Ihe Ndị Na-atụ n’Anya Banyere Ọka
Ihe Ndị Na-atụ n’Anya Banyere Ọka
HARLIN bụ onye ọrụ ugbo na-akụ ọka n’ógbè dị n’akụkụ ọdọ mmiri ndị a na-akpọ Finger Lakes na New York, nke dị ná mba United States, ọ bụkwa afọ ole na ole gara aga ka ọ kwụsịrị. Ọ na-atọ ya ụtọ mgbe niile ịkọwara ndị enyi ya na ndị ọbịa ya ihe ndị dị ịtụnanya banyere ọka. Teta! gwara Harlin ka ọ kọtụrụ ndị na-agụ akwụkwọ anyị ihe ndị ọ maara banyere ọka. Anyị ga-elebakwa anya n’akụkụ ndị ọzọ nke ihe ọkụkụ a dị ịtụnanya. Dị ka ihe atụ, olee ebe e si nweta ọka? Olee otú o si gbasaa n’ụwa niile? Oleekwa ihe ndị e ji ya eme? Ka anyị tụlezie otú Harlin si kọwaa ụfọdụ n’ime ihe ndị dị ịtụnanya banyere ọka.
Ọka “Na-agwa” Gị “Okwu”
“Ana m ele ọrụ ịkụ ọka anya dị ka ọrụ nkà na ọrụ metụtara nnọọ mgbakọ na mwepụ. A haziri ihe niile dị n’ọka otú mara mma n’anya, ma akwụkwọ ya ma mkpụrụ nke ọ bụla dị n’isisi ya. Ọzọkwa, ka ọka na-eto, ọ ‘na-agwa’ gị ‘okwu.’ Ọ na-agwa gị mgbe akpịrị na-akpọ ya nkụ nakwa mgbe ọ na-anaghị enweta nri zuuru ya. Nwa ọhụrụ na-ebe ákwá mgbe ihe dị ya mkpa. Dị ka ọtụtụ ihe ọkụkụ ndị ọzọ, ọka na-eto eto na-egosi gị ihe ụfọdụ ga-eme ka ị mara ihe ndị dị ya mkpa, dị ka mgbe akwụkwọ ya
chagharịwara na mgbe ọdịdị ya gbanwere. Ihe dị mkpa bụ ịghọta ihe ọka na-agwa gị.“Mgbe akwụkwọ ya chawara uhie uhie, o nwere ike igosi na o nweghị ihe na-edozi ya ahụ́, bụ́ phosphate, otú ga-ezuru ya. E nwere ihe ndị ọzọ ọ ga-abụ ị hụ gị amara na nri akụ́kụ́ ndị bụ́ magnesium, nitrogen, ma ọ bụ akanwụ dị n’ala ebe a kụrụ ya anaghị ezuru ya. Onye ọrụ ugbo nwekwara ike ịmata ma ọka ya ò butela ọrịa ma ọ bụ ma kemikal ọ̀ chọwala igbu ya ozugbo o lere ya anya.
“Dịkwa ka ndị ọzọ na-akụ ọka, m na-akụ ọka m n’oge opupu ihe ubi n’ihi na okpomọkụ na-adị n’ala mgbe ahụ na-enyere ya aka ipu. Mgbe ọka m tojuru n’agbata ọnwa anọ na ọnwa isii, ọ na-adị ihe dị ka mita abụọ n’ogologo.
“Uto ọka dị n’ogo n’ogo, e nwekwara ike ịgụ akwụkwọ ya ọnụ iji mata ogo ọ nọ na ya. Mgbe ọ nọ n’ogo nke inwe akwụkwọ ise, otú akụkụ ya dị iche iche si arụkọ ọrụ n’uto ya na-apụta nnọọ ìhè, ị ga-ahụkwa na uto ya metụtara “mgbakọ na mwepụ.” Nke mbụ, mgbọrọgwụ ya na-achọpụta otú ala ebe a kụrụ ya dị. Ihe ọ chọpụtara ga-ekpebi otú oghere ndị ga-adị n’isisi ọka ahụ ga-asaru mbara, ihe a ga-ejikwa mata otú ha saruru mbara bụ ahịrị mkpụrụ ọka ole isisi ọka ahụ ga-enwe. Mgbe o toruziri n’ogo nke inwe akwụkwọ dị n’agbata iri na abụọ na iri na asaa, ihe mgbọrọgwụ ọka ahụ chọpụtara banyere otú ala dị na-enyere ya aka ikpebi mkpụrụ ọka ole ga-adị n’isisi ọka nke ọ bụla. Ikwu ya n’ụzọ dị mfe, osisi ọka nke ọ bụla na-ekpebi otú ọ ga-esi nweta ihe kasị mma n’ala ebe a kụrụ ya. Ihe ọzọ na-egosi na e kere ọka n’ụzọ dị ịtụnanya bụ otú o si amụba.”
Ọza, Ntụ Ọza, na Ụzarị
“Osisi ọka nke ọ bụla na-abụ ma oké ma nne. Ọza ya nke na-epu n’isi osisi ọka bụ oké. Alaka nke ọ bụla nke ọza ya na-enwe ihe dị ka puku ntụ ọza isii. Ọtụtụ nde ntụ ọza na-esi n’ọza ọka nke ọ bụla adapụ. Ikuku na-ebuga ntụ ọza ndị ahụ n’àkwá ndị dị n’obere oko ọka nke osisi ọka ndị dị ha nso ma si otú ahụ mee ka ha nwee ike ịmị mkpụrụ. Mkpo ọka na-ezochi àkwá ndị a.
“Olee otú ntụ ọza ọka na-esi agafe mkpo ọka ma banye n’àkwá ahụ? Ọ na-esi n’ụzarị ya abanye. Ụzarị ọka bụ ihe yọrị yọrị ahụ na-adị n’isi oko ọka a na-ekpechabeghị ekpecha. Otu ọka na-enwe ọtụtụ narị ụzarị ndị a. Ọ bụrụ na i soro eriri ụzarị nke ọ bụla iji hụ ebe o si, ọ ga-eduga gị n’akpa àkwá, bụ́ ebe àkwá na-adị. Otu eriri ụzarị na-enwe otu àkwá. Àkwá nke ọ bụla na-amịpụtakwa otu mkpụrụ ọka.
“Ebe ndị a na-ahụ anya n’ụzarị ahụ na-enwe ajị ndị nwere ike ịdọrọ ntụ ọza ndị ahụ ikuku bu na-aga. Ozugbo ntụ ọza dakwasịrị n’ụzarị ahụ, bụ́ nke nwere ike ịdakwasị n’akụkụ ya ọ bụla pụtara ìhè, ntụ ọza ahụ na-amalite ịrụ ọrụ, ụzarị ọka ahụ na-eburu ya gbadaa n’ebe ákwà ahụ dị ma mee ka ọ mịpụta mkpụrụ ọka.
“Ihe mere ọka ụfọdụ ji enwe ezé mfo bụ n’ihi na ụzarị nke ha enwetaghị ntụ ọza nke gaara eme ka ha mịa mkpụrụ, ikekwe n’ihi na ha etopụtaghị n’oge. Ala ịkpọ nkụ nwekwara ike ime ka ọka nwee ezé mfo. Ọzọkwa, ọ bụrụ na onye ọrụ ugbo amata ihe ndị nwere ike ime ka ọka ya nwee ezé mfo, ọ ga-eme ka ọka ya mịpụtakwuo mkpụrụ—ma ó melighị ya na nke ọ kụrụla akụ, ya emee ya mgbe ọzọ ọ ga-akụ ọka. Ihe m na-eme iji mee ka ọka m mịpụtakwuo mkpụrụ bụ m kụọ ọka n’ala m n’afọ a mụ akụọ sọyabins na ya n’afọ ọzọ. Sọyabins na-eme ka ala nweta nri akụ́kụ́ bụ́ nitrogen, ọtị anaghịkwa erili ya.
“Ọ na-eme m obi ụtọ ịhụ ka ala tọgbọrọ n’efu jupụtara n’ọka ndị na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ ma na-emepụta nnukwu nri—na-emekwa ya n’emeghị ụzụ, n’emetọghị ikuku, ma maakwa mma n’anya. Ekwenyesiri m ike na ọka
—dị ka ihe ọkụkụ ndị ọzọ—so n’ihe ndị dị ịtụnanya Chineke kere. Ihe m makwaara banyere ọka enweghị ihe ọ bụ ma e were ya tụnyere ihe ndị m na-amatabeghị.”Ihe ndị Harlin kwuru ò meela ka ị chọọ ịmatakwu ihe ndị ọzọ banyere ihe ọkụkụ a na-atụ n’anya? Ka anyị tụlee otú ọka si bịa bụrụ ihe a ma ama na ihe dị iche iche e ji ya eme.
O Si na Mexico Gazuo Ụwa!
A malitere ịkụ ọka na kọntinent ndị dị n’America, karịsịa na Mexico, ọ bụkwa ebe ahụ ka o si gbasaa. Ndị Peru dịrị ndụ tupu ndị Inca ebie ebe ahụ fere chi nwaanyị ọka ofufe, bụ́ onye a kpụrụ ebe o kpu okpueze oko ọka gbara gburugburu. Onye na-ede banyere ihe ọkụkụ bụ́ Joseph Kastner kwuru na ndị India America “fere [ọka] ofufe dị ka nri chi mere, nakwa dị ka nri e ji kee mmadụ . . . Ọ na-adị nnọọ mfe ọkụkụ—otu úkwù ọka na-amịpụta ihe mmadụ ga-eji rijuo afọ n’otu ụbọchị.” Otú ọ dị, ndị obodo ahụ na-erikọta ya na àgwà, bụ́ ihe ndị Latin America na-eme ruo taa.
Ndị Europe chọpụtara ọka n’afọ 1492 mgbe onye na-eme nchọpụta bụ́ Christopher Columbus sisịrị n’ógbè Caribbean lọta. Nwa Columbus bụ́ Ferdinand dere na nna ya hụrụ otu mkpụrụ akụ́kụ́ “nke ha kpọrọ ọka, nakwa na ọ na-atọ ezigbo ụtọ ma e sie ya esie, hụọ ya ahụọ, ma ọ bụkwanụ gwee ya egwee.” Columbus ji mkpụrụ ya ụfọdụ laa, Kastner dere na ka ọ na-erule “n’etiti afọ ndị 1500,” “[ọka] etowela na Spen, na-etokwa na Bulgaria nakwa na Turkey. Ndị na-agba mgbere ohu bubatara ọka n’Africa . . . Ndị òtù [onye Spen na-eme nchọpụta nke a mụrụ na Portugal bụ́ Ferdinand] Magellan busara mkpụrụ akụ́kụ́ ahụ si Mexico na Philippines nakwa n’Eshia.” Ọ bụ otú ahụ ka ọka si wuwe ewuwe.
Taa, ọka bụ mkpụrụ akụ́kụ́ nke abụọ a kasị eri n’ụwa, ọ bụ naanị wit ka ndị mmadụ na-eri karịa ya. Osikapa bụ mkpụrụ akụ́kụ́ nke atọ a kasị eri n’ụwa. Ọ bụ mkpụrụ akụkụ atọ a ka ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ ji mere nri, ka a gharadị ikwuwe ụmụ anụmanụ na-erikwa ha.
Ọka dị n’ụdị dị iche iche, dịkwa ka ihe ọkụkụ ndị ọzọ. N’ezie, naanị na United States, e nwere ihe karịrị otu puku ụdị ya, gụnyere ndị a kọpụtara site n’ijikọta ụdị abụọ. E nwere ọka ndị na-adị sentimita iri isii n’ogologo, nweekwa ndị na-etoru mita isii! Otú otu oko ọka na-aha n’ogologo na-adịgasịkwa iche. Ụfọdụ na-adị naanị sentimita ise n’ogologo; ndị ọzọ na-adịkwa sentimita iri isii n’ogologo. Akwụkwọ bụ́ Latin American Cooking kwuru, sị: “Ụfọdụ ụdị ọka ndị a na-akụ n’Ebe Ndịda America taa na-amịpụta nnukwu oko ọka ndị na-adị ka [isi akị bekee], nwee mkpụrụ ndị dị gburugburu na-akarị sentimita abụọ na ọkara n’ogologo, fọkwa obere ka ha saa mbara otú ahụ.”
Ọka na-enwekwa ụcha dị iche iche. E wezụga ndị nke na-acha odo odo, oko ọka nwere ike ịdị na-acha uhie uhie, anụnụ anụnụ, pinki pinki, ma ọ bụ na-eji oji. Mgbe ụfọdụkwa mkpụrụ ndị dị n’ime ọka nwere ike ime ka isi ọka ahụ tụọ àgwà dị iche iche, ma ọ bụ ọbụna yie ihe a kara akara. Ọ bụghị ihe ijuanya na mgbe ụfọdụ, a na-eji oko ọka ndị ahụ nwere àgwà ndị mara mma mere ihe ịchọ mma.
Mkpụrụ Akụ́kụ́ E Ji Eme Ọtụtụ Ihe
Ọ bụ ezie na e nwere ụdị ọka dịgasị iche iche, e nwere ike ikewa ha niile ụzọ isii: ọka na-afịkpọ afịkpọ, ọka mkpụrụ ya na-agba gburugburu, ọka e ji eme ntụ ọka, ọka ọtịta, ọka mkpụrụ ya na-egbuke egbuke, na ọka e ji eme pọpkọn. Ọka ọtịta bụ naanị otu n’ime ọtụtụ ụdị ọka ndị e nwere. Ihe mere o ji atọ ụtọ bụ na ọ naghị enwe ike ịgbanwecha shuga dị n’ime ya ka ọ ghọọ stach. N’ime ọka niile a na-akọpụta n’ụwa, a na-eji ihe karịrị ụzọ isii n’ime ụzọ iri azụ ụmụ anụmanụ, naanị ihe ụmụ mmadụ na-eri n’ime ya bụ ihe na-erughị ụzọ abụọ n’ime ụzọ iri. A na-ejizi nke fọrọ afọ emepụta ihe ma ọ bụ jiri ya kụghachi n’ala. N’ezie, otú e si eji ya eme ihe n’otu mba na-adị iche n’otú e si eji ya eme ihe ná mba ọzọ.
E nwere nnọọ ọtụtụ ihe e ji ọka eme. A na-eji ọka ma ọ bụ ihe ndị e si na ya nweta emepụta ma mgba ma ihe e ji ata bred a na-akpọ mayonnaise, jirikwa ya emepụta biya na ihe a na-awanye ụmụaka n’úkwù. A na-ejidị ọka emepụta mmanụ ọkụ a na-akpọ ethanol—ọ bụ ezie na nke a na-ese okwu. O doro anya na a ghọtachabeghị ihe niile banyere mkpụrụ akụ́kụ́ a dị ịtụnanya e ji eme ọtụtụ ihe.
[Igbe dị na peeji nke 29]
Ọka E Ji Ụdị Abụọ Kọpụta
N’ọtụtụ mba, ndị ọrụ ugbo na-eji ụdị ọka abụọ akọpụta ọka n’ihi na ọ na-aka eme nke ọma. A na-akụ ọka ndị e ji ụdị abụọ kọpụta site n’ịma ụma ejikọta ụdị ọka abụọ yiri onwe ha mgbe a na-akụ ha. Ma, nke a na-eme ka ọ dị mkpa ka ndị ọrụ ugbo na-azụ ụdị ọka abụọ ahụ mgbe ọ bụla ha chọrọ ịkụ ọka. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ị kụọ ọka e ji ụdị abụọ kọpụta, o nwere ike ịdị iche na nke ahụ i si na ya kụọ ya ma ghara ime nke ọma ka nke mbụ ahụ e ji ụdị abụọ kọpụta.
[Foto ndị dị na peeji nke 28]
E nwere ọtụtụ narị ụdị ọka n’ụwa niile
[Ebe E Sigasị Nweta ha]
Site n’ikike a natara Sam Fentress
Site n’ikike a natara Jenny Mealing/flickr.com