Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Unu Emeela Maka Ezi Ịhụnanya Unu Nwere n’Ebe Ụmụ Mmadụ Nọ”

“Unu Emeela Maka Ezi Ịhụnanya Unu Nwere n’Ebe Ụmụ Mmadụ Nọ”

“Unu Emeela Maka Ezi Ịhụnanya Unu Nwere n’Ebe Ụmụ Mmadụ Nọ”

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA RUSSIA

▪ N’obodo Chita nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Siberia, otu ọgbakọ Ndịàmà Jehova na-anọ n’ọnụ ụlọ klas nke otu ụlọ akwụkwọ enwe ọmụmụ ihe ha ruo mgbe ha kwagara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha rụrụ ọhụrụ. N’ihi na Ndịàmà ahụ na-edebe ọnụ ụlọ klas ahụ ọcha, na-arụzi ya ma o mebie, ma nwee obiọma, onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ degaara Ndịàmà Jehova akwụkwọ ozi ekele.

Ihe ụfọdụ akwụkwọ ozi ahụ kwuru bụ: “Unu emeela maka ezi ịhụnanya unu nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ, bụ́ ihe onye ọ bụla unu na ya mekọrọ ihe na-ahụ ozugbo, anyị na-ekelekwa unu maka ozi ala ọzọ unu na-aga na aka unu na-enyere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha. Ọ dịghị otú anyị ga-esi chefuo ezigbo ihe ndị anyị mụtarala n’aka unu n’ime afọ ndị a anyị na unu mekọtara ihe, bụ́ nke gosiri na ndị kweere na Chineke na-eme ezi ihe, na-akwụwa aka ọtọ, dị obiọma, nke kakwa nke, na ha na-enwe nzube na olileanya ná ndụ.” Ụdị okwu ndị ahụ na-amasị Ndịàmà Jehova.

▪ N’ógbè St. Petersburg, nke dị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku kilomita ise na narị ise site n’obodo Chita, a kpọrọ onye nnọchianya nke alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Russia òkù ịbịa otu ememme pụrụ iche ndị isi obodo St. Petersburg haziri. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ na-abụ kwa afọ, mgbe snoo kpụkọrọ n’okporo ụzọ gbazechara, Ndịàmà bi n’ógbè ahụ enye aka kpochaa unyí dị n’otu okporo ụzọ dịdebere alaka ụlọ ọrụ ha, bụ́ nke dị kilomita iri isii n’ogologo. Otu onye ọrụ gọọmenti nyere onye nnọchianya alaka ụlọ ọrụ ahụ satifiketi iji kelee ha maka ọrụ ọma ahụ ha na-arụrụ obodo. Ndị nọ n’ebe ahụ kụrụ nnọọ aka. Ọ bụ ihe na-eme obi ụtọ na mgbe onyeisi nnọkọ ahụ kpọjọrọ aha Chineke, bụ́ Jehova, ọtụtụ ndị na-abụghị Ndịàmà nọ n’ebe ahụ gbaziri ya olu ngwa ngwa, bụ́ nke na-egosi na ha ma aha Chineke na ndị e ji ya mara.

Otu ihe mere ndị mmadụ ji mara aha ahụ na ndị kasị eji aha ahụ eme ihe bụ ozi ihu ọha Ndịàmà Jehova na-eje, bụ́ ndị fọrọ nke nta ka ha ruo otu narị puku na iri puku ise na Russia. Ebumnobi ha bụ ịnọgide na-enwe “ezigbo ịhụnanya . . . n’ebe ụmụ mmadụ nọ” site n’izi ndị niile chọrọ ige ntị ozi Baịbụl na-akasi obi.—Matiu 22:39.

[Foto dị na peeji nke 11]

Onye nnọchianya alaka ụlọ ọrụ dị na Russia natara satifiketi maka ọrụ ọma