Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Amabughị M na Chineke Nwere Aha”

“Amabughị M na Chineke Nwere Aha”

“Amabughị M na Chineke Nwere Aha”

▪ Otu nwaanyị kwuru okwu ahụ mgbe ọ gụchara akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Nwaanyị ahụ kwukwara sị, “Ma o kwesịkwaranụ inwe aha. Mgbe m chọrọ aha Chineke na Baịbụl, ahụrụ m ya!” O tipụrụ, sị: “Agụtụbeghị m akwụkwọ na-ekwu banyere Baịbụl nke na-enye aka na nke dị mfe nghọta ka nke a mbụ!”

Ihe akwụkwọ Bible Na-akụzi na-eme abụghị naanị igosi na nzube mbụ nke Chineke maka ụwa bụ ka ọ bụrụ paradaịs, kama ọ na-emekwa ka otú nzube ahụ ga-esi mezuo doo anya. Akwụkwọ ahụ na-emekwa ka anyị mara ọrụ dị mkpa Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs, na-arụ n’imezu nzube a. Ọ na-emekwa ka anyị mata otú Baịbụl si kọwaa ihe mere anyị ji aka nká ma na-anwụ anwụ, ihe mere Chineke ji kwere ka nhụjuanya dịrị, na otú Alaeze Chineke ga-esi napụta anyị n’ahụhụ anyị na-ata.

N’agbanyeghị na e bipụtara akwụkwọ Bible Na-akụzi naanị afọ atọ gara aga, e bipụtala ya ihe karịrị nde iri asaa na itoolu n’asụsụ narị abụọ na iri abụọ. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta akwụkwọ a, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 nke magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Baịbụl ebe obibi n’efu.