Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

N’ime afọ isii gara aga, “e gbuola ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ otu narị puku mmadụ . . . na United States.”—THE NEW YORK TIMES, U.S.A.

Otu ụlọ ọrụ nwere ebe mmadụ nwere ike idenye ihe n’Intanet, akagbuola ihe puku mmadụ iri abụọ na itoolu, bụ́ ndị a mara ikpe na ha nwere mmekọahụ na-ezighị ezi, dere banyere onwe ha. Ọkàikpe Ukwu ndị Connecticut, bụ́ Richard Blumenthal, kwuru na “otú ọnụ ọgụgụ ndị na-enwe mmekọahụ na-ezighị ezi [na-ekwu banyere onwe ha n’Intanet] si na-arị elu emeela ka ọ dị mkpa ka e lebara ya anya.”—REUTERS NEWS SERVICE, U.S.A.

“Ụkọ aha ji ndị China aka ọjọọ. . . . Nnyocha e mere n’afọ 2006 gosiri [na] ihe dị ka otu ijeri mmadụ, na narị nde mmadụ na nde iri itoolu . . . nke ndị China, bụ́ ndị dị otu ijeri na narị nde anọ n’ọnụ ọgụgụ, nwere naanị otu narị aha nna.”—CHINA DAILY, CHINA.

N’ime otu kilomita ọ bụla, “ọnụ ọgụgụ ndị ọgba tum tum nwere ike ịnwụ” n’ihe mberede okporo ụzọ “ji okpukpu iri atọ na abụọ karịa” nke ndị nọ n’ụgbọala nwere ike ịnwụ.—UC BERKELEY WELLNESS LETTER, U.S.A.

E Debala Aha Ndịàmà Jehova n’Akwụkwọ na Turkey

Na July 31, 2007, Ndịàmà Jehova nọ na Turkey natara ozi sitere n’aka ndị ọchịchị na e debala aha ha n’akwụkwọ dị ka okpukpe iwu kwadoro. Nke a ga-eme ka ha nwee ike ịzụta na inwe ala nke ha, ịnata ebe ha ga na-anọ amụ ihe ná ngo, ịnata onyinye, na ịga n’ụlọikpe iji nweta ihe ndị ruuru ha mgbe ọ bụla ọ dị mkpa.

Intanet “Na-ebelata Ihere”

N’otu ọkwa a maara ọhaneze, otu ebe a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet na Germany, bụ́ nke e mepụtara iji nyere ndị di na nwunye aka ịkwa iko, turu ọnụ na ya enwetala narị puku mmadụ atọ na iri puku mmadụ, nakwa na, kwa ụbọchị, otu puku mmadụ na-abata. Ụlọ ọrụ na-ahụ maka ebe ahụ a na-edebe ihe n’Intanet turu ọnụ na ya achọtarala ndị di na nwunye ndị ọzọ ha na ha ga-akwa iko ‘n’emetụghị ka ndị mmadụ mara.’ Otu n’ime ndị isi ụlọ ọrụ ahụ kwuru, sị: “Otú ahụ Intanet na-esi ezochi ihe na-aganụ na-ebelata ihere,” na-emekwa “ka ọ dịrị ndị mmadụ mfe inweta ndị ha na ha ga na-akpa n’ezoghịrị onwe ha ihe.” Onyeisi ọzọ kwuru na ya kwenyesiri ike na Intanet ga-eme ka ọtụtụ ndị di na nwunye malite ịkwa iko.

Ọkpụkpụ Ndị Siri Ike Nkọwa

Ndị ọkà mmụta sayensị na-ekwukarị na “agba” ndị ikpeazụ nke “otú mmadụ si si n’enwe pụta” bụ na o si n’ihe a na-akpọ Homo habilis ghọọ Homo erectus, sikwa na Homo erectus ghọọ “mmadụ nke oge a,” nke a na-akpọ Homo sapiens. Ma, e kwuola ugbu a na ụdị ọkpụkpụ abụọ a hụrụ n’ebe na-adịchaghị anya site n’ibe ha na Kenya na-egosi na Homo habilis na Homo erectus, bụ́ ndị e cheburu na ha bụ ụdị ihe abụọ mmadụ ghọrọ tupu ya abụrụ mmadụ, dịrị ndụ n’otu oge. Meave Leakey, bụ́ otu n’ime ndị dere ihe ahụ a chọpụtara, kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na ha abụọ biri ndụ n’otu oge, o yighị ka Homo erectus ò si na Homo habilis pụta.”

Oyi Ọ̀ Na-aka Atụ ná Ngwụsị Izu?

Ọtụtụ ndị Germany na-eche na oyi na-aka atụ ná ngwụsị izu karịa n’ụbọchị ndị ọzọ n’izu. Magazin bụ́ Der Spiegel kọrọ na otu nnyocha e mere site n’idekọ otú oyi si atụ n’akụkụ dị iche iche nke Germany n’ime afọ iri na ise nwere ike igosi na ihe ha chere bụ eziokwu. Ụbọchị kasị ekpo ọkụ bụ Wednesday, ụbọchị oyi kasịkwanụ atụ abụrụ Saturday. Mmiri na-ezo n’ụbọchị Saturday na-eji pasent iri na ise akarị nke Monday, bụ́ ụbọchị ọkọchị na-akasị akọ, ugboro ole mmiri na-ezo na Saturday na-ejikwa pasent iri akarị ugboro ole ọ na-ezo na Monday. Anwụ na-acha n’ụbọchị Tuesday na-eji nkeji iri na ise achakarị nke Saturday. Ndị mere nnyocha ahụ na-eche na ihe ndị mmadụ mepụtara n’etiti izu na-agbakọta ná ngwụsị izu, mee ka anwụ na-achasi ike ma nye aka mee ka mmiri kpụkọta n’urukpuru ma zoo.