Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Ndị Dị Afọ Iri na Ụma Nwere Ike Isi Merie Ịda Mbà n’Obi

Otú Ndị Dị Afọ Iri na Ụma Nwere Ike Isi Merie Ịda Mbà n’Obi

Otú Ndị Dị Afọ Iri na Ụma Nwere Ike Isi Merie Ịda Mbà n’Obi

A GWARA ụmụ akwụkwọ na-amụ asụsụ Bekee na Mexico ka ha jiri isiokwu ọ bụla sọrọ ha kwadebe okwu ha ga-ekwu. Maritza kọwara, sị: “Ọ dị mgbe m dara mbà n’obi, ma usoro isiokwu bụ́ ‘Enyemaka Maka Ndị Nọ n’Afọ Iri na Ụma Dara Mbà n’Obi,’ bụ́ nke gbara na Teta! nke September 8, 2001, nyeere m aka. N’ihi ya, eji m ihe dị na magazin ahụ kwuo okwu, e nyekwara m akara kasị elu maka ya. Ka e mesịrị, enyere m ụmụ akwụkwọ na ndị nkụzi usoro isiokwu ahụ otu otu.”

Mgbe afọ abụọ gasịrị, ka Maritza nọ na-ekwusa ozi ọma, ọ gara n’ụlọ otu nwa akwụkwọ a sịkwara dee ihe ahụ a gwara ya dee. Ọ tụrụ Maritza n’anya mgbe nwa akwụkwọ ahụ gosiri ya usoro isiokwu Teta! ahụ kwuru banyere ịda mbà n’obi nke ndị dị afọ iri na ụma. O yiri ka ọ̀ masịrị onye nkụzi ahụ nke ukwuu nke na o nyere nwa akwụkwọ ya nke ọ bụla otu!

I nwere ike ịmụtakwu ihe banyere ịda mbà n’obi nke ndị dị afọ iri na ụma n’akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè. Ụfọdụ n’ime isiokwu ndị dị na ya bụ “N’ihi Gịnị Ka Onwe M Na-ejighị Amasị M?,” “N’ihi Gịnị Ka M Ji Enwe Oké Ịda Mbà n’Obi?” na “Olee Otú M Pụrụ Isi Mee Ka Owu Na-ama M Laa?” Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta akwụkwọ a, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 nke magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Baịbụl ebe obibi n’efu.