Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ihe Nwere Ike Ịkpata Nsogbu?

Olee Ihe Nwere Ike Ịkpata Nsogbu?

Olee Ihe Nwere Ike Ịkpata Nsogbu?

ANYỊ ekwesịghị ịtụ anya na a gaghị enwe nsogbu ọ bụla n’alụmdi na nwunye. A sị ka e kwuwe, ọbụna di na nwunye ihe na-adabara nnọọ agaghị na-ekwekọrịta n’ihe niile. N’ihi ya, a ga-enwerịrị nsogbu ụfọdụ. Dị nnọọ ka ígwè e tere ágbá nwere ike ịta nchara n’ime, e nwere ọtụtụ ihe ndị nwere ike iji nwayọọ nwayọọ bibie alụmdi na nwunye. Iji ghọta ihe e nwere ike ime iji mee ka alụmdi na nwunye ka mma, ka anyị buru ụzọ tụlee ihe ụfọdụ nwere ike ịkpata nsogbu.

Oge Oké Nchekasị

Baịbụl buru amụma na ọtụtụ ndị dị ndụ n’oge anyị ga-abụ “ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, . . . ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe, ndị na-enweghị obi mmadụ, ndị na-adịghị achọ inwe nkwekọrịta ọ bụla, ndị nkwutọ, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị na-eme ihe ike, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye, ndị isi ike, ndị nganga fụliri elu.” (2 Timoti 3:2-4) Àgwà ndị dị otú ahụ nwere ike ime ka nghọtahie, akọwaghị ihe otú ọ ga-edo anya, ikwu okwu n’echeghị echiche, bụ́ ihe ndị ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-emekarị, ka njọ.

Otu onye na-eme nnyocha kwuru, sị: “Ihe na-eme n’alụmdi na nwunye n’oge a na-eju anya. . . . Anyị nwere ọtụtụ ebe anyị nwere ike isi mụta otú e si eme ka alụmdi na nwunye sikwuo ike . . . Ma, anyị nwere ọtụtụ nsogbu ego na ụdị nsogbu ndị ọzọ ndị na-eme ka o siere anyị ike inwe ezi alụmdi na nwunye.”

Ịtụ Anya Ihe Ndị Na-agaghị Ekwe Omume

Otu onye na-ahụ maka nsogbu alụmdi na nwunye kwuru, sị: “Otu n’ime ihe ndị na-akasị akpata enweghị afọ ojuju n’alụmdi na nwunye bụ ịtụ anya ihe ndị na-agaghị ekwe omume.” Obi na-ajọ nnọọ ọtụtụ ndị di na nwunye njọ mgbe ha chọpụtara na alụmdi na nwunye abụchaghị ihe ha tụrụ anya na ọ ga-abụ nakwa na di ha ma ọ bụ nwunye ha abụchaghị ụdị onye ha chere na ọ bụ. Obi na-ajọ ha nnọọ njọ ma ha hụ àgwà ọjọọ ndị di ma ọ bụ nwunye ha nwere bụ́ ndị ha na-ahụbughị ma ọ bụ chọpụta na àgwà ọjọọ ya ụfọdụ ndị ha mabu dị njọ karịa otú ha chere.

Ma Baịbụl kwuru hoo haa na alụmdi na nwunye nwere ike iweta “ihe mgbu na mwute.” (1 Ndị Kọrịnt 7:28, The New English Bible) N’ihi gịnị? Otu n’ime ihe ndị kpatara ya bụ na ka mmadụ abụọ na-ezughị okè na-ebikọ, ha ga-emecha chọpụta ọrụ onye nke ọ bụla n’ime ha gbara.

Ọzọ, ọtụtụ ndị achọghị ịrụsi ọrụ ike iji mee ka alụmdi na nwunye ha gaa nke ọma ma ha na-atụ anya ka ọ gaa nke ọma. N’ihi ihe ndị ha nụrụ banyere otú alụmdi na nwunye si atọ ụtọ, ha anaghị echeta na ọ dị ha mkpa ịrụsi ọrụ ike iji nwee obi ụtọ n’alụmdi na nwunye ha. N’ihi ụdị echiche ahụ ha nwere, obi ga-adarịrị ha mbà mgbe ha hụrụ otú alụmdi na nwunye dị n’ezie, ha agaghịkwa ama otú ha ga-esi mee ka ọ ka mma. Mgbe mgbe, otú mmadụ nweruru echiche na-ezighị ezi banyere alụmdi na nwunye bụkwa otú onye ahụ ga-enweru obi ọjọọ mgbe ọ ghọtara na alụmdi na nwunye abụghị ihe o chere.

Nsogbu Nkwurịta Okwu

Olee nsogbu ụfọdụ a na-enwe n’ihe banyere nkwurịta okwu bụ́ ndị di na nwunye nwere ike izere iji nwee alụmdi na nwunye sikwuru ike? Ụfọdụ di na nwunye na-ekwe ka ọ mara ha ahụ́ ịnụ ihe n’egeghị ntị na ikwu okwu n’enweghị mkparịta ụka. Kama iji ịhụnanya na-ekwurịta okwu, ha na-aza onwe ha okwu ngwa ngwa n’egosighị mmasị ọ bụla n’ihe ibe ha na-ekwu. Arụmụka banyere obere ihe ọ bụla na-emekarị ka ha ghara inwe mgbe ha na-ewepụta oge jiri ezi obi kparịta ihe ndị dịịrị ha. Ịghọtahie ihe e kwuru na-akpata esemokwu; okwu ọjọọ na-eme ka onye nke ọzọ gbachie nnọọ ibe ya nkịtị.

Ọ dị mwute ikwu na ọtụtụ ndị di na nwunye anaghị ahụ ezi ihe ndị di ha ma ọ bụ nwunye ha na-eme ma ọ bụ ya abụrụ na ha na-ahụ ha ma ghara ikele ha maka ha. Ọzọkwa, n’ihi na di na nwunye na-arụzi ọrụ ego n’oge a, iwe na-eju ọtụtụ ụmụ nwaanyị lụrụ di obi n’ihi na a na-ahapụrụ ha ihe ka ọtụtụ n’ọrụ ndị dị n’ụlọ ka ha rụọ tụkwasị n’ọrụ ego ha na-arụ. E wezụga nke ahụ, ọtụtụ ụmụ nwaanyị na-eche na di ha anaghị achọ ịma otú obi dị ha.

Olee ihe i nwere ike ime iji mee ka obi ụtọ dị n’alụmdi na nwunye gị? Tụlee ndụmọdụ ndị a bara uru sitere na Baịbụl.

[Ihe Odide Gbatụrụ Okpotokpo nke dị na peeji nke 4]

Ụfọdụ di na nwunye na-anụ ihe n’egeghị ntị ma na-ekwu okwu n’enweghị mkparịta ụka

[Ihe Odide Gbatụrụ Okpotokpo nke dị na peeji nke 5]

Ọtụtụ ndị achọghị ịrụsi ọrụ ike iji mee ka alụmdi na nwunye ha gaa nke ọma ma ha na-atụ anya ka ọ gaa nke ọma