Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Mgbe Mmadụ Nwere Ike Ime Ihe Ike Iji Chebe Onwe Ya?

Olee Mgbe Mmadụ Nwere Ike Ime Ihe Ike Iji Chebe Onwe Ya?

Echiche Baịbụl

Olee Mgbe Mmadụ Nwere Ike Ime Ihe Ike Iji Chebe Onwe Ya?

KA E were ya na otu mkpọtụ kpọtere gị na mberede n’etiti abalị. Gị anụ ụda ụkwụ. Mmadụ awabatala n’ụlọ gị. Ka obi na-akụ gị kpum kpum, ụjọ ana-atụkwa gị, ị nọ na-eche ihe ị ga-eme.

Ihe a nwere ike ime onye ọ bụla. Mpụ—ọbụna ụdị a na-eme ihe ike na ya—abụghịzi ihe na-eme naanị ná mba ụfọdụ ma ọ bụ n’obodo ndị mepere emepe. N’ihi ụjọ nke a kpatarala, ọtụtụ mmadụ na-agbalị ichebe onwe ha site n’ịzụrụ ngwá ọgụ ma ọ bụ ịmụ otú e si alụ ọgụ ụkwụ na aka. Ụfọdụ gọọmenti etiela iwu ndị nyere ụmụ amaala ha ikike inwe ngwá ọgụ ndị nwere ike igbu mmadụ, bụ́ ndị ha ga-eji na-echebe onwe ha. Ma, gịnị ka Baịbụl kwuru banyere ya? Ọ̀ dị mgbe mmadụ nwere ike ime ihe ike iji chebe onwe ya ma ọ bụ ezinụlọ ya?

Chineke Kpọrọ Ime Ihe Ike Asị

Baịbụl katọrọ ihe ike na ndị na-eme ya. Ọbụ abụ bụ́ Devid kwuru banyere Jehova Chineke, sị: “Mkpụrụ obi ya kpọrọ onye ọ bụla nke hụrụ ime ihe ike n’anya asị.” (Abụ Ọma 11:5) Chineke mara mba dị iche iche ikpe n’oge ochie, gụnyere ndị ya, n’ihi ihe ike ha na-eme na ọbara ha na-akwafu. (Joel 3:19; Maịka 6:12; Nehọm 3:1) Ọbụna igbu mmadụ n’amaghị ama n’ihi akpacharaghị anya bụ mpụ n’Iwu e nyere ụmụ Izrel.—Diuterọnọmi 22:8.

Baịbụl na-agba ndị mmadụ ume ka ha ghara ime ihe ọ bụla nwere ike ịkpata ọgụ site n’ịdị na-eme udo kwa ụbọchị. Ihe na-akpatakarị ọgụ bụ mmadụ abụọ iji iwe agwa ibe ha okwu. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụrụ na nkụ adịghị, ọkụ na-anyụ, ọ bụrụkwa na e nweghị onye nkwutọ, esemokwu na-akwụsị.” (Ilu 26:20) Mmadụ ịnọ jụụ na-emekarị ka iwe belata ma na-egbochi ọgụ. Pọl onyeozi dere, sị: “Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, unu na mmadụ niile dịrị n’udo.”—Ndị Rom 12:18.

Mgbe E Menyere Gị Egwu

Na ị bụ onye na-achọ udo apụtaghị na o nwetụghị mgbe a ga-emeso gị ihe ike. Kemgbe ụwa, a na-emeso ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe Chineke ihe ike. (Jenesis 4:8; Job 1:14, 15, 17) Ọ bụrụ na onye o ji égbè ezu ohi abịa na nke mmadụ, gịnị ka onye ahụ kwesịrị ime? Jizọs kwuru, sị: “Emegwarala onye bụ́ ajọ mmadụ ihe o mere gị.” (Matiu 5:39) O kwukwara, sị: “Onye naara gị uwe elu gị, ajụla inye ya ọbụna uwe ime gị.” (Luk 6:29) Jizọs akwadoghị mmadụ iji ngwá ọgụ echebe ihe onwunwe ya. Ọ bụrụ na onye o ji égbè ezu ohi abịa na nke mmadụ, onye ahụ ọ bịara na nke ya mara ihe, ọ gaghị ajụ inye ya ihe ndị bara uru o nwere. O doro anya na ndụ dị nnọọ mkpa karịa ihe onwunwe!

Ya bụrụkwanụ na onye o ji égbè ezu ohi bịara na nke mmadụ bịara igbu onye ahụ egbu? Otu n’ime iwu ndị Chineke nyere Izrel oge ochie mere ka okwu a dokwuo anya. Ọ bụrụ na e jide onye ohi n’ehihie ma gbuo ya, ikpe igbu ọchụ ga-ama onye gburu ya. O nwere ike ịbụ na ihe kpatara ya bụ na a naghị ama onye zuru ohi ikpe ọnwụ, e nwekwara ike ịhụ onye ahụ ma nye ya ntaramahụhụ kwesịrị ya. Ma, ọ bụrụ na onye nwe ụlọ egbuo onye wabatara na nke ya n’abalị, e nwere ike ịgbaghara ya n’ihi na ọ ga-esiri ya ike ịhụ ihe onye ahụ na-eme na ịmata kpọmkwem ihe ọ chọrọ ime. Onye ahụ nwe ụlọ nwere ike ikpebi na ya na ezinụlọ ya nọ n’ihe ize ndụ, n’ihi ya kwa, mee ihe iji chebe ezinụlọ ya.—Ọpụpụ 22:2, 3.

Baịbụl si otú a gosi na mmadụ nwere ike ime ihe iji chebe onwe ya na ndị ezinụlọ ya ma e mesoo ha ihe ike. O nwere ike ịkụpụ onye chọrọ ịkụ ya ọkpọ aka, ijichi onye ahụ, ma ọ bụ ọbụna ịkụ onye ahụ ọkpọ iji kụgharịa ya anya ma ọ bụ iji mee ka ike gharazie ịdị ya imerụ ya ahụ́. Ihe o bu n’obi mee ihe ahụ o mere bụ ịkwụsị ihe ike ahụ. Ebe ọ dị otú ahụ, ọ bụrụ na e merụọ ome ihe ike ahụ ahụ́ ma ọ bụ gbuo ya n’ọnọdụ ahụ, ọ nwụrụ n’ọghọm, a maghị ụma gbuo ya.

Ụzọ Kasị Mma Mmadụ Ga-esi Chebe Onwe Ya

O doro anya na e nwere mgbe ọ na-agaghị adị njọ mmadụ ime ihe ike iji chebe onwe ya. Ọ bụghị ihe ọjọọ mmadụ ichebe onwe ya na ndị ọ hụrụ n’anya mgbe a na-achọ imerụ ha ahụ́ ma ọ bụ igbu ha. Ya bụrụ na ọ dịghị otú anyị ga-esi gbapụ, ọ dịghị iwu Baịbụl kwuru na anyị enweghị ike ime ihe ọ bụla iji chebe onwe anyị. Ma, ihe amamihe dị na ya ime bụ ime ihe niile anyị nwere ike ime iji zere ihe ọ bụla nwere ike ịkpata ime ihe ike.—Ilu 16:32.

Baịbụl gbara anyị ume ka anyị “chọọ udo, chụsookwa ya” n’ihe niile anyị na-eme ná ndụ. (1 Pita 3:11) Nke a bụ nnọọ ihe ga-enyere anyị aka ime ka anyị na ndị ọzọ dịrị n’udo.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

▪ Olee ihe mere anyị kwesịrị iji zere ime ihe ike?—Abụ Ọma 11:5.

▪ Olee ihe amamihe dị na ya ime ma a bịa n’ichebe ihe onwunwe anyị?—Ilu 16:32; Luk 12:15.

▪ Olee ihe anyị kwesịrị ime ka esemokwu ghara ịpụta ma kpata mmerụ ahụ́?—Ndị Rom 12:18.

[Ihe Odide Gbatụrụ Okpotokpo nke dị na peeji nke 13]

Baịbụl gosiri na mmadụ nwere ike ime ihe iji chebe onwe ya ma ọ bụ ezinụlọ ya mgbe a chọrọ imeso ha ihe ike