Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere na Ndị Mụrụ M Atụkwasịghị M Obi?

Gịnị Mere na Ndị Mụrụ M Atụkwasịghị M Obi?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Gịnị Mere na Ndị Mụrụ M Atụkwasịghị M Obi?

“A Sị nnọọ na ndị mụrụ m ga-ekwe ka m pụtụ apụtụ. Ọ bụghị na m chọrọ ịga wagharịwa n’ụwa. Dị ka ihe atụ, aga m achọ ịdị na-aga eleta daada m, mama m aghara ịtụ ụjọ na mụ achọwala ịhapụ ụlọ.”—Sarah, onye dị afọ 18. *

“M na-ajụ ndị mụrụ m mgbe niile ihe mere na ha anaghị atụkwasị m obi ma m chọọ iso ndị enyi m kpapụ. Ihe ha na-agwakarị m bụ: ‘Anyị tụkwasịrị gị obi. Ndị anyị na-atụkwasịghị obi bụ ndị enyi gị.’ Ọ na-enye m nnọọ nsogbu n’obi mgbe ọ bụla ha kwuru ihe a!”—Christine, onye dị afọ 18.

NTỤKWASỊ OBI dị nnọọ ka ego. Ọ na-esi ike nnweta, ma ịtụfu ya anaghị ara ahụ́, n’agbanyeghịkwa otú nke i nwetarala hà, ọ dịghị mgbe ị ga-eche na o zuorola gị. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na isii aha ya bụ Iliana, kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla m chọrọ ịpụ apụ, ndị mụrụ m na-ajụkasị m ajụjụ ahụ́ iji mata ebe m na-aga, ndị mụ na ha so aga, ihe m na-aga ime ebe ahụ, na mgbe m ga-alọta. Ama m na ọ bụ ha mụrụ m, ma ọ na-ewe m iwe ma ha jụwa m ụdị ajụjụ ndị ahụ!”

Ọ̀ na-adị gị mgbe ụfọdụ ka ndị mụrụ gị hà kwesịrị ịtụkwasịkwu gị obi? Ya bụrụ otú ahụ, gịnị ka ị ga-eme banyere ya? Ka anyị buru ụzọ leba anya n’ihe mere ntụkwasị obi ji esere ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha na-eto eto okwu.

Nsogbu Ndị Na-eto Eto Na-enwe

Baịbụl kwetara na ‘nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya.’ (Jenesis 2:24) E nwekwara ike ikwu otu ihe ahụ banyere nwaanyị. Ma ị̀ bụ nwoke ma ị̀ bụ nwaanyị, otu ihe ọ dị oké mkpa ka ị mụta mgbe ị bụ onye na-eto eto bụ otú ị ga-esi bie ndụ mgbe i toro—bụ́ mgbe ị ga-eru eru ịhapụ ụlọ, nakwa ma eleghị anya, nwee ezinụlọ nke gị.

Ma, o nweghị afọ ole ọ ga-abụ mmadụ gbahaala, a sị na ọ ghọọla onye toro eto. Kama nke ahụ, mmadụ na-eji nwayọọ nwayọọ aghọ onye toro eto, dị ka ebe ọ na-arị steepụ. Ọ bụ eziokwu na ebe ndị mụrụ gị sịrị na i ruola na steepụ ahụ nwere ike ịdị iche n’ebe i chere na i ruola. Maria, bụ́ onye chere na a tụkwasịghị ya obi n’ihi ụdị ndị enyi o nwere, kwuru, sị: “Adị m afọ iri abụọ, ma nke a ka na-ese okwu. Ndị mụrụ m chere na mụ agaghị ezetali ihe ọjọọ. Agbalịala m ịgwa ha na o nweelarị oge ndị m zeere ihe ọjọọ, ma, o jughị ha afọ!”

Dị ka ihe Maria kwuru na-egosi, ihe metụtara ntụkwasị obi nwere ike ịdị na-esere ndị na-eto eto na ndị mụrụ ha okwu. Ọ̀ bụ otú ọ dị n’ezinụlọ unu? Ya bụrụ otú ahụ, gịnị ka ị ga-eme ka ndị mụrụ gị tụkwasịkwuo gị obi? Ọ bụrụkwa na ha atụkwasịghịzi gị obi n’ihi omume ndị amamihe na-adịghị na ha i mere n’oge gara aga, gịnị ka ị ga-eme iji dozie nsogbu ahụ?

Gosi na A Pụrụ Ịtụkwasị Gị Obi

Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst narị afọ mbụ akwụkwọ ozi, sị: “Na-anwapụtanụ ihe unu onwe unu bụ.” (2 Ndị Kọrịnt 13:5) Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị ndị na-eto eto kpọmkwem ka ọ na-agwa okwu, ụkpụrụ dị na ya baara ha uru. Ihe na-ekpebi otú a ga-atụkwasịru gị obi na-abụkarị otú i gosiruru onwe gị na e nwere ike ịtụkwasị gị obi. Ọ pụtaghị na ị ga-ezu okè. E kwuwerị, onye ọ bụla na-emehie ihe. (Ekliziastis 7:20) Otú i si akpa àgwà ọ̀ na-eme ka ndị mụrụ gị nwee ihe mere ha ga-eji ghara ịtụkwasị gị obi?

Dị ka ihe atụ, Pọl dere, sị: “Anyị na-achọ ka anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.” (Ndị Hibru 13:18) Jụọ onwe gị, sị, ‘M̀ na-agwa ndị mụrụ m eziokwu mgbe niile ma ha jụọ m ebe m gara na ihe m na-eme?’ Tụlee ihe ụfọdụ ndị na-eto eto kwuru, bụ́ ndị lebakwuuru onwe ha anya n’akụkụ a.

Lori: “Anọ m na-ezigara otu nwa okorobịa ihe ya na-amasị m ozi e-mail na nzuzo. Ndị mụrụ m chọpụtara ma gwa m ka m kwụsị ya. Ekwere m ha nkwa na m ga-akwụsị ya, ma akwụsịghị m. Anọgidere m na-eme ya ruo otu afọ. Ọ na-abụ m zigara nwa okorobịa ahụ ozi e-mail, ndị mụrụ m achọpụta, mụ arịọ ha ma kwe ha nkwa na m ga-akwụsị ya, emechaakwa, mụ emee ya ọzọ. O ruru n’ókè nke na ndị mụrụ m atụkwasịghịzi m obi n’ihe ọ bụla!”

Gịnị ka i chere mere ndị mụrụ Lori ji gharazie ịtụkwasị ya obi, oleekwa otú Lori gaara esi mee omume dị ka onye maara ihe mgbe mbụ ndị mụrụ ya gwara ya banyere nsogbu ahụ? Dee azịza gị n’okpuru ebe a.

․․․․․

Beverly: “Ndị mụrụ m atụkwasịghị m obi n’ihe gbasara ụmụ nwoke, ma aghọtala m ihe kpatara ya. Anọ m na-achụ ụmụ nwoke abụọ ji afọ abụọ tọọ m. Mụ na ha na-ekwukwa okwu na fon ruo ọtụtụ awa, anyị gaakwa nnọkọ, ọ na-afọ obere ka ọ bụrụ naanị ha ka mụ na ha na-ekwurịta okwu. Ndị mụrụ m jichiri fon m ruo otu ọnwa, ha anaghịkwa ekwe m gaa ebe ọ bụla ụmụ okorobịa ahụ ga-anọ.”

Gịnị ka i chere mere ndị mụrụ Beverly ji ghara ịtụkwasị ya obi ruo oge ụfọdụ, oleekwa ihe ọ gaara eme iji mee ka ndị mụrụ ya maliteghachi ịtụkwasị ya obi?

․․․․․

Annette: “Mgbe m ka nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, mụ na otu enyi m jicha biya si n’otu nnọkọ anyị gara lọta—n’agbanyeghị na anyị maara na ndị mụrụ anyị agaghị achọ ka anyị ṅụọ biya—anyị ṅụrụ ya ka e mesịrị, ka ọ bụrụkwa na anyị ṅụrụ ya. Mama enyi m hụrụ mkpọ biya nke ya. E mesịkwara chọpụta na ọ dị nke m jikwa lọta. Ihe kasị nye m nsogbu n’obi bụ otú ihe ahụ si wute mama m!”

A sị na Annette bụ nwanne gị nta, olee ihe ị ga-agwa ya ka o mee iji mee ka mama gị maliteghachi ịtụkwasị ya obi?

․․․․․

Inwetaghachi Ntụkwasị Obi nke Ndị Mụrụ Gị

Ọ bụrụkwanụ na omume gị esorola mee ka ndị mụrụ gị gharazie ịtụkwasị gị obi, dị ka ọ dị ndị ntorobịa ahụ e kwuru okwu ha n’elu? Ya bụrụgodị na ọ dị otú ahụ, jide n’aka na i nwere ike ime ka ọnọdụ ahụ gbanwee. Ma, olee otú ị ga-esi mee ya?

O yiri ka ndị mụrụ gị hà ga na-atụkwasịkwu gị obi ka ị na-akpakwu ezigbo àgwà. Iji maa atụ: Were ya na otu nwoke ji ndị ụlọ akụ̀ ụgwọ. Ọ bụrụ na ọ na-akwụnye ego kwa mgbe kwa mgbe, ụlọ akụ̀ ahụ ga-atụkwasị ya obi, ha nwedịrị ike ibinyekwu ya ego n’ọdịnihu. Ihe yiri nke ahụ na-emekwa n’ụlọ. I gosi ndị mụrụ gị na i kwesịrị ntụkwasị obi—ọbụna n’obere ihe—o yikarịrị ka hà ga-atụkwasịkwu gị obi n’ọdịnihu.

Annette mechara ghọta nke ahụ. O kwuru, sị: “Mgbe ị ka dị obere, ị gaghị aghọtacha uru ọ bara ịbụ onye a tụkwasịrị obi. Amatakwuola m ihe, m na-agbalịsikwa ike izere ihe ọ bụla ga-eme ka ndị mụrụ m maliteghachi inyo m enyo.” Gịnị ka ị mụtara na nke a? Kama ịnọ na-eme mkpesa na ndị mụrụ gị atụkwasịghị gị obi, gbalịa hụ na ị na-akpa àgwà ndị ga-eme ka a tụkwasị gị obi.

Dị ka ihe atụ, è nwere ike ịtụkwasị gị obi n’ihe ndị a e depụtara n’okpuru? Kanye ihe n’àgwà nke ọ bụla ọ dị gị mkpa ịrụ ọrụ na ya.

□ Ịlọta mgbe a gwara m lọta

□ Ịga ihe n’oge

□ Ịrụcha ọrụ e kenyere m

□ Idebe ụlọ m ọcha

□ Otú m si akpọ fon

□ Imezu nkwa m

□ Ịghara ịdị na-emefusị ego

□ Iteta ụra n’onwe m

□ Ikwu eziokwu

□ Ikweta mmejọ m na ịrịọ mgbaghara

□ Ihe ọzọ

Ị gbalịakwanụ igosi na e nwere ike ịtụkwasị gị obi n’àgwà ndị ahụ ị kanyere ihe? Gbasoo ndụmọdụ ndị a dị na Baịbụl: ‘Yipụ mmadụ ochie ahụ, nke kwekọrọ n’ụzọ unu si eme omume n’oge gara aga.’ (Ndị Efesọs 4:22) “Ka Ee [gị] bụrụ Ee.” (Jems 5:12) “Ka onye ọ bụla n’ime unu na-agwa onye agbata obi ya eziokwu.” (Ndị Efesọs 4:25) “Na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi n’ihe niile.” (Ndị Kọlọsi 3:20) Ka oge na-aga, ndị mmadụ, gụnyere ndị mụrụ gị, ga-ahụ ọganihu gị.—1 Timoti 4:15.

Ma, ọ́ bụrụkwanụ na i chere na ndị mụrụ gị atụkwasịghị gị obi otú ha kwesịrị n’agbanyeghị mgbalị gị niile? Ọ́ gaghị aka mma ka gị na ha kwurịta ya? Kama ịnọ na-ekpesa na ha kwesịrị ịtụkwasịkwu gị obi, jiri nkwanye ùgwù jụọ ha ihe ha chere i kwesịrị ime iji mee ka ha tụkwasị gị obi. Mee ka ha ghọta ihe ị chọrọ ime n’akụkụ a.

Echela na ndị mụrụ gị ga-agbanwe obi ha ozugbo. O doro anya na ha ga-achọ ijide n’aka na ị ga-emezu nkwa gị. Jiri ohere a gosi na ị bụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi. Ka oge na-aga, ndị mụrụ gị nwere ike ịtụkwasịkwu gị obi. Nke ahụ bụ ihe mere Beverly, bụ́ onye e dere ihe o kwuru ná mmalite. O kwuru, sị: “Ọ na-esi ike ime ka mmadụ tụkwasị gị obi, ma ọ naghị esi ike ime ihe ga-eme ka a kwụsị ịtụkwasị gị obi,” o kwukwara, sị, “Emewela m ka ndị mụrụ m na-atụkwasị m obi, obi dịkwa m ụtọ n’ihi ya!”

Ị gaa n’Intanet, ị ga-enweta ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị” n’adres bụ́ www.watchtower.org/ype

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwere aha ndị dị n’isiokwu a agbanwe.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

▪ Olee ihe mere ndị mụrụ gị nwere ike iji ghara ịtụkwasị gị obi ozugbo n’agbanyeghị mgbalị niile ị na-eme iji gosi na a pụrụ ịtụkwasị gị obi?

▪ Olee ihe mere o ji dị mkpa ka gị na ndị mụrụ gị kwurịta okwu ma ọ bụrụ na ị chọrọ ka ha tụkwasịkwuo gị obi?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 24]

Gbalịa hụ na ị na-akpa àgwà ndị ga-eme ka a tụkwasị gị obi

[Ihe Osise na Foto dị na peeji nke 23]

Ịghọ onye toro eto dị ka mmadụ iji nwayọọ nwayọọ na-arị steepụ

[Ihe Osise]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

ONYE TORO ETO

ONYE NA-ETO ETO

NWATAKỊRỊ