Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbakọ Distrikti “Ndị Mmụọ Chineke Na-edu” nke Ndịàmà Jehova

Mgbakọ Distrikti “Ndị Mmụọ Chineke Na-edu” nke Ndịàmà Jehova

Mgbakọ Distrikti “Ndị Mmụọ Chineke Na-edu” nke Ndịàmà Jehova

▪ N’ọnwa ndị na-abịa abịa, n’ọtụtụ puku obodo n’ụwa niile, a ga-enwe ọtụtụ puku mgbakọ distrikti ụbọchị atọ a, bụ́ nke malitere na United States ná ngwụsị izu nke May 23-25. N’afọ 2007, ihe karịrị nde mmadụ iri na abụọ gara ihe karịrị puku atọ na narị abụọ nke mgbakọ ndị yiri nke a!

N’ọtụtụ ebe n’afọ a, a ga na-eji abụ olu amalite usoro ihe omume kwa ụbọchị ma o jiri nkeji iri abụọ gafee elekere itoolu nke ụtụtụ. Isiokwu nke ụbọchị Friday, bụ́ nke dabeere na Jọn 16:13, bụ “Mmụọ Ahụ Ga-eduzi Unu Wee Nyere Unu Aka Ịghọta Eziokwu Niile.” Isiokwu ndị bụ́ “Olee Ihe Mere Anyị Ga-eji Kwe Ka Mmụọ Chineke Na-edu Anyị?” na “Mmụọ Nsọ—E Ji Ya Rụọ Ọrụ Mgbe A Na-eke Ihe!” so n’okwu ndị mbụ a ga-ekwu ná mgbakọ ahụ. Okwu mmadụ atọ ga-ekwu nke isiokwu ya bụ, “Ndị Kwesịrị Ntụkwasị Obi n’Oge Ochie Bụ́ Ndị Mmụọ Chineke Duziri,” ga-enwe isiokwu ndị bụ́ “N’oge Mozis,” “N’oge Ndị Ikpe,” na “Na Narị Afọ Mbụ.” Okwu a ga-eji mechie nnọkọ ụtụtụ bụ okwu bụ́ isi nke isiokwu ya bụ “Ọrụ Mmụọ Nsọ Na-arụ n’Imezu Nzube Jehova.”

A ga-eji okwu bụ́ “Ajụjụ na Azịza Banyere Mmụọ Nsọ” malite nnọkọ nke ehihie Friday, okwu ndị bụ́ “Mmụọ ahụ Na-enyocha . . . Ihe Ndị Miri Emi nke Chineke” na “Bụrụnụ Ndị Na-anụ Okwu Chineke ma Na-eme Ya” ga-esochikwa ya. Okwu mmadụ isii ga-ekwu, nke bụ́ “Ndị Na-Eto Eto—Na-ejenụ Ije na Mmụọ Nsọ!” ga-enwe isiokwu ndị bụ́ “n’Ụlọ Akwụkwọ,” “n’Ebe A Na-arụ Ọrụ,” “n’Ezinụlọ,” “n’Ọgbakọ,” “n’Oge Ntụrụndụ,” na “Mgbe Naanị Unu Nọ.” A ga-eji otu isiokwu ga-ede ude ná mgbakọ ahụ, bụ́ “Ndị Na-eto Eto—Chebenụ Mmekọrịta Unu na Jehova!,” mechie nnọkọ ahụ, isiokwu a ga-enyekwara ha aka ime otú ahụ.

Isiokwu nke ụbọchị Saturday bụ “Na-agha Mkpụrụ Maka Mmụọ Nsọ,” ọ dabeere ná Ndị Galeshia 6:8. Okwu mmadụ atọ ga-ekwu nke isiokwu ya bụ “Mmụọ Chineke Na-edu Anyị n’Ozi Anyị” ga-eso n’okwu ndị a ga-ekwu n’ụtụtụ ahụ. Okwu ikpeazụ a ga-ekwu n’ụtụtụ ahụ bụ okwu baptizim, e kwuchaakwa ya, e mee ndị ruru eru baptizim.

E kwuchaa okwu mbụ a ga-ekwu n’ehihie Saturday, bụ́ “Mmụọ Nsọ Duru Ndị Dere Baịbụl,’” a ga-enwezi okwu mmadụ ise ga-ekwu nke isiokwu ya bụ “Mmụọ Nsọ Na-enye Anyị Ike” “Imeri Ọnwụnwa,” “Imeri Ike Ọgwụgwụ na Nkụda Mmụọ,” “Imeri Mkpagbu,” “Ịghara Ịsọrọ Ndị Ọgbọ Anyị Anya Mee Ihe Ọjọọ,” na “Idi Nsogbu.” A ga-eji okwu ọzọ ga-ede ude, bụ́ “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke,” mechie nnọkọ nke ụbọchị ahụ.

Isiokwu nke ụbọchị Sunday bụ “Nọgidenụ Na-eje Ije Site na Mmụọ Nsọ,” ọ dabekwaara ná Ndị Galeshia 5:16. N’okwu mmadụ itoolu ga-ekwu nke isiokwu ya bụ “Nweta ‘Mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ,’” a ga-atụle àgwà nke ọ bụla so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ, bụ́ ndị e kwuru okwu ha ná Ndị Galeshia 5:22, 23. Okwu ihu ọha nke isiokwu ya bụ “Nweta Ngọzi Site n’Aka Eze nke Mmụọ Jehova Na-edu!” ka a ga-eji pịachie nnọkọ nke ụtụtụ ahụ. Ihe omume pụrụ iche a ga-eme n’ehihie ya bụ ihe nkiri a ga-eyi uwe ihe nkiri mee, nke isiokwu ya bụ “Ahapụla ‘Ịhụnanya ahụ I Nwere na Mbụ.’” Ọ ga-egosi àgwà o nwere ike ịbụ na Ndị Kraịst dịrị ndụ ná ngwụsị narị afọ mbụ nwere, nakwa ọnọdụ ndị o yiri ka hà nọ na ya mgbe ahụ. Isiokwu nke okwu mmechi nke mgbakọ ahụ bụ “Jiri Ikwesị Ntụkwasị Obi Soro Nzukọ Jehova Mmụọ Nsọ Na-eduzi Na-eje Ozi.”

Bido ugbu a mewe ndokwa ịga. Ọ bụrụ na ị na-achọ ebe ga-akasị adịrị gị nso n’ime ebe ndị a ga-anọ nwee mgbakọ a, gaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova dị n’ógbè gị jụọ ajụjụ ma ọ bụ detara ndị na-ebipụta magazin a akwụkwọ.