Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nkwenkwe Ụgha Ò Kwekọrọ n’Ozizi Baịbụl?

Nkwenkwe Ụgha Ò Kwekọrọ n’Ozizi Baịbụl?

Echiche Baịbụl

Nkwenkwe Ụgha Ò Kwekọrọ n’Ozizi Baịbụl?

OTU onye nta akụkọ abaghị ụgbọelu ruo otu afọ n’ihi na dibịa afa gwara ya na ọ ga-anwụ n’ihe ọghọm ụgbọelu. Ọtụtụ mmadụ, ma ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị ọchụ nta ego, ndị na-eme ihe nkiri, ndị na-eme egwuregwu, na ndị nọ na mahadum, na-eme ihe ndị na-egosi na ha nwere nkwenkwe ụgha. Mgbe ha nọ ná mgbagwoju anya, mgbe ha nọ ná nsogbu, ma ọ bụ mgbe ha nwere ihe na-echegbu ha, ha na-eche na ime ihe ndị dị otú ahụ ga-echebe ha ma ọ bụ nyere ha aka imezu ebumnobi ha.

Ndị mmadụ na-ele ọtụtụ nkwenkwe ụgha anya dị ka omenala oge ochie na-enweghị ihe ọjọọ dị na ha bụ́ ndị na-enyere mmadụ aka ná ndụ. Margaret Mead, bụ́ ọkà mmụta n’ihe banyere ụmụ mmadụ bụ́ onye nwụrụlanụ, kwuru, sị: “Nkwenkwe ụgha na-egosi otú o si agụsi anyị agụụ ike izere ọdachi ma ọ bụ ịhụ ka ihe anyị na-atụ anya ya mezuru. Otú anyị si agbaso ya n’agbanyeghị na anyị ekwenyeghị na ya na-eme ka ọ na-enye anyị olileanya ma ghara ime anyị ohu ya.” N’agbanyeghị nke ahụ, ndị kpebisiri ike ime ihe na-atọ Chineke ụtọ kwesịrị ịjụ onwe ha, sị, ‘Ndị Kraịst hà kwesịrị ịnabata nkwenkwe ụgha?’

Otú Nkwenkwe Ụgha Si Malite

Ụmụ mmadụ na-atụ egwu ọtụtụ ihe—egwu ọnwụ, egwu ihe ha na-amaghị, nakwa egwu ihe ga-eme ha ma ha nwụọ, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Setan, bụ́ onye nnupụisi ahụ na-emegide Chineke, kpebisiri ike iji ụmụ mmadụ mere ohu, ọ nọwokwa na-akụziri ha ụgha ndị dị otú ahụ. (Jọn 8:44; Mkpughe 12:9) Ọ bụghị naanị Setan na-anwa ime ka ụmụ mmadụ gbakụta Chineke azụ. N’ime Baịbụl, a kpọrọ Setan “onye na-achị ndị mmụọ ọjọọ.” (Matiu 12:24–27) Olee ndị bụ́ ndị mmụọ ọjọọ? N’oge Noa, ọtụtụ ndị mmụọ ozi sooro Setan nupụrụ Chineke isi ma si otú ahụ mee onwe ha ndị mmụọ ọjọọ. Kemgbe ahụ, ha anọwo na-anwa imegharị ndị mmadụ anya. Otu ụzọ ha si eme ya bụ ime ka ndị mmadụ nwee nkwenkwe ụgha.—Jenesis 6:1, 2; Luk 8:2, 30; Jud 6.

Ihe mere e ji nwee nkwenkwe ụgha bụ otu n’ime ụgha ndị Setan ghara. Ọ bụ ihe ahụ ndị mmadụ kweere nke bụ́ na ọ dị ihe a na-anaghị ahụ anya na-esi mmadụ n’ahụ́ apụ ma onye ahụ nwụọ, bụ́kwa nke nwere ike ịlọghachi inye ndị dị ndụ nsogbu. Ma Baịbụl kwuru, sị: “Ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.” O kwukwara na “ọrụ ma ọ bụ ichepụta ihe ma ọ bụ ihe ọmụma ma ọ bụ amamihe adịghị” ma mmadụ nwụọ.—Ekliziastis 9:5, 10.

“Ihe Arụ n’Anya Jehova”

Ọtụtụ ndị ahọrọla ikwere ụgha Setan. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ afọ gara aga, Chineke nyere ndị ya bụ́ ndị Izrel ntụziaka doro anya banyere nkwenkwe ụgha. Okwu ya kwuru, sị: “A gaghị ahụ n’etiti unu onye ọ bụla nke . . . na-agba afa, onye na-eme anwansi ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-achọ ihe mgbaàmà ọdịnihu ma ọ bụ dibịa anwansi, ma ọ bụ onye na-akọ ndị ọzọ ọgwụ ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ajụ onye na-agba afa ase ma ọ bụ onye ọrụ ya bụ ịkọ ọdịnihu ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ajụ ndị nwụrụ anwụ ase. N’ihi na onye ọ bụla nke na-eme ihe ndị a bụ ihe arụ n’anya Jehova.”—Diuterọnọmi 18:10-12.

Ọ dị mwute ikwu na ọ bụghị mgbe niile ka ndị Izrel ṅara ntị n’ịdọ aka ná ntị a. Dị ka ihe atụ, n’oge Aịzaya onye amụma, ụfọdụ chere na ọ bụrụ na ha chọrọ ka ihe ha kụrụ n’ubi mee nke ọma, na ha aghaghị ịchụrụ “chi Ihu Ọma” àjà—bụ́ nkwenkwe ụgha nke kpataara ha ajọ ọdachi. Jehova wesara ha iwe ma kwụsị ịgọzi ha.—Aịzaya 65:11, 12.

Jehova agbanweghị otú o si ele nkwenkwe ụgha anya n’oge Ndị Kraịst. Pọl onyeozi gbara ndị obodo Listra nwere nkwenkwe ụgha ume ka ha “hapụ ihe efu [“nkwenkwe ụgha,” The Emphatic Diaglott] ndị a ma bịakwute Chineke ahụ dị ndụ, onye kere eluigwe na ụwa na oké osimiri na ihe niile dị n’ime ha.”—Ọrụ 14:15.

Otú Mmadụ Pụrụ Isi Kwụsị Inwe Nkwenkwe Ụgha

Ọ dị ọtụtụ ihe ndị mmadụ na-eme n’ihi nkwenkwe ụgha ndị ha nwere, e nwekwara ihe jikọrọ ha niile—ya bụ, na a naghị enwe ike ịkọwa ha otú ha ga-edo anya. Otu n’ime ihe ọjọọ ndị nkwenkwe ụgha nwere ike ịkpata bụ ime ka ndị mmadụ na-ekwu na ihe mere ihe ọjọọ ji dabara ha bụ na ha enweghị ihu ọma kama ikweta na ọ bụ ihe ha mere kpatara ya.

Ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ ịhụ na ọtụtụ ndị akwụsịla inwe nkwenkwe ụgha. Jizọs kwuru, sị: “Unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.” (Jọn 8:32) Clementina, bụ́ onye Brazil gbara afa ruo afọ iri abụọ na ise, kwuru, sị: “Ọ bụ naanị ịgba afa ka m ji na-akpa afọ m. Ma eziokwu Baịbụl mere ka m nwere onwe m pụọ na nkwenkwe ụgha.” Nke bụ́ eziokwu bụ na ịmụchi Baịbụl anya na ikpegara Jehova Chineke ekpere site n’ala ala obi anyị nwere ike ime ka anyị nwee obi ike ga-enyere anyị aka ịkwụsị ya. Nke a nwere ike ime ka anyị na-eche echiche ka ndị maara ihe, bụ́ nke nwere ike ime ka anyị mee mkpebi ndị amamihe dị na ha bụ́ ndị ga-enyere anyị aka izere ọdachi na nchekasị.—Ndị Filipaị 4:6, 7, 13.

Baịbụl jụrụ, sị: “Olee òkè ìhè na ọchịchịrị nwere? Oleekwa nkwekọ dị n’etiti Kraịst na Bilial [Setan]?” N’ihi ya, ezi Ndị Kraịst aghaghị izere nkwenkwe ụgha.—2 Ndị Kọrịnt 6:14-16.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

▪ Olee onye ndị Izrel ahụ nwere nkwenkwe ụgha n’oge Aịzaya tụkwasịrị obi kama ịtụkwasị Chineke obi?—Aịzaya 65:11, 12.

▪ Olee ihe Pọl onyeozi gbara ndị Listra nwere nkwenkwe ụgha ume ime?—Ọrụ 14:15.

▪ Ezi Ndị Kraịst hà na-anabata nkwenkwe ụgha?—2 Ndị Kọrịnt 6:14-16.

[Foto ndị dị na peeji nke 13]

Nkwenkwe ụgha na-eme ka ndị mmadụ chee na o nweghị ihe ga-eme ha kama ichebara àgwà ha echiche