Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka M Ga-eme Ma Nwanne M Gbuo Onwe Ya?

Gịnị Ka M Ga-eme Ma Nwanne M Gbuo Onwe Ya?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Gịnị Ka M Ga-eme Ma Nwanne M Gbuo Onwe Ya?

Ndụ Karen gbanwere ụbọchị papa ya gwara ya banyere ya. Naanị ihe papa ya nwere ike ikwu bụ, “Sheila ahapụla.” Karen na papa ya dakwasịrị onwe ha n’ahụ́, na-eche ihe kpatara omume nzuzu ahụ. Nwanne Karen gburu onwe ya. *

MGBE onye na-eto eto nwụrụ, ọ na-abụkarị naanị ndị mụrụ ya ka ndị bịaara ha mgbaru na-akasi obi. Ha na-ajụ ụmụnne onye ahụ nwụrụ anwụ, sị, “Olee otú papa unu na mama unu mere? Hà nahụ akara obi?” ma ha nwere ike ichefu ịjụ, sị, “Olee otú unu mere? Ùnu nahụ akara obi?” Ya mere, ọ dabara nnọọ adaba na a na-akpọ ụmụaka ụmụnne ha nwụnahụrụ ndị na-eru újú e chefuru ịkasi obi.

Nnyocha e mere na-egosi na ọ na-ewute ndị na-eto eto nke ukwuu ma nwanne ha nwụnahụ ha. N’akwụkwọ ya bụ́ Sibling Grief—Healing After the Death of a Sister or Brother, Dr. P. Gill White dere, sị: “Nnukwu mfu dị otú ahụ na-emetụta ahụ́ ike, àgwà, ihe omume ụlọ akwụkwọ, ùgwù onwe onye, na uto nke ụmụaka nwanne ha nwụrụ.”

Ọ na-ewutekwa ndị nke tọrọ onye ahụ gburu onwe ya. Karen, bụ́ onye e kwuru banyere ya n’elu, dị afọ iri abụọ na abụọ mgbe Sheila, bụ́ nwanne ya nwaanyị nke ọ tọrọ, gburu onwe ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-adị ya ka ọ́ gaghị edili ọnwụ ahụ. O kwuru, sị: “Agaghị m asị na o wutere m karịa ndị mụrụ m, ma echere m na ha ka m die ya.”

Dị ka Karen, nwanne gị ọ̀ nwanahụtụla gị? Ya bụrụ otú ahụ, o nwere ike ịdị gị otú ọ dị ọbụ abụ bụ́ Devid, bụ́ onye dere, sị: “Obi erukwaghị m ala, adawo m mbà nke ukwuu; ejegharịwo m ná mwute ogologo ụbọchị dum?” (Abụ Ọma 38:6) Olee otú i nwere ike isi die ya?

“A Sị Nnọọ na . . . ”

Ọ bụrụ na nwanne gị nwoke ma ọ bụ nwanne gị nwaanyị egbuo onwe ya, o nwere ike ime ka obi gị na-ama gị nnọọ ikpe. I nwere ike ịdị na-agwa onwe gị, sị, ‘A sị nnọọ na emeghị m ihe otú ahụ m si mee ya, nwanne m ka gaara anọ ndụ.’ O nwere ike iyi ka ihe ahụ ị na-eche ọ̀ bụ eziokwu. Chris, bụ́ onye dị afọ iri abụọ na otu mgbe nwanne ya nwoke dị afọ iri na asatọ gburu onwe ya, kweere nke ahụ. O kwuru, sị: “Ọ bụ m bụ onye ikpeazụ gwara nwanne m nwoke okwu, n’ihi ya, echere m na m kwesịrị ịma na o nwere ihe na-aganụ. Echere m na a sị nnọọ na m mekwuru ka obi ruo ya ala, ọ gaara akọrọ m ihe dị ya n’obi.”

Ihe mere obi ji jọkwuo Chris njọ bụ na ya na nwanne ya nwoke adịchaghị ná mma. Chris ji oké mwute kwuo, sị: “N’akwụkwọ o dere tupu ya anwụọ, o kwuru na m gaara abụkwu ezigbo nwanne. Ọ bụ ezie na m maara na isi akpakọchaghị ya ọnụ, m ka na-eche na m gaara egbochili ọnwụ ya.” Mgbe mgbe, obi na-ajọkwu mmadụ njọ ma o cheta okwu ọjọọ ya na nwanne ya gwara onwe ha tupu nwanne ya anwụọ. Dr. White, bụ́ onye e kwuru ihe o kwuru ná mmalite, gwara Teta! sị: “Ọtụtụ ndị nwanne ha nwụrụ gwara m na obi ha ka na-ama ha ikpe n’ihi okwu ha sere ọtụtụ ọnwa gara aga, na ọbụna ọtụtụ afọ gara aga.”

Ọ bụrụ na obi gị na-ama gị ikpe maka ogbugbu nwanne gị gburu onwe ya, jụọ onwe gị, sị, ‘Ò nwere onye nwere ike ịchịkwa ihe niile onye ọzọ ga-eme?’ Karen kwuru, sị, “Ị gaghị egbochili nsogbu niile nwanne gị na-achọ izere, na ihe ahụ jọgburu onwe ya o mere iji zere ha.”

Ma, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na okwu ọjọọ ma ọ bụ okwu na-agbawa obi ị gwara nwanne gị ekweghị gị nchefu? Baịbụl nwere ike inyere gị aka ile ihe anya otú o kwesịrị. O kwuru, sị: “Anyị niile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro. Ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị asụ ngọngọ n’okwu, ọ bụ onye zuru okè.” (Jems 3:2; Abụ Ọma 130:3) N’eziokwu, ichewe banyere omume ọjọọ ndị i chere na i mesoro nwanne gị ma ọ bụ okwu ọjọọ ndị i chere na ị gwara ya ga-eme nnọọ ka obi jọkwuo gị njọ. Ọ bụ ezie na icheta ihe ndị dị otú ahụ na-ewute nnọọ ewute, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị gị kpatara ọnwụ nwanne gị. *

Ụzọ Isi Die Ọnwụ Nwanne Gị

Ọ dịghị mmadụ abụọ na-eru uju kpọmkwem n’otu ụzọ ahụ. Ụfọdụ na-ebe ákwá n’ihu ọha, ọ dịghịkwa ihe ọjọọ dị na ya. Baịbụl gwara anyị na Devid “kwara ákwá nke ukwuu” mgbe Amnọn nwa ya nwụrụ. (2 Samuel 13:36) “Anya mmiri gbara” ọbụna Jizọs mgbe ọ hụrụ otú ọnwụ enyi ya nwoke bụ́ Lazarọs si wute ndị mmadụ.—Jọn 11:33-35.

N’aka nke ọzọ, ụfọdụ anaghị eru uju ozugbo ahụ—karịsịa ma ọ bụrụ na ọnwụ ahụ bụ ọnwụ mberede. Karen chetara, sị: “O yiri nnọọ ka ihe ahụ merenụ emetụghị m n’ahụ́. Ruo oge ụfọdụ, o yighị ka ọ̀ dị ihe na-ewute m.” Ọ na-adịkarị ndị nwanne ha gburu onwe ha otú ahụ. Dr. White gwara Teta! sị: “Mmadụ igbu onwe ya na-akụnwụ ndị onye ahụ hapụrụ ahụ́, ị ghaghịkwa ibu ụzọ mee ihe banyere ahụ́ nkụnwụ ahụ tupu gị ekwuwe okwu iru uju ọ na-akpata. Ụfọdụ ndị ji ilekọta ndị na-eru uju mere aka ọrụ na-anwakarị ime ka ndị mmadụ nwụnahụrụ bewe ákwá mgbe ákwá na-agụwabeghị ha. Ahụ́ ka kụnwụrụ ha n’ihi ihe mberede ahụ merenụ.”

Idi ọnwụ nwanne gị ga-ewe oge, nke ahụ ekwesịghịkwa iju anyị anya n’ihi otú ihe ahụ si mee. Chris kwuru, sị: “Ezinụlọ anyị yiri ite ájá a kụwachara mechaa nyakọtakwa ya. O yiri ka obere ihe ọ̀ na-emezi ka anyị ruwekwa uju.” Iji nyere gị aka idi ọnọdụ ahụ, gbalịa ime ihe ndị na-esonụ:

Depụtasịa amaokwu Baịbụl ndị na-akasi obi, na-agụkwa ha ya dịkarịa ala otu ugboro kwa ụbọchị.—Abụ Ọma 94:19.

Gwa onye nwere obiọma ihe na-enye gị nsogbu n’obi. Ikwupụta otú obi dị gị nwere ike ime ka iru uju gị belata.—Ilu 17:17.

Na-atụgharị uche ná nkwa Baịbụl kwere banyere mbilite n’ọnwụ.—Jọn 5:28, 29.

I nwekwara ike ịchọpụta na idepụta mmetụta gị edepụta—ma ọ́ dịghị ihe ọzọ ruo oge ụfọdụ—ga-enyere gị aka idi uju ị na-eru. Í dejupụtakwanụ igbe dị n’okpuru ebe a iji mara otú ị na-eme?

Jide n’aka na “Chineke karịrị obi anyị, marakwa ihe niile.” (1 Jọn 3:20) Ọ ka mmadụ ọ bụla mara banyere ihe ọ bụla ma ọ bụ ọnọdụ ọ bụla so kpatara nwanne gị ụdị nchegbu ahụ o nwere. Ọ makwa gị—karịa otú ị maara onwe gị. (Abụ Ọma 139:1-3) N’ihi ya, obi sie gị ike na ọ ma ihe gị na ya na-alụ. Mgbe uju ị na-eru yiri ka ọ̀ karịala gị, cheta okwu ndị a dị n’Abụ Ọma 55:22: “Tụkwasị Jehova ibu arọ gị, ya onwe ya ga-akwadokwa gị. Ọ dịghị mgbe ọ ga-ekwe ka onye ezi omume maa jijiji.”

Nkasi Obi Maka Ndị Mmadụ Nwụnahụrụ

Iji matakwuo otú ị ga-esi die ọnwụ nke onye ị hụrụ n’anya, lee broshuọ bụ́ Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ị gaa n’Ịntanet, ị ga-enweta ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị” n’adres bụ́ www.watchtower.org/ype

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwere aha ndị dị n’isiokwu a agbanwe.

^ par. 12 Onye ihe mberede ma ọ bụ ọrịa gburu onye ya na-echekwa ihe ndị yiri nke ahụ. N’agbanyeghị otú ị hụruru nwanne gị n’anya, ị gaghị egbochili “oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya.”—Ekliziastis 9:11.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

▪ Ònye ka i nwere ike ịkọrọ ma ọ bụrụ na uju ị na-eru eyie ka ọ̀ karịala gị?

▪ Olee otú i nwere ike isi kasie onye na-eto eto nke na-eru uju obi?

[Igbe dị na peeji nke 22]

Idetu otú obi dị gị n’akwụkwọ nwere nnọọ ike inyere gị aka idi ọnwụ nke onye ị hụrụ n’anya. Buru nke ahụ n’obi dezuo ahịrịokwu ndị dị n’okpuru ebe a, zaakwa ajụjụ ndị na-eso ha.

❖ Ihe ndị a bụ ezi ihe atọ m na-echeta banyere nwanne m:

1 ․․․․․

2 ․․․․․

3 ․․․․․

Ihe ndị a bụ ihe ndị ọ gaara amasị m ma a sị na m gwara nwanne m mgbe ọ ka dị ndụ:

․․․․․

Gịnị ka ị ga-agwa onye ị tọrọ nke na-ata onwe ya ụta na ọnwụ nwanne ya si ya n’aka?

․․․․․

N’amaokwu Baịbụl ndị e depụtara n’okpuru ebe a, olee nke kasị akasi gị obi, n’ihi gịnịkwa?

□ “Jehova nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso; ọ na-azọpụtakwa ndị e gburu mmụọ ha.”—Abụ Ọma 34:18.

□ “Ọ dịghị eleda mmekpa ahụ́ nke onye nọ n’ahụhụ anya, ọ dịghịkwa eleghara ya anya; o wepụghịkwa ihu ya n’ebe ọ nọ, mgbe o tikuru ya maka enyemaka, ọ nụrụ.”—Abụ Ọma 22:24.

□ “Oge awa na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya [Jizọs] wee pụta.”—Jọn 5:28, 29.