Otú I Nwere Ike Isi Nwee Alụmdi na Nwunye Na-aga nke Ọma
Otú I Nwere Ike Isi Nwee Alụmdi na Nwunye Na-aga nke Ọma
E NWERE ike iji alụmdi na nwunye tụnyere njem—ogologo njem nke ị ga-ahụ ọtụtụ ihe dị ịtụnanya na ya—ụfọdụ n’ime ha ga-atọ gị ụtọ, ndị ọzọ ewee gị iwe. “Okporo ụzọ” ị na-amabughị nwere ike ịkpatara gị nsogbu ndị ị na-atụghị anya ha, ụfọdụ n’ime nsogbu ndị ahụ nwekwara ike iyi ndị ị na-agaghị emerili. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị na-eji obi ụtọ mee njem a, ya agaara ha nke ọma, ha enweekwa naanị nsogbu ole na ole. N’ezie, ihe ga-ekpebi ma alụmdi na nwunye ọ̀ ga-aga nke ọma abụghị ugwu na ndịda ole dị na njem ahụ kama ọ bụ otú di na nwunye ahụ si lee njem ahụ anya.
Olee ihe i chere nwere ike ime ka njem alụmdi na nwunye gakwuo nke ọma ma tọkwuo ụtọ? Ọtụtụ di na nwunye kweere na ọ dị ha mkpa inwe ‘map’ ga-eduzi ha ụzọ. Onye malitere alụmdi na nwunye—bụ́ Jehova Chineke—enyela anyị map kasị zie ezie maka alụmdi na nwunye. Ma, Okwu ya e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Baịbụl Nsọ, abụghị ọtụmọkpọ ga-eme ka ihe niile gaa nke ọma. Kama nke ahụ, o nwere ntụziaka ndị bara uru ndị ọ dị mkpa ka di na nwunye na-eso iji mee ka alụmdi na nwunye ha gaa nke ọma.—Abụ Ọma 119:105; Ndị Efesọs 5:21-33; 2 Timoti 3:16.
Ka anyị tụlee ụfọdụ ntụziaka na akara nduzi ụzọ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ—ya bụ ụkpụrụ Baịbụl ndị gbara ọkpụrụkpụ—nwere ike inye aka duzie gị na njem nke na-eduga n’alụmdi na nwunye na-aga nke ọma na nke na-enye obi ụtọ.
▸ Lee alụmdi na nwunye anya dị ka ihe dị nsọ. “Ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.” (Matiu 19:6) Onye Okike anyị malitere ndokwa alụmdi na nwunye mgbe ọ kpọtaara nwoke mbụ, bụ́ Adam, nwunye ya, bụ́ Iv. (Jenesis 2:21-24) Kraịst Jizọs, bụ́ onye nọ n’eluigwe jiri anya ya hụ ihe a mgbe ọ na-aghọbeghị mmadụ, kwughachiri na Chineke bu n’obi ka alụmdi na nwunye Adam na Iv dịgide adịgide. O kwuru, sị: “Ọ̀ bụ na unu agụghị na onye kere ha site ná mmalite mere ha nwoke na nwaanyị wee sị, ‘N’ihi ya, nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ́’? Nke mere na ha abụkwaghị anụ ahụ́ abụọ, kama ha bụ otu. Ya mere, ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.”—Matiu 19:4-6.
Mgbe Jizọs sịrị, “ihe Chineke kekọtara,” ihe ọ na-ekwu abụghị na a na-ejikọta di na nwunye n’eluigwe. Kama nke ahụ, ihe ọ na-ekwu bụ na ọ bụ Chineke malitere ndokwa nke alụmdi na nwunye, nakwa na e kwesịrị ile ya anya dị ka ihe dị nsọ. *
N’ezie, di na nwunye agaghị achọ ịbụ ndị ‘e kekọtara’ n’alụmdi na nwunye ịhụnanya na-adịghị na ya. Kama nke ahụ, ha chọrọ inwe alụmdi na nwunye na-eju afọ nke ga-eme ha abụọ obi ụtọ. Ha nwere ike ịbụ ndị ‘e kekọtara’ n’alụmdi na nwunye na-enye obi ụtọ ma ọ bụrụ na ha esoro ndụmọdụ ndị bara uru Onye Okike nyere na Baịbụl.
Ebe ọ bụ na anyị niile bụ ndị na-ezughị okè, a ga-enwerịrị nghọtahie na esemokwu n’alụmdi na nwunye. Ma, ihe na-akasị eme ka alụmdi na nwunye gaa nke ọma abụghị otú ihe si adabara mmadụ abụọ ahụ kama ọ bụ ihe ha na-eme mgbe ha na-ekwekọrịtaghị n’otu ihe. N’ihi ya, otu n’ime nkà ndị kasị mkpa n’alụmdi na nwunye bụ di na nwunye inwe ike iji ịhụnanya dozie esemokwu ha, n’ihi na ịhụnanya “na-eme ka ihe niile dị nnọọ n’otu.”—Ndị Kọlọsi 3:14, English Standard Version.
▸ Jiri nkwanye ùgwù na-ekwu okwu. “E nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị echiche dị ka ebe e ji mma agha maa mmadụ, ma ire ndị maara ihe na-agwọ ọrịa.” (Ilu 12:18) Ndị na-eme nchọpụta achọpụtala na ihe ka ọtụtụ ná nkwurịta okwu na-ebi otú ha si malite. N’ihi ya, ọ bụrụ na nkwurịta okwu malitere n’ụzọ nkwanye ùgwù, o yikarịrị ka ọ̀ ga-ebi n’ụzọ nkwanye ùgwù. N’aka nke ọzọ, ị maara otú o si egbu mmụọ mgbe onye ị hụrụ n’anya gwara gị okwu n’echeghị echiche. N’ihi ya, kpesie ekpere ike ma gbalịa ịdị na-eji nkwanye ùgwù, nsọpụrụ, na ịhụnanya ekwu okwu. (Ndị Efesọs 4:31) Otu nwaanyị onye Japan nọrọla na di ruo afọ iri anọ na anọ, nke aha ya bụ Haruko * kọwara, sị: “Ọ bụ ezie na anyị na-ahụ ebe ibe anyị na-adịghị emete nke ọma, anyị na-agbalị ịkwanyere onwe anyị ùgwù n’okwu na n’omume anyị. Nke ahụ enyerela anyị aka inwe alụmdi na nwunye na-aga nke ọma.”
▸ Mụta inwe obiọma na obi ọmịiko. “Nweenụ obiọma n’ebe ibe unu nọ, na-enwekwanụ obi ọmịiko.” (Ndị Efesọs 4:32) Mgbe e nwere nnukwu esemokwu, ọ na-adị mfe iji iwe kwuo okwu ndị na-akpasu iwe. Na Germany, Annette, bụ́ onye nọrọla na di ruo afọ iri atọ na anọ, kwetara, sị: “Ọ naghị adị mfe iwetu obi mgbe iwe na-ewe gị—ihe ga na-agụ gị bụ ikwu ihe ndị ga-akpasu di ma ọ bụ nwunye gị iwe, naanị ihe nke ahụ na-emekwa bụ ime ka ihe ka njọ.” Ma, ọ bụrụ na ị na-agbalị inwe obiọma na obi ọmịiko, ị ga-enwe nnọọ ike ime ka ụzọ nke na-eduga n’alụmdi na nwunye dị n’udo dị larịị.
▸ Dịrị umeala n’obi. “Ghara ime ihe ọ bụla n’ihi esemokwu ma ọ bụ n’ihi ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi, kama n’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka unu.” (Ndị Filipaị 2:3) Ihe na-akpata ọtụtụ esemokwu bụ na di na nwunye na-ata ibe ha ụta maka nsogbu ndị dapụtaranụ n’ihi mpako kama iji ịdị umeala n’obi chọọ otú ha ga-esi mee ka ihe kara ibe ha mma. Ịdị nwayọọ n’obi, ma ọ bụ ịdị umeala n’obi, nwere ike ime ka i zere ịkpọ ekwe nkụ na ikpe laara gị mgbe e nwere esemokwu.
▸ Adịla ngwa ịbụ onye a kpasuru iwe. “Adịla ngwa ná mmụọ gị ịbụ onye a kpasuru iwe, n’ihi na iwe iwe bụ ihe na-adịgide n’obi ndị nzuzu.” (Ekliziastis 7:9) Gbalịa izere ịgbagha ihe di ma ọ bụ nwunye gị kwuru ma ọ bụ ịzọwa onwe gị ozugbo mgbe di ma ọ bụ nwunye gị kwuru na ihe i kwuru ma ọ bụ ihe i mere adịghị ya mma. Kama nke ahụ, gee di ma ọ bụ nwunye gị ntị ma gwa ya na ị ghọtara ihe ọ na-ekwu. Chee echiche nke ọma tupu ị na-azaghachi. Ọ bụ naanị mgbe ọtụtụ ndị di na nwunye mewerela okenye ka ha na-aghọta na ime ka obi dị di ma ọ bụ nwunye ha mma dị mkpa karịa imeri n’arụmụka.
▸ Mara mgbe ị ga-agbachi nkịtị. “[Bụrụ] onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa, onye na-adịghị ewe iwe ngwa ngwa.” (Jems 1:19) O doro anya na inwe ezi nkwurịta okwu bụ otu n’ime akara nduzi ụzọ ndị kasị mkpa dị n’okporo ụzọ nke na-eduga n’alụmdi na nwunye obi ụtọ. Oleezi ihe mere Baịbụl ji kwuo na e nwere “oge ịgbachi nkịtị”? (Ekliziastis 3:7) Nke a nwere ike ịbụ oge ige ntị nke ọma iji ghọta ihe onye nke ọzọ na-ekwu—nke bụ́ akụkụ dị mkpa nke nkwurịta okwu, bụ́ mgbe mmadụ na-achọ ịghọta nnọọ otú obi dị di ya ma ọ bụ nwunye ya na ihe mere obi ji dị ya otú ahụ.
Ndị Rom 12:15) Ọ bụrụ na ị chọrọ ka gị na di ma ọ bụ nwunye gị na-enwe nkwurịta okwu ga-arụpụta ihe, ị ghaghị inwe ọmịiko n’ahụ́ ya n’ihi na ọ ga-enyere gị aka ịma otú obi dị ya na ihe mere obi ji dị ya otú ahụ. Ọ ga-eme ka a kwanyere echiche onye nke ọ bụla na otú obi dị ya ùgwù mgbe a na-enwe nkwurịta okwu. Nella, bụ́ onye bi na Brazil nke nọrọla na di ruo afọ iri atọ na abụọ kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla anyị na-ekwurịta nsogbu anyị, ana m ege ntị nke ọma iji ghọta ihe Manuel chere na otú obi dị ya.” Mgbe di ma ọ bụ nwunye gị na-ekwu okwu, ọ bụ “oge [nke gị] ịgbachi nkịtị” na iji ọmịiko gee ntị.
▸ Jiri ọmịiko gee ntị. “Soronụ ndị na-aṅụrị ọṅụ ṅụrịa ọṅụ; soronụ ndị na-akwa ákwá kwaa ákwá.” (▸ Mee ka ọ mara gị ahụ́ ikele di ma ọ bụ nwunye gị maka ezi ihe ndị o mere. “Gosikwanụ na unu bụ ndị nwere ekele.” (Ndị Kọlọsi 3:15) Ihe e ji ama alụmdi na nwunye ndị siri ike bụ di na nwunye ndị na-ahụ na ha mere ka ibe ha mara na ha ji ha kpọrọ ihe. Ma, ka di na nwunye na-eme ihe ndị dịịrị ha kwa ụbọchị, ụfọdụ ndị di na nwunye na-eleghara ikele ibe ha anya ma chee na di ha ma ọ bụ nwunye ha maara na ha ji ha kpọrọ ihe. Dr. Ellen Wachtel kwuru, sị: “Ihe ka ọtụtụ ná ndị di na nwunye nwere ike ime ka ibe ha mara na ha ji ha kpọrọ ihe ma ọ bụrụ na ha echebatụrụ ya nnọọ echiche.”
Ọ na-adị ụmụ nwaanyị mkpa karịsịa ịnụ ka di ha ji ịhụnanya na-agwa ha na ọ ka hụrụ ha n’anya nakwa na o ji ha kpọrọ ihe. Unu ndị bụ́ di nwere ike ime ka alụmdi na nwunye unu ka nnọọ mma, meekwa ka obi ruo nwunye unu, na unu onwe unu ala, ma ọ bụrụ na unu ana-agbalị ikele ndị nwunye unu n’ihi ihe ọma ndị ha na-eme ma ọ bụ àgwà ọma ndị ha nwere.
Ọ dị mkpa iji ma ọnụ ma ụzọ ndị ọzọ agwa ha na unu ka hụrụ ha n’anya. Mgbe i ji nwayọọ sutụ nwunye gị ọnụ, metụ ya aka, mụmụọrọ ya ọnụ ọchị, ọ na-agwa ya ihe karịrị “Ahụrụ m gị n’anya.” Ọ na-eme ka obi sie ya ike na ọ bụ onye pụrụ iche nye gị nakwa na ọ dị gị mkpa. Na-akpọtụ ya na fon ma ọ bụ na-eji fon ezigara ya ozi iji sị ya, “Agụụ gị na-agụ m” ma ọ bụ “Olee otú ị na-eme?” Ọ bụrụ na kemgbe unu lụchara, ị nakwaghị agwakarị ya ụdị ihe ndị ahụ, ọ dị mma ka ị maliteghachi ya. Nọgide na-achọpụta ihe ndị na-eru nwunye gị n’obi.
Okwu ndị nne Eze Lemuel nke Izrel oge ochie gwara ya dabara nnọọ adaba: “Di ya na-eto ya, ‘Ọtụtụ ụmụ nwaanyị emeela nke ọma, ma i ka ha niile mma.’” (Ilu 31:1, 28, 29, Tanakh—The Holy Scriptures) Olee mgbe ikpeazụ ị jara nwunye gị mma? Ma ọ bụ gịnwa bụ́ nwaanyị, Olee mgbe ikpeazụ ị jara di gị mma?
▸ Na-adị ngwa ịgbaghara. “Anọkwala na-ewe iwe ruo mgbe anyanwụ dara.” (Ndị Efesọs 4:26) Ị ga-emejọrịrị di ma ọ bụ nwunye gị, ọ ga-enwerịrịkwa mgbe yanwa ga-emejọ gị. N’ihi ya, ọ dị mkpa ka ị na-adị njikere ịgbaghara. Clive na Monica, bụ́ ndị bi na South Africa, bụ́ ndị lụrụ afọ iri anọ na atọ gara aga, achọpụtala na ndụmọdụ Baịbụl a na-enye nnọọ aka. Clive kwuru, sị: “Anyị na-agbalị ime ihe Ndị Efesọs 4:26 kwuru, anyị na-agbalịkwa ịgbaghara ibe anyị ngwa ngwa, ebe anyị maara na nke ahụ na-eme Chineke obi ụtọ. Ọ na-emekwa ka obi ruo anyị ala, anyị ejiri akọnuche dị ọcha laba ụra ma hie ụra nke ọma.”
Otu ilu oge ochie kwuru ihe a amamihe dị na ya: “Ileghara mmejọ anya [bụ] ịma mma.” (Ilu 19:11) Annette, bụ́ onye a kpọtụrụ aha na mbụ, kwetara, kwuokwa, sị: “Ọ dịghị otú a ga-esi nwee alụmdi na nwunye dị mma ma e nweghị mgbaghara.” Ọ kọwara ihe mere o ji kwuo otú ahụ, sị: “Ma ọ́ bụghị ya, iwe ga-eju mmadụ abụọ ahụ obi, ha akwụsịkwa ịtụkwasị onwe ha obi, ihe ndị dị otú ahụ na-egbukwa alụmdi na nwunye. Mgbaghara na-eme ka alụmdi na nwunye sikwuo ike, meekwa ka unu nọrọkwuo ibe unu nso.”
Ọ bụrụ na i mejọrọ di ma ọ bụ nwunye gị, asịla nnọọ na ọ ga-echefu ya. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka gị na di ma ọ bụ nwunye gị kpezie, ọ na-adịkarị mkpa ka i mee otu n’ime ihe ndị ka sie ike di na nwunye kwesịrị ịdị na-eme, nke bụ́: Ikweta na i mejọrọ. N’agbanyeghị nke ahụ, chọta otú ị ga-esi wetuo onwe gị ala ma sị: “Nke m, gbaghara m. Emejọrọ m.” Ọ bụrụ na i wetuo onwe gị ala ma rịọ mgbaghara, ọ ga-eme ka di ma ọ bụ nwunye gị na-akwanyere gị ùgwù, mee ka ọ na-atụkwasị gị obi, meekwa ka obi rukwuo unu abụọ ala.
▸ Nọgide jiri di ma ọ bụ nwunye gị na alụmdi na nwunye unu kpọrọ ihe. “Ha [di na nwunye] abụkwaghị anụ ahụ́ abụọ, kama ha bụ otu. Ya mere, ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.” (Matiu 19:6) Unu nọ n’ihu Chineke na mmadụ kwe onwe unu nkwa na unu ga-anọgide bụrụ di na nwunye, n’agbanyeghị nsogbu ndị nwere ike ibilite. * Ma, ihe mere unu ji anọgide n’alụmdi na nwunye unu abụghị naanị na iwu kwuru otú ahụ. Kama nke ahụ, ihe na-akpali unu ime ya bụ ezi ịhụnanya si n’obi unu nwere, ọ bụkwa ihe na-egosi na unu na-akwanyere ibe unu na Chineke ùgwù, nakwa na unu na-asọpụrụ ibe unu na Chineke. N’ihi ya, ya adịla mgbe ị ga-eji mmekọrịta dị nsọ unu nwere gwurie egwu site n’ịchụ nwaanyị ma ọ bụ nwoke; ka anya gị dị n’ebe naanị di ma ọ bụ nwunye gị nọ.—Matiu 5:28.
▸ Ibute ọdịmma di ma ọ bụ nwunye gị ụzọ na-eme ka alụmdi na nwunye sikwuo ike. “Na-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe unu, kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.” (Ndị Filipaị 2:4) Ibute ọdịmma di ma ọ bụ nwunye gị ụzọ bụ otu ụzọ isi mee ka alụmdi na nwunye unu sikwuo ike. Premji na nwunye ya ebiela afọ iri abụọ, ma ọ na-agbalịsi ike inyere nwunye ya aka, bụ́ onye na-arụ ọrụ ego na-ewe oge, site n’ịrụtụrụ ya ọrụ ndị dị n’ụlọ. “M na-enyere Rita aka isi nri na ihicha ụlọ na ịrụ ọrụ ndị ọzọ ka o wee nwee oge na ume ime ihe ndị na-atọ ya ụtọ.”
Mgbalị Na-arụpụta Ezigbo Ihe
Mgbe ụfọdụ, oké ọrụ dị n’ime ka a na-enwe obi ụtọ n’alụmdi na nwunye nwere ike ime ka ụfọdụ chọwa ịkwụsị ime mgbalị. Ma, ekwela ka nsogbu mee ka ị kwụsị mgbalị ị na-eme ma ọ bụ kwe ka ihe niile i tinyerela n’alụmdi na nwunye gị funahụ gị, nke ga-apụta unu isi ebe unu rurula na njem unu laghachiwe azụ.
Sid, bụ́ onye alụmdi na nwunye ya garala nke ọma ruo afọ iri atọ na atọ, tụrụ aro, sị: “Ọ bụrụ na unu agbalịsie nnọọ ike ma gosi na unu chọrọ ka alụmdi na nwunye unu gaa nke ọma, Jehova ga-agọzi unu.” Otú unu abụọ si enyere onwe unu aka mgbe ihe siri ike na otú unu abụọ si aṅụrị ọṅụ mgbe ihe dị mma ga-eme ka unu nwee afọ ojuju ka unu na-eme njem nke alụmdi na nwunye na-aga nke ọma.
[Ihe odide ala ala peeji]
^ par. 6 Jizọs kwuru na naanị ihe ga-eme ka di na nwunye gbasaa ma nwee ike ịlụ ndị ọzọ bụ ịkwa iko—ya bụ, otu n’ime ha na onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ya inwe mmekọahụ.—Matiu 19:9.
^ par. 9 A gbanwere aha ụfọdụ dị n’isiokwu a agbanwe.
^ par. 22 Baịbụl nyere onye di ya ma ọ bụ nwunye ya kwara iko ikike ikpebi ma ọ̀ ga-agba ya alụkwaghịm. (Matiu 19:9) Lee isiokwu bụ́ “Echiche nke Bible: Ịkwa Iko Ndị Lụrụ Di Ma Ọ Bụ Nwunye—Ịgbaghara Ka Ọ̀ Bụ Ịghara Ịgbaghara?” nke dị na Teta! August 8, 1995.
[Ihe Odide Gbatụrụ Okpotokpo nke dị na peeji nke 6]
Baịbụl dị ka map ga-eduzi gị ụzọ na njem alụmdi na nwunye gị
[Igbe/Foto dị na peeji nke 7]
Mgbe Ọ Dị Mkpa Ka Unu Kwurịta Nsogbu Unu
▪ Wepụtanụ oge mgbe ọ na-adịghị onye nke ọ bụla n’ime unu ike gwụrụ.
▪ Zerenụ ịkatọ onwe unu; na-elenụ onwe unu anya ọma.
▪ Zerenụ ịnapụ ibe unu okwu n’ọnụ; mgbe otu onye na-ekwu okwu onye nke ọzọ gewe ntị.
▪ Gosi na ị ghọtara otú obi dị di ma ọ bụ nwunye gị.
▪ Nweenụ ọmịiko n’ahụ́ ibe unu, ọbụna mgbe unu na-ekwenyeghịrị ibe unu.
▪ Dịnụ njikere ịgbanwe echiche unu, unu esikwala ọnwụ.
▪ Weda onwe gị ala ma rịọ mgbaghara mgbe i mejọrọ.
▪ Kelee di ma ọ bụ nwunye gị maka ebe ndị ọ na-emezi ma gwa ya na ị hụrụ ya n’anya.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 8]
Ọ Bụrụ na Unu Chọrọ Ka Alụmdi na Nwunye Unu Gaa nke Ọma
▪ Unu ejila eziokwu Baịbụl ndị na-eme ka alụmdi na nwunye sie ike egwuri egwu.
▪ Na-ewepụta oge maka alụmdi na nwunye gị na maka di ma ọ bụ nwunye gị.
▪ Na-eme ihe ndị ga na-akwalite ịhụnanya n’alụmdi na nwunye gị.
▪ Bụrụ onye kwesịrị ntụkwasị obi ma jiri alụmdi na nwunye gị kpọrọ ihe.
▪ Nwee obiọma, na-akwanyekwara di ma ọ bụ nwunye gị ùgwù.
▪ Na-agbakọtanụ aka arụ ọrụ ndị dị n’ụlọ.
▪ Mgbe unu na-ekwurịta okwu, onye nke ọ bụla na-ekwu ihe ndị ga-eme ka nkwurịta okwu ahụ tọọ ụtọ.
▪ Na-emenụ ibe unu ihe ọchị, na-ewepụtakwanụ ohere iji kporie ndụ.
▪ Nọgidenụ na-arụ ọrụ iji mee ka alụmdi na nwunye unu na-esiwanye ike.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 9]
Ihe Ị Ga-echebara Echiche
▪ Olee ebe m kwesịrị ịrụ ọrụ karịsịa n’alụmdi na nwunye m?
▪ Olee ihe ndị m ga-eme iji mee otú ahụ?