Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Dị Mma Itu Mmadụ Aha?

Ọ̀ Dị Mma Itu Mmadụ Aha?

Echiche Baịbụl

Ọ̀ Dị Mma Itu Mmadụ Aha?

KA Ndị Kraịst narị afọ mbụ na-eme ihe ndị dịịrị ha kwa ụbọchị ma na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke, ha zutere ọtụtụ ndị ọrụ gọọmenti—ma ndị nọ n’ọkwá dị ala ma ndị nọ n’ọkwá dị elu. Ụmụazụ Jizọs etughị ibe ha aha ọ bụla iji gosi ọkwá onye nke ọ bụla n’ime ha. Ma n’oge ahụ, a na-etukarị ndị na-achị achị aha. A na-etu eze ukwu Rom “Onye Ukwu.”—Ọrụ 25:21.

Ya mere, mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs gara n’ihu ndị ọrụ gọọmenti, hà turu ha aha? Ànyị kwesịrị ịdị na-etu ndị ọchịchị aha n’ihi ọkwá ha?

Ịsọpụrụ Mmadụ Apụtaghị Ịnabata Ihe Ọ Na-eme

Pọl onyeozi dụrụ ndị kwere ekwe ibe ya ọdụ ka ha ‘na-enye mmadụ niile ihe ruuru ha, onye e kwesịrị ịsọpụrụ, a sọpụrụ ya.’ (Ndị Rom 13:7) Nke a gụnyere ịdị na-etu ndị ọrụ gọọmenti aha e nyere ha n’ihi ọkwá ha. Taa, utu aha ndị dị ka Onyeisi Ala na Gọvanọ socha n’utu aha ndị a na-akpọ ndị ji ọkwá dị elu. Ma, ụfọdụ nwere ike ịjụ, sị, ‘Olee otú m ga-esi tuo mmadụ ụdị aha a ebe m ka na-enyo àgwà ya enyo?’

Ọtụtụ ndị ọrụ gọọmenti na-arụ ọrụ ha nke ọma, ma ọ bụghị ha niile ka e nwere ike ịtụkwasị obi. N’agbanyeghị nke ahụ, Baịbụl na-agba anyị ume ka anyị doo onwe anyị n’okpuru ndị eze na ndị gọvanọ “n’ihi Onyenwe anyị.” (1 Pita 2:13, 14) N’ihi ya, ịmata na ọ bụ Chineke kwere ka onye ọchịchị ahụ nọrọ n’ọkwá ahụ ọ nọ na ya ga-akpali anyị inye ya nsọpụrụ ruuru ya.—Ndị Rom 13:1.

Ọ bụghị àgwà onye ọrụ gọọmenti ahụ ka anyị na-ekwu okwu ya ebe a. Ihe mere anyị ga-eji nye ya nsọpụrụ abụghị maka àgwà ya. Itu onye ọrụ gọọmenti aha e ji akwanyere ya ùgwù apụtaghị na anyị na-akwado omume ya. Ihe mere ná ndụ Pọl onyeozi gosiri na nke a bụ eziokwu.

Pọl Turu Ndị Mmadụ Aha

A nwụdere Pọl onyeozi na Jeruselem n’ihi ebubo ụgha ndị e boro ya ma kpụrụ ya gaa n’ihu Filiks, bụ́ gọvanọ ndị Judia. Filiks abụtụghị ezigbo onye ọchịchị. Tacitus, bụ́ onye Rom na-akọ akụkọ ihe mere eme, dere na Filiks “chere na ya nwere ike ime ihe ọjọọ ọ bụla sọrọ ya n’enwetaghị ntaramahụhụ.” Ihe ka ya mkpa bụ ego aka azụ ọ ga-enweta, ọ bụghị ikpe ikpe ziri ezi. N’agbanyeghị nke ahụ, n’afọ abụọ Pọl nọrọ n’ụlọ mkpọrọ, ọ sọpụụrụ gọvanọ ahụ, ha abụọ na-akparịtakwa nkata mgbe mgbe—Filiks nọ na-atụ anya inweta ego aka azụ, ma o nwetaghị ya, kama Pọl ji ohere ahụ gbaara ya àmà.—Ọrụ 24:26.

Mgbe gọvanọ ọhụrụ bụ́ Festọs nọchiri Filiks, ọ nụrụ banyere okwu Pọl na Sesaria. Iji nweta ihu ọma ndị ndú ndị Juu, Festọs kwuru ka e kpee Pọl ikpe na Jeruselem. Ma, Pọl maara na e nwere ike ghara ikpe ya ikpe ziri ezi n’ebe ahụ, ya mere, ebe ọ bụ nwa amaala Rom, o kwuru, sị: “Ana m akpọku Siza!”Ọrụ 25:11.

Festọs amaghị otú ọ ga-esi akọwara Siza ebubo ndị e boro Pọl, ma obi ruru Festọs ala mgbe Eze Agrịpa nke Abụọ bịara leta ya, ma gosi na ya nwere mmasị n’okwu ahụ. N’echi ya, ndị ọchịagha na ndị ikom a ma ama n’obodo ahụ meere nnọọ okomoko soro eze banye n’ụlọ ịnụrụ okwu ahụ.—Ọrụ 25:13-23.

Mgbe a kpọrọ Pọl ka o kwuo okwu, o ji utu aha bụ́ “Eze” malite okwu ya, kwuokwa na ya maara Agrịpa dị ka ọkachamara n’omenala niile nakwa n’arụmụka ndị dị n’etiti ndị Juu. (Ọrụ 26:2, 3) N’oge ahụ, mmadụ niile maara na Agrịpa na nwanne ya nwaanyị na-enwe mmekọahụ jọgburu onwe ya. O dokwara anya na Pọl maara na Agrịpa na-ebi ndụ rụrụ arụ. Ma, Pọl nyekwara ya nsọpụrụ kwesịịrị onye eze.

Mgbe Pọl na-azara ọnụ ya, Festọs kwuru n’oké olu, sị: “Ara na-agba gị, Pọl!” Kama Pọl iwe iwe, ọ zaghachiri ya n’olu ọma, ọbụna kpọọ gọvanọ ahụ “Onye Ukwu.” (Ọrụ 26:24, 25) Pọl nyere ya nsọpụrụ kwesịịrị ọkwá ya. Ma, ihe atụ ndị a na-akpalite ajụjụ bụ́, Ò nwere ókè e kwesịrị inyeru ndị ọchịchị nsọpụrụ?

Nsọpụrụ A Kpaara Ókè

A kpaara ikike ndị ọchịchị nwere ókè dị ka e gosiri ná Ndị Rom 13:1, bụ́ nke kwuru, sị: “Ọ bụ Chineke debere ọchịchị ndị dị adị n’ọnọdụ ha nọ n’okpuru ya.” N’ihi ya, a kpakwaara nsọpụrụ a na-enye ndị gọọmenti ókè. Jizọs gosiri ókè e kwesịrị inyeru ndị ọzọ nsọpụrụ mgbe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ka a ghara ịkpọ unu onwe unu Rabaị, n’ihi na otu onye bụ onye ozizi unu, ma unu niile bụ ụmụnna. Unu akpọkwala onye ọ bụla nna unu n’elu ụwa, n’ihi na otu onye bụ Nna unu, ya bụ, Onye nke eluigwe. Ka a gharakwa ịkpọ unu ‘ndị ndú,’ n’ihi na Onye Ndú unu bụ otu onye, ya bụ, Kraịst.”—Matiu 23:8-10.

N’ihi ya, ihe ga-ekpebi ma ànyị ga na-etu mmadụ aha a na-etu ya bụ ma utu aha ahụ ọ̀ bụ nke ọchịchị nyere ya ka ọ̀ bụ nke okpukpe nyere ya. Ọ bụrụ na ndị ọrụ gọọmenti enwee utu aha okpukpe nyere ha, ndụmọdụ Pọl nyere anyị ịdị na-asọpụrụ ha erughị n’itu ha aha ahụ okpukpe nyere ha. Onye ọ bụla na-agbaso ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ ga-enye onye ọrụ gọọmenti ahụ nsọpụrụ kwesịrị ya. Ma, akọnuche ya e ji Baịbụl zụọ ga-eme ka ọ ghara ịkpọ onye ọ bụla utu aha okpukpe ya, n’ihi na iwu ji ya ‘ịkwụ Chineke ihe Chineke.’—Matiu 22:21.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

▪ Olee otú ụmụazụ Jizọs si lee ndị ọchịchị anya?—Ndị Rom 13:7.

▪ Pọl onyeozi ọ̀ kpọrọ ndị ọrụ gọọmenti utu aha e ji asọpụrụ ha?—Ọrụ 25:11; 26:2, 25.

▪ Olee ụdị utu aha ndị Jizọs katọrọ?—Matiu 23:8-10.

[Foto dị na peeji nke 14 na 15]

Gịnị ka Pọl kpọrọ Agripa?