Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ihe Ị Ga-aza?

Olee Ihe Ị Ga-aza?

Olee Ihe Ị Ga-aza?

Kọwaa Foto Ndị A

1. N’ihe e dekọrọ na Matiu 25:31-46, ònye ka a kpọrọ “Nwa nke mmadụ”?

IJI NYERE GỊ AKA: Gụọ Matiu 16:13-17.

․․․․․

2. Olee ihe na-ekpebi ma mmadụ ọ̀ bụ ewu ka ọ̀ bụ atụrụ?

․․․․․

3. Gịnị ga-eme ndị bụ́ ewu, gịnị ga-emekwa ndị bụ́ atụrụ?

․․․․․

IHE A GA-EKWURỊTA:

Ole ndị kpọmkwem ka a kpọrọ “ụmụnna m”? Olee otú i nwere ike isi nyere ha aka?

Site na Magazin A

Zaa ajụjụ ndị a, ma denye amaokwu Baịbụl ndị na-adịghị na ha.

PEEJI NKE 3 Gịnị ka ndị na-akwa emo ga-ekwu n’oge ikpeazụ? 2 Pita 3:․․․

PEEJI NKE 7 Olee mgbe mbibi mberede ga-abịa? 1 Ndị Tesalonaịka 5:․․․

PEEJI NKE 14 Gịnị mere onyeisi ezinụlọ kwesịrị iji na-egbo mkpa anụ ahụ́ nke ezinụlọ ya? 1 Timoti 5:․․․

PEEJI NKE 23 Olee otú anyị kwesịrị isi na-eme? Ndị Hibru 13:․․․

Ònye So n’Ezinụlọ Jizọs?

Tụlee ihe ndị e depụtara iji nyere gị aka. Gụọ amaokwu Baịbụl ndị e depụtara. Denyezie aha kwesịrị ekwesị n’ohere e wepụtara.

4. ․․․․․

IJI NYERE GỊ AKA: Abụ m nna ochie Ebreham.

Gụọ Jenesis 11:24-26.

5. ․․․․․

IJI NYERE GỊ AKA: Mụ na ezinụlọ m si n’obodo Ọọ na-aga n’ala Kenan.

Gụọ Jenesis 11:31.

6. ․․․․․

IJI NYERE GỊ AKA: Jehova gbanwere aha m n’ihi na ọ sịrị na m ga-aghọ “nna nke ìgwè mba dị iche iche.”

Gụọ Jenesis 17:5.

AZỊZA

1. Jizọs.

2. Otú onye ahụ si mesoo ụmụnna ime mmụọ Jizọs.

3. Ndị bụ́ atụrụ ga-enweta ndụ ebighị ebi; ndị bụ́ ewu ga-aga ná mbibi ebighị ebi.

4. Nehọ.—Luk 3:34.

5. Tira.—Luk 3:34.

6. Ebreham.—Luk 3:34.