Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Oge Ikpeazụ nke Gịnị?

Oge Ikpeazụ nke Gịnị?

Oge Ikpeazụ nke Gịnị?

OTU ihe a mapawara na windo nke otu ụlọ ahịa kwuru, sị: “Oge Ikpeazụ.” Ihe ọ pụtara doro anya. O nwere ike ịpụta na otu ngwá ahịa e gburu ná ntụ agwụwala, ma ọ bụ na ụlọ ahịa ahụ ga-emechi n’oge na-adịghị anya. Ọ bụrụkwanụ na mmadụ asị, “Anyị bi n’oge ikpeazụ”? Gịnị ka ọ pụtara?

Ọ dịla anya Baịbụl kwuru banyere “oge ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1; Daniel 12:4) Ihe karịrị puku afọ abụọ na narị ise gara aga, e mere ka Daniel onye amụma hụ ọhụụ nke ike ọchịchị ụwa dị iche iche na nke agha ha ga na-alụso onwe ha ruo “n’oge ikpeazụ.” A gwara ya na ọ bụ n’oge ikpeazụ ahụ ka a ga-eme ka ihe ọhụụ ahụ pụtara doo anya. (Daniel 8:17, 19; 11:35, 40; 12:9) Daniel dekwara, sị: “N’ụbọchị ndị eze ahụ, Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze nke a na-agaghị ebibi ebibi malite ịchị. A gaghịkwa enyefe ndị ọ bụla ọzọ alaeze ahụ. Ọ ga-egwepịa alaeze ndị a niile, mee ka ha ghara ịdịkwa, ma ya onwe ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.”—Daniel 2:44.

Jizọs Kraịst kwuru banyere “ọgwụgwụ” mgbe ọ na-aza ajụjụ a jụrụ ya banyere “ihe ịrịba ama nke ọnụnọ [ya] na nke ọgwụgwụ usoro ihe a.” (Matiu 24:3-42) O yiri ka ma Daniel ma Jizọs hà na-ekwucha banyere ọgwụgwụ—ya bụ, mgbe ihe ga-agbanwe kpamkpam n’ụzọ ga-emetụta ma ndị dị ndụ n’ụwa ma ndị dịrịla ndụ na ya. Daniel dere banyere ọgwụgwụ nke ọchịchị niile nke ụwa. Jizọs kwuru banyere “ọgwụgwụ usoro ihe a.”

Ì kwesịrị ichewe banyere ya? Eenụ. Mmadụ niile kwesịrị ịdị na-eche banyere ya n’ihi na ọ gbasara onye ọ bụla. Ma, ọtụtụ ndị ejighị ya kpọrọ ihe. Baịbụl buru amụma, sị: “N’oge ikpeazụ, ndị na-akwa emo ga-eji ịkwa emo ha bịa, na-agbaso ọchịchọ nke onwe ha, na-asị: ‘Olee ebe nkwa a nke ọnụnọ ya dị? Leenụ, site n’ụbọchị nna nna anyị hà dara n’ụra ọnwụ, ihe niile ka dị kpọmkwem otú ha dị site ná mmalite okike.’” (2 Pita 3:3, 4) Ee, ụfọdụ ndị taa chere na ọ dịghị ihe na-eme ugbu a nke na-emebeghị mbụ, nakwa na ndụ ga-adịgide otú ọ dị ugbu a n’akwụsịghị akwụsị.

È nwere ihe na-egosi na anyị bi nnọọ n’oge Baịbụl kpọrọ oge ikpeazụ? Ka anyị hụ.