Mmadụ Ịdị Ndụ Ọzọ Mgbe Ọ Nwụsịrị—Ọ Ga-ekwe Omume!
Mmadụ Ịdị Ndụ Ọzọ Mgbe Ọ Nwụsịrị—Ọ Ga-ekwe Omume!
N’OTU fim e mere afọ ole na ole gara aga, e gosiri ebe otu nwa okorobịa guzo n’ili nke onye ọ hụrụ n’anya. O kwuru, sị: “Mama m na-ekwu mgbe niile na onye ọ bụla dị ndụ ga-anwụ anwụ.” Mgbe e sepụtaziri ili ahụ, o kwukwara, sị: “Ọ dị m nnọọ ka ya bụrụ na ọ bụghị eziokwu.”
Ọ bụ otú a ka obi dị ọtụtụ ijeri ndị onye ha hụrụ n’anya nwụnahụrụ. Ọnwụ bụ ajọ onye iro! Ma, Chineke kwere nkwa, sị: “Dị ka onye iro ikpeazụ, a ga-eme ka ọnwụ ghara ịdị irè.” (1 Ndị Kọrịnt 15:26) Ma, gịnị mere anyị ji anwụ anwụ n’agbanyeghị na o doro anya na e kere anyị ịdị ndụ ebighị ebi? Olee otú a ga-esi wepụ ọnwụ?
Ihe Mere Anyị Ji Aka Nká Ma Na-anwụ Anwụ
Baịbụl kwuru banyere Jehova Chineke, bụ́ Onye Okike anyị, sị: “Ihe zuru okè ka ọrụ ya bụ.” (Diuterọnọmi 32:4; Abụ Ọma 83:18) Nwoke mbụ, bụ́ Adam, zuru okè mgbe e kere ya, o nwekwara ike ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’Iden, bụ́ ubi Paradaịs ahụ Chineke debere ya n’ime ya n’ụwa. (Jenesis 2:7-9) Gịnị mere Adam ji si n’ebe obibi ya ahụ bụ́ Paradaịs pụọ, kaa nká ma nwụọ?
N’igbu ya ná nkenke: Adam jụrụ irube isi n’iwu e nyere ya ka ọ ghara iri mkpụrụ nke otu osisi. Chineke eburula ụzọ dọsie Adam aka ná ntị ike banyere ihe ga-eme ya ma o rie mkpụrụ osisi ahụ, sị: “Ị ga-anwụrịrị.” (Jenesis 2:16, 17) Adam so nwunye ya, bụ́ Iv, nupụ isi n’iwu ahụ, n’ihi ya, Chineke chụpụrụ ha n’Iden. Ihe mere o ji dị mkpa ka Chineke chụpụ ha n’ebe ahụ n’egbughị oge doro nnọọ anya. Baịbụl kwuru, sị: “Ka [Adam] wee ghara isetịpụ aka ya ghọrọ mkpụrụ n’osisi nke ndụ [dị n’ubi ahụ] rie wee dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.”—Jenesis 3:1-6, 22.
Adam na Iv nwụrụ n’ihi nnupụisi ha, ma gịnị mere ụmụ ha niile ji aka nká ma na-anwụ anwụ? Ọ bụ n’ihi na ha ketara mmehie n’aka Adam, mmehie akpatakwarala nwa ya nke ọ bụla ezughị okè na ọnwụ. Baịbụl kọwara, sị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ [Adam] bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere.”—Ndị Rom 5:12.
Ihe Mere Mmadụ Ga-eji Nwee Ike Ịdị Ndụ Ọzọ
Dị ka anyị gụrụ na mbụ, “a ga-eme ka ọnwụ ghara ịdị irè”—ee, a ga-ewepụ ya kpamkpam! (1 Ndị Kọrịnt 15:26) Ma olee otú a ga-esi wepụ ya? Baịbụl kọwara nke a, sị: “E si n’otu omume ziri ezi kpọọ ụdị mmadụ niile ndị ezi omume ka ha wee nweta ndụ.” (Ndị Rom 5:18) Gịnị bụ ihe ahụ mere mmadụ ga-eji nwee ike ịbụ onye ezi omume n’anya Chineke ma nweta ndụ ebighị ebi?
Ọ bụ ndokwa ahụ Chineke mere ịkagbu mmehie ahụ mmadụ niile ketara n’aka mmadụ mbụ ahụ, bụ́ Adam. Baịbụl kọwara, sị: “Onyinye nke Chineke na-enye bụ ndụ ebighị ebi site n’aka Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.” (Ndị Rom 6:23) Jizọs kwuru banyere ndokwa a a ga-eji kpọọ ndị mmadụ ndị ezi omume, sị: “Chineke hụrụ ụwa [ụmụ mmadụ] n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16.
Cheedị otú Chineke hụruru anyị n’anya, nakwa otú Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst hụruru anyị n’anya, bụ́ onye tara nnukwu ahụhụ n’ihi anyị. Pọl onyeozi dere, sị: “Ọkpara Chineke . . . hụrụ m n’anya ma nyefee onwe ya maka m.” (Ndị Galeshia 2:20) Ma, gịnị mere o ji bụrụ naanị Jizọs bụ mmadụ nwere ike ‘inye mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta’ maka anyị ma si otú ahụ napụta anyị n’ihe ọjọọ ndị mmehie na-akpata?—Matiu 20:28.
Ọ bụ naanị Jizọs bụ onye nwere ike inye mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ihi na ọ bụ naanị ya bụ mmadụ nke na-eketaghị mmehie n’aka mmadụ mbụ, bụ́ Adam. Olee ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na e si n’eluigwe bufee ndụ Jizọs n’akpa nwa Meri, bụ́ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, n’ụzọ ọrụ ebube. Ya mere, ihe otu mmụọ ozi gwara Meri mezuru, nke bụ́ na a ga-akpọ nwa ya nwoke “onye nsọ, Ọkpara Chineke.” (Luk 1:34, 35) Ọ bụ ya mere e ji akpọ Jizọs “Adam ikpeazụ,” ọ bụkwa ya mere na o ketaghị mmehie n’aka “nwoke mbụ ahụ bụ́ Adam.” (1 Ndị Kọrịnt 15:45) Ebe ọ bụ na Jizọs bụ mmadụ na-enweghị mmehie, o nwere ike inye onwe ya ka ọ bụrụ “ihe mgbapụta kwekọrọ ekwekọ”—n’ihi na ndụ ya na ndụ nke mmadụ mbụ ahụ zuburu okè, nke na-enweghịkwa mmehie, ha nhata.—1 Timoti 2:6.
Chineke mere ka o kwe anyị omume inweta ihe nwoke mbụ ahụ bụ́ Adam tụfuru, ya bụ, ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs site n’inye anyị ihe mgbapụta ahụ. Ma, ka ihe ka nnọọ ọtụtụ n’ime ụmụ mmadụ nwee ike inweta ngọzi a, ha aghaghị ịdị ndụ ọzọ. Nke a bụ nnọọ atụmanya magburu onwe ya! Ma, onye nwụrụ anwụ ịdị ndụ ọzọ, ọ̀ bụ nrọ efu?
Ihe Mere Ị Ga-eji Kwere
Ò kwesịrị isi oké ike ikwere na Jehova Chineke, bụ́ onye kere ndụ, nwere ikike ikeghachi onye dịtụrụla ndụ? Chegodị echiche banyere ikike nwaanyị nwere ịtụrụ ime, bụ́ nke Chineke nyere nwaanyị mbụ. “Adam na nwunye ya bụ́ Iv wee nwee mmekọahụ,” mgbe ihe dị ka ọnwa itoolu gasịkwara, ha mụpụtara obere nwa yiri ha. (Jenesis 4:1) Otú akụkụ ahụ́ niile nke nwa ọhụrụ ahụ si pụta maa nọkọta ọnụ n’ime afọ Iv ka bụ ọrụ ebube nke mmadụ na-enweghị ike ịghọtacha!—Abụ Ọma 139:13-16.
Ndị mmadụ anaghị eche na ịmụ nwa bụ oké ihe n’ihi na a na-amụ ọtụtụ narị puku ụmụ ọhụrụ kwa ụbọchị. Ma, ọtụtụ ndị ka na-eche na ọ gaghị ekwe omume ime ka onye dịburu ndụ dịghachi ndụ ọzọ. Mgbe Jizọs gwara ndị na-eru újú maka ọnwụ nke otu nwatakịrị nwaanyị ka ha kwụsị ibe ákwá, ‘ha malitere ịchị ya ọchị na ịkwa ya emo’ n’ihi na ha maara na nwa ahụ anwụọla. Ma Jizọs gwara nwatakịrị nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ okwu, sị: “‘Bilie!’ Nwata nwaanyị ahụ biliri ozugbo wee malite ije ije.” A gwara anyị, sị: “Ozugbo ahụ, [ndị nọ ebe ahụ] nwere oké obi ụtọ.”—Mak 5:39-43; Luk 8:51-56.
Mgbe Jizọs kwuru ka a kwapụ nkume e ji dochie ọnụ ili nke ezigbo enyi ya bụ́ Lazarọs, Mata, bụ́ nwanne Lazarọs, jụrụ ma kwuo, sị: “Ka ọ dị ugbu a, ọ ghaghị ịbụ na o siwela ísì, n’ihi na o meela ụbọchị anọ.” Ma, ọṅụ jupụtara nnọọ mmadụ niile obi mgbe Jizọs mere ka Lazarọs dịghachi ndụ! (Jọn 11:38-44) Ọtụtụ ndị matara banyere ọrụ ebube ndị Jizọs na-arụ. Mgbe Jọn Onye Na-eme Baptizim, nọ n’ụlọ mkpọrọ, ndị na-eso ụzọ Jọn gwara ya banyere ọrụ Jizọs, sị: “A na-akpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ.”—Luk 7:22.
Ime Ka Mmadụ Dịghachi Ndụ Site n’Ịkpọlite Ya n’Ọnwụ
Gịnị mere Jizọs ji rụọ ọrụ ebube ndị ahụ ebe ọ bụ na ndị ahụ ọ kpọlitere n’ọnwụ mechara rịa ọrịa ma nwụọ ọzọ? O mere ya n’ihi na nke ahụ gosiri na e nwere ike inwetaghachi ihe ahụ Adam mbụ tụfuru—ya bụ, ndụ ebighị ebi n’ime ụwa paradaịs—a ga-enwetaghachikwa ya. Mkpọlite Jizọs kpọlitere ndị mmadụ n’ọnwụ gosiri na ọtụtụ nde mmadụ ga-emecha ‘nweta ụwa,’ “ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29.
Obi dị anyị ụtọ ịmata na anyị nwere ike iso ná ndị ga-enwe olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi ma ọ bụrụ na anyị ebie ndụ “nsọpụrụ Chineke.” Baịbụl kwuru na ụdị ndụ ahụ “nwere nkwa maka ndụ dị ugbu a, na ndụ nke gaje ịbịa.” A na-akpọkwa ‘ndụ ahụ nke gaje ịbịa’ “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.”—1 Timoti 4:8; 6:19.
Ka anyị tụleekwala otú ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie, bụ́ ụdị ndụ a ga-ebi n’ime ụwa ọhụrụ ezi omume nke Chineke, ga-adị.
[Foto dị na peeji nke 6]
“Ha nwere oké obi ụtọ”