Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Enyemaka A Na-atụghị Anya Ya Sitere na Teta!

Enyemaka A Na-atụghị Anya Ya Sitere na Teta!

Enyemaka A Na-atụghị Anya Ya Sitere na Teta!

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA BENIN

▪ Mgbe Noël bụ́ onye dị afọ iri abụọ na atọ kpebiri ịkwụsị ịga ụlọ akwụkwọ ma ghọọ onye ozi oge niile nke Ndịàmà Jehova, ndị ikwu ya nọ na-eche ma ọ̀ ga-akpalikwa afọ ya. N’eziokwu, o siiri ya ike inweta ezigbo ọrụ nwa oge. N’ihi ya, mgbe ọmarịcha isiokwu bụ́ “Isi Ihe Ise Ndị Na-enye Aka n’Ịchọta Ọrụ” gbara na magazin bụ́ Teta! Noël ji nwayọọ gụọ ya ugboro ugboro. * Ò nyeere ya aka? Ee, ma ọ bụghị otú ọ tụrụ anya ya.

Onyeisi nke otu ụlọ akwụkwọ mmadụ nwe hụrụ Noël ka ọ na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ ma jụọ ya ma ọ̀ bụ Onyeàmà Jehova. Onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ chọrọ onye nkụzi ọzọ, ebe ọ bụkwa na ọ hụla na Ndịàmà Jehova na-akụzi ihe nke ọma, ọ jụrụ Noël ma ò nwere onye ọ maara ga-achọ ọrụ ahụ. Mgbe Noël sịrị mba, onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ jụrụ ya, sị, “Gịnwakwanụ?”

Noël akụzitụbeghị ihe n’ụlọ akwụkwọ, ọ na-asụtụkwa nsụ mgbe ụfọdụ. Na Benin, nke a bụ nsogbu n’ihi na ụlọ ọrụ na-ahụ maka agụmakwụkwọ na-achọ ka ndị ga-akụzi nkụzi gaa lee ule iji jide n’aka na ha abụghị ndị nsụ. Onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ kwere ya nkwa, sị: “Weta asambodo gị, m ga-enye gị ọrụ ahụ.”

Noël emeela nnọọ nke ọma n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, bụ́ ụlọ akwụkwọ a kwadebere iji mee ka ndị mmadụ mụtakwuo ikwu okwu n’ihu ọha, nke a na-enwe kwa izu n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova. Ọ na-ekwudị okwu ihu ọha n’ọgbakọ ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ụjọ jidere ya mgbe ọ gara ule ahụ.

Onye na-ele ha ule nyere ya otu magazin ma gwa ya ka ọ gụpụta otu paragraf a kanyere ihe na-acha uhie uhie n’olu dara ụda. Ọ tụrụ Noël n’anya mgbe ọ hụrụ na ihe ahụ a sịrị ya gụọ sitere n’isiokwu bụ́ “Isi Ihe Ise Ndị Na-enye Aka n’Ịchọta Ọrụ.” Ọ gụrụ paragraf ahụ werewere ma nweta asambodo ahụ.

Onye ahụ na-ele ha ule mechara kwuo na ya na-agụchi magazin Ndịàmà Jehova anya. Ọ kọwara, sị: “Ihe ndị dị na magazin ndị a na-aba uru, a na-edekwa ha nke ọma nke na m na-ejikarị ha ele ndị mmadụ ule.”

Noël malitere ọrụ nkụzi, onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ chọkwara ka ọ kụzikwuo n’ụlọ akwụkwọ ahụ n’afọ na-eso ya, ma Noël nwere atụmatụ ọzọ. A kpọọla ya ịbịa rụwa n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova, bụ́kwa ebe ọ na-eje ozi ugbu a.

[Ihe odide ala ala peeji]