Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Nwere Ike Isi Merie Ọnwụnwa?

Olee Otú M Nwere Ike Isi Merie Ọnwụnwa?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Olee Otú M Nwere Ike Isi Merie Ọnwụnwa?

▪ Karen anọfebeghị nkeji iri n’oriri ahụ mgbe ọ hụrụ ka ụmụ okorobịa abụọ bu nnukwu akpa ndị e ji akwụkwọ mee bata. Onye ọ bụla ma ihe dị n’akpa ndị ahụ. Ọ nụbuola ka ụmụ okorobịa abụọ a na-ekwu na “a ga-ata nkwụ” n’oriri a. Karen agwakwanụghị papa ya na mama ya ihe ahụ ọ nụrụ. Ọ gwara onwe ya na ụmụ okorobịa ahụ na-egwu egwu. A sị ka e kwuwe, e kwesịrị inwe ụfọdụ ndị toro eto n’ụlọ a—a ga-enwerịrị otu ebe ha nọ n’ụlọ a.

Ozugbo ahụ, Karen nụrụ olu onye ọ ma ama n’azụ ya. “Olee ihe ị guzo ebe ahụ eme, mgbeke dị ka gị?” Karen tụgharịrị ma hụ enyi ya nwaanyị bụ́ Jessica ka o bu karama mmanya biya abụọ a ka kwụpere akwụpe. Jessica nyewere Karen otu ma sị ya, “Agwakwala m na i torubeghị ikporitụ ndụ!”

Karen chọrọ ịjụ. Ma, o siiri ya ike otú ọ na-atụghị anya ya. Nsogbu ya abụghị na ịṅụ mmanya na-aba n’anya na-agụ ya. Nsogbu ya bụ na Jessica bụ enyi ya, Karen achọkwanụghị iyi mgbeke ahụ Jessica kpọrọ ya. E wezụga nke ahụ, Jessica so n’ezigbo ụmụ agbọghọ e nwere n’ụlọ akwụkwọ ha. Ya bụrụ na ọ na-aṅụ biya, oleekwanụ ihe ọjọọ dị na ya ma Karen soro ya ṅụọ? Karen gwara onwe ya sị, ‘Ọ́ bụghị naanị biya? Ọ bụghị ịṅụ ọgwụ ike ma ọ bụ inwe mmekọahụ.’

MGBE ị dị obere, ọnwụnwa na-abịa n’ọtụtụ ụzọ. Mgbe mgbe, ọ na-abụ n’ihe metụtara onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị. Ramon, bụ́ onye dị afọ iri na asaa, kwuru, sị, “Ụmụ agbọghọ mụ na ha nọ n’ụlọ akwụkwọ anaghị ekwe ekwe. * Ha ga na-emetụgharị gị aka iji mara ebe ị ga-anabataru ya. Ị gwa ha na ị chọghị, ya adị ha ka ị na-egwu egwu!” Deanna, onye dịkwa afọ iri na asaa, chọpụtakwara otu ihe ahụ. O kwuru, sị: “Otu nwa okorobịa bịara konye m aka n’olu. Esuru m ya aka n’aka ma sị ya, ‘À na-akpọkwanụ ụdị egwuregwu a gịnị? Amadịghị m onye ị bụ!’”

Ọnwụnwa nwekwara ike ịbịara gịnwa, o nwekwara ike iyi ihe na-anaghị akwụsị akwụsị. Otu Onye Kraịst kwuru na “ọnwụnwa yiri onye na-akụ aka n’ọnụ ụzọ gị n’akwụsịghị akwụsị n’agbanyeghị na ọ hụrụ ihe mgbaàmà i tinyere n’ọnụ ụzọ nke, sịrị, Enyela M Nsogbu.” À na-akụrụ gị aka ahụ karịa otú ị chọrọ? Dị ka ihe atụ, à na-anwa gị ọnwụnwa ime nke ọ bụla n’ime ihe ndị e dere n’okpuru ebe a?

□ Ịṅụ sịga

□ Ịṅụ mmanya na-aba n’anya

□ Ịṅụ ọgwụ ọjọọ

□ Ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ

□ Inwe mmekọahụ rụrụ arụ

□ Ihe ọzọ ․․․․․

Ọ bụrụ na o nwere nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ dị n’elu ị kanyere ihe na ya, ekpebila na i nweghị ike ịghọ Onye Kraịst. I nwere ike ịmụta otú e si ajụ ihe ọjọọ na otú e si emeri ọnwụnwa. Olee otú ị ga-esi mụta ya? Ọ na-enye aka ịmata ihe na-akpata ọnwụnwa. Tụlee ihe atọ ndị na-akpata ya.

1. Ezughị okè. Ime ihe ọjọọ na-agụ ụmụ mmadụ niile na-ezughị okè agụụ. Ọbụna Pọl onyeozi—bụ́ Onye Kraịst tozuru okè—kwuru nnọọ eziokwu, sị: “Mgbe m chọrọ ime ihe ziri ezi, ọ bụ ihe ọjọọ na-adị n’ebe m nọ.” (Ndị Rom 7:21) O doro anya na ọbụna onye kacha eme ezi omume maara na mgbe ụfọdụ o nwere ike inwe “ọchịchọ nke anụ ahụ́ na ọchịchọ nke anya.” (1 Jọn 2:16) Ma mmadụ ịnọgide na-eche banyere ihe ọjọọ a nwara ya ọnwụnwa ime na-eme ka ihe ka nnọọ njọ, n’ihi na Baịbụl kwuru, sị: “Mgbe ọchịchọ ahụ tụụrụ ime, ọ na-amụpụta mmehie.”—Jems 1:15.

2. Ibi n’ụwa rụrụ arụ. Ọnwụnwa juru ebe niile. Trudy kwuru, sị: “N’ụlọ akwụkwọ nakwa n’ebe ọrụ, ndị mmadụ na-ekwu banyere mmekọahụ mgbe niile. Na tiivi, na n’ihe nkiri, a na-eme mgbe niile ka o yie ihe magburu onwe ya, nke na-atọ ezigbo ụtọ. Ọ na-esi ike ha egosi gị ihe ọjọọ ndị ọ na-akpata!” N’ihi ihe merela Trudy, ọ maara otú tiivi nwere ike isi mebie mmadụ. O kwuru, sị: “Mgbe m dị afọ iri na isii, echere m na emetala m enyi nwoke hụrụ m n’anya. Mama m dowere m ọdụ ma gwa m na ọ bụrụ na m nọgide na-eme ihe a m na-eme, na m ga-atụrụ ime ọkwa. Ọ tụrụ m n’anya na mama m ga-ekwu ụdị ihe ahụ! Ọnwa abụọ ka ọ gwasịrị m ihe ahụ, atụụrụ m ime ọkwa.”

3. “Ọchịchọ a na-enwe n’oge ntorobịa.” (2 Timoti 2:22) Ọchịchọ a nwere ike ịgụnye ọchịchọ ọ bụla mmadụ na-enwekarị mgbe ọ ka na-eto eto, dị ka ọchịchọ ịbụ onye e ji kpọrọ ihe ma ọ bụ ịchọ ka ndị mmadụ lewe gị anya dị ka onye toro eto. Ọchịchọ ndị ahụ adịghị njọ n’onwe ha, ma ọ bụrụ na ị kpacharaghị anya, ha nwere ike ime ka o sikwuoro gị ike imeri ọnwụnwa. Dị ka ihe atụ, ịchọ ka e lewe gị anya dị ka onye toro eto nwere ike ime ka ị kwụsị ịkpa àgwà dị ka onye a zuru azụ. Nke ahụ bụ ihe mere Steve mgbe ọ dị afọ iri na asaa. Ọ sịrị, “M malitere inupụrụ ndị mụrụ m isi, na-emekwa ihe ọ bụla na ihe niile ha sị m emela—ihe a niile malitere ime obere oge e mechara m baptizim.”

N’eziokwu, ọ naghị adị mfe izere ọchịchọ ndị ahụ e kwuru okwu ha. Ma, i nwere ike imeri ọnwụnwa. Olee otú ị ga-esi mee ya?

▪ Ihe mbụ ị ga-eme bụ ịchọpụta ọnwụnwa nke na-akasị esiri gị ike mmeri. (O nwere ike ịbụ na ị kanyela ihe na ya n’elu.)

▪ Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ịjụ onwe gị, sị, ‘Olee mgbe o yiri ka ọnwụnwa ọ̀ ga-abịara m?’ Kanye ihe n’otu n’ime ihe ndị a:

□ Mgbe m nọ n’ụlọ akwụkwọ

□ Mgbe m nọ n’ebe ọrụ

□ Mgbe m nọ naanị m

□ Oge ndị ọzọ ․․․․․

Ịma mgbe o yiri ka ọnwụnwa ọ̀ ga-abịara gị nwedịrị ike inyere gị aka izere ya kpamkpam. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe atụ ahụ e nyere ná mmalite nke isiokwu a. Olee ihe gbaara Karen àmà na a ga-enwe nsogbu ná nnọkọ ahụ ọ gara? Olee otú ọ gaara esi zere ọnwụnwa?

▪ Ugbu a ị chọpụtarala (1) ọnwụnwa ahụ, (2) chọpụtakwa mgbe o yiri ka ọ̀ ga-abịa, ị dịla njikere ime ihe banyere ya. Ihe mbụ ị ga-achọ ime bụ ịchọta otú ị ga-esi belata ma ọ bụ gbochie ọnwụnwa ahụ. Dee ihe i nwere ike ime n’ebe a.

․․․․․

․․․․․

(Ihe atụ: Ọ bụrụ na ị na-ahụkarị ụmụ akwụkwọ ibe gị n’ụzọ mgbe ị na-ala akwụkwọ, ha ana-agwakwa gị ka i soro ha ṅụọ sịga, ikekwe, i nwere ike isi ụzọ ọzọ na-ala ka ị ghara izute ha. Ọ bụrụ na ị na-ahụkarị ndị gba ọtọ ị na-achọghị ịhụ mgbe ị na-achọ ihe n’Ịntanet, i nwere ike itinye ihe nwere ike igbochi foto ndị ahụ gba ọtọ ka ha ghara ịpụta. Ihe ọzọ i nwekwara ike ime bụ idenye kpọmkwem okwu ndị bụ́ isi dị n’ihe ị na-achọ n’Ịntanet.)

N’eziokwu, ị gaghị ezerechali ọnwụnwa niile. Otu ụbọchị, ọnwụnwa siri ezigbo ike nwere ike ịbịara gị—ikekwe mgbe ị na-atụtụghị anya ya. Gịnị ka i nwere ike ime banyere ya?

Dịrị njikere. Mgbe ‘Setan na-anwa’ Jizọs, Jizọs na-ajụ ihe ọ bụla ọ gwara ya mee ozugbo. (Mak 1:13) N’ihi gịnị? N’ihi na ọ marala na ya agaghị eme nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ ọ gwara ya mee. Chegodị echiche banyere ya. Jizọs abụghị ígwè ọrụ na-eme naanị ihe a rụrụ ya ime. E nwere ike ịnwata ya ma o kwere. Ma o kpebielarị irubere Nna ya isi mgbe niile. (Jọn 8:28, 29) Jizọs ma ihe ọ na-ekwu mgbe ọ sịrị: “Esi m n’eluigwe bịa ime, ọ bụghị uche m, kama uche onye zitere m.”—Jọn 6:38.

N’ohere dị n’okpuru ebe a, dee ihe abụọ mere i kwesịrị iji merie ọnwụnwa nke na-akacha abịara gị nakwa ụzọ abụọ i kpebiri isi mee ya.

1. ․․․․․

2. ․․․․․

Cheta na mgbe ọ bụla i kwere ka ọnwụnwa merie gị, ị ghọọla ohu nke ọchịchọ gị. (Taịtọs 3:3) Olee ihe mere ị ga-eji kwere ka ọchịchọ gị na-atụrụ gị ihe ị ga-eme? Mee ka dimkpa site n’ịtụrụ ọchịchọ gị ihe ọ ga-eme kama ọ ga na-atụrụ gị ihe ị ga-eme.—Ndị Kọlọsi 3:5.

Ị gaa n’Ịntanet, ị ga-enweta ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị” n’adres bụ́ www.watchtower.org/ype

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 6 A gbanwere aha ndị dị n’isiokwu a agbanwe.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

▪ È nwere ike ịnwa onye zuru okè ọnwụnwa?—Jenesis 6:1-3; Jọn 8:44.

▪ Mgbe i meriri ọnwụnwa, olee otú ikwesị ntụkwasị obi gị si emetụta ndị ọzọ?—Ilu 27:11; 1 Timoti 4:12.

[Igbe dị na peeji nke 19]

ARO

Chepụta ihe ndị ị ga-ekwu mgbe mmadụ nwara ime ka i mee ihe ọjọọ. Echegbula onwe gị. Ọ dịghị mkpa ka i mewe ka ị bụka onye ezi omume mgbe ị na-aza onye ahụ okwu. Ọtụtụ mgbe, naanị ihe dị gị mkpa ime bụ iji obi ike kwuo n’ụzọ dị mfe na ị chọghị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwa akwụkwọ ibe gị enye gị sịga ka ị ṅụọ, i nwere ike ịsị: “Ọ baghị uru inyewe m ya. Anaghị m aṅụ sịga!”

[Foto dị na peeji nke 20]

Mgbe ọ bụla i kwere ka ọnwụnwa merie gị, ị ghọọla ohu nke ọchịchọ gị