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Gị?

NDỤ gbalụ gbalụ anyị na-ebi na-achọ anyị ọtụtụ ihe n’aka. Mgbe ụfọdụ, ọ na-esiri anyị ike imecha ihe ndị anyị kwesịrị ime. Ma, anyị kwesịrị icheta na ndụ n’onwe ya bụ onyinye Chineke nyere anyị. (Abụ Ọma 36:9) Oge na ike ha aṅaa ka Chineke chọrọ ka anyị na-eji ejere ya ozi? Ọ bụ ihe na-agba ume ịmata na ihe Baịbụl sịrị na Chineke chọrọ anyị n’aka akarịghị anyị.

Jizọs maara ihe Nna ya chọrọ n’aka ụmụ mmadụ karịa onye ọ bụla ọzọ. (Matiu 11:27) Mgbe a jụrụ Jizọs iwu kasịnụ, o kwuru, sị: “Jiri obi gị dum, jirikwa mkpụrụ obi gị dum, jirikwa uche gị dum, jirikwa ike gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Mak 12:30) Gịnị ka nke ahụ pụtara? Ihe ahụ Chineke chọrọ ọ̀ karịrị anyị?

Ihe Mmadụ Iji Mkpụrụ Obi Ya Dum Hụ Chineke n’Anya Gụnyere

Ịhụnanya anyị nwere maka Chineke ga-emikwu emi ma ọ bụrụ na anyị ana-atụgharị uche n’ihe ọma ndị ọ na-emere anyị n’esepụghị aka. Ọ bụrụ na ịhụnanya anyị si n’ala ala obi, ọ ga-akpali anyị inye Chineke ihe kasị mma anyị nwere. Obi ga-adị anyị otú ọ dị otu onye so dee Baịbụl, bụ́ onye jụrụ, sị: “Gịnị ka m ga-eji kwụọ Jehova ụgwọ uru niile ọ na-eme ka m rite?” (Abụ Ọma 116:12) Olee otú ịhụ Chineke n’anya otú ahụ ga-esi emetụta ihe anyị ji oge anyị eme?

Baịbụl ekwughị awa ole anyị ga-ejirịrị na-efe ofufe kwa izu. Ma, o kwuru ihe ndị anyị kwesịrị ibute ụzọ ná ndụ, na ihe mere anyị kwesịrị iji bute ha ụzọ. Dị ka ihe atụ, Jizọs kụziri na ịmata Chineke nke ọma dị anyị mkpa iji nweta “ndụ ebighị ebi.” (Jọn 17:3) O kwukwara na ụmụazụ ya kwesịrị inyere ndị na-amaghị Chineke aka inweta ndụ site n’ịkụziri ha banyere Chineke. (Matiu 28:19, 20) Baịbụl gwara anyị ka anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị na-ezukọta mgbe niile iji nweta ume iji jeere Chineke ozi, nakwa iji na-agbarịta ibe anyị ume. (Ndị Hibru 10:24, 25) Ihe a niile na-ewe oge.

Chineke ọ̀ chọrọ ka anyị buru okpukpe n’isi—ghara ịdị na-eme ihe ndị ọzọ ma e wezụga ife ofufe? Mbanụ! Ihe ndị ọzọ a na-eme ná ndụ kwa ụbọchị kwesịkwara ka e lebara ha anya. Baịbụl gbara ndị isi ezinụlọ ume ka ha na-egbo mkpa ezinụlọ ha, sị: “N’ezie, ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị egboro ndị nke ya mkpa ha, karịsịa, ndị bụ́ ndị ezinụlọ ya, ọ [jọkarịrị] onye na-ekweghị ekwe ná njọ.”—1 Timoti 5:8.

Chineke kere mmadụ ka o nwee ike ikpori ndụ. Ebe ọ dị otú ahụ, o kwesịrị ekwesị ka anyị na ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị na-anọrị, jirikwa ezigbo nri na-ekpori ndụ. Eze Sọlọmọn dere, sị: “Amatawo m na ọ dịghị ihe dịịrị ha mma karịa ịṅụrị ọṅụ na ime ihe ọma n’oge ndụ ha; nakwa ka onye ọ bụla na-eri ihe, na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, na-ahụkwa ihe ọma n’ihi ịrụsi ọrụ ike ya niile. Ọ bụ onyinye Chineke.”—Ekliziastis 3:12, 13.

Jehova Chineke ghọtakwara adịghị ike ụmụ mmadụ, “na-echeta na anyị bụ ájá.” (Abụ Ọma 103:14) Baịbụl kwetara na ọ dị mkpa ka anyị na-ezu ike nke ọma. Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs gasịrị ozi n’ezughị ike ruo oge ụfọdụ, Jizọs gwara ha ka ha gaa “zurutụ ike n’ebe ndị mmadụ na-adịghị anọkarị.”—Mak 6:31.

Ya mere, ụdị ndụ na-atọ Chineke ụtọ bụ nke na-eme ka mmadụ debe ihe ọ bụla n’ọnọdụ ya, o nwekwara ike ịgụnye ụdị ọrụ dị iche iche. Ma, ihe niile anyị na-eme—ma hà metụtara ofufe anyị ma ọ bụ na ha emetụtaghị ya—kwesịrị igosi na anyị ji mkpụrụ obi anyị dum hụ Chineke n’anya. Baịbụl na-adụ anyị ọdụ, sị: “Ma ùnu na-eri ihe ma ùnu na-aṅụ ihe ọṅụṅụ ma ùnu na-eme ihe ọ bụla ọzọ, na-emenụ ihe niile iji nye Chineke otuto.”—1 Ndị Kọrịnt 10:31.

Ibute Ihe Ndị Ka Mkpa Ụzọ

Ibute ihe ndị metụtara ofufe Chineke ụzọ ná ndụ ò siri oké ike nke na ị gaghị emeli ya? Ọ bụ eziokwu na ime ihe ndị Chineke na-achọ n’aka anyị nwere ike ịchọ ka anyị mee mgbanwe ụfọdụ—ọbụna chụọ ihe ụfọdụ n’àjà—ma a bịa n’ihe anyị na-eji oge anyị eme. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na Onye Okike anyị agwaghị anyị ka anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli. N’ezie, ọ na-enyere anyị nnọọ aka ime uche ya. Anyị ga-enwe ihe ịga nke ọma ma ọ bụrụ na anyị adabere “n’ike nke Chineke na-enye.”—1 Pita 4:11.

O nwere ike isitụrụ gị ike ịhazigharị ihe ndị ị na-eme iji webata ihe ndị metụtara ofufe Chineke. Na-ewepụta oge mgbe mgbe iji kpegara Jehova Chineke, bụ́ “Onye na-anụ ekpere,” ekpere. (Abụ Ọma 65:2) N’ekpere gị, i nwere ike ịkọrọ ya ihe ọ bụla na-echegbu gị, ebe ị maara na ‘ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.’ (1 Pita 5:7) Eze Devid kpere ekpere, sị: “Kụziere m ime uche gị, n’ihi na ị bụ Chineke m.” (Abụ Ọma 143:10) Gị onwe gị kwa nwere ike ịrịọ Chineke ka o nyere gị aka ime mgbanwe ndị dị mkpa ná ndụ gị.

Òkù a na-emetụ n’obi dị na Baịbụl: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jems 4:8) Ka ị na-eme ihe ndị na-amasị Chineke, dị ka ịmụ Baịbụl na ịga nzukọ Ndị Kraịst, ị ga-abịarukwu Chineke nso. Ya onwe ya kwa ga-enyere gị aka inwekwu ọganihu.

Jelena, bụ́ onye Ndịàmà Jehova na-amụrụ Baịbụl, kwuru banyere mgbalị ya ibute ihe ndị ka mkpa ụzọ, sị, “Ọ dịghịrị m mfe.” Ma, o kwuziri, sị: “Ozugbo m malitere ịga nzukọ Ndị Kraịst, abịara m nwee ike itinye ihe ndị Baịbụl kwuru n’ọrụ. Nkwado ndị ọzọ na-enye m n’akwụsịghị akwụsị enyekwarala m aka.” Irite uru ndị dị n’ijere Chineke ozi bụkwa ihe ọzọ na-akpali mmadụ. (Ndị Efesọs 6:10) Jelena kwuru, sị, “Emeela m ka mmekọrịta mụ na di m ka mma, otú m si adọ ụmụ m aka ná ntị akakwala mma.”

N’agbanyeghị ndụ gbalụ gbalụ a na-ebi n’ụwa taa, mmụọ nsọ Jehova nwere ike inye gị ume ma kpalie gị ịtụleghachi ihe ndị ị na-ebute ụzọ ná ndụ ma ‘na-azụtara onwe gị oge’ iji jeere Chineke ozi. (Ndị Efesọs 3:16; 5:15-17) Jizọs kwuru, sị: “Ihe na-ekweghị omume n’ebe ụmụ mmadụ nọ kwere omume n’ebe Chineke nọ.”—Luk 18:27.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

▪ Gịnị mere i kwesịrị iji bute ime uche Chineke ụzọ ná ndụ?—Abụ Ọma 116:12; Mak 12:30.

▪ Olee ihe ndị Chineke chọrọ ka i soro na-eme?—Matiu 28:19, 20; Jọn 17:3; Ndị Hibru 10:24, 25.

▪ Olee ihe ndị ga-enyere gị aka ibute ihe ndị ka mkpa ụzọ iji mee Chineke obi ụtọ?—Ndị Efesọs 5:15-17; Jems 4:8.

[Foto dị na peeji nke 14]

Ime ihe na-atọ Chineke ụtọ chọrọ ka anyị debe ihe ọ bụla n’ọnọdụ ya