Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Alụmdi na Nwunye Nọ ná Nsogbu

Alụmdi na Nwunye Nọ ná Nsogbu

Alụmdi na Nwunye Nọ ná Nsogbu

“Ike ya agwụla m!” Ị̀ nụtụla ebe ndị mmadụ kwuru ihe dị otú ahụ banyere alụmdi na nwunye ha? Ọ bụrụ na ị lụọla di ma ọ bụ nwunye, ò nwetụla mgbe ọ dị gị otú ahụ?

ỌTỤTỤ puku di na nwunye lụrụ n’ihi na ha nwere ezigbo ịhụnanya n’ebe ibe ha nọ—ma ọ bụ n’ihi otú ha si maa onwe ha mma n’anya—ma tụọ anya na ha ga-enwe obi ụtọ. Otu onye na-adụ ndị di na nwunye ọdụ kwuru, sị: “Ma, tupu ọtụtụ n’ime ha abịa ịhụ m, ike alụmdi na nwunye ha agwụla ha. Ha enweghịzi mmasị na di ma ọ bụ nwunye ha, n’alụmdi na nwunye ha, n’ịhụnanya, mgbe ụfọdụkwa, ha enweghịzi mmasị ịdị ndụ.” Ọ dịghịzi ihe ọzọ jikọtara ọtụtụ ndị di na nwunye ahụ ma ọ́ bụghị satifiketi alụmdi na nwunye ha na otu ụlọ ahụ ha bi na ya.

Ihe na-etisa ụfọdụ alụmdi na nwunye bụ nchegbu na nchekasị ndị na-abịara ha aghara aghara. Ọrụ na-ewe oge, ọrụ onye rụtụ ibe ya arụtụ, na ịrụ ọrụ ruo n’ime abalị nwere ike ime ka ọbụna di na nwunye hụrụ nnọọ ibe ha n’anya gharazie inwe oge maka ibe ha. Nsogbu ego, nsogbu ụmụaka, ịkwaga n’ụlọ ọhụrụ, ịgbanwe ọrụ, na ọrịa nwekwara ike ime ka ịhụnanya na nkwanye ùgwù mie ala n’alụmdi na nwunye. Ihe anyị na-ekwu bụ na mgbanwe ndị a na-enwe ka oge na-aga nwere ike ịkpatara di na nwunye ụdị nchekasị nwere ike itisa alụmdi na nwunye ha.

Ọtụtụ ndị bụ́ nne na-arụ ụzọ ọrụ abụọ na-ericha ha oge—otu n’ebe ọrụ ha, nke ọzọ n’ụlọ ha. Nke a nwere ike ime ka ha lekwasịzie anya naanị n’ọrụ ha na n’ụmụ ha. Nchekasị na ike ọgwụgwụ na-eme ka di na nwunye gharazie inwecha oge maka ibe ha. N’ihi ya, ọtụtụ na-eche na ha agaghị ezereli nchekasị na ịnọ iche iche n’alụmdi na nwunye ha. Olee ihe mere ọtụtụ alụmdi na nwunye ji na-enwe ọtụtụ nsogbu otú a? Olee ihe i nwere ike ime iji nwee alụmdi na nwunye na-enye obi ụtọ na nke na-aga nke ọma?