Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Oge Ikpeazụ—Olee Mgbe Ọ Ga-abụ?

Oge Ikpeazụ—Olee Mgbe Ọ Ga-abụ?

Oge Ikpeazụ—Olee Mgbe Ọ Ga-abụ?

Magazin bụ́ Sky & Telescope kwuru n’oge na-adịbeghị anya, sị: “N’ihe karịtụrụ otu ijeri afọ na-abịa abịa, anyị na-atụ anya na Ụwa ga-aghọ ọzara kpọrọ nkụ nke ihe na-adịghị na ya. O nwetụghị otú a ga-esi tụwa anya na ihe ọ bụla nwere ọtụtụ mkpụrụ ndụ ga-ebi n’ime ya ma ghara ịnwụ.” N’ihi gịnị? Magazin bụ́ Astronomy kwuru, sị: “Anwụ ga na-achasikwu ike ma mee ka oké osimiri gbọọ ka mmiri e siri n’ọkụ, meekwa ka ụwa niile ghọọ ala kpọrọ nkụ,” kwuokwa, sị: “Ọdachi a abụghị naanị eziokwu na-agbawa obi—ọ bụ ihe anyị na-agaghị agbatali n’ọsọ.”

Ma Baịbụl kwuru, sị: “[Chineke] tọrọ ntọala ụwa mee ka o sie ike; ọ gaghị ama jijiji ruo mgbe ebighị ebi, ma ọ bụ ruo mgbe niile ebighị ebi.” (Abụ Ọma 104:5) O doro anya na Onye kere ụwa nwekwara ikike ime ka ọ dịgide. N’ezie, ọ “kpụrụ ya ka e biri n’ime ya.” (Aịzaya 45:18) Ma, o keghị ya ka ndị ajọ mmadụ na-anwụ anwụ biri na ya. Chineke kpebiri mgbe ọ ga-amaliteghachi ịchị ụwa site n’Alaeze ahụ Daniel 2:44 kwuru banyere ya.

Jizọs kwusara banyere Alaeze Chineke. O kwuru banyere oge a ga-ekpe mba dị iche iche na ndị dị iche iche ikpe. Ọ dọrọ aka ná ntị na a ga-enwe mkpagbu nke karịrị nke ọ bụla e nwetụrụla. O kwukwara banyere ihe ịrịba ama ọtụtụ ihe mejupụtara, nke ga-egosi mgbe ọgwụgwụ nke ụwa anyị a rurula nso.—Matiu 9:35; Mak 13:19; Luk 21:7-11; Jọn 12:31.

Na Jizọs, bụ́ onye ama ama, kwuru banyere ihe ndị dị otú ahụ emeela ka ọtụtụ ndị chewe banyere ha. Olee mgbe ihe ndị ahụ ga-eme? Ụfọdụ anwaala ịchọpụta kpọmkwem mgbe oge ọgwụgwụ ga-abụ site n’ịmụ amụma na ọgụgụ oge Baịbụl. Otu n’ime ndị nyochara nke a bụ ọkà ná mgbakọ na mwepụ nke dịrị ndụ na narị afọ nke iri na asaa, onye aha ya bụ Sir Isaac Newton, bụ́ onye chọpụtara ikike ndọda na onye wepụtara ụzọ e si eme mgbakọ na mwepụ a na-akpọ calculus.

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ dịrịghị unu ịmara oge ahụ ma ọ bụ mgbe a kara aka nke Nna m debere ka ọ dị n’aka ya.” (Ọrụ 1:7) Mgbe Jizọs na-ekwu banyere “ihe ịrịba ama nke ọnụnọ [ya] na nke ọgwụgwụ usoro ihe a,” ọ sịrị: “Ọ dịghị onye maara ụbọchị ahụ na oge awa ahụ, ndị mmụọ ozi nke eluigwe amaghị, Ọkpara ahụ amaghịkwa, kama ọ bụ naanị Nna m maara.” (Matiu 24:3, 36) Mgbe Jizọs jisịrị mbibi nke ụwa nke oge Noa tụnyere mbibi a ga-enwe n’oge “ọnụnọ Nwa nke mmadụ,” o kwuziri, sị: “Ya mere, na-echenụ nche, n’ihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.”—Matiu 24:39, 42.

Ya mere, ọ bụ ezie na e meghị ka anyị mara kpọmkwem mgbe ọgwụgwụ nke “usoro ihe a” ga-abụ, “ihe ịrịba ama” Jizọs kwuru banyere ya ga-enyere anyị aka ịmata mgbe anyị banyere n’oge a maara dị ka ‘oge ikpeazụ.’ (2 Timoti 3:1) Ọ ga-abụ oge anyị kwesịrị ‘ịmụrụ anya’ ka anyị “wee nwee ike ịgbanahụ ihe ndị a niile a kara aka na ha ga-eme.”—Luk 21:36.

Tupu Jizọs ekwuo banyere ihe ịrịba ama ahụ, ọ dọrọ aka ná ntị, sị: “Lezienụ anya ka a ghara iduhie unu; n’ihi na ọtụtụ ndị ga-abịa n’aha m, sị, ‘Ọ bụ m bụ ya,’ sịkwa, ‘Oge ahụ a kara aka eruwo.’ Unu esola ha. Mgbe unu na-anụkwa mkpọtụ agha na nke ọgba aghara, unu atụla ụjọ. N’ihi na ihe ndị a aghaghị ibu ụzọ mee, ma ọgwụgwụ agaghị abịa ozugbo ahụ.”—Luk 21:8, 9.

Gịnị Bụ Ihe Ịrịba Ama Ahụ?

Jizọs gaziri n’ihu ịgwa anyị ihe a ga-eji mata oge ikpeazụ, sị: “Mba ga-ebuso mba ọzọ agha, alaeze ga-ebusokwa alaeze ọzọ agha; a ga-enwekwa oké ala ọma jijiji, ọrịa na-efe efe na ụkọ nri ga-adịkwa n’ebe dị iche iche; a ga-ahụkwa ihe ndị na-atụ egwu, nweekwa oké ihe ịrịba ama dị iche iche site n’eluigwe.” (Luk 21:10, 11) Jizọs kwukwara, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”(Matiu 24:14) Ihe ndị Jizọs kwuru banyere ha—agha, ala ọma jijiji, ọrịa na-efe efe, ụkọ nri—agaghị abụ ihe ọhụrụ. Ha na-eme eme kemgbe ụwa. Ihe ga-adị iche bụ na ha niile ga na-eme n’otu mgbe.

Jụọ onwe gị, sị, ‘Olee mgbe ihe ndị a niile e kwuru n’Oziọma ndị ahụ merela n’otu oge?’ Kemgbe afọ 1914, ụmụ mmadụ ahụla agha ụwa ndị mebiri ihe; oké ala ọma jijiji na ihe ọjọọ ndị ha na-akpata, dị ka oké ebili mmiri; ọrịa ọjọọ ndị juru ebe niile dị ka, ịba, oké ahụ́ ọkụ, na ọrịa o biri n’ájá ọcha; ọtụtụ nde mmadụ na-anwụ n’ihi ụkọ nri; oké egwú ji ụwa niile n’ihi ndị na-eyi ọha egwu na ngwá agha ọgwụrụ mba; nakwa ozi ọma Alaeze eluigwe nke Chineke nke Ndịàmà Jehova na-ekwusa gburugburu ụwa. Ihe a niile emezuola dị nnọọ ka Jizọs buru n’amụma.

Burukwa n’uche ihe a Pọl onyeozi dere: “Mara nke a, na n’oge ikpeazụ, a ga-enwe oge dị oké egwu, nke tara akpụ. N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe, ndị na-enweghị obi mmadụ, ndị na-adịghị achọ inwe nkwekọrịta ọ bụla, ndị nkwutọ, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị na-eme ihe ike, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye, ndị isi ike, ndị nganga fụliri elu, ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya, ndị na-eme ka hà nwere nsọpụrụ Chineke ma na-agọnahụ ike ya.” (2 Timoti 3:1-5) Ee, “oge dị oké egwu,” bụ́ nke e ji mmebi iwu, asọpụrụghị Chineke, obi ọjọọ, na ime ihe ike n’ihi echebaraghị ndị ọzọ echiche mara, ga-ezu ụwa ọnụ. *

Ma, ò nwere ike ịbụ na ‘oge ikpeazụ’ nke a ga-enwe tupu ọgwụgwụ nke ụwa a ka dị n’ihu? È nwere ihe ọzọ ga-egosi mgbe ọ ga-amalite?

Olee Mgbe ‘Oge Ikpeazụ’ Ga-amalite?

Mgbe e gositụchara Daniel ihe ụfọdụ ga-eme n’oge dị anya n’ọdịnihu, a gwara ya, sị: “N’oge ahụ, [“n’oge ikpeazụ” e kwuru banyere ya na Daniel 11:40] Maịkel [Jizọs Kraịst] ga-ebili, bụ́ nnukwu onyeisi ahụ nke guzo ọtọ n’ihi ụmụ ndị gị.” (Daniel 12:1) Olee ihe Maịkel ga-eme?

Akwụkwọ Mkpughe kwuru banyere oge Maịkel ga na-achị achị. O kwuru, sị: “Agha wee daa n’eluigwe: Maịkel na ndị mmụọ ozi ya busoro dragọn ahụ agha, dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya bukwara agha ma dragọn ahụ emerighị, ohere adịghịrị ha ọzọ n’eluigwe. E wee chụda dragọn ukwu ahụ, bụ́ agwọ mbụ ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi; a chụdara ya n’ụwa, a chụdara ya na ndị mmụọ ozi ya. N’ihi nke a, ṅụrịanụ ọṅụ, gị eluigwe na unu ndị bi n’ime ya! Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri, n’ihi na Ekwensu agbadatawo n’ebe unu nọ, ọ na-ewe oké iwe, ebe ọ maara na o nwere oge dị mkpirikpi.”—Mkpughe 12:7-9, 12.

Usoro ngụkọ oge Baịbụl na-egosi na agha a e ji chụpụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ga-eme ka ndị nọ n’ụwa taa nnukwu ahụhụ n’ihi iwe ji Ekwensu ebe ọ maara na oge o nwere iji chịa ụwa dị mkpirikpi. Iwe ya ga na-adịkwu ọkụ n’oge ikpeazụ ruo mgbe a ga-emeri ya kpamkpam n’agha Amagedọn.—Mkpughe 16:14, 16; 19:11, 15; 20:1-3.

Mgbe Jọn onyeozi kwuchara ihe ga-esi n’agha ahụ a ga-alụ n’eluigwe pụta, o kwuru, sị: “M wee nụ oké olu nke si n’eluigwe sị: ‘Nzọpụta na ike na alaeze nke Chineke anyị na ikike nke Kraịst ya amalitewo ugbu a, n’ihi na a chụdawo onye ahụ nke na-ebo ụmụnna anyị ebubo, onye na-ebo ha ebubo n’ihu Chineke anyị ehihie na abalị!’” (Mkpughe 12:10) Ị̀ chọpụtara na a mara ọkwa iguzobe Alaeze nke Kraịst ga-achị? Ee, e guzobere Alaeze eluigwe ahụ n’afọ 1914. * Otú ọ dị, dị ka Abụ Ọma 110:2 si kwuo, Jizọs ga na-achị “n’etiti ndị iro [ya]” ruo oge Alaeze ahụ ga-achịwa ụwa dị ka o si na-achị eluigwe.—Matiu 6:10.

Ọ bụ ihe obi ụtọ ịmara na mmụọ ozi ahụ gwara Daniel onye amụma banyere ihe ndị ahụ ga-emenụ, kwukwara, sị: “Ma gị onwe gị, Daniel, zochie okwu ndị a, mechiekwa akwụkwọ a, ruo n’oge ikpeazụ. Ọtụtụ ndị ga na-awagharị, ezi ihe ọmụma ga-abakwa ụba.” (Daniel 12:4) Nke a bụ ihe ọzọ na-eme ka anyị mara na anyị bi “n’oge ikpeazụ.” E meelarị ka ihe amụma ndị a pụtara doo anya, a na-akpọsakwa ya ugbu a n’ụwa niile. *

Olee Mgbe ‘Oge Ikpeazụ’ ahụ Ga-agwụ?

Baịbụl ekwughị kpọmkwem otú oge ikpeazụ ahụ ga-aha. Ma, n’oge ikpeazụ, ọnọdụ ụwa ga na-ajọwanye njọ ka oge fọdụụrụ Setan na-adịwanye mkpirikpi. Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị na “ndị ajọ mmadụ na ndị nduhie ga na-ajọwanye njọ, na-eduhie ndị mmadụ ma bụrụ ndị a na-eduhie.” (2 Timoti 3:13) Mgbe Jizọs na-ekwukwa banyere ihe ndị ka ga-eme n’ọdịnihu, o kwuru, sị: “Ụbọchị ndị ahụ ga-abụ ụbọchị mkpagbu nke a na-enwebeghị ụdị ya kemgbe ihe ndị Chineke kere malitere ịdị ruo mgbe ahụ, a gaghị enwekwa ya ọzọ. N’eziokwu, ọ bụrụ na Jehova emeghị ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpirikpi, a gaghị azọpụta anụ ahụ́ ọ bụla. Ma n’ihi ndị a họọrọ, ya bụ, ndị ọ họọrọ, o mewo ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpirikpi.”—Mak 13:19, 20.

Ụfọdụ n’ihe ndị ka ga-eme n’ọdịnihu bụ “oké mkpagbu,” bụ́ nke ga-agụnye agha Amagedọn, na mgbochi a ga-egbochi Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ịkpa ike n’ụwa. (Matiu 24:21) “Chineke, onye na-apụghị ịgha ụgha,” ekwela anyị nkwa na ihe ndị a ga-eme. (Taịtọs 1:2) Ọ bụ Chineke ga-eme ka a lụọ agha Amagedọn, meekwa ka a tụba Setan n’abis.

E nyere Pọl onyeozi ike mmụọ nsọ ịgwa anyị kpọmkwem ihe ga-emenụ tupu mbibi ahụ Chineke ga-eweta. Banyere “oge na mgbe a kara aka,” o dere, sị: “Ụbọchị Jehova na-abịa kpọmkwem dị ka onye ohi si abịa n’abalị. Mgbe ọ bụla ha na-asị: ‘Udo na obi iru ala!’ mgbe ahụ ka mbibi mberede ga-abịakwasị ha n’otu ntabi anya dị nnọọ ka ihe mgbu nke na-abịakwasị nwaanyị dị ime; ha agaghịkwa agbanahụ ya ma ọlị.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:1-3) E kwughị ihe ga-akpali ha ịkpọsa “udo na obi iru ala” ụgha ahụ, ọ bụ n’ọdịnihu ka anyị ga-amata ya; ma ọ gaghị egbochi ụbọchị ikpe Jehova ịbịa. *

Ọ bụrụ na anyị kwenyesiri ike na amụma ndị a ga-emezu, ọ ga-akpali anyị ime ihe. Ime gịnị? Pita zara, sị: “Ebe a ga-esi otú a gbazee ihe ndị a niile, chebaranụ ụdị mmadụ unu kwesịrị ịbụ echiche n’ihe banyere àgwà dị nsọ na omume ịsọpụrụ Chineke, na-echere ma na-eburu ọbịbịa nke ụbọchị Jehova n’uche!” (2 Pita 3:11, 12) Ma, i nwere ike ịjụ, sị, ‘Olee uru nke a ga-abara m?’ Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ ahụ.

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 12 Iji matakwuo ihe ndị a ga-eji mara ‘oge ikpeazụ,’ lee Teta! nke April-June 2007, peeji nke 8-10, nakwa Ụlọ Nche nke September 15, 2006, peeji nke 4-7, na nke October 1, 2005, peeji nke 4-7, ndị Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 18 Iji matakwuo banyere usoro ngụkọ oge Baịbụl, lee peeji nke 215-218 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 19 Lee akwụkwọ bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel! na 2008 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, peeji nke 31-39, ndị Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 23 Lee akwụkwọ bụ́ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! (nke e bipụtara n’afọ 2006), peeji nke 250-251, paragraf nke 13 na nke 14.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 5]

Jizọs sịrị na ọ bụ naanị Chineke maara “ụbọchị ahụ na oge awa ahụ”

[Foto dị na peeji nke 4]

Sir Isaac Newton

[Ebe E Si Nweta Foto]

© A. H. C./age fotostock

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

A malitela ịhụ ihe ịrịba ama ahụ Jizọs kwuru banyere ya kemgbe afọ 1914

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

© Heidi Bradner/Panos Pictures

© Paul Smith/Panos Pictures