Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú E Nwere Ike Isi Chọta Ezi Okpukpe

Otú E Nwere Ike Isi Chọta Ezi Okpukpe

Otú E Nwere Ike Isi Chọta Ezi Okpukpe

Ụfọdụ na-ajụ, sị: ‘Ọ bụrụ na e nwere eziokwu sitere n’aka Chineke, olee ihe mere m ga-ejirịrị chọọ ya achọọ? Ọ bụrụ na Chineke nwere ozi dị mkpa ọ chọrọ izi ụmụ mmadụ, ọ́ gaghị ekwu ya otú ọ ga-edo anya ka ndị mmadụ nwee ike ịghọta ya ozugbo, n’achọghị ya achọ?’

N’EZIOKWU, Chineke nwere ike ime ya otú ahụ. Ma, ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ họọrọ isi kụziere anyị eziokwu?

Otú Chineke Si Akụzi Eziokwu

N’eziokwu, Chineke na-ezi ozi ya otú ọ ga-adịrị ndị ji ezi obi achọ eziokwu mfe nchọta. (Abụ Ọma 14:2) Tụlee ozi Chineke ziri site n’aka onye amụma ya bụ́ Jeremaya ọtụtụ narị afọ gara aga. E ziri ya ndị Chineke na-enupụ isi banyere mbibi ndị Babịlọn ga-ebibi Jeruselem.—Jeremaya 25:8-11; 52:12-14.

Ma, n’otu oge ahụ, ndị amụma ndị ọzọ na-azọrọ na ọ bụ Chineke gwara ha ihe ha na-ekwu. Hananaya buru amụma na udo ga-adị na Jeruselem. Ozi ahụ dị nnọọ iche na nke Jeremaya. Ònyezi ka mmadụ ga-ekwenyere n’oge ahụ—Jeremaya ka ọ̀ bụ ndị ahụ na-ezi ozi dị iche na nke ya?—Jeremaya 23:16, 17; 28:1, 2, 10-17.

Ka ndị Juu nwere obi eziokwu nwee ike ịmata onye nke na-ekwu eziokwu, ọ dị ha mkpa ịmata onye Jehova bụ. Ọ dị ha mkpa ịghọta iwu na ụkpụrụ ya, nakwa otú o si ele omume ọjọọ anya. Ọ bụrụ na ha mere otú ahụ, ha gaara ekwere ihe ahụ Chineke si n’ọnụ Jeremaya gwa ha na “ọ dịghị onye na-echegharị n’ihe ọjọọ ya.” (Jeremaya 8:5-7) Ọzọkwa, ha gaara amara na ihe ahụ na-emenụ ga-akpatara Jeruselem na ndị bi na ya ọdachi.—Diuterọnọmi 28:15-68; Jeremaya 52:4-14.

Ihe Jeremaya buru n’amụma banyere Jeruselem mezuru. Ndị Babịlọn bibiri obodo ahụ n’afọ 607 T.O.A.

Ọ bụ ezie na ogologo oge tupu oge Jeremaya, e buola amụma ihe ga-eme ndị obodo ahụ ma ha nupụ isi, ọ dị mmadụ mkpa itinye mgbalị iji mata na oge ahụ Chineke ga-eme ihe eruola.

Olee Maka Eziokwu Ndị Kraịst Kụziri?

Olee maka eziokwu ahụ Jizọs Kraịst kụziri? Mmadụ niile hà ghọtara ya dị ka ozi sitere n’aka Chineke? Ee e. Ọ bụ ezie na Jizọs nọ nnọọ n’etiti ụmụ Izrel na-akụziri ha ihe, na-arụkwa ọrụ ebube dị iche iche, ihe ka ọtụtụ ná ndị na-ege ya ntị aghọtaghị na ọ bụ ya bụ Mesaya ahụ e buru n’amụma—Kraịst ahụ, ma ọ bụ Onye E Tere Mmanụ.

Jizọs n’onwe ya gwara ndị Farisii nọ na-ajụ ya mgbe Alaeze Chineke ga-abịa, sị: “Alaeze Chineke agaghị abịa n’ụzọ pụtara oké ìhè.” Ọ gwakwara ha, sị: “Alaeze Chineke dị n’etiti unu.” (Luk 17:20, 21) Jizọs, bụ́ Onye Ọchịchị Chineke họpụtara, nọ n’etiti ha! Ma, ndị Farisii ahụ achọghị ịhụ ihe àmà na-egosi na Jizọs na-emezu amụma ndị e buru banyere Mesaya ma kwere na ọ bụ ya bụ “Kraịst, Ọkpara nke Chineke dị ndụ.”—Matiu 16:16.

Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ndị mmadụ mere banyere eziokwu ndịozi Kraịst nke narị afọ mbụ kwusara. Ọ bụ ezie na ọrụ ebube ndị a rụrụ n’oge ahụ gosiri na Chineke na-akwado ndịozi ahụ, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ aghọtachaghị eziokwu ahụ. (Ọrụ 8:1-8; 9:32-41) Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ọrụ ime ‘ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya’ site n’ịkụziri ha ihe. Ndị ji ezi obi achọ eziokwu ahụ ghọrọ ndị kwere ekwe n’ihi na ha gere ntị ma mụta eziokwu ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ.—Matiu 28:19; Ọrụ 5:42; 17:2-4, 32-34.

Otú ahụkwa ka ọ dị taa. A na-ekwusa “ozi ọma [nke] alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile.” (Matiu 24:14) A naghị eme ya “n’ụzọ pụtara oké ìhè”—otú mmadụ niile bi n’ụwa ga-aghọta na ọ bụ ozi si n’aka Chineke. N’agbanyeghị nke ahụ, eziokwu si n’aka Chineke bụ ihe a pụrụ ịghọta aghọta, ọ na-akpalikwa ndị nwere obi eziokwu, bụ́ ndị chọrọ ife Chineke otú o si chọọ, ime ezi ihe.—Jọn 10:4, 27.

Na ị na-agụ akwụkwọ na-ekwu banyere Baịbụl na-egosi na ikekwe ị bụ onye ji ezi obi na-achọ eziokwu. Olee otú i nwere ike isi mata okpukpe nke na-akụzi ya?

Otú Ị Ga-esi Achọta Ya

Pọl onyeozi jara ụfọdụ ndị bi na Beria na narị afọ mbụ mma maka ihe ha mere mgbe ọ kụzichaara ha ihe. Ha ekwetaghị ozugbo na ihe Pọl kwuru bụ eziokwu; ma, ha ji nkwanye ùgwù gee ya ntị. Anyị nwere ike ịmụta ihe n’ihe ndị Beria mere mgbe ha nụchara ozi ahụ.

Buru n’uche na Baịbụl kọwara, sị: “Ndị Beria nwere ezi obi karịa ndị bi na Tesalonaịka, n’ihi na ha ji oké ịnụ ọkụ n’obi nabata okwu Chineke, na-enyocha Akwụkwọ Nsọ nke ọma kwa ụbọchị iji mara ma ihe ndị a hà dị otú ahụ. Ya mere, ọtụtụ n’ime ha ghọrọ ndị kwere ekwe.” (Ọrụ 17:10-12) N’ihi ya, ha achọghị eziokwu ahụ elu elu. Ha ebughị n’uche na otu ugboro ma ọ bụ ugboro abụọ ha na Pọl kwurịtatụrụ okwu ga-eme ka ha ghọtachaa ihe niile o kwuru.

Chetakwa na ndị Beria “ji oké ịnụ ọkụ n’obi nabata okwu Chineke.” Nke a mere ka anyị ghọtatụkwuo otú ha si lee ịmụ Akwụkwọ Nsọ anya. Ha ekwereghị ihe ọ bụla ha nụrụ n’ajụghị ase, ha abụkwanụghị ekwe ekwe. Ha akatọwaghị ihe Pọl na-akọwara ha, ebe ọ bụ na Pọl na-ezi ha ozi Chineke.

Tụleekwa nke a: Nke ahụ bụ nke mbụ ndị Beria na-anụ banyere Iso Ụzọ Kraịst. Ihe ha nụrụ banyere ya dị ha mma, ma eleghị anya, o yiri ha ihe na-agaghị emeli eme. Ma kama ịjụ ya, ha ji nlezianya nyochaa Akwụkwọ Nsọ, na-atụle ya iji hụ ma ‘ihe ndị Pọl na-ekwu hà dị otú ahụ.’ Chetakwa na ndị mere otú ahụ ma na Beria ma na Tesalonaịka ghọrọ ndị kwere ekwe. (Ọrụ 17:4, 12) Ha ewepụghị obi ma kwubie na ọ dịghị onye ga-achọtali eziokwu. Ha matara okpukpe nke bụ́ ezi okpukpe.

Otú Eziokwu Si Emetụta Ndị Mmadụ

Mgbe mmadụ chọtara eziokwu, dị ka ndị Beria, ọ na-akpali ya iji ịnụ ọkụ n’obi agwa ya ndị ọzọ. Ndị ọzọ nwere ike iche na ọ dịghị mkpa n’ihi na ha chere na anyị ga-aka abụ ndị dị umeala n’obi ma ọ bụrụ na anyị ekwere na okpukpe ndị ọzọ dịkwa mma. Ma, ozugbo mmadụ chọtara eziokwu Baịbụl, ọ na-eme ka obi sie onye ahụ ike na ya achọtala ya. Onye ahụ anakwaghị echewe ma mmadụ ọ̀ ga-achọtali eziokwu ma ọ bụ ma okpukpe niile hà pụrụ iduga ná nzọpụta. Ma, iji chọta eziokwu, mmadụ ga-ebu ụzọ jiri obi ọcha nyochaa Akwụkwọ Nsọ, bụ́ nke ga-achọ ka onye ahụ dị umeala n’obi.

Ndịàmà Jehova esila otú ahụ nyochaa Akwụkwọ Nsọ. Ọ bụ ya mere ha ji kwere na ha achọtala ezi okpukpe. Ha na-agbakwa gị ume ka i nyochaa Akwụkwọ Nsọ iji mata ndị na-ekpe ezi okpukpe taa. Ọ bụ ezie na idepụta ihe ole na ole e ji amata ezi okpukpe agaghị ezuru anyị iji chọta ya, ihe e dere n’igbe dị na peeji a banyere Ndị Kraịst narị afọ mbụ nwere ike inyere gị aka ịmalite ime nnyocha dị otú ahụ.

Site n’ịnabata ọmụmụ Baịbụl Ndịàmà Jehova na-eduziri ndị mmadụ n’efu n’ụlọ ha, ị ga-enwe ike iji nlezianya nyochaa ihe Baịbụl na-akụzi n’ezie. Ịmata nke a ga-enyere gị aka ịmata ezi okpukpe ahụ.

[Igbe dị na peeji nke 27]

Ihe Ndị E Ji Amata Ezi Okpukpe

Ka anyị tụlee àgwà na ozizi nke Ndị Kraịst narị afọ mbụ:

Ha kwere ka Okwu Chineke na-eduzi ha.—2 Timoti 3:16; 2 Pita 1:21.

Ha kụziri na Jizọs bụ Ọkpara Chineke, na ọ dị iche na Chineke, nakwa na ọ nọ n’okpuru Chineke.—1 Ndị Kọrịnt 11:3; 1 Pita 1:3.

Ha kụziri na a ga-eme ka ndị nwụrụ anwụ dịghachi ndụ n’ọdịnihu site n’ịkpọlite ha n’ọnwụ.—Ọrụ 24:15.

Isi ihe ndị mmadụ ji mara ha bụ ịhụnanya ha nwere n’etiti onwe ha.—Jọn 13:34, 35.

Ha efeghị Chineke naanị n’otu n’otu kama nke ahụ, ha nwere ọgbakọ dị iche iche, ndị nlekọta ọgbakọ ha na ndị okenye na-elekọta ọgbakọ ha niile, bụ́ ndị weere Jizọs dị ka Onyeisi ha, mekwara ka ha dị n’otu.—Ọrụ 14:21-23; 15:1-31; Ndị Efesọs 1:22; 1 Timoti 3:1-13.

Ha ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa na Alaeze Chineke bụ naanị olileanya dịịrị ụmụ mmadụ.—Matiu 24:14; 28:19, 20; Ọrụ 1:8.

[Foto dị na peeji nke 25]

Olee otú ndị mmadụ ga-esi mata na Jeremaya bụ ezi onye amụma, ebe ọ bụ na ndị amụma ndị ọzọ ziri ozi dị iche na nke ya?

[Foto ndị dị na peeji nke 26 na 27]

Ndị Beria narị afọ mbụ gere Pọl ntị, ma mesịa nyochaa Akwụkwọ Nsọ iji jide n’aka na ihe ndị o kwuru bụ eziokwu

[Foto dị na peeji nke 26 na 27]

Iji nlezianya amụ Baịbụl nwere ike inyere gị aka ịmata ezi okpukpe