Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È Kwesịrị Ịgwa M Mgbe M Ga-alọta?

È Kwesịrị Ịgwa M Mgbe M Ga-alọta?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

È Kwesịrị Ịgwa M Mgbe M Ga-alọta?

I si n’ebe gị na ndị enyi gị gara ná mgbede lọta. Oge agaala. Ị nọfeela mgbe a gwara gị lọta, ị ga-agwakwa ndị mụrụ gị ihe mere i ji lọta n’azụ oge. Gị eburu ụzọ cheretụ n’èzí tupu gị abanyewe ime ụlọ. Obi gị ana-agwa gị, sị, ‘Ya bụrụkwa na papa m na mama m alabala.’ Gị ejiri nwayọọ kwaghee ụzọ, hụzie ha ka ha guzo—na-ele anya na klọọkụ, na-eche ka ị kọwaara ha ihe mere na ị lọtaghị n’oge.

ỤDỊ ihe a a kọrọ n’elu ò metụla gị? Gị na ndị mụrụ gị ùnu na-arụ ụka banyere oge i kwesịrị iji na-alọta? Debora, bụ́ onye dị afọ iri na asaa, kwuru, sị: “Ebe anyị bi adịchaghị njọ, ma m nọfehaala etiti abalị n’èzí, ụjọ abịa ndị mụrụ m.” *

Gịnị mere o ji esiri gị ike ịlọta mgbe a gwara gị lọta? Ọ̀ dị njọ mmadụ ịchọ inwerekwu onwe ya? Olee ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ịlọta mgbe a gwara gị lọta?

Ihe Ndị Na-ese Okwu

Oge a gwara gị na-alọta nwere ike ịdị na-agbakasị gị ahụ́, karịsịa ma ọ bụrụ na ọ naghị enye gị oge zuru ezu iji kporie ndụ. Natasha kwuru, sị: “Oge a gwara m na-alọta na-ewe m ezigbo iwe. N’otu oge, ndị mụrụ m maara na mụ na ụfọdụ ndị enyi m na-ele fim n’ụlọ na-adịghị anya na nke anyị. N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe o ji naanị nkeji abụọ gafee oge ha gwara m lọta, ha kpọrọ m na fon ma jụọ m ihe mere na alọtabeghị m!”

Nwata nwaanyị aha ya bụ Stacy kwuru ihe ọzọ na-ese okwu. Ọ sịrị: “A na-atụ anya ka m lọta tupu mama m na papa m alaba. Ọ bụrụ na ha amụrụ anya chere m, ike na-agwụcha ha, ezigbo iwe ana-ewekwa ha mgbe m lọtara.” Gịnị na-emezi? Stacy kwuru, sị: “Ha ga-agwa m okwu ga-eme ka m tawa onwe m ụta.” O kwukwara, sị: “Nke a na-agbakasị m nnọọ ahụ́. Amaghị m ihe mere ha ga-eji mụrụ anya na-eche m!” Ụdị nsogbu a nwere ike ime ka ọ dị gị otú ọ dị Katie dị afọ iri na asatọ, bụ́ onye kwuru, sị: “Ọ gaara adị m mma ma a sị na ndị mụrụ m ga-enyetụkwu m ohere, ka ọ ghara ịdị ka m̀ bụ onye nnupụisi.”

Ikekwe, ọ dị gị otú ọ dị ndị a na-eto eto a ka kwupụrụ ihe ha kwuru. Ya bụrụ otú ahụ, jụọ onwe gị ajụjụ a:

Olee ihe mere o ji amasị m ịpụ apụ kama ịnọ n’ụlọ? (Kanye ihe n’otu.)

□ Ọ na-eme ka m lee onwe m anya ka onye nweere onwe ya.

□ Ọ na-eme ka obi rutụ m ala.

□ Ọ na-enye m ohere iso ndị enyi m nọrịa.

Ihe ndị e kwuru ebe a dịcha mma. O nweghị onye ọ na-anaghị agụ inwerekwu onwe ya ka ọ na-etolite, ntụrụndụ dị mma nwekwara ike ime ka ahụ́ ruo mmadụ ala. Ọzọkwa, Baịbụl na-agba gị ume ka i meta ezigbo ndị enyi. (Abụ Ọma 119:63; 2 Timoti 2:22) Nke ahụ ga-esiri gị ike ma ọ bụrụ na ị na-anọ n’ụlọ mgbe niile!

Ma, olee otú i nwere ike isi mee ihe ndị ahụ ma ọ bụrụ na oge a gwara gị na-alọta anatụghị enye gị ohere? Tụlee ihe ndị a.

Nsogbu nke 1: Oge a gwara gị ka ị na-alọta na-eme ka i yie nwatakịrị. Andrea bụ́ onye dị afọ iri abụọ na otu ugbu a, chetara ihe mere n’oge gara aga ma kwuo, sị: “Elere m nnọọ onwe m anya dị ka nwatakịrị n’ihi na m na-eme ka mmadụ niile kwụsị ihe ha na-eme iji chọta onye ga-ebula m n’oge.”

Ihe nwere ike inye aka: Were ya na ị malitere ịkwọ ụgbọala ọhụrụ ma nweta akwụkwọ ikike ịkwọ ụgbọala. N’ebe ụfọdụ, iwu obodo ga-egbochi gị ịga ebe ụfọdụ, ịkwọ ụgbọala n’oge ụfọdụ, ma ọ bụ kwuo ndị gị na ha ga-anọ n’ime ụgbọala ahụ—ma ọ dịghị ihe ọzọ ruo mgbe i ruru afọ ndụ a chọrọ. Ị̀ ga-ajụ inweta akwụkwọ ikike ahụ n’ihi na i chere, sị: “Ọ bụrụ na a gaghị ekwe m nyara gawa ebe ọ bụla m chọrọ, ọ kaara m mma ịhapụ ịnya anya”? Mbanụ! Akwụkwọ ikike ahụ i nwetara ga-adị gị ka ebe i nwetara nnukwu ihe.

N’otu aka ahụ, gbalịa iwere mgbe a gwara gị na-alọta dị ka ihe na-egosi na ị na-enwe ọganihu—ịghọ ezigbo mmadụ. Elekwasịla anya n’ihe ndị oge a gwara gị na-alọta na-egbochi gị ime, kama nke ahụ, lekwasị anya n’ohere ọ na-enye gị. Ọ̀ bụ na i nwereghị onwe gị ugbu a karịa mgbe ị ka bụ nwata?

Ihe mere nke a ji aba uru: Oge a gwara gị na-alọta ga-adịkwuru gị mfe ịnabata ma ọ bụrụ na i lee ya anya dị ka ohere e nyere gị ime ihe na-atọ gị ụtọ kama ile ya anya dị ka ihe na-egbochi gị ime ihe ndị ị chọrọ ime. Ọ bụrụ na ị na-alọta mgbe a gwara gị lọta, e nwere ike ịgbatịkwuru gị oge ị ga-eji na-alọta ka oge na-aga.—Luk 16:10.

Nsogbu nke 2: Ị ghọtaghị ihe mere e ji sị gị na-alọta nnọọ n’oge. Nikki, bụ́ onye obi na-adịbughị mma n’ihi oge a gwara ya na-alọta, kwuru, sị, “Echetara m na obi m nọ na-agwa m na mama m na-enye m iwu naanị iji gosi na ikike dị ya n’aka.”

Ihe nwere ike inye aka: Tinye ụkpụrụ dị n’Ilu 15:22 n’ọrụ, bụ́ ebe kwuru, sị: “Atụmatụ na-aghasasị ma ọ bụrụ na a gbaghị izu, ma a na-arụzu ihe ma e nwee ọtụtụ ndị ndụmọdụ.” Wetuo obi gakwuru ndị mụrụ gị ka gị na ha kparịta ya. Gbalịa chọpụta ihe mere ha ji gwa gị ka ị na-alọta n’oge ahụ ha kwuru. *

Ihe mere nke a ji aba uru: Ịnụrụ ihe ndị mụrụ gị chere nwere ike ime ka ị ghọtakwuo echiche ha. Stephen kwuru, sị: “Papa m gwara m na mama m anaghị ehili ụra n’abalị ruo mgbe m lọtara n’udo. Echebatụbereghị m nke ahụ echiche.”

Cheta: Ọ na-aka mma iji nwayọọ kwurịta ihe kama ịba mba—bụ́ nke ga-akpatarịrị gị nsogbu. Natasha kwuru, sị: “Achọpụtala m na m jiri iwe gwa ndị mụrụ m okwu, ha na-egbochikarị m ime ihe ole na ole ndị ọzọ m chọrọ ime.”

Nsogbu nke 3: I chere na a na-akpagide gị akpagide. Mgbe ụfọdụ, ndị nne na nna na-ekwu na iwu ndị ha tiri n’ụlọ—bụ́ ndị nwere ike ịgụnye mgbe ị ga na-alọta—bụ maka ọdịmma gị. Brandi, onye dị afọ iri abụọ kwuru, sị: “Mgbe ndị mụrụ m gwara m ụdị okwu a, ọ na-adị m ka ha achọghị ka m kpebiere onwe m ihe ma ọ bụ ka m tụọ aro ọ bụla.”

Ihe nwere ike inye aka: I nwere ike ikpebi ịgbaso ndụmọdụ a Jizọs nyere na Matiu 5:41: “Ọ bụrụkwa na onye nwere ikike amanye gị ịga otu maịl, soro ya gaa maịl abụọ.” Ashley na nwanne ya nwoke achọpụtala ụzọ bara uru isi gbasoo ụkpụrụ ahụ. O kwuru, sị: “Anyị na-agbalịkarị ịhụ na anyị lọtara mgbe ọ fọrọ nkeji iri na ise ka oge e nyere anyị ruo.” Ì nwere ike ịnwa ime otú ahụ?

Ihe mere nke a ji aba uru: Ọ na-aka atọ anyị ụtọ ime ihe n’ihi na anyị chọrọ ime ya karịa n’ihi na anyị aghaghị ime ya! Cheekwa echiche banyere nke a: Mgbe ị họọrọ ịlọta tupu oge e nyere gị eruo, ọ bụ gị na-ekpebi ihe ị na-eme. Ọzọkwa, i nwere ike icheta ụkpụrụ a: “Ka omume ọma gị wee si gị n’obi, ọ bụghị ná mmanye.”—Faịlimọn 14.

Gị ịlọta tupu oge e nyere gị eruo na-emekwa ka ndị mụrụ gị tụkwasikwuo gị obi, bụ́kwanụ nke nwere nnọọ ike ime ka ha nyekwuo gị ohere. Wade, onye dị afọ iri na asatọ, kwuru, sị, “Ọ bụrụ na i mee ka ndị mụrụ gị tụkwasịkwuo gị obi, ha ga-eme ka i nwerekwuo onwe gị.”

Detuo nsogbu ọzọ oge a gwara gị na-alọta na-akpatara gị.

․․․․․

Olee ihe ga-enyere gị aka imeri nsogbu a?

․․․․․

Olee ihe i chere mere nke a nwere ike iji rụpụta ihe?

․․․․․

Otu ụbọchị i nwere ike ibiri nke gị ma nwerekwuo nnọọ onwe gị. Ka ọ dịgodị, nwee ndidi. Tiffany, onye dị afọ iri abụọ ugbu a, kwuru, sị: “O nwere ike ị gaghị enwerecha onwe gị otú ị chọrọ, ma ọ bụrụ na ị mụta idi ya, obi agaghị ajọ gị njọ n’oge niile ị bụ onye na-eto eto.”

Ị gaa n’Ịntanet, ị ga-enweta ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị” n’adres bụ́ www.watchtower.org/ype

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 4 A gbanwere aha ndị dị n’isiokwu a agbanwe.

^ par. 21 Ị chọọ inweta aro otú i nwere ike isi mee ya, lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . Gịnị Mere E Ji Enye M Ọtụtụ Iwu?” nke gbara na Teta! nke January–March 2007.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

▪ Olee otú mgbe ndị mụrụ gị chọrọ ka i jiri na-alọta si gosi na ha na-echere gị echiche ọma?

▪ Ọ bụrụ na o nweela mgbe ị na-alọtaghị mgbe a gwara gị jiri na-alọta, olee otú i nwere ike isi mee ka ndị mụrụ gị tụkwasị gị obi ọzọ?

[Igbe dị na peeji nke 25]

IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU

“Echere m na oge ndị mụrụ m chọrọ ka m jiri na-alọta dị mma n’ihi na ma mụ ehighị ụra nke ọma n’abalị, ahụ́ na-agbakasị m!”—Gabe, onye dị afọ iri na asaa.

“Mgbe m ji alọta azọọla m ọtụtụ ugboro. Dị ka ihe atụ, n’otu oge, ndị na-eto eto na-erubeghị ịṅụ mmanya na-aba n’anya wetara ya ná nnọkọ ntụrụndụ anyị nwere. Ngwa ngwa mụ na enyi m hụrụ mmanya ahụ na-aba n’anya, anyị gwara ha na anyị ga-ala n’ihi na oge a gwara anyị jiri na-alọta eruola.”—Katie, onye dị afọ iri na asatọ.

[Igbe dị na peeji nke 26]

KWEKỌRỊTANỤ N’IHE NDỊ A

Gị na ndị mụrụ gị kwurịtakwanụ banyere oge ha sịrị gị jiri na-alọta iji mata ma ùnu ga-ekwekọrịta n’ihe ndị e dere n’okpuru ebe a?

▪ M ga na-alọta n’elekere ․․․․․ n’abalị ụbọchị ndị a: ․․․․․, na n’elekere ․․․․․ n’abalị ụbọchị ndị a: ․․․․․.

▪ Aghọtara m na ọ bụrụ na mụ alọtaghị n’oge a kara aka, a ga-egbubilata oge m ka ọ bụrụzie elekere ․․․․․ ọ dịkarịa ala ruo izu ․․․․․.

▪ A ga-atụleghachi ma à ga-etinyekwu ihe n’oge a sịrị m jiri na-alọta ma ọ bụrụ na mụ alọta n’oge ahụ ọ dịkarịa ala ruo ọnwa ․․․․․.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 26]

MGBE Ị CHỌRỌ KA E TINYEKWUO IHE N’OGE A GWARA GỊ JIRI NA-ALỌTA . . .

▪ Kwulite ya n’oge kwesịrị ekwesị.—Ekliziastis 3:1, 7.

▪ Mee ka a tụkwasị gị obi site n’ịdị na-alọta n’oge.—Matiu 5:37.

▪ Gwa ndị mụrụ gị ka ha tinyekwuoro gị oge ruo nwa oge ma mara otú ị ga-eme.—Matiu 25:23.

[Igbe dị na peeji nke 27]

IHE NDỊ MỤRỤ ỤMỤ KWESỊRỊ IBURU N’UCHE

▪ O jirila nkeji iri atọ gafee oge nwa gị nwoke kwesịrị iji lọta mgbe ị nụrụ ka ọnụ ụzọ ụlọ unu ji nwayọọ na-emeghe. Ị nọ na-agwa onwe gị, sị, ‘O chere na alakpuola m.’ Ma, ị ka mụ anya. Ị nọdị ọdụ n’akụkụ ọnụ ọnụ ụzọ kemgbe oge nwa gị nwoke kwesịrị iji alọbata ruru. Ọnụ ụzọ ahụ emepechaala ugbu a, anya gị na nwa gị akụkọtakwa. Gịnị ka ị ga-ekwu? Gịnị ka ị ga-eme?

Ihe i nwere ike ime abụghị otu. I nwere ike ịhapụ okwu ahụ otú ahụ. I nwere ike ịgwa onwe gị, sị, ‘Ụmụaka bụkwa ụmụaka.’ Ma ọ bụkwanụ i nwere ike jiri oké iwe kwuo, sị, “Ị gaghị esikwa n’ụlọ a mapụ ụkwụ ọzọ n’abalị.” Kama iji obi ọkụ mee ihe, burugodị ụzọ gee ya ntị, a dịghị ama ama ya bụrụ na o nwere ezi ihe mere o ji lọta n’azụ oge. I nweziri ike iji iwu ahụ ọ dara kụziere ya ihe ga-abara ya ezigbo uru. Olee otú ị ga-esi mee ya?

Aro: Gwa nwa gị na gị na ya ga-ekwu banyere ihe ahụ echi. N’oge kwesịziri ekwesị, gị na ya nọdụ ala kwurịta ihe unu ga-eme banyere ọnọdụ ahụ. Ụfọdụ ndị nne na nna anwaleela ihe a. Ọ bụrụ na nwa ha nwoke ma ọ bụ nwa ha nwaanyị alọtaghị mgbe a gwara ya na-alọta, ha ga-ewepụ nkeji iri atọ n’oge ọ ga-eji lọta mgbe ọzọ ọ pụrụ. Ma, ọ bụrụ na nwa ahụ na-alọta mgbe ọ bụla unu gwara ya lọta, sikwa otú ahụ gosi na o kwesịrị ntụkwasị obi, unu nwere ike nyetụkwuo ya ohere ụfọdụ ndị kwesịrị ekwesị—mgbe ụfọdụ, unu nwedịrị ike gbatịkwuoro ya oge ọ ga-eji lọta. Ọ dị mkpa na nwa unu nwoke ma ọ bụ nwa unu nwaanyị maara kpọmkwem oge a chọrọ ka o jiri na-alọta na ihe na-echere ya mgbe ọ na-alọtaghị n’oge a gwara ya lọta. Unu kwesịziri ịhụ na unu mere ya ihe unu kwuru unu ga-eme ya mgbe ọ lọtara n’azụ oge.

Ịdọ Aka ná Ntị: Baịbụl kwuru, sị: “Meenụ ka mmadụ niile mara na unu nwere ezi uche.” (Ndị Filipaị 4:5) Tupu unu agwawa nwa unu oge ọ ga-eji na-alọta, unu nwere ike buru ụzọ kpọọ ya ka unu na ya kwurịta ya, nyekwa ya ohere ịtụ aro oge ọ ga-eji na-alọta ma kwuo ihe mere o ji họrọ oge ahụ. Lebaranụ aro ahụ ọ tụrụ anya. Ọ bụrụ na nwa unu egosila na o kwesịrị ntụkwasị obi, unu nwere ike ịhapụ ya ka ọ lọtawa mgbe ọ gwara unu ọ chọrọ iji na-alọta ma ọ bụrụ na o nweghị ihe ọ ga-emebi.

Iji oge eme ihe dị mkpa ná ndụ. Ịgwa nwa gị mgbe ọ ga-eji na-alọta abụghị naanị iji mee ka o zere nsogbu. Ọ bụ ịkụziri ya ihe ga-abara ya uru ná ndụ mgbe o biiri nke ya.—Ilu 22:6.

[Foto dị na peeji nke 25]

Dị ka onye nwetara akwụkwọ ikike ịkwọ ụgbọala, ịgwa gị oge ị ga-eji na-alọta na-egosi na i nweela ọganihu